Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ì Chetara?

Ì Chetara?

Ị̀ ga-azali ajụjụ ndị a si n’isiokwu ndị gbara n’Ụlọ Nche ndị e bipụtara n’afọ 2019?

Chineke kwere nkwa na ‘ngwá ọgụ ọ bụla a kpụrụ iji lụso anyị ọgụ agaghị aga nke ọma.’ Gịnị ka ọ pụtara? (Aịza. 54:17)

Obi kwesịrị isi anyị ike na Jehova ga-echebe anyị n’aka “ndị aka ike.” (Aịza. 25:​4, 5) O nweghị nsogbu ndị iro anyị na-enye anyị ga-adịgide.​—w19.01, peeji nke 6 na nke 7.

Olee otú ihe Chineke mere ndị Kenan na ndị Izrel na-enupụrụ ya isi si gosi na ọ na-ekpe ikpe ziri ezi?

Chineke kpere ndị ahụ na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ ma ọ bụ na-emegbu ụmụ nwaanyị na ụmụaka ikpe. Ọ gọziri ndị rubeere ya isi na ndị na-emeso ndị ọzọ otú dị mma.​—w19.02, peeji nke 22 na nke 23.

Gịnị ka anyị ga-eme ma anyị nọrọ mgbe onye na-abụghị nwanna na-ekpe ekpere?

Anyị nwere ike ịgba nkịtị ma kwanyere ha ùgwù. Ma anyị agaghị eso ekwe “amen” ma ọ bụ jide ndị ọzọ aka mgbe ọ na-ekpe ekpere. Anyị nwere ike ikpe ekpere n’ime obi anyị.​—w19.03, peeji nke 31.

Gịnị mere imetọ ụmụaka ji jọgbuo onwe ya?

Onye metọrọ nwatakịrị mere ya ezigbo ihe ọjọọ, mejọọ ọgbakọ, mebie iwu ndị ọchịchị, mehiekwa Chineke. N’obodo iwu kwuru ka a kọọrọ ndị ọchịchị na e metọrọ nwatakịrị, ndị okenye na-eme otú ahụ.​—w19.05, peeji nke 9 na nke 10.

Olee otú ị ga-esi agbanwe ụdị mmadụ ị bụ ma ọ bụ mee ka ọ ka mma?

Na-agwa Jehova otú obi dị gị n’ekpere. Na-atụgharị uche ka i nwee ike ichebara onwe gị echiche. Ka gị na ndị ezigbo mmadụ na-akpakọrịta.​—w19.06, peeji nke 11.

Gịnị ka anyị ga-eme ugbu a iji jikere maka mkpagbu?

Anyị kwesịrị ime ka anyị na Jehova dịrịkwuo ná mma. Obi sie gị ike na Jehova hụrụ gị n’anya, nakwa na ọ gaghị agbahapụ gị. Na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị, na-ekpekwa ekpere mgbe niile. Obi sie gị ike na ihe ndị Jehova kwere nkwa imere anyị n’Alaeze ya ga-emezu. Bute amaokwu Baịbụl na abụ ndị na-amasị gị n’isi.​—w19.07, peeji nke 2 ruo na nke 4.

Olee ihe anyị nwere ike ime iji nyere ndị ezinụlọ anyị aka ka a zọpụta ha?

Anyị kwesịrị ịghọta otú ọ dị ha, na-akpa àgwà ọma, na-enwere ha ndidi, jirikwa akọ na-agwa ha okwu.​—w19.08, peeji nke 15 ruo na nke 17.

Olee otú Jizọs si eme ka anyị nweta ume otú ahụ o kwere anyị ná nkwa na Matiu 11:28?

O mere ka anyị nwee ndị nlekọta hụrụ anyị n’anya, ndị enyi kacha mma nakwa ọrụ kacha mma.​—w19.09, peeji nke 23.

Olee otú Jehova si eme ka anyị chọọ ime uche ya, nyekwa anyị ike ime ya? (Fil. 2:13)

Anyị gụwa Okwu Chineke ma na-atụgharị uche n’ihe anyị gụrụ, Chineke nwere ike ime ka anyị chọọ ime uche ya, nyekwa anyị ike anyị ga-eji eme ya. O nwekwara ike iji mmụọ nsọ ya mee ka anyị na-emekwu nke ọma na nkà anyị nwere.​—w19.10, peeji nke 21.

Olee ihe ndị anyị kwesịrị ime tupu anyị ekpebie ihe dị ezigbo mkpa?

Ihe ise ị ga-eme bụ: Mee ezigbo nchọnchọ. Rịọ Jehova ka o nye gị amamihe. Chee ihe mere i ji chọọ ime ihe ahụ. Kapịa ihe ị chọrọ ime ọnụ. Kpebie ihe ị ga-emeli.​—w19.11, peeji nke 27 ruo na nke 29.

Ihe a ndị mmadụ na-akụzi taa na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ, ọ̀ malitere mgbe Setan gwara Iv na ọ gaghị anwụ ma o rie mkpụrụ osisi ahụ?

Mba. Setan gwara Iv na ọ gaghị anwụ, ọ bụghị na ọ ga-adị ka ọ̀ nwụrụ. E nweghị nkụzi ụgha fọrọ mgbe Iju Mmiri gachara. O nwere ike ịbụ na nkụzi ahụ bụ́ na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ malitere tupu Chineke emee ka ndị na-arụ Ụlọ Elu Bebel gbasasịa.​—w19.12, peeji nke 15.