Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Na-ekele Onye Ọ Bụla Meere Gị Ihe

Na-ekele Onye Ọ Bụla Meere Gị Ihe

Ị̀ NA-EKELE onye meere gị ihe? Onye ọ bụla n’ime anyị kwesịrị ichebara ajụjụ a echiche. Baịbụl buru amụma na n’oge anyị a, ọtụtụ ndị agaghị na-ekele onye meere ha ihe. (2 Tim. 3:2) O nwere ike ịbụ na ị hụtụla ndị na-eche na ihe ọ bụla e nyere ha ma ọ bụ meere ha bụ ihe ruuru ha, ka à ga-asị na e ji ha ụgwọ. O yiri ka ha chere na ha ekwesịghị ikele onye ọ bụla meere ha ihe. Ọ̀ na-ewe gị iwe ma gị na ụdị ndị ahụ nọrọ?

Jehova gwara ndị na-efe ya ka ha na-egosi na obi dị ha ụtọ maka ihe ndị ọzọ meere ha. Anyị kwesịrị ịna-ekele onye ọ bụla meere anyị ihe. (Kọl. 3:15; 1 Tesa. 5:18) Nke bụ́ eziokwu bụ na ikele ndị meere anyị ihe na-abara anyị uru. E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ji kwuo otú ahụ.

IKELE ONYE MEERE ANYỊ IHE GA-EME KA OBI DỊ ANYỊ ỤTỌ

Otu ihe dị mkpa mere anyị ji kwesị ịna-ekele onye meere anyị ihe bụ na ọ na-eme ka anyị na-enwe obi ụtọ. I kelee mmadụ maka ihe o meere gị, o nwere ike ime ka obi dị gị ụtọ, meekwa ka obi dị onye ahụ ụtọ. Gịnị mere o ji adị otú ahụ? Legodị ihe atụ a: Ị chọpụta na ndị ọzọ na-enwe mmasị imere gị ihe, ọ̀ bụ na ọ naghị egosi gị na ị bara uru? Ha ji gị kpọrọ ihe. Ị chọpụta na ndị ọzọ ji gị kpọrọ ihe, obi ga-adị gị ụtọ. Anyị ma na ọ bụ otú ọ dị Rut. Boaz meere ya ihe ọma. O doro anya na obi tọrọ Rut ezigbo ụtọ mgbe Boaz mere ihe gosiri na o ji ya kpọrọ ihe.​—Rut 2:​10-13.

Onye anyị ga-akacha na-ekele bụ Chineke. O doro anya na i cheela mgbe ụfọdụ gbasara ọtụtụ ihe o nyerela gị ma ka na-enye gị, ma ndị nke na-eme ka okwukwe gị sie ike. (Diut. 8:​17, 18; Ọrụ 14:17) Kama ile ihe ọma Chineke meere anyị ma wepụ obi na ya ozugbo, anyị kwesịrị iwepụta oge chebara ihe ọma niile ọ na-emere anyị na ndị enyi anyị echiche. Anyị chebara ihe ọ na-emere anyị echiche, anyị ga-ahụkwu ya n’anya, matakwa otú ọ hụruru anyị n’anya ma jiri anyị kpọrọ ihe.​—1 Jọn 4:9.

Ihe ị ga-eme abụghị naanị ịna-eche gbasara ihe ọma niile Jehova na-emere gị. I kwesịkwara ịna-ekele ya maka ha. (Ọma 100:​4, 5) Otu akwụkwọ kwuru na “ikele ndị meere anyị ihe na-eme ka obi na-adịkwu anyị ụtọ.”

IKELE NDỊ MEERE ANYỊ IHE GA-EME KA ANYỊ NA HA DỊKWUO NÁ MMA

Ihe ọzọ mere o ji dị mma ka anyị na-ekele ndị meere anyị ihe bụ na ọ ga-eme ka anyị na ha dịkwuo ná mma. Anyị niile na-achọ ka mmadụ kelee anyị ma anyị meere ya ihe. Ọ bụrụ na i jiri obi gị niile kelee onye meere gị ihe ọma, gị na ya ga-adịkwu ná mma. (Rom 16:​3, 4) Ihe ọzọ bụ na ọ bụrụ na mmadụ na-ekele onye meere ya ihe ọma, ọ ga-aka adịrị ya mfe inyere ndị ọzọ aka. Ụdị onye ahụ na-amata mgbe e meere ya ihe ọma. Ọ ga na-achọkwa imere ndị ọzọ ihe ọma. N’eziokwu, inyere ndị ọzọ aka na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Ihe Jizọs kwuru bụ eziokwu. Ọ sịrị: “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.”​—Ọrụ 20:35.

Otu nwoke aha ya bụ Robert Emmons so hazie nchọnchọ e mere na Kalịfọnịa gbasara mmadụ ikele ndị meere ya ihe ọma. O kwuru, sị: “Ihe ga-enyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ ma mmadụ meere anyị ihe bụ ịghọta na ọ bụ aka nri kwọọ aka ekpe, aka ekpe akwọọ aka nri. Anyị nwere ike inye mmadụ ihe taa. O ruo echi, onye ọzọ enye anyị.” Nke bụ́ eziokwu bụ na ndị ọzọ ga na-enyere anyị aka ka anyị nwee ike ịna-adị ndụ ma na-enwe obi ụtọ. Dị ka ihe atụ, ha nwere ike inye anyị nri ma ọ bụ gbaa mbọ ka a gwọọ anyị. (1 Kọr. 12:21) Onye na-ekele onye meere ya ihe na-egosi na obi dị ya ezigbo ụtọ maka ihe ndị ọzọ meere ya. N’ihi ya, gbalịa ka ị na-ekele onye ọ bụla meere gị ihe.

