Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 50

Jehova Na-eme Ka I Nwere Onwe Gị

Jehova Na-eme Ka I Nwere Onwe Gị

‘Unu ga-akpọsara ndị niile bi n’ala unu nnwere onwe.’​—LEV. 25:10.

ABỤ NKE 22 Alaeze Chineke Na-achị​—Ya Bịawa

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. (a) Gịnị bụ Jubili? (Kwuo ihe e dere n’igbe bụ́ “ Gịnị Bụ Jubili Ndị Izrel Mere n’Oge Ochie?”) (b) Olee ihe Jizọs kwuru gbasara ya na Luk 4:​16-18?

NÁ MBA ụfọdụ, eze chịa afọ iri ise, a na-emere ya ememme pụrụ iche. Ha na-akpọkarị afọ nke iri ise ahụ afọ Jubili. E nwere ike ime ememme ahụ otu ụbọchị, otu izu, ma ọ bụdị karịa. Ma ọ na-emecha gwụ, e chefuokwa obi ụtọ niile e nwere n’ememme ahụ.

2 Anyị ga-eleba anya na Jubili karịrị nke ahụ ndị Izrel oge ochie na-eme otu afọ n’afọ iri ise ọ bụla. Ememme Jubili ahụ ndị Izrel na-eme mere ka ha nwere onwe ha. Gịnị mere o ji gbasa anyị taa? Ọ bụ n’ihi na afọ Jubili ndị Izrel ahụ na-echetara anyị ihe magburu onwe ya Jehova haziri ugbu a ka anyị nwee ike inwere onwe anyị ruo mgbe ebighị ebi. Ọ bụ ya bụ nnwere onwe ahụ Jizọs kwuru okwu ya.​—Gụọ Luk 4:​16-18.

N’afọ Jubili, ndị Izrel na-enwe obi ụtọ n’ihi na ọ na-eme ka ndị bụ́ ohu laghachi n’ezinụlọ ha nakwa n’ala ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3) *

3. Dị ka e kwuru na Levitikọs 25:​8-12, olee uru Jubili baara ndị Izrel?

3 Anyị ga-aka aghọta ihe Jizọs bu n’obi kwuo gbasara nnwere onwe ma ọ bụrụ na anyị eburu ụzọ leba anya na Jubili ahụ Chineke haziiri ndị ya n’oge ochie. Jehova gwara ndị Izrel, sị: “Unu ga-edo afọ nke iri ise nsọ ma kpọsaara ndị niile bi n’ala unu nnwere onwe. Ọ ga-abụrụ unu afọ Jubili, onye nke ọ bụla n’ime unu ga-alaghachi n’ala ya, onye nke ọ bụla n’ime unu ga-alaghachikwuru ezinụlọ ya.” (Gụọ Levitikọs 25:​8-12.) N’isiokwu bu nke a ụzọ, anyị mụrụ gbasara otú Ụbọchị Izu Ike si baara ndị Izrel uru. Ma, olee uru Jubili baara ha? Ka e were ya na onye Izrel ji ụgwọ, nke mere ka o ree ala ya ka o nwee ike ịkwụ ụgwọ ahụ. N’afọ Jubili, a ga-enyeghachi ya ala ahụ. N’ihi ya, onye ahụ ga-enwe ike ‘ịlaghachi n’ala ya.’ Ala ụmụ ya ga-eketa agaghị efu. Ka e werekwa ya na nwoke ihe siiri ike rere nwa ya, ma ọ bụdị ree onwe ya, ka ọ gaa gbawa ohu iji kwụọ ụgwọ o ji. O ruo n’afọ Jubili ahụ, ohu ahụ “ga-alaghachikwuru ezinụlọ ya.” N’ihi ya, o nweghị onye ga-abụ ohu mgbe niile n’enweghị olileanya. Ihe a gosiri na Jehova dị ezigbo obiọma.

4-5. Gịnị mere anyị ji kwesị ịmụ gbasara Jubili?

4 Olee uru ọzọ Jubili baara ndị Izrel? Jehova kwuru, sị: “Ọ dịghị onye kwesịrị ịda ogbenye n’etiti unu, n’ihi na Jehova aghaghị ịgọzi gị n’ala ahụ Jehova bụ́ Chineke gị na-enye gị ka i nweta dị ka ihe nketa.” (Diut. 15:4) Ọ dị ezigbo iche n’ihe na-eme n’ụwa taa. Ihe anyị na-ahụ taa bụ na ndị ọgaranya na-abakwu ọgaranya, ndị ogbenye ana-adakwu ogbenye.

