Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

 IHE BAỊBỤL KWURU

Jizọs

Jizọs

Jizọs ọ̀ bụ Chineke?

“Ọ dịghị mmadụ hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla.” —Jọn 1:18.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ọtụtụ ndị na-ekwu na Jizọs abụghị Chineke. Ma, ụfọdụ ndị na-ekwu na e nwere amaokwu Baịbụl ndị na-egosi na Jizọs na Chineke hà.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl ekwughị na Jizọs bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, o kwughịkwa na ha abụọ hà. Kama, o kwuru na Chineke ka Jizọs. Dị ka ihe atụ, Jizọs kwuru, sị: “Nna m ka m ukwuu.” (Jọn 14:28) Baịbụl kwukwara, sị: “Ọ dịghị mmadụ hụtụrụla Chineke mgbe ọ bụla.” (Jọn 1:18) Ma, ọtụtụ ndị hụrụ Jizọs mgbe ọ bịara n’ụwa. N’ihi ya, ọ bụghị Chineke.

Ndị na-eso ụzọ Jizọs ekwughị na ọ bụ Chineke. Dị ka ihe atụ, Jọn onyeozi dere, sị: “E dere ihe ndị a ka unu wee kwere na Jizọs bụ Kraịst, Ọkpara Chineke.”Jọn 20:31. *

 Olee mgbe a mụrụ Jizọs?

“E nwere ndị ọzụzụ atụrụ ndị bi n’ọhịa. Ha na-eche ìgwè atụrụ ha nche n’abalị.”—Luk 2:8.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ ndị na-agba Krismas n’ụbọchị iri abụọ na ise n’ọnwa Disemba n’ihi na ha na-ekwu na ọ bụ ụbọchị ahụ ka a mụrụ Jizọs. Ndị ọzọ na-ekwu na ọ bụ n’ọnwa Jenụwarị ka a mụrụ ya.

IHE BAỊBỤL KWURU

Baịbụl ekwughị ụbọchị a mụrụ Jizọs. Ma, o kwuru na mgbe a mụrụ ya, ‘e nwere ndị ọzụzụ atụrụ ndị bi n’ọhịa, na-eche ìgwè atụrụ ha nche n’abalị.’ (Luk 2:8) O nweghị ka ndị ọzụzụ atụrụ ahụ ga-esi chịrị atụrụ ha nọrọ n’èzí n’abalị n’ọnwa Disemba ma ọ bụkwanụ n’ọnwa Jenụwarị. N’ihi gịnị ka anyị ji kwuo otú a?

Ọ bụ n’ihi na n’ebe a mụrụ Jizọs, ezigbo oyi na-atụ n’ọnwa Disemba nakwa n’ọnwa Jenụwarị. Baịbụl kwuru na n’oge Disemba na Jenụwarị, ndị mmadụ “na-ama jijiji n’ihi . . . mmiri ozuzo.” (Ezra 10:9, 13; Jeremaya 36:22) N’ihi ya, oge ahụ abụghị oge ndị ọzụzụ atụrụ ga-eji chịrị atụrụ ha gaa ‘biri n’ọhịa.’

À kpọlitere Jizọs n’ọnwụ n’eziokwu?

“Chineke si ná ndị nwụrụ anwụ kpọlite [Jizọs].”Ọrụ Ndịozi 3:15.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ ekwetaghị na e nwere ike ịkpọlite onye nwụrụ anwụ. Ha ekweghịkwa na Jizọs si n’ọnwụ bilite.

IHE BAỊBỤL KWURU

Jizọs gwara ndị na-eso ụzọ ya na a ga-ata ya ọtụtụ ahụhụ, gbuokwa ya. O kwukwara na a ga-akpọlite ya n’ụbọchị nke atọ. (Matiu 16:21) Baịbụl kwuru na mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, ihe karịrị narị mmadụ ise hụrụ ya. (1 Ndị Kọrịnt 15:6) Ndị ahụ hụrụ ya enweghị obi abụọ na o bilitere n’ọnwụ. E gbudịrị ụfọdụ n’ime ha n’ihi na ha kwetasịrị ike na Jizọs si n’ọnwụ bilie.—Ọrụ Ndịozi 7:51-60; 12:1, 2.

IHE MERE O JI GBASA GỊ

Baịbụl kwuru na ọnwụ Jizọs nwụrụ na otú Chineke si kpọlite ya n’ọnwụ ga-abara ụmụ mmadụ uru. Uru ha ga-erite bụ na ha ga-ebi n’ụwa mgbe Chineke ga-eme ka ọ ghọọ Paradaịs. (Abụ Ọma 37:11, 29; Mkpughe 21:3, 4) Ọ bụ maka na Jizọs na Nna ya bụ́ Jehova hụrụ anyị n’anya mere anyị ji nwee olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa mgbe ọ ga-aghọ Paradaịs, bụ́ ebe anyị ga-enwe obi ụtọ.—Jọn 3:16; Ndị Rom 6:23.

^ para. 7 Baịbụl ekwughị na Chineke lụrụ nwaanyị, ya amụtara ya ụmụ. Kama, ihe mere e ji akpọ Jizọs “Ọkpara Chineke” bụ na Chineke ji aka ya kee ya. Ọ na-akpakwa àgwà ka Chineke.