INWE OBI ỤTỌ MAKA IHE MMADỤ MEERE GỊ GA-EME KA OTÚ I SI ELE NSOGBU ANYA GBANWEE

Ihe ọzọ mere i ji kwesị ikele onye meere gị ihe bụ na ọ ga-eme ka ị na-eche ihe dị mma n’obi gị kama ịna-eche ihe na-adịghị mma. E nwere ike ikwu na uche mmadụ na-eme ka ihe e ji ayọ ihe. Mmadụ nụ ihe, uche ya na-ayọcha ya, were nke dị mma, tụfuo nke na-adịghị mma. Ihe ị ga na-echezi gbasara ya bụ ihe ọma, kama ịna-eche gbasara nsogbu. Ka ị na-ekelekwu ndị meere gị ihe ka ị ga na-ahụkwu ihe ọma e meere gị. Ọ ga-eme ka ị na-achọkwu ịna-ekele ndị meere gị ihe. Ọ bụrụ na ị na-ahụtakarị ihe ọma ndị ọzọ meere gị, ọ ga-enyere gị aka ime ihe Pọl onyeozi kwuru. Ọ sịrị: “Na-aṅụrịnụ ọṅụ mgbe niile n’ime Onyenwe anyị.”​—Fil. 4:4.

Ọ bụrụ na ị na-ekele ndị ọzọ maka ihe ha meere gị, ị ga-achọpụta na ọ ga-eme ka ị ghara ịna-eche ihe ga-emebi gị obi. I nwee obi ụtọ maka ihe mmadụ meere gị, ọ ga-esi ike imewere onye ahụ anyaụfụ, iwewere ya iwe ma ọ bụ ibuwere ya ihe n’obi. Ndị na-enwe obi ụtọ maka ihe e meere ha anaghị achụkarị ego ọnwụ ọnwụ. Ihe ha nwere na-eju ha afọ. Mkpa ha anaghị abụ inwetakwu ihe.​—Fil. 4:12.

NA-ECHETA IHE ỌMA NDỊ E MEERE GỊ

Ebe ị bụ Onye Kraịst, ị ma na Ekwensu ga-achọ iji ihe isi ike na nsogbu juru n’oge ikpeazụ a mee ka obi na-ajọ gị njọ ma ọ bụ mee ka ị daa mbà. Obi ga-atọ ya ezigbo ụtọ ma ọ bụrụ na obi anaghị adị gị mma, gị ana-atamukwa ntamu mgbe niile. Ụdị àgwà ahụ nwere ike ime ka ndị mmadụ ghara ịna-ege gị ntị n’ozi ọma. N’eziokwu, mkpụrụ nke mmụọ nsọ na inwe obi ụtọ maka ihe e meere anyị bụ nwanne. Dị ka ihe atụ, anyị na-aṅụrị ọṅụ maka ihe ọma Chineke meere anyị, nweekwa okwukwe ná nkwa ya niile.​—Gal. 5:​22, 23.

Ebe ị na-efe Jehova, o nwere ike ịbụ na i kwetara ihe e kwuru n’isiokwu a gbasara ikele onye meere anyị ihe. Ma, ị ghọtara na ọ naghị adị mfe mgbe niile inwe obi ụtọ maka ihe mmadụ meere anyị ma ọ bụ ikele onye ahụ. Ekwela ka o mee ka ị kwụsị ime ya. Ị ga-amụtali ikele onye meere gị ihe. Olee otú ị ga-esi eme ya? Wepụta oge kwa ụbọchị na-eche gbasara ihe ndị mere ná ndụ gị na-eme gị obi ụtọ. I mewe otú ahụ, ọ ga na-adịrị gị mfe ịna-ekele ndị meere gị ihe. Obi ga na-adị gị ụtọ karịa ndị na-echegbukarị onwe ha gbasara nsogbu ndị juru n’ụwa a. Na-eche gbasara ihe ọma ndị Jehova na ndị ọzọ meere gị na-eme gị obi ụtọ. I nwedịrị ike ịmalite dewe ha edewe. I nwere ike ide ihe abụọ ma ọ bụ atọ mere gị obi ụtọ n’ụbọchị.

Ụfọdụ ndị achọpụtala na “ọ bụrụ na anyị ana-ekele onye ọ bụla meere anyị ihe, o nwere ike ịgbanwe otú ụbụrụ anyị si arụ ọrụ, mezie ka ọ na-adịrị anyị mfe ịna-enwe obi ụtọ ná ndụ.” Onye na-ekele onye meere ya ihe na-enwekarị obi ụtọ. N’ihi ya, chee gbasara ihe ọma niile meere gị, nwee obi ụtọ maka ha, keleekwa ndị meere gị ha. Kama ileghara ihe ọma ndị meere gị anya, ‘kelee Jehova, n’ihi na ọ dị mma.’ N’eziokwu, anyị kwesịrị ‘ịna-ekele Chineke banyere ihe ọ bụla.’​—1 Ihe 16:34; 1 Tesa. 5:18.