Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Mgbe Setan gwara Iv na ọ gaghị anwụ ma o rie mkpụrụ si n’osisi ịma ihe ọma na ihe ọjọọ, ò si otú ahụ malite ihe a ndị mmadụ na-akụzi taa, na mkpụrụ obi mmadụ anaghị anwụ anwụ?

Mba. Ekwensu agwaghị Iv na o rie mkpụrụ osisi ahụ Chineke sịrị ha erila, na ọ ga-adị ka ọ̀ nwụrụ, ma mmụọ ya agaa ebe ọzọ dịrị ndụ na-aga. Ụfọdụ na-akpọ ya mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ. Setan si n’ọnụ agwọ kwuo na ọ bụrụ na Iv erie mkpụrụ si n’osisi ahụ, na ‘ọ gaghị anwụ ma ọlị.’ Ihe ahụ o kwuru pụtara na Iv ga-adịrị ndụ na-aga, ndụ ya aka mma n’ụwa. Ọ bụghịzi Chineke ga na-agwa ya ihe ọ ga-eme.​—Jen. 2:17; 3:​3-5.

Ọ bụrụ na ọ bụghị n’ogige Iden ka ozizi ụgha ahụ bụ́ na mkpụrụ obi anaghị anwụ anwụ malitere, oleezi mgbe o bidoro? Anyị amaghị. Ihe anyị ma bụ na Iju Mmiri oge Noa kpochapụrụ okpukpe ụgha niile. E nweghị nkụzi ụgha fọrọ mgbe Iju Mmiri gachara n’ihi na ọ bụ naanị Noa na ezinụlọ ya, bụ́ ndị na-efe Chineke, ka Iju Mmiri ahụ na-egbughị.

N’ihi ya, ọ ga-abụrịrị na ihe a ndị mmadụ na-akụzi ugbu a na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ malitere mgbe Iju Mmiri gachara. Mgbe Chineke ghagburu asụsụ na Bebel, ndị mmadụ esikwa “n’ebe ahụ gbasaa n’ebe niile n’elu ụwa,” ọ ga-abụ na ha ji nkụzi ahụ bụ́ na mmadụ nwere mkpụrụ obi na-anaghị anwụ anwụ gawa ebe dị iche iche. (Jen. 11:​8, 9) N’agbanyeghị mgbe ozizi ụgha a malitere, o doro anya na ọ bụ “nna ụgha” ahụ bụ́ Ekwensu malitere ya. Obi dịkwa ya ụtọ na ozizi ahụ agbasaala ebe niile.​—Jọn 8:44.