Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 52

Ndị Nne na Nna, Zụọnụ Ụmụ Unu Ka Ha Hụ Jehova n’Anya

Ndị Nne na Nna, Zụọnụ Ụmụ Unu Ka Ha Hụ Jehova n’Anya

“Ụmụ bụ ihe nketa si n’aka Jehova.”​—ỌMA 127:3.

ABỤ NKE 134 Ụmụ Bụ Onyinye Si n’Aka Chineke

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ọrụ Jehova nyere ndị nne na nna?

JEHOVA kere di na nwunye mbụ ka ịmụ ụmụ na-agụ ha agụụ. Ọ bụ ya mere Baịbụl ji kwuo, sị: “Ụmụ bụ ihe nketa si n’aka Jehova.” (Ọma 127:3) Gịnị ka ihe a pụtara? Weregodị ya na ezigbo enyi gị nyere gị ego buru ibu ka i dowere ya. Olee otú obi ga-adị gị? Obi nwere ike ịdị gị ụtọ na enyi gị ahụ tụkwasịrị gị obi. Ma, i nwere ike ịna-eche otú ị ga-esi dozie ego ahụ ka ihe ghara ime ya. Jehova kacha bụrụ ezigbo Enyi anyị. O nyere ndị nne na nna ihe ha ga na-elekọta karịrị ego. Ọrụ o nyere ha bụ ịna-elekọta ụmụ ha nke ọma nakwa ime ka ha na-enwe obi ụtọ.

2. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

2 Ònye ga-ekpebi ma di na nwunye hà ga-amụ ụmụ ma ọ bụ na ha agaghị amụ? Gịnị ka ndị nne na nna nwere ike ime iji nyere ụmụ ha aka ka ha na-enwe obi ụtọ? Legodị ụfọdụ ihe Baịbụl kwuru nwere ike inyere ndị nne na nna aka ikpebi ihe dị mma.

HAPỤRỤ DI NA NWUNYE IHE HA KPEBIRI

3. (a) Ònye kwesịrị ikpebi ma di na nwunye hà ga-amụ ụmụ? (b) Olee ihe Baịbụl kwuru ndị ikwu na ibe di na nwunye kwesịrị ịna-echeta?

3 N’obodo ụfọdụ, onye ọ bụla na-eche na ndị lụrụ ọhụrụ ekwesịghị igbu oge tupu ha amụwa ụmụ. Ndị ezinụlọ ha na ndị ọzọ nwere ike ịna-enye ha nsogbu ka ha mụwa ụmụ ozugbo. Otu nwanna n’Eshia aha ya bụ Jethro kwuru, sị: “N’ọgbakọ anyị, ụfọdụ di na nwunye mụrụ ụmụ na-enye ndị nke na-amụbeghị nsogbu ka ha mụọ ụmụ.” Nwanna ọzọ bikwa n’Eshia aha ya bụ Jeffrey kwuru, sị: “Ụfọdụ na-agwa di na nwunye na-amụghị nwa na o nweghị onye ga-ele ha nká.” Ma, di na nwunye ga-eji aka ha kpebie ma hà ga-amụ ụmụ ma ọ bụ na ha agaghị amụ. Ọ bụ ha ka ọ dịịrị ikpebi. (Gal. 6:5) O doro anya na ndị ikwu na ibe na-achọ ka di na nwunye lụrụ ọhụrụ na-enwe obi ụtọ. Ma, mmadụ niile kwesịrị icheta na ọ bụ di na nwunye ahụ ka ọ dịịrị ikpebi ma hà ga-amụ ụmụ ma ọ bụ na ha agaghị amụ.​—1 Tesa. 4:11.

4-5. Olee ihe abụọ di na nwunye kwesịrị ịkpa, oleekwa oge kacha mma ịkpa ihe ndị ahụ? Kọwaa.

4 Di na nwunye kpebie na ha ga-amụ ụmụ, ha kwesịrị ịkpa ihe abụọ dị mkpa: Nke mbụ bụ, Olee mgbe ha ga-ebido ịmụ ụmụ? Nke abụọ abụrụ, Ụmụ ole ka ha chọrọ ịmụ? Olee mgbe ọ kacha mma ka di na nwunye kpaa ihe ndị a? Gịnị mere ihe abụọ a ji dị ezigbo mkpa?

