Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 46

Ị̀ Na-eme Ka “Ọta Ukwu Bụ́ Okwukwe” Gị Dị Otú O Kwesịrị?

Ị̀ Na-eme Ka “Ọta Ukwu Bụ́ Okwukwe” Gị Dị Otú O Kwesịrị?

“Burunụ ọta ukwu bụ́ okwukwe.”—EFE. 6:16.

ABỤ NKE 119 Ka Anyị Nwee Okwukwe

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. (a) Dị ka e kwuru ná Ndị Efesọs 6:16, gịnị mere “ọta ukwu bụ́ okwukwe” ji dị anyị mkpa? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-eleba anya na ha?

Ì NWERE “ọta ukwu bụ́ okwukwe”? (Gụọ Ndị Efesọs 6:16.) O doro anya na i nwere. Otú ahụ ọta ukwu si echebe ọtụtụ ebe n’ahụ́ mmadụ ka okwukwe si echebe anyị ka anyị ghara itinye aka n’ihe ọjọọ ndị ụwa na-eme, dị ka omume rụrụ arụ, tigbuo zọgbuo, na ihe ndị ọzọ na-adịghị Chineke mma.

2 Ma, anyị bi “n’oge ikpeazụ.” A ga na-enwekwa ihe ndị ga-eme ka a mata ma ànyị nwekwara okwukwe. (2 Tim. 3:1) Olee otú i nwere ike isi mata ma okwukwe gị ọ̀ ka sikwara ike? Gịnị ka ị ga-eme ka okwukwe gị sikwuo ike? Ka anyị leba anya n’ajụjụ ndị a.

NA-ENYOCHA OKWUKWE GỊ NKE ỌMA

Ndị agha lụchaa agha, ha na-eme ka ọta ha dị otú o kwesịrị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 3)

3. Olee ihe ndị agha na-eme ọta ha, n’ihi gịnịkwa?

3 N’oge ochie, ndị agha na-enwekarị ọta e ji akpụkpọ anụ kpuchie. Ha na-ete ọta ha mmanụ iji chebe akpụkpọ anụ ahụ, nakwa iji mee ka ígwè dị na ya ghara ịta nchara. Ọ bụrụ na onye agha achọpụta na ọta ya mebiri emebi, ọ na-agbalị mezie ya ka o nwee ike ịdị njikere maka agha ọzọ. Olee otú ihe ahụ ndị agha na-eme si gbasa okwukwe gị?

4. Gịnị mere i kwesịrị iji na-enyocha okwukwe gị? Oleekwa otú ị ga-esi eme ya?

4 Otú ahụ ndị agha si enyocha ọta ha n’oge ochie ka gịnwa kwesịkwara ịna-enyocha okwukwe gị ka i nwee ike ịdị njikere mgbe ọ bụla maka agha. E nwere ọgụ anyị bụ́ Ndị Kraịst na-alụ. Anyị na-alụsokwa ndị mmụọ ọjọọ ọgụ. (Efe. 6:10-12) Ọ bụghị onye ọzọ ga na-elekọtara gị ọta gị, ya bụ, okwukwe gị. Olee otú i nwere ike isi chọpụta ma okwukwe gị ọ̀ ga-esi ike ma ọnwụnwa bịara gị? Nke mbụ, i kwesịrị ikpe ekpere ka Chineke nyere gị aka. Ọzọ bụ na i kwesịrị inyocha Okwu Chineke ka ị mata ma okwukwe gị ọ̀ dịkwa otú Chineke chọrọ ya. (Hib. 4:12) Baịbụl kwuru, sị: “Jiri obi gị dum tụkwasị Jehova obi, adaberekwala ná nghọta gị.” (Ilu 3:5, 6) Ugbu a, chebara ihe mere ná ndụ gị na nso nso a echiche na ihe i mere banyere ya. Dị ka ihe atụ, ihe ò siiri gị ezigbo ike? Ò mere ka i cheta nkwa Jehova kwere ná Ndị Hibru 13:5, ebe sịrị: “M gaghị ahapụ gị ma ọlị, m gaghịkwa agbahapụ gị ma ọlị”? Nkwa ahụ ò mere ka obi sikwuo gị ike na Jehova ga-enyere gị aka? Ya bụrụ otú ahụ, ọ pụtara na okwukwe gị dị otú o kwesịrị.

5. Gịnị ka i nwere ike ịchọpụta ma i nyochaa okwukwe gị?

5 I nyochaa okwukwe gị, ihe ị ga-achọpụta nwere ike iju gị anya. I nwere ike ịchọpụta ihe ụfọdụ na-adịchaghị mma gbasara onwe gị ị na-amabughị. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịchọpụta na nchegbu, ụgha, na ịda mbà n’obi akpaala okwukwe gị aka ọjọọ. Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka ị ga-eme ka okwukwe gị siekwa ike?

