Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 48

Mechaa Ihe Ị Malitere

Mechaa Ihe Ị Malitere

“[Ihe] unu malitere . . . , mechaakwanụ ya.”—2 KỌR. 8:10, 11.

ABỤ NKE 35 “Na-achọpụta Ihe Ndị Ka Mkpa”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Gịnị ka Jehova na-ahapụ anyị ka anyị na-eme?

JEHOVA na-ahapụ anyị ka anyị na-ekpebi ihe anyị ga-eme. Ọ na-akụziri anyị ikpebi ezigbo ihe. Ọ bụrụ na anyị ekpebie ime ihe dị ya mma, ọ na-enyere anyị aka ime ya. (Ọma 119:173) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe anyị mụtara na Baịbụl, anyị ga na-ekpebi ime ezigbo ihe.—Hib. 5:14.

2. Olee ihe nwere ike isiri anyị ike ma anyị kpebichaa ihe anyị ga-eme?

2 Ọ bụrụgodị na anyị ekpebie ime ihe dị mma, o nwere ike isiri anyị ike imecha ihe anyị bidoro. Dị ka ihe atụ, nwanna nwoke na-eto eto nwere ike ikpebi ịgụcha Baịbụl. Ma, mgbe ọ gụrụ ya izu ole na ole, ya akwụsị. Otu nwanna nwaanyị nwere ike ikpebi ịbụ onye ọsụ ụzọ oge niile, ma na-eyigharị mgbe ọ ga-amalite. Ndị okenye nwere ike iji otu obi kpebie ịgara ndị nọ n’ọgbakọ ha nleta ọzụzụ atụrụ. Ma mgbe ọtụtụ ọnwa gara, ha amalitebeghị ya. Ihe atụ ndị a abụghị otu ihe. Ma, e nwere otú ha si yie. Ndị ahụ kpebiri ihe ha ga-eme, ma ha emeghị ya. Ụdị ihe ahụ mere Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt n’oge ndịozi Jizọs. Ka anyị leba anya n’ihe anyị ga-amụta n’aka ha.

3. Olee ihe ụmụnna nọ na Kọrịnt kpebiri ime? Ma gịnịzi mere?

3 N’ihe dị ka afọ 55, ndị Kọrịnt kpebiri ime otu ihe dị ezigbo mkpa. Ha nụrụ na nsogbu bịaara ụmụnna nọ na Jeruselem na Judia nakwa na ha dara ogbenye. Ha nụkwara na ọgbakọ ndị ọzọ na-anakọta ego a ga-eji nyere ha aka. Otú ụmụnna nọ na Kọrịnt si dị obiọma ma na-emesapụ aka mere ka ha kpebie na ha chọrọ inyere ụmụnna ndị ahụ aka. N’ihi ya, ha jụrụ Pọl onyeozi otú ha ga-esi enye aka. Pọl zigaara ọgbakọ ahụ ozi gbasara ihe ha ga-eme. Ọ họpụtakwara Taịtọs ka o nye aka nakọta onyinye ha. (1 Kọr. 16:1; 2 Kọr. 8:6) Ma, mgbe ọnwa ole na ole gara, Pọl nụrụ na ndị Kọrịnt emebeghị ihe ahụ ha kpebiri ime. N’ihi ya, o yiri ka a gaghị anakọtacha onyinye ha n’oge ka e nwee ike iji ya na onyinye ọgbakọ ndị ọzọ nyere gaa Jeruselem.—2 Kọr. 9:4, 5.

4. Dị ka e kwuru ná 2 Ndị Kọrịnt 8:7, 10, 11, gịnị ka Pọl gbara ụmụnna nọ na Kọrịnt ume ka ha mee?

4 Ihe ụmụnna nọ na Kọrịnt kpebiri ime dị mma. Pọl jakwara ha mma maka okwukwe ha na-enweghị atụ na otú ha si chọọ imesapụ aka. Ma, ọ gbakwara ha ume ka ha mechaa ihe ahụ ha bidoro. (Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 8:7, 10, 11.) Ihe ha mere na-akụziri anyị na o nwere ike isiri Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi ike ime ihe ha kpebiri ime.

5. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

5 O nwere ike isiri anyị ike ime ihe anyị kpebiri ime otú ahụ o siiri ụmụnna nọ na Kọrịnt. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na ezughị okè nwere ike ime ka anyị na-eyigharị ihe anyị kpebiri ime. Ihe anyị na-atụghị anya ya nwekwara ike ime ka o siere anyị ike ime ihe anyị kpebiri. (Ekli. 9:11; Rom 7:18) Olee otú anyị nwere ike isi lebagharịa anya n’ihe anyị kpebiri ma mata ma ànyị kwesịrị ịgbanwe ya? Oleekwa otú anyị ga-esi na-emecha ihe anyị malitere?