5 Ebe anyị bụ Ndị Kraịst, anyị anaghị edebe iwu Mozis. Ọ pụtara na anyị anaghị edebe iwu Jubili, nke kwuru ka e mee ka ndị ohu nwere onwe ha, ka a kagbuo ụgwọ ndị mmadụ ji nakwa ka e nyeghachi ndị mmadụ ala ha ketara. (Rom 7:4; 10:4; Efe. 2:15) Ma, anyị kwesịrị ịmụ gbasara Jubili. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị ga-enwereli onwe anyị, nke ga-eme ka anyị cheta ihe ahụ Jehova meere ndị Izrel.

JIZỌS KPỌSAARA NDỊ MMADỤ NNWERE ONWE

6. Olee ihe e kwesịrị ịgbapụta ụmụ mmadụ na ya?

6 E kwesịrị ịgbapụta anyị niile n’ihi na anyị bụ ndị ohu mmehie, nke bụ́ ụdị ịgba ohu jọgburu onwe ya. Ebe anyị bụ ndị mmehie, anyị na-aka nká, na-arịa ọrịa, na-anwụkwa anwụ. Ọtụtụ ndị na-amata na ihe a bụ eziokwu ma ha lee onwe ha n’enyo ma ọ bụ gaa n’ụlọ ọgwụ ka a gwọọ ha ọrịa. Obi na-adakwa anyị mbà ma anyị mee mmehie. Pọl onyeozi kwuru na a ‘na-adọrọ ya n’agha gaa n’iwu nke mmehie nke dị ya n’ahụ́.’ O kwukwara, sị: “Lee nhụsianya m nọ na ya! Ònye ga-anapụta m n’ahụ́ nke na-eduga m n’ịnwụ ụdị ọnwụ a?”​—Rom 7:​23, 24.

7. Gịnị ka Aịzaya buru n’amụma gbasara nnwere onwe?

7 Obi dị anyị ụtọ na Chineke ahaziela otú a ga-esi napụta anyị n’aka mmehie. Ọ bụ Jizọs ka o si n’aka ya na-eme ka anyị nwere onwe anyị. N’ihe karịrị narị afọ asaa tupu Jizọs abịa n’ụwa, Aịzaya buru amụma na otú ndị mmadụ ga-esi nwere onwe ha n’ọdịnihu agaghị enwe atụ. Uru ọ ga-aba ga-akarị uru afọ Jubili baara ndị Izrel. O dere, sị: “Mmụọ nke Ọkaakaa Onyenwe anyị Jehova dị n’ahụ́ m, n’ihi na Jehova etewo m mmanụ izi ndị dị umeala n’obi ozi ọma. O zitewo m ikechi ọnyá nke ndị e tiwara obi, ịkpọsara ndị a dọọrọ n’agha na a tọhapụwo ha.” (Aịza. 61:1) Olee ndị amụma ahụ gbasara?

8. Ònye mezuru amụma ahụ Aịzaya buru gbasara nnwere onwe?

8 Amụma ahụ dị mkpa e buru gbasara nnwere onwe malitere imezu mgbe Jizọs malitechara ozi ya. Mgbe ọ gara n’ụlọ nzukọ dị n’obodo ya bụ Nazaret, ọ gụpụtaara ndị Juu zukọrọ ebe ahụ amụma ahụ Aịzaya buru. Jizọs kwuru na ya mezuru amụma ahụ. Ọ sịrị: “Mmụọ Jehova dị n’ahụ́ m, n’ihi na o tere m mmanụ izi ndị ogbenye ozi ọma, o zitere m ikwusara ndị a dọọrọ n’agha na a tọhapụwo ha, na ime ka ndị ìsì malite ịhụ ụzọ, na ịtọhapụ ndị a na-echi ọnụ n’ala ka ha lawa, ikwusa afọ Jehova na-anabata ndị mmadụ.” (Luk 4:​16-19) Olee otú Jizọs si mezuo amụma ahụ?

NDỊ MBỤ E MERE KA HA NWERE ONWE HA

N’ụlọ nzukọ dị na Nazaret, Jizọs kwuru na ndị mmadụ ga-enwere onwe ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 na nke 9)

9. Gịnị ka ọtụtụ ndị tụrụ anya ya n’oge Jizọs?

9 N’oge Jizọs, ndị mmadụ malitere inwere onwe ha otú ahụ Aịzaya buru n’amụma ahụ Jizọs gụpụtaara ha. Otú anyị si mata na ihe a bụ eziokwu bụ na Jizọs kwuru, sị: “Taa ka ihe a e dere n’Akwụkwọ Nsọ unu nụrụ ugbu a mezuru.” (Luk 4:21) Ọ ga-abụ na ọtụtụ n’ime ndị nụrụ ihe ahụ Jizọs gụpụtara na-achọ onye ga-anapụta ha n’aka ọchịchị ndị Rom. O nwere ike ịdị ha otú ọ dị mmadụ abụọ ahụ kwuru, sị: “Anyị nọ na-enwe olileanya na nwoke a bụ onye a kara aka ịnapụta Izrel.” (Luk 24:​13, 21) Ma, anyị ma na Jizọs agwaghị ndị na-eso ụzọ ya ka ha nupụrụ ọchịchị Rom isi. Kama, ọ gwara ha ka ha na-akwụ “Siza ihe Siza.” (Mat. 22:21) Oleezi otú Jizọs si mee ka ha nwere onwe ha n’oge ahụ?