5 Ọtụtụ mgbe, ọ na-akacha mma ka ha kpaa ya tupu ha alụọ. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ọ dị ezigbo mkpa ka obi ha abụọ bụrụ otu n’ihe a. Ihe ọzọ bụ na ha kwesịrị iche ma hà dị njikere ime ihe ya na ịmụ nwa so. Ụfọdụ di na nwunye lụrụ ọhụrụ ekpebiela ichere ka otu afọ ma ọ bụ abụọ gaa tupu ha ebido ịmụ nwa n’ihi na ha mụhaala ụmụ, ha ga-ejizi oge ha niile na ike ha niile na-elekọta ụmụ ha. Ihe mere ha ji echeretụ bụ na ọ ga-eme ka ihe gbasara alụmdi na nwunye mara ha ahụ́, meekwa ka ha abụọ dịkwuo ná mma.​—Efe. 5:33.

6. Gịnị ka ụfọdụ di na nwunye kpebiri ime n’ihi oge tara akpụ anyị bi na ya?

6 Ụfọdụ di na nwunye bụ́ Ndị Kraịst ekpebiela ime ihe ụmụ Noa atọ na ndị nwunye ha mere. Ha amụghị ụmụ ozugbo. (Jen. 6:18; 9:​18, 19; 10:1; 2 Pita 2:5) Jizọs ji oge anyị a tụnyere “ụbọchị Noa.” O dokwara anya na anyị bi ‘n’oge dị oké egwu, nke tara akpụ.’ (Mat. 24:37; 2 Tim. 3:1) N’ihi ya, ụfọdụ di na nwunye ekpebiela na ha agaghị amụ nwa ozugbo iji wepụtakwuo oge maka ozi Jehova.

Tupu di na nwunye ma ihe ekpebiwe ma hà ga-amụ ụmụ nakwa ụmụ ole ha ga-amụ, ha na-ebu ụzọ “gbakọọ ihe ọ ga-efu” (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7) *

7. Olee otú ihe e kwuru na Luk 14:​28, 29 nakwa n’Ilu 21:5 ga-esi nyere di na nwunye aka?

7 Tupu di na nwunye ma ihe ekpebiwe ma hà ga-amụ ụmụ nakwa ụmụ ole ha ga-amụ, ha na-ebu ụzọ “gbakọọ ihe ọ ga-efu” ha. (Gụọ Luk 14:​28, 29.) Ndị di na nwunye mụrụla ụmụ maara na ịzụ ụmụ na-efu ezigbo ego, na-ewe oge, nweekwa ike ime ka ike gwụ mmadụ. N’ihi ya, di na nwunye kwesịrị ichebara ajụjụ ndị a echiche: ‘Anyị abụọ ànyị ga na-arụ ọrụ iji nwee ike ịna-egbo mkpa ezinụlọ anyị? Ànyị kwekọrịtara n’ihe ndị dị ezinụlọ anyị mkpa n’eziokwu? Ọ bụrụ na anyị abụọ ga na-arụ ọrụ, ònye ga na-elekọta ụmụ anyị? Ònye ka anyị chọrọ ka ha na-eche echiche ma ọ bụ na-akpa àgwà ka ya?’ Mgbe di na nwunye weturu obi na-ekwurịta ihe ndị a dị mkpa, ha kwesịrị iburu n’obi ihe e kwuru n’Ilu 21:5.​—Gụọ ya.

Di hụrụ nwunye ya n’anya ga-agbalịsi ike inyere ya aka (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8)

8. Olee ụfọdụ nsogbu di na nwunye kwesịrị ịtụ anya ha, oleekwa ihe di hụrụ nwunye ya n’anya ga na-eme?

8 Nne na nna kwesịrị iwepụtara nwa ha ezigbo oge, jirikwa ike ha niile na-elebara ya anya. N’ihi ya, ọ bụrụ na di na nwunye amụọ ọtụtụ ụmụ n’enweghị nke ji ezigbo ihe tọ ibe ya, o nwere ike isiri ha ike ịna-elebara nke ọ bụla n’ime ha anya. Ụfọdụ ndị nne na nna mụrụ ọtụtụ ụmụ kwuru na ọ dịghịrị ha mfe. O nwere ike ime ka ike na-agwụkarị nne, obi ana-ajọkwa ya njọ. O nwere ike ime ka ọ ghara inwe ike ịmụ ihe, ikpe ekpere nakwa ịga ozi ọma otú o kwesịrị. Ihe ọzọ nwekwara ike isiri ya ike bụ ige ntị n’ọmụmụ ihe na irite uru na ya. Nke bụ́ eziokwu bụ na di hụrụ nwunye ya n’anya na-eme ihe o nwere ike ime inyere nwunye ya aka ilekọta ụmụ ha, ma n’ọmụmụ ihe ma n’ụlọ. Dị ka ihe atụ, o nwere ike inyere nwunye ya aka rụọ ọrụ ndị dị n’ụlọ. Ọ ga-agbalịkwa ka Ofufe Ezinụlọ ha na-enwe kwa izu baara ha niile uru. O kwesịkwara ịna-akpọ ezinụlọ ya aga ozi ọma mgbe niile.

