‘Ihe Ncheta Pụrụ Iche’
N’OBODO a na-akpọ Hiroshima, nke dị na Japan, e nwere osimiri a na-akpọ Osimiri Motoyasu. E nwere otu ụlọ dị n’akụkụ osimiri a. Kemgbe afọ 1945 a tụrụ bọmbụ ebe ahụ, ọ tọgbọ nkịtị. Gịnị mere na a rụzibeghị ụlọ ahụ kemgbe ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ iri afọ asaa?
Mgbe a rụrụ ụlọ ahụ bụ n’afọ 1915. E ji brik rụọ ya. Ọ bụ ụlọ elu nwere okpukpu abụọ. E ji ya mere ebe ndị mmadụ na-aga egosi ngwá ahịa ha mepụtara ọhụrụ. Ma, n’abalị isii n’ọnwa asatọ n’afọ 1945, mgbe o ji nkeji iri na ise gafee elekere asatọ nke ụtụtụ, njinji jiri. N’ụbọchị ahụ, ngwá agha ọgwụrụ mba a tụrụ n’obodo ahụ gbawara n’ebe na-adịghị anya n’ụlọ ahụ. Ọ bụ ya bụ nke mbụ e ji lụọ agha n’ụwa. Mmadụ niile nọ n’ụlọ ahụ nwụrụ ozugbo nje. Ma, okpokoro ụlọ ahụ adaghị.
Kemgbe ahụ, ndị obodo ahụ agbaala mbọ ka ụlọ ahụ dịkwa otú ahụ ọ dị kemgbe a tụrụ ya bọmbụ. Ngalaba Òtù Mba Ụwa a na-akpọ UNESCO kwuru na ụlọ ahụ na-echetara ndị mmadụ ụdị ike ngwá agha ụmụ mmadụ rụrụ kpara. N’afọ 1996, òtù UNESCO denyere aha ụlọ a n’ebe ha na-edenye aha ihe dị iche iche a na-agaghị echefu echefu n’ụwa. Ha kwuru na ụlọ ahụ na-echetara ha na ha kwesịrị ime ka udo dịrị n’ụwa.
Ma, ụdị ihe a emebeghị ka ndị mmadụ kwụsị ịlụ agha. Ihe na-akpatakwa agha ndị ahụ bụ anyaukwu, ịkpọ ndị agbụrụ ọzọ ma ọ bụ ndị okpukpe ọzọ asị ma ọ bụkwanụ mmadụ iburu ihe gbasara obodo ya n’isi. Ọ̀ pụtaziri na agha agaghị akwụsị akwụsị?
Baịbụl kwuru na ọ ga-akwụsị. Abụ Ọma 46:9 sịrị: “[Chineke] na-eme ka agha kwụsị ruo na nsọtụ ụwa. Ọ na-agbaji ụta, na-egbujisịkwa ube; ọ na-agbakwa ụgbọ agha ọkụ.” N’oge ahụ, Chineke ga-ewepụ ọchịchị ụmụ mmadụ were Alaeze ya dochie ha. Ọ bụ Jizọs Kraịst, bụ́ “Eze nke ndị eze,” ga na-achịzi ụmụ mmadụ.—Mkpughe 11:15; 19:16.
N’oge ahụ, a gaghịzi enwe ihe ndị ga na-echetara anyị agha ndị a lụrụ n’oge gara aga. Ihe ndị na-agbawa anyị obi ugbu a agaghịzi adị n’ihi na Aịzaya 65:17 kwuru, sị: “A gaghị echeta ihe mbụ niile, ha agaghị abatakwa n’obi.”