TUPU GỊ EKPEBIE IHE Ị GA-EME

6. Olee mgbe o nwere ike ịdị mkpa ka anyị gbanwee ihe anyị kpebiri ime?

6 E nwere ụfọdụ ihe dị mkpa anyị kpebiri ime anyị na-agaghị agbanweli. Dị ka ihe atụ, anyị kpebiri ife Jehova. Anyị agaghị agbanwe ya. Anyị kpebikwara na e nweghị ihe ga-eme ka anyị hapụ di anyị ma ọ bụ nwunye anyị. (Mat. 16:24; 19:6) Ma, e nwere ụfọdụ ihe anyị kpebiri ime o nwere ike ịdị mkpa ka anyị gbanwee. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na egwú nwere ike ịdagharị. Olee ihe ga-enyere anyị aka ikpebi ihe ga-akacha baara anyị uru?

7. Olee ihe anyị kwesịrị ịrịọ Jehova ka o meere anyị? N’ihi gịnịkwa?

7 Rịọ Jehova ka o nye gị amamihe. Jehova nyere Jems ike mmụọ nsọ ide, sị: “Ọ bụrụ na e nwere onye ọ bụla n’ime unu amamihe kọrọ, ka ọ na-arịọ Chineke, n’ihi na ọ na-eji mmesapụ aka enye mmadụ niile ihe.” (Jems 1:5) Onye ọ bụla n’ime anyị nwere ebe “amamihe kọrọ” ya. N’ihi ya, rịọ Jehova ka o nyere gị aka ma mgbe ị na-ekpebi ihe ị ga-eme ma mgbe ị chọrọ ilebagharị anya n’ihe i kpebiri. Jehova ga-enyeziri gị aka ikpebi ihe ga-abara gị uru.

8. Olee ụdị nchọnchọ anyị kwesịrị ime tupu anyị ekpebie ihe anyị ga-eme?

8 Mee ezigbo nchọnchọ. Gụọ Okwu Chineke na akwụkwọ ndị nzukọ Jehova na-ebipụta. Gị na ndị ga-enye gị ezigbo ndụmọdụ kwurịtakwa ya. (Ilu 20:18) I kwesịrị ime ụdị nchọnchọ a ma i kpebiwe ịgbanwe ọrụ, ịkwaga ebe ọzọ ma ọ bụkwanụ ebe ị ga-agụru akwụkwọ ka i nwee ike ịna-akpa afọ gị ma na-efe Jehova.

9. Olee uru ọ ga-abara anyị ma anyị gwa onwe anyị eziokwu?

9 Chee ihe mere i ji chọọ ime ihe ahụ. Jehova chọrọ ịma ihe mere anyị ji chọọ ime ihe ọ bụla anyị chọrọ ime. (Ilu 16:2) Ọ chọrọ ka anyị na-ekwu eziokwu n’ihe niile anyị na-eme. N’ihi ya, anyị kpebiwe ihe anyị ga-eme, anyị kwesịkwara ịgwa ma onwe anyị ma ndị ọzọ eziokwu gbasara ihe mere anyị ji chọọ ime ihe ahụ. Ọ bụrụ na anyị ekwuchaghị eziokwu, o nwere ike isiri anyị ike ime ihe ahụ anyị kpebiri. Dị ka ihe atụ, nwanna bụ́ onye na-eto eto nwere ike ikpebi ịbụ ọsụ ụzọ oge niile. Ma, ka oge na-aga, ya esiere ya ike ịrụzu awa ya. Ozi ọma agaghịzi na-atọ ya ụtọ. O nwere ike ịbụ na o chere na ihe mere o ji malite ịsụ ụzọ bụ na ọ chọrọ ime ihe dị Jehova mma. Ma, ọ̀ ga-abụ na ihe mere o ji malite ịsụ ụzọ bụ na ọ chọrọ ime ihe dị nne na nna ya ma ọ bụ onye ọzọ mma?

10. Olee ihe ga-enyere anyị aka ịkwụsị ihe ọjọọ anyị na-eme?

10 Chegodị banyere onye a na-amụrụ Baịbụl kpebiri ịkwụsị ịṅụ sịga. Ná mbido, ọ gbalịrị kwụsị ya ruo otu izu ma ọ bụ abụọ, ma mechaa ṅụọkwa ya ọzọ. O mechaziri kwụsị ya kpamkpam. Ihe nyeere ya aka ịkwụsị ya bụ na ọ hụrụ Jehova n’anya ma chọọ ime ihe dị ya mma.—Kọl. 1:10; 3:23.