NA-AKỤZIRI ỤMỤ GỊ ỊHỤ JEHOVA N’ANYA

9-10. Olee ihe ndị nne na nna kwesịrị ime iji nyere ụmụ ha aka?

9 Olee ihe ụfọdụ ndị nne na nna nwere ike ime iji nyere ụmụ ha aka ịhụ Jehova n’anya? Olee otú ha nwere ike isi chebe ụmụ ha ka ha ghara ịmụta àgwà ọjọọ? Ka anyị hụ ụfọdụ ihe nne na nna nwere ike ime.

10 Rịọ Jehova ka o nyere gị aka. Legodị ihe Manoa na nwunye ya mere tupu ha amụọ Samsịn. Mgbe Manoa chọpụtara na ya na nwunye ya ga-amụ nwa nwoke, ọ rịọrọ Jehova ka ọ gwa ha otú ha ga-esi zụọ nwa ahụ.

11. Dị ka e kwuru ná Ndị Ikpe 13:​8, olee otú ndị nne na nna nwere ike isi mee ihe Manoa mere?

11 Otu nwanna aha ya bụ Nihad na Alma nwunye ya, bụ́ ndị Bosnia na Hezegovina, mụtara ihe n’aka Manoa na nwunye ya. Ha kwuru, sị: “Anyị kpere ekpere ka Jehova gwa anyị otú anyị ga-esi azụ ụmụ anyị otú ahụ Manoa mere. Jehova ji ọtụtụ ihe za ekpere anyị. O ji Baịbụl, akwụkwọ ndị anyị ji amụ Baịbụl, ọmụmụ ihe nakwa mgbakọ nyere anyị aka.”​—Gụọ Ndị Ikpe 13:8.

12. Olee ihe Josef na Meri si n’àgwà ha kụziere ụmụ ha?

12 Na-eme ihe ị na-akụziri ha. Ihe ị na-agwa ụmụ gị ga-abara ha uru. Ma ihe nwere ike ịkacha baara ha uru bụ ihe ị na-eme. O doro anya na Josef na Meri mere ihe ha chọrọ ka Jizọs na ụmụ ha ndị ọzọ na-eme. Josef rụsiri ọrụ ike iji na-elekọta ezinụlọ ya. O mekwara ka ihe gbasara ofufe Chineke na-atọ ha ụtọ. (Diut. 4:​9, 10) Ọ bụ eziokwu na iwu ekwughị ka Josef kpọrọ ezinụlọ ya na-aga Jeruselem kwa afọ maka Ememme Ngabiga, o mere otú ahụ. (Luk 2:​41, 42) Ụfọdụ ndị nna n’oge ahụ nwere ike ịna-eche na ịkpọrọ ezinụlọ ha gaa ụdị ihe ahụ siri ezigbo ike, na-egbu oge, na-efukwa ezigbo ego. Ma, Josef ji ihe gbasara ofufe Chineke kpọrọ ihe. Ọ kụzikwaara ụmụ ya ime otú ahụ. Ihe ọzọ bụ na Meri ma Akwụkwọ Nsọ nke ọma. O doro anya na o si n’ihe ọ na-ekwu na ihe ọ na-eme kụziere ụmụ ya iji Okwu Chineke kpọrọ ihe.

13. Olee otú otu nwanna na nwunye ya si mee ihe Josef na Meri mere?

13 Nihad na Alma anyị kwuburu okwu ha gbara mbọ ime ihe Josef na Meri mere. Olee otú o si nyere ha aka ịzụ nwa ha ka ọ hụ Chineke n’anya ma na-efe ya? Ha kwuru, sị: “Anyị si n’otú anyị si ebi ndụ na-egosi nwa anyị na ọ dị mma ka mmadụ na-eme ihe Jehova kwuru.” Nihad kwukwara, sị: “Bụrụ ụdị onye ị chọrọ ka nwa gị bụrụ.”

14. Gịnị mere ndị nne na nna ji kwesị ịmata ndị ha na ụmụ ha na-akpa?

14 Nyere ụmụ gị aka ka ha meta ezigbo ndị enyi. Nne na nna kwesịrị ịma ndị ha na ụmụ ha na-akpa na ihe ha na-eme. Ihe ọ pụtara bụ na ndị nne na nna kwesịrị ịma ndị ha na ụmụ ha na-ezirịta ozi n’Ịntanet nakwa n’ekwentị. Ụmụaka nwere ike malite iche echiche ma ọ bụ ịkpa àgwà ka ndị enyi ha.​—1 Kọr. 15:33.

