Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Baịbụl kwuru na ọ dịkarịa ala, mmadụ abụọ ga-agba akaebe tupu a mara na okwu bụ eziokwu. (Ọnụ Ọgụ. 35:30; Diut. 17:6; 19:15; Mat. 18:16; 1 Tim. 5:19) Ma, n’Iwu Mozis, ọ bụrụ na nwoke hụrụ nwa agbọghọ e kwere nkwa ọlụlụ, dinaa ya n’ike “n’ọhịa,” nwa agbọghọ ahụ etie mkpu, ikpe mara nke nwoke, ma aka nke nwaanyị dị ọcha. Ebe ọ bụ na o nweghị onye ọzọ hụrụ mgbe e dinara ya n’ike, gịnịzi mere aka ya ji dịrị ọcha, ikpe ama nke nwoke?

Ihe bụ́ isi e dere na Diuterọnọmi 22:​25-27 abụghị ka e gosi na ikpe mara nke nwoke, n’ihi na e bula ụzọ kwuo na ikpe mara ya. Ihe a chọrọ igosi n’Iwu ahụ bụ na aka nke nwaanyị dị ọcha. Ka anyị hụ ihe amaokwu ndị ọzọ kwuru.

Amaokwu ndị bu ụzọ kwuru gbasara nwoke hụrụ nwaanyị e kwere nkwa ọlụlụ ma dinaa ya “n’obodo.” Ihe ahụ o mere gosiri na ọ kwara iko ebe ọ bụ na e weere nwaanyị ahụ e kwere nkwa ọlụlụ ka onye lụrụla di. Nke nwaanyị kwanụ? “O tighị mkpu n’obodo.” A sị na o tiri mkpu, ndị ọzọ gaara anụ olu ya, bịa napụta ya. Ma, o tighịnụ mkpu. N’ihi ya, o kwetara ka ha kwaa iko. Ọ bụ ya mere e ji maa ha abụọ ikpe.​—Diut. 22:​23, 24.

Iwu ahụ kwuru ihe ọzọ dị iche. Ọ sịrị: “Otú ọ dị, ọ bụrụ n’ọhịa ka nwoke ahụ hụrụ nwa agbọghọ e kwere nkwa ọlụlụ, nwoke ahụ ewee bagide ya ma dinaa ya, nwoke ahụ nke dinara ya ga-anwụ naanị ya, emela nwa agbọghọ ahụ ihe ọ bụla. Nwa agbọghọ ahụ emeghị mmehie kwesịrị ọnwụ, n’ihi na ihe a dị nnọọ ka mgbe mmadụ biliri wakpo mmadụ ibe ya wee gbuo ya, ya bụ, gbuo mkpụrụ obi. N’ihi na ọ bụ n’ọhịa ka ọ hụrụ ya. Nwa agbọghọ ahụ e kwere nkwa ọlụlụ tiri mkpu, ma ọ dịghị onye nọ ịnapụta ya.”​—Diut. 22:​25-27.

Na nke ahụ, ndị ikpe kwetara ihe nwaanyị ahụ kwuru. N’ihi gịnị? Ha weere na nwaanyị ahụ “tiri mkpu, ma ọ dịghị onye nọ ịnapụta ya.” N’ihi ya, ọ kwaghị iko. Ma, nwoke ahụ dinara ya n’ike, kwaakwa iko, ebe ọ bụ na Baịbụl kwuru na ọ ‘bagidere nwaanyị ahụ e kwere nkwa ọlụlụ ma dinaa ya.’

N’ihi ya, n’agbanyeghị na ihe bụ́ isi e kwuru n’iwu a bụ na aka nke nwaanyị dị ọcha, ọ dabara adaba na Diuterọnọmi 22:​25-27 kwuru na nwoke ahụ dinara nwaanyị ahụ n’ike, kwaakwa iko. Obi siri anyị ike na n’oge ahụ, ndị ikpe ‘na-enyocha ụdị okwu ahụ nke ọma’ ma jiri iwu doro anya Chineke nyere ugboro ugboro kpebie ya.​—Diut. 13:14; 17:4; Ọpụ. 20:14.