11. Gịnị mere anyị kwesịrị iji kapịa ihe anyị chọrọ ime ọnụ?

11 Kapịa ihe ị chọrọ ime ọnụ. Ọ bụrụ na ị kapịa ihe ị chọrọ ime ọnụ, ọ ga-enyere gị aka imecha ihe ị malitere. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na i kpebiri ịna-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Ma, ọ bụrụ na i nweghị usoro ị ga-esi na-agụ ya, o nwere ike ị gaghị emezu ya. * Ndị okenye ọgbakọ nwere ike ikpebi ịna-agakwuru ndị ọgbakọ ha nleta ọzụzụ atụrụ. Ma, ka oge na-aga, ya abụrụ na ha emebeghị ihe ahụ ha kpebiri ime. Ha chọọ ime ihe ha kpebiri, ha nwere ike ibu ụzọ jụọ onwe ha, sị: “Ànyị achọpụtala ụmụnna ndị nleta ọzụzụ atụrụ ga-akacha baara uru? Ànyị ekpebiela mgbe anyị ga-aga leta ha?”

12. Olee ihe o nwere ike ịdị mkpa ka anyị mee? N’ihi gịnịkwa?

12 Kpebie ihe ị ga-emeli. E nweghị onye ọ bụla n’ime anyị nwere oge, ike, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ ọ ga-eji mee ihe niile ọ ga-achọ ime. N’ihi ya, kpebie ihe ị ga-emeli. Mgbe ụfọdụ, o nwere ike ịdị mkpa ka ị gbanwee ihe i kpebiri ime ma ị chọpụta na ị gaghị emeli ya. (Ekli. 3:6) Ma, ka e were ya na i lebagharịala anya n’ihe i kpebiri ime, gbanwee ihe ndị i kwesịrị ịgbanwe, obi esiekwa gị ike na ị ga-emeli ya. Lee ihe ise ga-enyere gị aka imecha ihe ahụ ị malitere.

IHE NDỊ GA-ENYERE GỊ AKA IME IHE I KPEBIRI

13. Olee otú i nwere ike isi nweta ike ị ga-eji eme ihe i kpebiri?

13 Rịọ Jehova ka o nye gị ike ị ga-eji mee ya. Chineke nwere ike inye gị ike ị ga-eji mee ihe i kpebiri. (Fil. 2:13) N’ihi ya, rịọ ya ka o nye gị mmụọ nsọ ya ka i nwee ike ime ihe ahụ i kpebiri. Akwụsịla ịrịọ ya ọ bụrụgodị na ọ dị ka ò gbuola oge ịza gị. Jizọs sịrị: “Na-arịọnụ, a ga-enye unu” mmụọ nsọ.—Luk 11:9, 13.

14. Olee otú ihe e kwuru n’Ilu 21:5 nwere ike isi nyere gị aka ime ihe i kpebiri?

14 Hazie otú ị ga-esi eme ya. (Gụọ Ilu 21:5.) Ị chọọ imecha ihe ọ bụla ị malitere, i kwesịrị ịhazi otú ị ga-esi eme ya. Ihe ọzọ ị ga-eme bụ ime ya otú ahụ i si hazie ya. I kpebie ihe ị chọrọ ime, depụta ihe niile i kwesịrị ime iji mechaa ya. E nwee ihe siri ike ị chọrọ ime, kee ya ntakịrị ntakịrị. Nke ọ bụla i mechara, ị ga-ahụ na e nweela ihe i mepụtara. Pọl gwara ndị Kọrịnt ka onye ọ bụla n’ime ha wepụta ihe ọ ga-eji enye onyinye “kwa ụbọchị mbụ n’izu” kama ichere ka ọ bịa tupu ha anakọtawa ya. (1 Kọr. 16:2) Ọ bụrụ na i kee ihe ị chọrọ ime ntakịrị ntakịrị, ime ya nwere ike ọ gaghị esiri gị ike.