15. Gịnị ka ndị nne na nna nwere ike ịmụta n’aka Jessie?

15 Ọ bụrụkwanụ na nne na nna amaghị nke a na-akọ n’ihe gbasara kọmputa ma ọ bụ ekwentị? Otu nwanna bi na Filipinz aha ya bụ Jessie kwuru, sị: “Anyị amachaghị nke a na-akọ n’ihe gbasara kọmputa na ihe yiri ya. Ma o meghị ka anyị ghara ịna-eme ka ụmụ anyị mata nsogbu ndị ihe ndị ahụ nwere ike ịkpata.” Jessie asịghị ụmụ ya ejila ihe ndị ahụ eme ihe ọ bụla maka na yanwa amaghị ihe ọ bụla gbasara ha. O kwuru, sị: “M gwara ha ka ha jiri ha na-amụ asụsụ ọzọ, na-akwado ọmụmụ ihe, na-agụkwa Baịbụl kwa ụbọchị.” Ọ bụrụ na ị bụ nne ma ọ bụ nna, gị na ụmụ gị ùnu agụọla ihe dị na jw.org/ig, n’ebe e dere “Ndị Na-eto Eto,” nke kwuru gbasara iji ekwentị eziga ozi na itinye foto n’Ịntanet? Gị na ha ùnu eleela vidio bụ́ Gị na Ekwentị Gị Ònye Nwe Ibe Ya? na Kpachara Anya n’Ebe A Na-emeta Ndị Enyi n’Ịntanet? * Ihe ndị a ga-enyere ụmụ gị aka ịmata otú ha ga-esi kpachara anya ma ha nọrọ n’Ịntanet ma ọ bụ jiri ekwentị ha na-eme ihe ọ bụla.​—Ilu 13:20.

16. Gịnị ka ọtụtụ ndị nne na nna merela, oleekwa ihe ọma si na ya pụta?

16 Ọtụtụ ndị nne na nna na-agbalị ka ụmụ ha na ndị na-eme nke ọma n’ọgbakọ na-anọrị. Dị ka ihe atụ, otu nwanna aha ya bụ N’Déni na Bomine nwunye ya, bụ́ ndị Kot Devụa, na-akpọkarị ndị nlekọta sekit ka ha nọrọ n’ụlọ ha. N’Déni kwuru, sị: “Ime otú ahụ baara nwa anyị nwoke ezigbo uru. Ọ malitere ịsụ ụzọ. Ọ bụzi onye na-arụchitere onye nlekọta sekit ọrụ.” Ì nwere ike ime ka ụmụ gị na ndị dị otú a na-anọrị?

17-18. Olee mgbe ndị nne na nna kwesịrị ịmalite zụwa ụmụ ha?

17 Malite ịzụ ụmụ gị mgbe ha ka dị obere. Ọ ga-aka mma ka nne na nna malite n’oge zụwa ụmụ ha. (Ilu 22:6) Chegodị gbasara Timoti, bụ́ onye mechara soro Pọl onyeozi gaa kwusaa ozi ọma. Yunis nne Timoti na Lọịs nne nne ya malitere ‘n’oge ọ bụ nwa ọhụrụ’ zụwa ya.​—2 Tim. 1:5; 3:15.

18 Di na nwunye ọzọ bi na Kot Devụa aha ha bụ Jean-Claude na Peace mụrụ ụmụ isii, zụọkwa ha niile ha ahụ Jehova n’anya ma na-efe ya. Gịnị nyeere ha aka ime ya? Ha mere ka Yunis na Lọịs. Ha kwuru, sị: “Anyị malitere ịkụnye Okwu Chineke n’ime ụmụ anyị mgbe ha dị ezigbo obere, ya bụ, obere oge a mụchara ha.”​—Diut. 6:​6, 7.

19. Gịnị ka ịkụnye Okwu Chineke n’ime ụmụ gị pụtara?

19 Gịnị ka ‘ịkụnye’ Okwu Jehova n’ime ụmụ gị pụtara? Okwu Hibru e si sụgharịta “kụnye” pụtara “ịkụziri mmadụ ihe ugboro ugboro ka ọ baa ya n’obi.” Ihe ga-enyere ndị nne na nna aka ime otú ahụ bụ ịna-ewepụta oge ka ha na ụmụ ha ndị obere na-anọ. Ike nwere ike ịna-agwụ ndị nne na nna ma ha na-agwa ụmụ ha otu ihe ugboro ugboro. Ma, ndị nne na nna ga-agbalị were ya ka ohere ha ga-eji nyere ụmụ ha aka ka ha ghọta ihe Baịbụl kwuru ma na-eme ya.

