IHE BAỊBỤL KWURU
Mmanya Na-aba n’Anya
Ịṅụ mmanya na-aba n’anya ọ̀ dị njọ?
“Mmanya nke na-eme ka obi mmadụ ṅụrịa ọṅụ, iji mee ka ihu mmadụ na-egbu maramara n’ihi mmanụ, nakwa nri nke na-enye obi mmadụ ume.”—Abụ Ọma 104:15.
OTÚ NDỊ MMADỤ SI ELE MMANYA ANYA
N’ebe ụfọdụ, ọ na-abụ e bupụta nri e bupụta mmanya. * Ma, ụfọdụ ndị anaghị akpa mmanya aka. Gịnị mere ndị mmadụ ji ele ya anya otú dị iche iche? Ụfọdụ n’ime ihe kpatara ya bụ omenala, ụka mmadụ na-aga ma ọ bụ otú mmanya na-adị mmadụ n’ahụ́.
IHE BAỊBỤL KWURU
Baịbụl kwuru na ịṅụ oké mmanya adịghị mma nakwa na mmadụ ekwesịghị ịṅụ mmanya ruo otú ọ ga-egbuwe ya egbu. Ma, o kwughị na mmadụ ekwesịghị ịṅụ mmanya. (1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10) Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị fere Chineke n’oge ochie na-aṅụ mmanya. Baịbụl kpọkwara mmanya aha ihe karịrị narị ugboro abụọ. (Jenesis 27:25) Ekliziastis 9:7 kwuru, sị: “Jiri ọṅụ rie nri gị, jirikwa obi aṅụrị ṅụọ mmanya gị.” N’oge ochie, a na-aṅụ mmanya n’ebe a na-eme ememme, dị ka n’ebe a na-agba akwụkwọ n’ihi na mmanya na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Ọ bụ n’ebe a na-eme oriri alụmdi na nwunye ka Jizọs Kraịst mere mmiri ka ọ ghọọ “mmanya dị mma.” Ọ bụ ya bụ ọrụ ebube mbụ ọ rụrụ. (Jọn 2:1-11) E jikwa mmanya agwọ ọrịa n’oge ochie.—Luk 10:34; 1 Timoti 5:23.
Baịbụl ò kwuru ókè anyị ga-aṅụru mmanya?
‘Aṅụbigala mmanya oke.’—Taịtọs 2:3, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.
GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊMATA ÓKÈ A GA-AṄỤRU MMANYA?
Kwa afọ, ọtụtụ ezinụlọ na-ata ahụhụ n’ihi na nne ha ma ọ bụ nna ha na-aṅụ oké mmanya. Ọtụtụ ndị na-ada n’ụzọ n’ihi na ha ṅụbigara mmanya ókè. Ihe na-akpata ọtụtụ ihe mberede okporo ụzọ bụ na ọtụtụ ndị ọkwọ ụgbọala na-aṅụbiga mmanya ókè. Ịṅụ oké mmanya na-emekwa ka isi ghara ịkpakọ mmadụ ọnụ. Ọ na-akpatakwa ọrịa obi, na-emebikwa imejụ na afọ.
IHE BAỊBỤL KWURU
Chineke kwuru na anyị ekwesịghị ịna-eribiga nri ókè ma ọ bụ na-aṅụbiga mmanya ókè. (Ilu 23:20; 1 Timoti 3:2, 3, 8) Ọ bụrụ na anyị emeghị ihe a o kwuru, anyị na ya agaghị adị ná mma. Baịbụl sịrị: “Onye na-akwa emo ka mmanya bụ, ihe ọṅụṅụ na-egbu egbu bụ onye mkpọtụ, onye ọ bụla nke ọ na-eme ka ọ kpafuo amaghị ihe.”—Ilu 20:1.
Otu n’ime ụzọ mmanya si eme ka mmadụ kpafuo bụ ime ka onye ọ na-egbu mee ihe ọ garaghị eme. Hosia 4:11 sịrị: “Mmanya ochie na mmanya ọhụrụ na-anapụ ezi uche.” Ihe mere otu nwoke aha ya bụ Ginikanwa mere ka ọ ghọta ihe mmanya na-eme mmadụ. * O nwere otu ụbọchị ya na nwunye ya sere okwu, ya ejiri iwe gaa zụrụ mmanya ṅụwa. O mechara kwaa iko ụbọchị ahụ n’ihi na ọ ṅụbigara mmanya ókè. Mgbe anya doro ya, ihe ahụ o mere wutere ya, o kpebikwara na ya agaghị eme ụdị ihe a ọzọ. Ịṅụ oké mmanya nwere ike ịkpatara mmadụ ọrịa. Ọ na-emekwa ka mmadụ mee ihe na-adịghị mma. O nwekwara ike ime ka mmadụ na Chineke ghara ịdị ná mma. Baịbụl kwukwara na onye na-aṅụbiga mmanya ókè agaghị eketa Alaeze Chineke.—1 Ndị Kọrịnt 6:9, 10.
Olee mgbe anyị na-ekwesịghị ịṅụ mmanya?
“Onye maara ihe bụ onye hụrụ ọdachi gaa zoo, ma ndị na-amaghị ihe nọ na-aga, ha ga-atakwa ahụhụ ga-esi na ya pụta.”—Ilu 22:3.
GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊMATA MGBE ANYỊ NA-EKWESỊGHỊ ỊṄỤ MMANYA?
Otu akwụkwọ ọkọwa okwu kwuru na mmanya na-aba n’anya na-akpa ike. N’ihi ya, e nwere oge anyị na-ekwesịghịdị idetụ ya ọnụ.
IHE BAỊBỤL KWURU
Ụfọdụ ndị na-abanye ná nsogbu n’ihi na ha ṅụrụ mmanya n’oge ha na-ekwesịghị ịṅụ ya. Baịbụl kwuru na “e nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla.” N’ihi ya, e nwere oge mmadụ na-ekwesịghị ịṅụ mmanya. (Ekliziastis 3:1) Dị ka ihe atụ, n’obodo ụfọdụ, e nwere afọ ole mmadụ ga-eru tupu ya aṅụwa mmanya. Ma onye na-agbalị ịkwụsị ịṅụ oké mmanya ma onye na-aṅụ ọgwụ na-asọ mmanya ekwesịghị imetụ mmanya ọnụ. Onye na-arụ ọrụ ekwesịghịkwa ịṅụ mmanya, nke ka nke, ma ọ bụrụ na o ji ihe dị ka ígwè na-akwọbi ihe arụ ọrụ. N’eziokwu, ndị ma ihe ejighị ndụ ha na ahụ́ ike ha egwu egwu n’ihi na ha ma na ndụ si n’aka Chineke. (Abụ Ọma 36:9) Ọ bụrụ na anyị anaghị aṅụbiga mmanya ókè, ọ na-egosi na anyị na-ele ndụ anya otú Chineke si ele ya.
^ para. 5 Mmanya anyị na-ekwu banyere ya n’isiokwu a bụ mmanya na-aba n’anya.
^ para. 11 Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.