IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | DI NA NWUNYE
Otú Ị Ga-esi Kwụsị Ịna-ebu Iwe n’Obi
IHE BỤ́ NSOGBU
O nwere ike ịbụ na okwu ọjọọ di gị ma ọ bụ nwunye gị gwara gị ma ọ bụ ihe ọjọọ o mere gị ekweghị apụ gị apụ n’obi, mgbe ọ bụla i lere ya anya, gị echeta ihe ahụ. Ya emezie ka ị na-eburu ya iwe n’obi. Ọ dị gị ka e nweghị ihe ị ga-emeli ka unu na-ebi n’udo. Ị na-ewesakwa ya iwe maka na unu anaghị ebi n’udo.
Nke bụ́ eziokwu bụ na unu ga-ebili n’udo. Ma, ka anyị buru ụzọ ghọta ihe ụfọdụ ibu iwe n’obi nwere ike ịkpata.
IHE I KWESỊRỊ ỊMA
Ibu iwe n’obi nwere ike itisa ezinụlọ. Maka gịnị? Maka na onye buuru di ya ma ọ bụ nwunye ya iwe n’obi agaghị ahụ ya n’anya, ọ gaghị atụkwasị ya obi, ọ gaghịkwa na-emere ya ihe ọma. Ị manụ na ọ bụ ihe ndị a na-eme ka ezinụlọ ghara isi ike. Mmadụ iburu di ya ma ọ bụ nwunye ya iwe n’obi bụ nnukwu nsogbu n’ezinụlọ. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji sị: “Wepụnụ obi ilu niile na iwe . . . n’etiti unu.”—Ndị Efesọs 4:31.
Onye na-ebu iwe n’obi na-emerụ onwe ya ahụ́. Ibu iwe n’obi dị ka ebe mmadụ na-ama onwe ya ụra na-atụ anya na ọ bụ onye ọzọ ka ntì ga-afụ ụfụ. Otu ọkachamara aha ya bụ Mark Sichel kwuru na onye ahụ ị na-eburu iwe n’obi nwedịrị ike na-enwere onwe ya obi ụtọ, ghara ịchọ ịma ihe na-eme gị. Ihe ọ pụtara bụ na onye na-eburu di ya ma ọ bụ nwunye ya iwe n’obi na-emerụ onwe ya ahụ́.
Ibu iwe n’obi dị ka ebe mmadụ na-ama onwe ya ụra na-atụ anya na ọ bụ onye ọzọ ka ntì ga-afụ ụfụ
Ihe ị ga-eme dị gị n’aka. Ụfọdụ ndị nwere ike ha agaghị ekweta ihe a. Ha nwere ike ịsị, ‘Ọ bụ di m ma ọ bụ nwunye m mere m ji eburu ya iwe n’obi.’ Iche otú ahụ ga-eme ka mmadụ chewe na ọ gaghị akwụsịli iburu onye nke ọzọ iwe n’obi ebe ọ bụ onye ahụ kpasuru ya iwe. Ma, Baịbụl gwara anyị ihe anyị kwesịrị ime. Ọ sịrị: “Ka onye ọ bụla nwapụta ọrụ ya.” (Ndị Galeshia 6:4) Ọ bụghị anyị ga-ekpebiri ndị ọzọ ihe ha ga-ekwu ma ọ bụ ihe ha ga-eme. Ma, ọ bụ anyị ga-ekpebi ihe anyị ga-eme ma ha kpasuo anyị iwe. E nwere ihe ndị ọzọ anyị nwere ike ime ma e wezụga ibu iwe n’obi.
IHE I NWERE IKE IME
Kpebie ihe ị ga-eme. Ihe mbụ ga-agbata gị n’obi nwere ike ịbụ ịta di gị ma ọ bụ nwunye gị ụta. Ma, cheta na i nwere ike ikpebi iburu di gị ma ọ bụ nwunye gị iwe n’obi ma ọ bụ ịgbaghara ya. I nwere ike ime ihe a Baịbụl kwuru. Ọ sịrị: “Anọkwala na-ewe iwe ruo mgbe anyanwụ dara.” (Ndị Efesọs 4:26) Ọ bụrụ na ị na-agbaghara di gị ma ọ bụ nwunye gị, unu ga-enwe ike ịna-edozi ihe ọ bụla na-esere unu okwu.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Kọlọsi 3:13.
Gwa onwe gị eziokwu. Baịbụl kwuru na e nwere ndị “na-ewekarị iwe.” (Ilu 29:22) Ọ̀ bụ otú ahụ ka i si eme? Jụọ onwe gị, sị: ‘M̀ na-ewekarị iwe? Obere ihe ọ bụla mmadụ mere ọ̀ na-ewe m iwe?’ Baịbụl kwuru na ‘onye na-ekwu banyere otu ihe mgbe niile na-ekewa ndị ha na ibe ha dị ná mma.’ (Ilu 17:9; Ekliziastis 7:9) Ụdị ihe a nwekwara ike ime n’ezinụlọ. N’ihi ya, ọ bụrụ na ị na-ebukarịrị di gị ma ọ bụ nwunye gị iwe n’obi, jụọ onwe gị, sị, ‘M̀ nwere ike ịna-enwere ya ndidi?’—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: 1 Pita 4:8.
Mara mgbe ị ga-ekwu okwu na mgbe ị gaghị ekwu okwu. Baịbụl kwuru na e nwere “oge ịgbachi nkịtị na oge ikwu okwu.” (Ekliziastis 3:7) Ọ bụghị ihe ọ bụla di gị ma ọ bụ nwunye gị mere gị ka unu kwesịrị ịkpara isiokwu. Oge ụfọdụ, i nwere ike ‘kwuo ihe ị chọrọ ikwu n’ime obi gị, n’elu ihe ndina gị, ma gba nkịtị.’ (Abụ Ọma 4:4) Di gị ma ọ bụ nwunye gị mee ihe were gị iwe, chere ka obi gị dajụọ tupu ị gwawa ya banyere ya. Otu nwaanyị aha ya bụ Beatriz sịrị na di ya kpasuo ya iwe, ọ na-ebu ụzọ chere ka obi ya dajụọ. E mechaa ọ na-achọpụta na ihe ahụ were ya iwe mgbe ahụ e nweghị ihe ọ bụ. Ọ na-ewetuzi obi gwa di ya otú obi dị ya.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ilu 19:11.
Ghọta ihe ịgbaghara mmadụ pụtara. Okwu Hibru ma ọ bụ Grik e si sụgharịta “mgbaghara” pụtara ịhapụ ihe. N’ihi ya, ịgbaghara mmadụ apụtaghị na ị ga-eme ka à ga-asị na e nweghị ihe onye ahụ mere gị. Kama, ọ pụtara na ị ga-ahapụwa ihe ahụ o mere maka na ibu iwe n’obi nwere ike ịkpatara gị ọrịa ma ọ bụ tisaa ezinụlọ gị.