IHE BAỊBỤL KWURU
Tigbuo Zọgbuo
Ihe e ji mara ụmụ mmadụ kemgbe ụwa bụ tigbuo zọgbuo. Ọ̀ ga-emecha kwụsị?
Olee otú Chineke si ele tigbuo zọgbuo anya?
IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU
Ụfọdụ ndị na-aga chọọchị na ọtụtụ ndị ọzọ na-ekwu na mmadụ imesi onye kpasuru ya iwe ike abụghị ihe ọjọọ. Obi na-atọkwa ọtụtụ ndị ụtọ ma ha na-ekiri ebe mmadụ na-emesi ibe ya ike na fim.
IHE BAỊBỤL KWURU
Ị gaa n’ebe dị nso n’obodo Mọsụl nke dị n’ebe ugwu Ịrak, ị ga-ahụ otu ebe ọ na-enweghịzi onye bi na ya. Ọ bụbu nnukwu obodo, aha ya bụkwa Ninive. Ọ bụ ya bụ isi obodo Asiria n’oge ochie. Ndị mmadụ ka juru na Ninive mgbe Baịbụl buru amụma na Chineke ga-eme ka ‘ọ bụrụ ebe tọgbọ n’efu.’ (Zefanaya 2:13) Chineke kwuru na ya ga-eme ka Ninive bụrụ ihe nkiri. Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ maka na Ninive bụ “obodo na-awụfu ọbara.” (Nehọm 1:1; 3:1, 6) Abụ Ọma 5:6 kwukwara na “Jehova kpọrọ onye na-awụfu ọbara . . . asị.” Otú ahụ Ninive sizi tọgbọrọ n’efu gosiri na Chineke mere ihe ahụ o kwuru.
Ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu malitere tigbuo zọgbuo. Ọ bụ onye iro Chineke, bụrụkwa onye iro anyị. Jizọs Kraịst kpọkwara ya “ogbu mmadụ.” (Jọn 8:44) Tigbuo zọgbuo juru ebe niile taa, a na-egosikwa ya na fim ndị mmadụ na-ekiri. Ihe mere o ji dị otú a bụ na “ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Anyị chọọ ka obi dị Chineke mma, anyị kwesịrị ịkpọ ụdị omume a asị ma hụ ihe Chineke hụrụ n’anya n’anya. * Ànyị ga-emeli ya?
“Jehova . . . kpọrọ onye ọ bụla nke hụrụ ime ihe ike n’anya asị.”—Abụ Ọma 11:5.
Ndị e ji tigbuo zọgbuo mara hà ga-agbanweli?
IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU
Ndị mmadụ na-ekwu na o nweghị otú ụmụ mmadụ ga-esi kwụsị imekpa mmadụ ibe ha ahụ́ n’ihi na ọ bụ ihe ha bu pụta ụwa.
IHE BAỊBỤL KWURU
Baịbụl gwara anyị ka anyị hapụ ‘ọnụma, iwe, ihe ọjọọ, okwu mkparị, na okwu rụrụ arụ.’ Ọ gwakwara anyị, sị: “Yipụnụ mmadụ ochie ahụ na omume ya, ma yirinụ mmadụ ọhụrụ ahụ.” (Ndị Kọlọsi 3:8-10) Ànyị ga-emeli ihe a Chineke gwara anyị mee? Ee. Ndị mmadụ nwere ike ịgbanwe. * Ka mmadụ nwee ike ịgbanwe, e nwere ihe atọ nwere ike inyere ya aka.
Ndị Kọlọsi 3:10) Ọ bụrụ na mmadụ ejiri obi ya niile mụọ gbasara àgwà ndị Chineke nwere nakwa iwu o nyere ụmụ mmadụ, ọ ga-ahụ Chineke n’anya, na-emekwa ihe ọ chọrọ.—1 Jọn 5:3.
Ihe mbụ mmadụ kwesịrị ime bụ ịmụ gbasara Chineke. (Ihe nke abụọ ga-enyere mmadụ aka bụ ịkpachapụ anya ná ndị ya na ha na-akpa. Baịbụl kwuru, sị: “Abụla enyi onye ọ bụla nke na-ewekarị iwe; gị na onye na-ewe iwe ọkụ akpakọrịtala, ka ị ghara ịmụta ụzọ ya wee wetara mkpụrụ obi gị ọnyà.”—Ilu 22:24, 25.
Nke atọ bụ ịmata ihe tigbuo zọgbuo pụtara. Onye na-emesi ndị mmadụ ike nwere ezigbo nsogbu n’ihi na ọ naghị ejideli onwe ya. Ma, onye na-eme udo ka onye ahụ mma n’ihi na Ilu 16:32 kwuru na “onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ dị mma karịa dike.”
“Na-achụsonụ udo n’ebe mmadụ niile nọ.”—Ndị Hibru 12:14.
Ò nwere mgbe tigbuo zọgbuo ga-akwụsị?
IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU
Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụghị taa ka tigbuo zọgbuo bidoro nakwa na ọ gaghị akwụsị akwụsị.
IHE BAỊBỤL KWURU
“N’oge na-adịghị anya, onye ajọ omume agakwaghị anọ . . . Ma ndị dị umeala n’obi ga-enweta ụwa, ha ga-enwekwa obi ụtọ dị ukwuu n’ihi udo nke zuru ebe niile.” (Abụ Ọma 37:10, 11) Chineke ga-ebibi ndị e ji tigbuo zọgbuo mara otú o si bibie ndị Ninive. Ihe mere ọ ga-eji bibie ha bụ ka ndị dị umeala n’obi na ndị udo nwere onwe ha. A gaghịzi anụ ihe ọ bụla gbasara tigbuo zọgbuo n’ụwa.—Abụ Ọma 72:7.
Ọ bụrụ na mmadụ bụ onye tigbuo zọgbuo, ọ bụ ugbu a ka o kwesịrị ịgba mbọ gbanwee ka ya na Chineke dị ná mma. Pita nke abụọ, isi atọ, amaokwu itoolu kwuru, sị: “Jehova . . . na-enwere unu ndidi n’ihi na ọ chọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.”
“Ha ga-akpụgharịkwa mma agha ha ka ha bụrụ mma ogè, kpụgharịakwa ube ha ka ha bụrụ mma ịkwa osisi.”—Aịzaya 2:4.
^ para. 7 Ihe mere Chineke ji hapụ ụmụ Izrel ka ha lụọ agha bụ ka ndị mmadụ ghara ịnaghara ha ala ha. (2 Ihe E Mere 20:15, 17) Ma, ihe mechara gbanwee mgbe Chineke hapụrụ mba Izrel ma hiwe ọgbakọ Ndị Kraịst zuru ụwa ọnụ.
^ para. 11 Ị gụọ isiokwu bụ́ “Baịbụl Na-agbanwe Ndụ Ndị Mmadụ,” nke na-agba n’Ụlọ Nche, ị ga-ahụ ụfọdụ ndị a kọrọ akụkọ ha na otú ha si gbanwee àgwà ha.