15. I kpebie ihe ị ga-eme, olee ihe ọzọ i nwere ike ime?

15 I dee ihe ị chọrọ ime edee, o nwere ike ịdịrị gị mfe ime ya eme. (1 Kọr. 14:40) Dị ka ihe atụ, a gwara ndị okenye ka ha họpụta otu okenye ga na-edekọrọ ha ihe ha kpebiri ime, onye ga-eme ya, nakwa oge e kwesịrị imecha ya. Ọ bụrụ na ndị okenye ana-eme ihe a a gwara ha mee, ọ ga-adịrị ha mfe ime ihe ha kpebiri ime. (1 Kọr. 9:26) I nwere ike ịgbalị na-eme otú ahụ n’ihe ị na-eme kwa ụbọchị. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ide ihe ndị ị chọrọ ime n’ụbọchị, haziekwa ha n’usoro ị chọrọ isi mee ha. I mee otú ahụ, o nwere ike ịdịrị gị mfe imecha ihe ị malitere, meekwa ihe ndị ọzọ.

16. Olee ihe anyị kwesịrị ime iji nwee ike imecha ihe anyị kpebiri ime? Oleekwa otú Ndị Rom 12:11 si kwadoo ihe a?

16 Gbasie mbọ ike. Ọ naghị adị mfe ibido ihe i kpebiri ime ma mechaa ya. (Gụọ Ndị Rom 12:11.) Pọl gwara Timoti ka ọ ‘na-agbalịsi ike’ ịna-akụzikwu ihe nke ọma. Anyị nwekwara ike ịna-eme ihe a Pọl gwara Timoti n’ihe ọ bụla anyị chọrọ ime n’ozi Chineke.—1 Tim. 4:13, 16.

17. Olee otú Ndị Efesọs 5:15, 16 ga-esi nyere anyị aka ime ihe anyị kpebiri ime?

17 Jiri oge gị na-eme ihe ga-akacha baara gị uru. (Gụọ Ndị Efesọs 5:15, 16.) Kwuo mgbe ị ga-eji eme ihe i kpebiri ime. Meekwa ya ma oge ahụ ruo. Echerela ka ihe niile dị otú o kwesịrị tupu gị amalite ime ihe i kpebiri ime. E nwere ike ihe niile agaghị adị otú o kwesịrị. (Ekli. 11:4) Kpachara anya ka ị ghara ikwe ka ihe na-adịchaghị mkpa wekọrọ oge gị ma mee ka ị ghara inwe ike ime ihe ndị ka mkpa. (Fil. 1:10) O kwe omume, wepụta oge a na-enweghị ihe ga-eme ka uche gị pụọ n’ihe ị na-eme. Mee ka ndị ọzọ mara na ị chọghị ihe ga-eme ka uche gị pụọ n’ihe ị na-eme. I nwere ike ịgbanyụ ekwentị gị. E mechaa, gị agaa lee ma è ziteere gị ozi iimel ma ọ bụ ozi ndị ọzọ n’Ịntanet. *

18-19. Olee ihe nwere ike inyere gị aka ka i mechaa ihe i kpebiri ime ọ bụrụgodị na o siiri gị ike?

18 Na-eche gbasara uru ị ga-erite na ya. Uru ị ga-erite n’ihe i kpebiri ime dị ka ebe mmadụ chọrọ ịga. Ọ bụrụ na ị chọrọ iru ebe ị na-aga, ị ga na-aga ọ bụrụgodị na ị chọpụta na ụzọ ahụ echiela, ya abụrụ na ị ga-esi ụzọ ọzọ. Ọ bụrụkwa na anyị ana-eche gbasara uru anyị ga-erite n’ihe anyị kpebiri ime, ọ ga-eme ka anyị gbalịa mee ya ọ bụrụgodị na e nwere ihe ndị mere ka o siere anyị ike.—Gal. 6:9.

19 Ikpebi ime ihe dị mma anaghị adị mfe. Ime ya eme nwekwara ike isi ike. Ma, Jehova nwere ike inye gị amamihe na ike ị ga-eji mechaa ihe i bidoro.

ABỤ NKE 65 Gaa n’Ihu

^ par. 5 Ị̀ na-akwa mmakwaara ma i cheta ụfọdụ ihe i kpebiri ime? Ọ̀ na-esiri gị ike mgbe ụfọdụ ikpebi ezigbo ihe ị ga-eme ma mee ya? Isiokwu a ga-enyere gị aka imeri nsogbu ndị ahụ ma mechaa ihe ị malitere.

^ par. 11Usoro Ọgụgụ Baịbụl” dị na jw.org/ig nwere ike inyere gị aka ịhazi otú ị ga-esi na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. Pịa ebe e dere IHE NDỊ ANYỊ NWERE, pịzie AKWỤKWỌ NA BROSHỌ.

^ par. 17 Ị chọọ ịhụ ebe a kọwakwuru otú ị ga-esi jiri oge gị na-eme ihe bara uru, gụọ isiokwu bụ́ “20 Ways to Create More Time” dị na Teta! Bekee nke Eprel 2010.