Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa

Ihe Ndị Na-eme n’Ụwa

Amerịka

A chọpụtala na uche ọtụtụ ndị ji ụkwụ aga anaghị adị n’ebe ha na-aga. Ụfọdụ n’ime ha na-adị na-ege egwú n’ekwentị ha, ebe ụfọdụ na-aza fon ma ọ bụ na-eme ihe ọzọ. Ma, nke ka njọ bụ na ọ na-abụ ha na-aga, ha ana-ede ozi ha na-ezigara ndị ọzọ n’ekwentị. Ọ na-ewe ụdị ndị a oge ịgbafe okporo ụzọ karịa ndị uche ha dị n’ebe ha na-aga. Ebe ọ bụ na uche ha adịghị n’ebe ha na-aga, ha na-agbafe ụzọ n’ebe ha na-ekwesịghị isi gbafee, ha anaghịkwa ele anya nke ọma tupu ha agbafee.

Naịjirịa

A na-akpọrọ ụmụ agbọghọ ndị Naịjirịa ka ha gaa gbawa akwụna na Yurop. Tupu a kpọrọ ha pụwa, a na-akpọga ha n’ihu arụsị ka ha ṅụọ iyi ka ọ ga-abụ ha cheta na iyi ha ṅụrụ nwere ike igbu ha, ha emewe ihe ọ bụla a gwara ha.

Spen

Ọtụtụ ndị gara mahadum na ndị nke ma ọrụ ha nke ọma enweghị ọrụ. Ụfọdụ n’ime ha chọwa ọrụ, ha anaghị ekwu ebe ha gụruru akwụkwọ ma ọ bụ na ha ma ọrụ ahụ. Ihe mere ha ji eme otú ahụ bụ na ndị chọrọ iwe ha n’ọrụ mata na ha ma ọrụ, ha agaghị ewe ha maka na ha agaghị akwụli ha ụgwọ.

Ụwa niile

A chọpụtara na ihe dị ka nde mmadụ anọ na-anwụ kwa afọ ná mba ndị na-emepe emepe n’ihi na ha kuuru ikuku ọjọọ. A sị na otu n’ime ihe ndị ha kuuru bụ anwụrụ ọkụ na-akwụ n’ekwu ma a na-esi nri. Ndị chọpụtara ihe ahụ kwuru na ihe dị n’anwụrụ ọkụ yiri ihe ahụ na-adị n’anwụrụ ọkụ sịga. O nwekwara ike igbu mmadụ.