Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 51

Ị̀ Ma Jehova nke Ọma?

Ị̀ Ma Jehova nke Ọma?

“Ndị maara aha gị ga-atụkwasị gị obi, n’ihi na gị onwe gị, Jehova, agaghị ahapụ ndị na-achọ gị.”​—ỌMA 9:10.

ABỤ NKE 56 Ka Eziokwu Bamie Gị n’Obi

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. Olee ihe akụkọ Angelito na-akụziri onye ọ bụla n’ime anyị ime?

NNE na nna gị hà bụ Ndịàmà Jehova? Ọ bụrụ otú ahụ, cheta na mmadụ anaghị abụ enyi Jehova naanị n’ihi na nne na nna ya bụ enyi Jehova. Ma nne na nna anyị hà bụ Ndịàmà Jehova ma ọ bụ na ha abụghị, onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ime ka ya na Jehova dịrị ná mma.

2 Chegodị gbasara otu nwanna aha ya bụ Angelito. Ndị ezinụlọ ha bụ Ndịàmà Jehova. Ma mgbe ọ ka na-eto eto, o jighị ofufe Jehova kpọrọ ihe. O kwuru, sị: “M na-efe Jehova n’ihi na m chọrọ ime ihe ndị ezinụlọ anyị na-eme.” Angelito mechara wepụta oge na-agụ Akwụkwọ Nsọ, na-atụgharịkwa uche n’ihe ọ gụtara. Ọ malitekwara ịna-ekpe ekpere mgbe niile. Gịnị meziri? Angelito kwuru, sị: “Amụtara m na naanị ihe ga-eme ka mụ na Nna m bụ́ Jehova dịrị ná mma bụ mụnwa ịmata onye ọ bụ.” Akụkọ Angelito na-eme ka anyị jụọ onwe anyị ajụjụ ndị a dị mkpa: Gịnị dị iche n’ịmatụ Jehova na ịma ya nke ọma? Olee ihe anyị ga-eme iji mata Jehova nke ọma?

3. Olee ihe dị iche n’ịma Jehova na ịma ya nke ọma?

3 Anyị nwere ike ịna-eche na mmadụ ma Jehova ma onye ahụ mara aha Chineke ma ọ bụ ihe ụfọdụ o kwuru ma ọ bụkwanụ ihe ụfọdụ o mere. Ma, ọ bụghị ihe ịma Jehova nke ọma pụtara. Anyị kwesịrị iwepụta oge mụọ gbasara Jehova na àgwà ya ndị magburu onwe ha. Ọ gwụla mgbe anyị mere otú ahụ ka anyị ga-ebido ịghọta ihe mere o ji ekwu ihe ndị ọ na-ekwu, na-emekwa ihe ndị ọ na-eme. Ọ bụ ihe ga-enyere anyị aka ịmata ma ihe ndị anyị na-eche, ihe ndị anyị kpebiri ime, na ihe ndị anyị na-eme hà dị Jehova mma. Anyị matahaala ihe Jehova chọrọ ka anyị na-eme, anyị kwesịrị ịna-eme ya.

4. Olee otú ịmụ gbasara ndị a kọrọ akụkọ ha na Baịbụl ga-esi nyere anyị aka?

4 Ụfọdụ ndị nwere ike ịna-akwa anyị emo n’ihi na anyị chọrọ ịna-efe Jehova. Ha nwedịrị ike inyekwu anyị nsogbu ma anyị bido ịga ọmụmụ ihe. Ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova obi, ọ gaghị ahapụ anyị. Anyị ga-esi otú ahụ mewe ka anyị na Chineke dịrị ná mma ná ndụ anyị niile. Ànyị nwere ike ịmatali Jehova nke ọma? Ee, anyị nwere ike. Ihe ndị mmadụ na-ezughị okè mere, dị ka Mozis na Eze Devid, gosiri na anyị ga-amatali Jehova nke ọma. Ka anyị na-eleba anya n’ihe ndị ha mere, anyị ga-aza ajụjụ abụọ ndị a: Olee otú ha si mata Jehova? Oleekwa ihe anyị ga-amụta n’aka ha?