Ndị nne na nna kwesịrị ikpebi otú ha ga-esi zụọ nwa ha nke ọ bụla (A ga-akọwa ya na paragraf nke 20) *

20. Kọwaa otú e nwere ike isi mee ihe Abụ Ọma 127:4 kwuru mgbe a na-azụ ụmụ?

20 Mata ụmụ gị nke ọma. Abụ Ọma 127 ji ụmụaka tụnyere akụ́. (Gụọ Abụ Ọma 127:4.) Akụ́ na-adị n’ụdị n’ụdị. Ha anaghịkwa aha. Otú ahụ ka ụmụaka dị. Nwa nke ọ bụla dị iche. N’ihi ya, ndị nne na nna kwesịrị ikpebi otú ha ga-esi zụọ nke ọ bụla n’ime ụmụ ha. N’Izrel nke oge a, otu nwanna na nwunye ya kwuru ihe nyeere ha aka ịzụ ụmụ abụọ ha mụtara, ha ana-efe Jehova. Ha kwuru, sị: “Anyị na-amụrụ ha Baịbụl iche iche.” Nke bụ́ eziokwu bụ na onyeisi ezinụlọ ọ bụla ga-ekpebi ma isi otú ahụ amụrụ ụmụ ha ihe ọ̀ dị mkpa ma ọ bụ kwe omume.

JEHOVA GA-ENYERE GỊ AKA

21. Olee otú Jehova si enyere ndị nne na nna aka?

21 Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị ndị nne na nna ka nsogbu dị n’ịzụ ụmụ ọ̀ karịrị akarị. Ma, ụmụ bụ onyinye si n’aka Jehova. Ọ dị njikere mgbe niile inyere ndị nne na nna aka. Ọ na-ege ntị n’ekpere ha. Ihe ọ na-eji aza ekpere ha bụ Baịbụl, akwụkwọ ndị e ji amụ Baịbụl, nakwa ihe ụmụnna ndị ọzọ zụrụla ụmụ mere nakwa ndụmọdụ ha.

22. Olee ihe ndị so n’ihe kacha mma nne na nna ga-emere ụmụ ha?

22 Ụfọdụ na-ekwu na ịzụ nwa na-ewe afọ iri abụọ. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na o nweghị mgbe onye mụrụ nwa ga-akwụsị ịbụ nne ma ọ bụ nna. Ihe ndị so n’ihe kacha mma ha ga-emere ụmụ ha bụ ịhụ ha n’anya, iwepụtara ha oge, na iji Baịbụl na-azụ ha. Otú nwa nke ọ bụla ga-esi anabata ihe a kụziiri ya ga-adị iche. Ma, ọtụtụ n’ime ụmụaka nne na nna ha hụrụ Jehova n’anya kwuru ihe otu nwanna nwaanyị bi n’Eshia aha ya bụ Joanna Mae kwuru. Ọ sịrị: “M cheta otú nne na nna m si zụọ m, obi na-adị m ezigbo ụtọ na ha zụrụ m nke ọma ma kụziere m ịhụ Jehova n’anya. Ọ bụghị naanị na ha mụrụ m, kama ha mere ka ndụ m nwee isi.” (Ilu 23:​24, 25) Ọ dịkwa ọtụtụ ụmụnna anyị otú a ọ dị nwanna nwaanyị a.

ABỤ NKE 59 Soro M Too Jaa

^ par. 5 Di na nwunye hà kwesịrị ịmụ ụmụ? Ha kpebie na ha ga-amụ, ụmụ ole ka ha kwesịrị ịmụ? Olee otú ha kwesịrị isi zụọ ụmụ ha ka ha hụ Jehova n’anya ma na-efe ya? Isiokwu a ga-eleba anya n’ihe ndị na-eme n’oge anyị a, lebakwa anya n’ihe Baịbụl kwuru ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ ndị a.

^ par. 60 NKỌWA FOTO: Ebe di na nwunye na-akpa ma hà ga-amụ ụmụ ma ọ bụ na ha agaghị amụ, na-ekwukwa gbasara uru na ọrụ dị na ya.

^ par. 64 NKỌWA FOTO: Ebe nne na nna na-amụrụ ụmụ ha ihe iche iche n’ihi afọ ole ụmụ ha dị na otú ha si aghọta ihe.