10. Gịnị ka Jizọs mere ka ndị mmadụ nwere onwe ha na ya?

10 Mgbe Ọkpara Chineke bịara n’ụwa, e nwere ụzọ abụọ o si mee ka ndị mmadụ nwere onwe ha. Nke mbụ bụ na Jizọs nyeere ndị mmadụ aka inwere onwe ha n’ụgha ndị ndú okpukpe na-akụzi. A manyere ọtụtụ ndị Juu n’oge ahụ ịna-eme omenala ndị mmadụ na ikwere ihe ndị na-abụghị eziokwu. (Mat. 5:​31-37; 15:​1-11) Ndị sịrị na ha na-enyere ha aka ife Chineke amaghịdị ihe bụ́ ife Chineke. E nwere ike ịsị na ha kpuru ìsì. Ebe ọ bụ na ha jụrụ Mesaya na eziokwu ọ kụziri, ha ka nọkwa n’ọchịchịrị nakwa ná mmehie. (Jọn 9:​1, 14-16, 35-41) Jizọs kụziri eziokwu, kpaakwa àgwà ọma. O si otú ahụ kụziere ndị dị umeala n’obi otú ha ga-esi nwere onwe ha ná nkụzi ụgha.​—Mak 1:22; 2:23–3:5.

11. Olee ụzọ nke abụọ Jizọs si mee ka ndị mmadụ nwere onwe ha?

11 Nke abụọ bụ na Jizọs mere ka ndị mmadụ nwere onwe ha n’ohu ha na-agbara mmehie ha ketara n’aka Adam. Àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ mere ka Chineke nwee ike ịgbaghara mmehie ndị nwere okwukwe n’àjà ahụ ma na-ebi ndụ gosiri na ha nwere okwukwe na ya. (Hib. 10:​12-18) Jizọs kwuru, sị: “Ọ bụrụ na Ọkpara ahụ emee ka unu nwere onwe unu, unu ga-enwere onwe unu n’ezie.” (Jọn 8:36) O doro anya na ha nweere onwe ha karịa otú Jubili mere ka ndị Izrel nwere onwe ha n’oge ochie. Dị ka ihe atụ, onye nweere onwe ya n’afọ Jubili nwere ike imecha gbawakwa ohu. Ọ ga-emechakwa nwụọ.

12. Olee ndị mbụ Jizọs mere ka ha nwere onwe ha otú ahụ o kwuru?

12 N’ụbọchị Pentikọst afọ 33, Jehova ji mmụọ nsọ tee ndịozi Jizọs na ụmụ nwoke na ụmụ nwaanyị ndị ọzọ kwesịrị ntụkwasị obi mmanụ. O mere ka ha bụrụ ụmụ ya ka o nwee ike ịkpọlite ha n’ọnwụ n’ọdịnihu, ka ha soro Jizọs chịa n’eluigwe. (Rom 8:​2, 15-17) Ha bụ ndị mbụ Jizọs mere ka ha nwere onwe ha otú ahụ o kwuru n’ụlọ nzukọ dị na Nazaret. Ha nweere onwe ha n’ụgha niile ndị ndú okpukpe ndị Juu na-akụzi na omenala ha ndị na-esighị n’Okwu Chineke. Chineke wekwaara ha ka ndị nweerela onwe ha ná mmehie, nke bụ́ ihe na-akpata ọnwụ. Nnwere onwe ahụ Jehova haziri nke malitere mgbe e tere ndị na-eso ụzọ Jizọs mmanụ n’afọ 33 ga-akwụsị ma Jizọs chịchaa otu puku afọ. Olee ihe ọma ndị ga-eme malite ugbu a ruo n’oge ahụ?

ỌTỤTỤ NDE MMADỤ KA GA-ENWERE ONWE HA

13-14. E wezụga Ndị Kraịst e tere mmanụ, olee ndị ọzọ nwere ike inwere onwe ha otú ahụ Jizọs kwuru?

13 N’oge anyị a, ọtụtụ nde ndị nwere ezi obi, ndị si ná mba niile, so ‘n’atụrụ ọzọ.’ (Jọn 10:16) Chineke ahọrọghị ha iso Jizọs chịa n’eluigwe. Kama, Baịbụl kwuru na ha nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa. Ọ̀ bụ olileanya a ka i nwere?

