ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Disemba 2019

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ na Febụwarị 3 ruo na Mach 1, 2020.

“E Nwere Oge A Kara Aka Maka” Ịrụ Ọrụ na Izu Ike

Ihe isiokwu a ga-akọwa gbasara Ụbọchị Izu Ike a gwara ndị Izrel ka ha na-edebe kwa izu ga-enyere anyị aka iche gbasara otú anyị si ele ịrụ ọrụ na izu ike anya.

Jehova Na-eme Ka I Nwere Onwe Gị

Jubili ndị Izrel mere n’oge ochie na-echetara anyị ihe Jehova meere anyị ka anyị nwere onwe anyị.

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

N’Iwu Mozis, ọ bụrụ na nwoke hụrụ nwa agbọghọ e kwere nkwa ọlụlụ, dinaa ya n’ike “n’ọhịa,” aka nke nwaanyị dị ọcha ma ọ bụrụ na o tiri mkpu. N’ihi gịnị?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Mgbe Setan gwara Iv na ọ gaghị anwụ ma o rie mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, ò si otú ahụ malite ihe a ndị mmadụ na-akụzi taa, na mkpụrụ obi mmadụ anaghị anwụ anwụ?

Ị̀ Ma Jehova nke Ọma?

Gịnị ka ịma Jehova pụtara? Olee ihe anyị ga-amụta n’aka Mozis na Eze Devid gbasara otú anyị ga-esi eme ka anyị na Jehova dị n’ezigbo mma?

Ndị Nne na Nna, Zụọnụ Ụmụ Unu Ka Ha Hụ Jehova n’Anya

Olee otú ndị nne na nna ga-esi zụọ ụmụ ha ka ha hụ Jehova n’anya ma na-efe ya?

Na-ekele Onye Ọ Bụla Meere Gị Ihe

E nwere ọtụtụ uru ikele ndị meere anyị ihe na-abara anyị.

Ì Chetara?

Ị̀ gụọla Ụlọ Nche ndị ọhụrụ e bipụtara? Lee ma ị̀ ga-echetali ụfọdụ ihe ndị ị gụrụ.

Isiokwu Ndị E Bipụtara n’Ụlọ Nche na Teta! n’Afọ 2019

Ihe a e depụtara ga-enyere gị aka ịchọta isiokwu ndị gbara n’Ụlọ Nche na Teta! n’afọ 2019.