MOZIS HỤRỤ “ONYE A NA-APỤGHỊ ỊHỤ ANYA”

5. Olee ihe Mozis họọrọ ime?

5 Mozis mere ihe ndị ọ mụtara. Mgbe Mozis dị ihe dị ka afọ iri anọ, ọ họọrọ ka ya na ndị Izrel na-akpakọrịta, kama ikwe “ka a kpọọ ya nwa ada Fero.” (Hib. 11:24) Mozis hapụrụ ịbụ onye a ma ama, gaa dụnyere ndị Izrel na-agba ohu n’Ijipt úkwù n’agbanyeghị na ọ ma na ọ ga-ewe Fero ezigbo iwe. Fero bụ eze siri ezigbo ike ndị Ijipt weere ka chi. Ihe ahụ Mozis mere gosiri na o nwere ezigbo okwukwe n’ebe Jehova nọ. Ọ tụkwasịrị Jehova obi. Ọ bụ otú a o si tụkwasị Jehova obi mere ka ha abụọ bụrụ enyi ná ndụ ya niile.​—Ilu 3:5.

6. Gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’ihe Mozis mere?

6 Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Anyị niile kwesịrị ikpebi ihe anyị ga-eme otú ahụ Mozis mere. Ànyị ga-ekpebi ife Chineke, anyị na ndị ya ana-akpakọrịtakwa? O nwere ike ịdị mkpa ka anyị hapụ ihe ụfọdụ. Ndị na-amaghị Chineke nwekwara ike ịna-emegide anyị. Ma, ọ bụrụ na anyị atụkwasị Nna anyị nke eluigwe obi, obi siri anyị ike na ọ ga-akwado anyị.

7-8. Gịnị ka Mozis na-akwụsịghị ime?

7 Mozis akwụsịghị ịmụ gbasara àgwà Jehova na ime uche ya. Dị ka ihe atụ, mgbe Jehova gwara Mozis ka o duru ndị Izrel pụọ n’Ijipt, o chere na ya agaghị emeli ya. Ọ gwakwara Jehova ugboro ugboro na ya erughị eru ime ya. Jehova nyeere Mozis aka, si otú ahụ gosi na o nweere ya ọmịiko. (Ọpụ. 4:​10-16) Aka ahụ Jehova nyeere Mozis mere ka ọ kata obi zie Fero ozi ndị kpụ ọkụ n’ọnụ Jehova sịrị ya zie ya. Mozis hụziri otú Jehova si jiri ike ya zọpụta ndị Izrel ma gbuo Fero na ndị agha ya n’Oké Osimiri Uhie.​—Ọpụ. 14:​26-31; Ọma 136:15.

8 Mgbe Mozis kpọpụtachara ndị Izrel n’Ijipt, ha nọ na-atamu ntamu mgbe niile. Ma, Mozis hụrụ otú Jehova si na-enwere ndị Izrel ahụ a gbapụtara n’ohu ndidi. (Ọma 78:​40-43) Mozis hụkwara otú Jehova si dị umeala n’obi mgbe ọ rịọrọ Jehova ka ọ ghara igbu ndị Izrel, ya ekweta.​—Ọpụ. 32:​9-14.

9. Dị ka e dere ná Ndị Hibru 11:​27, olee otú Mozis na Jehova dịruru ná mma?

9 Mgbe Mozis na ụmụ Izrel pụtachara n’Ijipt, otú ya na Jehova si dị n’ezigbo mma mere ka ọ dịzie ka ọ̀ na-ahụ Nna ya nke eluigwe. (Gụọ Ndị Hibru 11:27.) Baịbụl kọwara otú Mozis na Jehova si dị ná mma. Ọ sịrị: “Jehova wee gwa Mozis okwu ihu na ihu, dị nnọọ ka mmadụ si agwa mmadụ ibe ya okwu.”​—Ọpụ. 33:11.