14 E nwere ụfọdụ uru ndị e tere mmanụ na-erite ugbu a gịnwa na-eritekwa. N’ihi okwukwe i nwere n’àjà Jizọs chụrụ, i nwere ike ịrịọ Jehova ka ọ gbaghara gị mmehie gị. Ọ ga-eme ka gị na Chineke dị ná mma, obi eruokwa gị ala. (Efe. 1:7; Mkpu. 7:​14, 15) Cheekwa gbasara uru ndị ị na-erite n’ihi na i nwerela onwe gị ná nkụzi ụgha niile. Jizọs kwuru, sị: ‘Unu ga-amara eziokwu ahụ, eziokwu ahụ ga-emekwa ka unu nwere onwe unu.’ (Jọn 8:32) Obi dị anyị ezigbo ụtọ na anyị nweere onwe anyị.

15. Olee nnwere onwe na ihe ọma ndị ọzọ anyị na-atụ anya ha?

15 N’ọdịnihu, anyị ga-enwerekwu onwe anyị. N’oge na-adịghị anya, Jizọs ga-ebibi okpukpe ụgha na ọchịchị ụmụ mmadụ obi tara mmiri. Chineke ga-echebe “oké ìgwè mmadụ” na-efe ya. Ọ ga-emekwa ka ha na-enwe obi ụtọ mgbe ụwa ga-aghọ paradaịs. (Mkpu. 7:​9, 14) A ga-akpọlite ọtụtu ndị n’ọnwụ, ha enwee ohere inwere onwe ha n’ihe ọjọọ niile mmehie Adam kpatara.​—Ọrụ 24:15.

16. Olee otú magburu onwe ya ụmụ mmadụ ga-esi nwere onwe ha n’ọdịnihu?

16 N’otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị, ya na ndị ga-eso ya chịa ga-eme ka mmadụ niile gharazie ịna-arịa ọrịa, meekwa ka ha bụrụ ụmụ Chineke. Oge ahụ ga-adị ka afọ Jubili a na-enwe n’Izrel oge ochie n’ihi na ndị mmadụ ga-enwere onwe ha, e meekwa ka ihe niile dịghachi otú ha dịbu. Ọ ga-eme ka ndị ji obi ha niile na-efe Jehova zuo okè, gharakwa ịna-eme mmehie.

N’ụwa ọhụrụ, anyị ga na-arụ ọrụ ga-abara anyị uru, na-atọkwa anyị ụtọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17)

17. Olee ihe ọma Aịzaya 65:​21-23 kwuru ga-emere ndị Chineke? (Lee ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

17 E buru amụma gbasara otú ụwa ga-adị mgbe ahụ n’Aịzaya 65:​21-23. (Gụọ ya.) Anyị agaghị na-anọ nkịtị mgbe ahụ. Kama, Baịbụl kwuru ihe gosiri na ndị Chineke ga na-arụ ọrụ ga-abara ha uru, na-emekwa ha obi ụtọ. Jizọs chịchaa otu puku afọ, obi siri anyị ike na a ga-eme “ka ihe e kere eke nwere onwe ya pụọ n’ịbụ ohu nke ire ure ma nweta nnwere onwe dị ebube nke ụmụ Chineke.”​—Rom 8:21.

18. Gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na anyị ga-enwe obi ụtọ n’ọdịnihu?

18 Otú ahụ Jehova haziri ka ndị Izrel nwee oge ịrụ ọrụ na oge izu ike ka ọ ga-emekwara ndị ya n’otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị. O doro anya na a ga-enwe oge anyị ga-eji na-efe Chineke. Ife Chineke na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ taa. Otú ahụ ka ọ ga-adịkwa n’ụwa ọhụrụ. Ndị ji obi ha niile na-efe Chineke ga na-enwe obi ụtọ n’otu puku afọ ahụ Jizọs ga-achị n’ihi na anyị niile ga na-arụ ọrụ ga-eme anyị obi ụtọ, na-efekwa Chineke.

ABỤ NKE 142 Ka Anyị Jidesie Olileanya Anyị Ike

^ par. 5 Jehova haziri otú ndị Izrel oge ochie ga-esi nwere onwe ha. Baịbụl kpọrọ ya Jubili. Ndị Kraịst anaghị edebe Iwu Mozis. Ma, ịmụ gbasara Jubili ga-abara anyị uru. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’otú Jubili ga-esi chetara anyị ihe ọma Jehova meere anyị nakwa uru o nwere ike ịbara anyị.

^ par. 61 NKỌWA FOTO Dị: N’afọ Jubili, a na-eme ka ndị ohu nwere onwe ha, ha alaghachi n’ezinụlọ ha nakwa n’ala ha.