10. Gịnị ka anyị ga-eme iji mata Chineke nke ọma?

10 Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Ọ bụrụ na anyị chọrọ ịmata Jehova nke ọma, anyị ga na-amụ gbasara àgwà ndị o nwere, na-emekwa ihe ọ chọrọ. Ihe Jehova chọrọ taa bụ “ka a zọpụta ụdị mmadụ niile, ka ha nwetakwa ezi ihe ọmụma nke eziokwu.” (1 Tim. 2:​3, 4) Otu ụzọ anyị nwere ike isi na-eme uche Jehova bụ ịna-akụziri ndị ọzọ gbasara Jehova.

11. Olee otú ịkụziri ndị ọzọ gbasara Jehova si eme ka anyị matakwuo ya?

11 Ọtụtụ mgbe, ọ na-abụ, anyị kụziwere ndị ọzọ gbasara Jehova, anyịnwa ana-amatakwu onye ọ bụ nke ọma. Dị ka ihe atụ, anyị na-ahụ otú Jehova si enwere ndị mmadụ ọmịiko ma o nyere anyị aka ịchọta ndị chọrọ ịbụ enyi ya. (Jọn 6:44; Ọrụ 13:48) Anyị na-ahụ ike Okwu Chineke na-akpa n’ihi na ọ na-enyere ndị anyị na-amụrụ Baịbụl aka ịkwusị àgwà ọjọọ ha ma kpawa àgwà ọma. (Kọl. 3:​9, 10) Anyị na-ahụkwa otú Chineke si enwere ndị anyị na-ezi ozi ọma ndidi n’ihi na ọ na-edunye anyị ugboro ugboro ka anyị gaa kụziere ha gbasara ya ka e nwee ike ịzọpụta ha.​—Rom 10:​13-15.

12. Dị ka e kwuru n’Ọpụpụ 33:​13, gịnị ka Mozis rịọrọ Jehova? N’ihi gịnị?

12 Mozis ji adịm ná mma ya na Jehova kpọrọ ihe. Jehova ji Mozis rụọ ọtụtụ ọrụ ebube. N’ihi ya, Mozis maara Jehova nke ọma. Ma ọ rịọkwara Jehova ka o nyere ya aka ịmatakwu ya. (Gụọ Ọpụpụ 33:13.) N’agbanyeghị na Mozis akarịala afọ iri asatọ mgbe ọ rịọrọ Jehova ihe a, ọ ma na ọ ka nwere ọtụtụ ihe o kwesịrị ịmụtakwu gbasara Nna ya nke eluigwe.

13. Olee otu ụzọ anyị nwere ike isi gosi na anyị ejighị adịm ná mma anyị na Jehova egwuri egwu?

13 Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? N’agbanyeghị afọ ole anyị ferela Jehova, anyị ekwesịghị iji adịm ná mma anyị na ya egwuri egwu. Otu ụzọ anyị nwere ike isi gosi na anyị ejighị adịm ná mma anyị na Jehova egwuri egwu bụ ikpe ekpere.

14. Olee otú ekpere ga-esi nyere anyị aka ime ka anyị na Jehova dịrịkwuo ná mma?

14 Ọ bụrụ na ị chọrọ ka gị na mmadụ dị n’ezigbo mma, gị na ya ga na-akparịta ụka mgbe niile. N’ihi ya, na-ekpe ekpere mgbe niile. Ọ ga-eme ka gị na Chineke dịrị ná mma. Ụjọ atụla gị ịgwa ya otú ọ dị gị n’obi. (Efe. 6:18) Otu nwanna nwaanyị bi na Tọki aha ya bụ Krista kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla m kpere ekpere Jehova aza m ekpere ahụ, ọ na-eme ka m hụkwuo ya n’anya ma tụkwasịkwuo ya obi. Ịhụ otú Jehova si aza ekpere m emeela ka o doo m anya na Jehova bụ Nna m na Enyi m.”

NWOKE OBI JEHOVA NABATARA

15. Gịnị ka Jehova kwuru gbasara Eze Devid?

15 Mgbe a mụrụ Eze Devid, nne na nna ya na ndị niile gbara ya gburugburu na-efe Jehova. Ma, ihe mere Devid ji fee Jehova abụghị n’ihi na ndị ezinụlọ ha na-efe Jehova. O mere ka ya na Jehova dịrị ná mma. Jehova hụkwara ya n’anya. Jehova ji ọnụ ya kwuo na Devid bụ “nwoke obi [ya] nabatara.” (Ọrụ 13:22) Olee otú Devid na Jehova si dị n’ezigbo mma otú a?

16. Gịnị ka Devid mụtara gbasara Jehova mgbe ọ na-ele ihe ndị Jehova kere?

16 Devid si n’ihe ndị Jehova kere mata gbasara ya. Mgbe Devid ka na-eto eto, ọ nọrọ n’èzí ọtụtụ awa, na-elekọta atụrụ nna ya. O nwere ike ịbụ mgbe ahụ ka ọ malitere iche gbasara ihe ndị Chineke kere. Dị ka ihe atụ, Devid lelie anya elu n’abalị, ọ bụghị naanị na ọ na-ahụ kpakpando juru n’eluigwe, kama ọ na-aghọtakwa àgwà ndị Onye kere ha nwere. Ihe ọ hụrụ mere ka o dee, sị: “Eluigwe na-akọsa ebube Chineke; mbara igwe na-akọkwa ọrụ aka ya.” (Ọma 19:​1, 2) Mgbe Devid chechara gbasara otú e si kee ụmụ mmadụ, ọ ghọtara na amamihe Jehova enweghị atụ. (Ọma 139:14) Ka Devid na-eche gbasara ihe ndị Jehova kere, ọ matara na ya dị ezigbo ntakịrị ma e jiri ya tụnyere Jehova.​—Ọma 139:6.

17. Gịnị ka anyị ga-amụta ma anyị na-echebara ihe Chineke kere echiche?

17 Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Na-eleru ihe ndị Chineke kere anya. Wepụta oge leruo ụwa a mara mma Jehova kere anya. Ị ga-ahụ na ọ ga-atụ gị n’anya. N’ihe niile ị na-eme n’ụbọchị, na-eche ihe osisi, anụmanụ, na mmadụ na-akụziri gị gbasara Onye kere ha bụ́ Jehova. Kwa ụbọchị, ị ga na-amụtakwu gbasara Nna gị hụrụ gị n’anya. (Rom 1:20) Ọ ga-emekwa ka ị na-ahụkwu ya n’anya.

18. Dị ka e kwuru n’Abụ Ọma 18, ònye ka Devid sịrị na o nyeere ya aka?

18 Devid matara na Jehova na-enyere ya aka. Dị ka ihe atụ, mgbe Devid napụtachara atụrụ nna ya n’aka ọdụm na anụ ọhịa bea, ọ ma na ọ bụ Jehova nyeere ya aka igbu anụmanụ ndị ahụ siri ezigbo ike. Mgbe o merikwara dike ahụ bụ́ Golayat, o doro ya anya na ọ bụ Jehova na-edu ya. (1 Sam. 17:37) Mgbe ọ gbanahụrụ Eze Sọl, o kwuru na ọ bụ Jehova napụtara ya. (Ọma 18, okwu mmeghe) A sị na Devid dị mpako, ọ gaara asị na ọ bụ yanwa mere ihe ndị ahụ. Ma, ebe ọ bụ na Devid dị umeala n’obi, o kwetara na ọ bụ Jehova nyeere ya aka ime ihe ndị ahụ.​—Ọma 138:6.

19. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Devid?

19 Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Ihe anyị ga-eme ekwesịghị ịbụ naanị ịrịọ Jehova ka o nyere anyị aka. Anyị kwesịkwara ịmata mgbe o nyeere anyị aka na otú o si mee ya. Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, anyị ga-ama ebe ike anyị ruru, matakwa na ọ bụ Jehova na-enyere anyị aka ime ihe ndị anyị na-agaghị emeli. Mgbe ọ bụla anyị hụrụ otú Jehova si nyere anyị aka, anyị na ya ga-adịkwu ná mma. E nwere otu nwanna ferela Jehova ọtụtụ afọ chọpụtara na ihe a bụ eziokwu. Aha ya bụ Isaac. O bi na Fiji. Ọ sịrị: “M cheta ihe niile mere ná ndụ m, m na-ahụ na Jehova enyerela m aka malite mgbe m bidoro ịmụ Baịbụl ruo taa. O meela ka mụ na Jehova dị n’ezigbo mma.”

20. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’otú Devid na Jehova si dị n’ezigbo mma?

20 Devid kpara àgwà ka Jehova. Jehova kere anyị otú anyị ga-enwe ike ịna-akpa àgwà ka ya. (Jen. 1:26) Ka anyị na-amụtakwu àgwà Jehova ka anyị ga na-akpakwu àgwà ka ya. Devid matara Nna ya nke eluigwe nke ọma. Ọ bụ ya mere o ji na-akpa àgwà ka ya mgbe ya na ndị ọzọ na-emekọ ihe. Legodị otu ihe atụ. Devid mehiere Jehova mgbe ya na Bat-shiba kwara iko, ya egbuokwa di ya. (2 Sam. 11:​1-4, 15) Ma, Jehova meere Devid ebere ebe ọ bụkwanụ na Devid na-emere ndị ọzọ ebere. Ndị Izrel hụrụ Devid n’anya n’ihi na ya na Jehova dị n’ezigbo mma. Jehova jikwa Devid na-amara ndị eze Izrel ndị ọzọ atụ.​—1 Eze 15:11; 2 Eze 14:​1-3.

21. Dị ka e kwuru ná Ndị Efesọs 4:24 na 5:​1, olee uru ‘iṅomi Chineke’ ga-abara anyị?

21 Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Anyị kwesịrị ‘ịna-eṅomi Chineke.’ Ime otú ahụ ga-abara anyị uru, meekwa ka anyị matakwuo ya. Ọ bụrụ na anyị ana-akpa àgwà ka Jehova, anyị na-egosi na anyị bụ ụmụ ya.​—Gụọ Ndị Efesọs 4:24; 5:1.

NA-ACHỌ ỊMATAKWU JEHOVA

22-23. Olee uru anyị ga-erite ma ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị anyị mụtara gbasara Jehova?

22 Anyị ahụla na anyị nwere ike isi n’ihe ndị Chineke kere nakwa na Baịbụl mụta gbasara Jehova. Na Baịbụl, a kọrọ gbasara ọtụtụ ndị ji obi ha niile fee Chineke anyị nwere ike ime ka ha, dị ka Mozis na Devid. Jehova emeela ihe o kwesịrị ime. Ọ bụzi anyịnwa ka ọ dịịrị ime ike anyị niile iji hụ na anyị mụtara gbasara ya.

23 O nweghị mgbe anyị ga-akwụsị ịmụ gbasara Jehova. (Ekli. 3:11) Ihe dị mkpa abụghị ihe anyị ma gbasara Jehova, kama ọ bụ ihe anyị ji ya eme. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị anyị mụtara, na-agbalịkwa ime ka Nna anyị hụrụ anyị n’anya, anyị na ya ga na-adị ná mma. (Jems 4:8) O si na Baịbụl mee ka obi sie anyị ike na ọ gaghị agbahapụ ndị na-achọ ịmatakwu ya.

ABỤ NKE 80 ‘Detụ Jehova Ire, Hụ na Ọ Dị Mma’

^ par. 5 Ọtụtụ ndị kweere na Chineke dị. Ma, ha amaghị ya n’eziokwu. Olee ihe ịma Jehova pụtara? Oleekwa ihe anyị ga-amụta n’otú Mozis na Eze Devid si mee ka ha na Jehova dịrị ná mma? A ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a.