EKWELA KA NCHEGBU, ỤGHA, NA ỊDA MBÀ N’OBI MEBIERE GỊ IHE

6. Olee ụfọdụ ihe anyị kwesịrị ịna-eche gbasara ha?

6 E nwere ụfọdụ ihe anyị kwesịrị ịna-eche gbasara ha. Dị ka ihe atụ, anyị kwesịrị ịna-eche otú anyị ga-esi na-eme ihe dị Jehova na Jizọs mma. (1 Kọr. 7:32) Ọ bụrụ na anyị emee mmehie jọgburu onwe ya, anyị kwesịrị ịna-eche otú anyị ga-esi mee ka anyị na Chineke dịghachi ná mma. (Ọma 38:18) Anyị kwesịkwara ịna-eche otú anyị ga-esi na-eme di anyị ma ọ bụ nwunye anyị obi ụtọ nakwa otú anyị ga-esi na-elekọta ndị ezinụlọ anyị na ụmụnna anyị.—1 Kọr. 7:33; 2 Kọr. 11:28.

7. Dị ka e kwuru n’Ilu 29:25, gịnị mere anyị ekwesịghị ịtụ egwu mmadụ?

7 Ma, nchegbu nwere ike ịkpa okwukwe anyị aka ọjọọ. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike ịna-echegbu onwe anyị mgbe niile gbasara otú anyị ga-esi nweta nri na uwe ga-ezuru anyị. (Mat. 6:31, 32) Ime otú ahụ nwere ike ime ka ịchụ akụnụba bụrụ ihe ka anyị mkpa. Anyị nwedịrị ike malite ịhụ ego n’anya. Anyị kwe ka ụdị ihe ahụ mee anyị, okwukwe anyị nwere n’ebe Chineke nọ agaghịzi esi ike. Anyị na ya agaghịzi adị ná mma. (Mak 4:19; 1 Tim. 6:10) Ihe ọzọ nwere ike ịna-echegbu anyị bụ ihe ndị ọzọ na-eche gbasara anyị. O nwere ike ime ka anyị tụwa mkpagbu ma ọ bụ ịkwa emo ụjọ kama ịtụwa ụjọ imehie Jehova. Ihe ga-enyere anyị aka ka ụdị ihe a ghara ime anyị bụ ịrịọ Jehova ka o nye anyị okwukwe na obi ike iji merie ịtụ egwu mmadụ.—Gụọ Ilu 29:25; Luk 17:5.

(A ga-akọwa ya na paragraf nke 8) *

8. Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma e kwuwe ihe na-abụghị eziokwu gbasara nzukọ Jehova?

8 Setan bụ́ “nna ụgha” na-eji ndị na-ejere ya ozi agbasa ụgha gbasara Jehova na ụmụnna anyị. (Jọn 8:44) Dị ka ihe atụ, ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ekwu ihe na-abụghị eziokwu gbasara nzukọ Jehova n’Ịntanet na televishọn nakwa n’ebe ndị ọzọ a na-agbasa ozi. Ụgha ndị ahụ so ‘n’akụ́ ụta niile na-ere ọkụ’ nke Ekwensu. (Efe. 6:16) Gịnị ka anyị kwesịrị ime ma mmadụ gwawa anyị gbasara ụgha ndị ahụ? Anyị ekwesịghị ige ya ntị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na anyị tụkwasịrị Jehova na ụmụnna anyị obi. Nke bụ́ eziokwu bụ na anyị na ndị si n’ezi ofufe dapụ ekwesịghị ikwurịta ihe ọ bụla. Anyị ekwesịghịkwa ikwe ka ihe ọ bụla ma ọ bụ onye ọ bụla mee ka anyị na ha rụwa ụka, ọ bụrụgodị na naanị ihe anyị chọrọ bụ ịmata ihe ha chere.

9. Gịnị ka ịda mbà n’obi nwere ike ime anyị?

9 Ịda mbà n’obi nwere ike ịkpa okwukwe anyị aka ọjọọ. O nweghị otú anyị ga-esi mee ka anyị ahụghị nsogbu ndị bịaara anyị. Nke bụ́ eziokwu bụ na ime otú ahụ ga-apụta na anyị anaghị eji ihe akpọrọ ihe. Mgbe ụfọdụ, nsogbu ndị bịaara anyị nwere ike ime ka anyị daa mbà. Ma anyị ekwesịghị ịna-eche gbasara nsogbu anyị mgbe niile. Ime otú ahụ nwere ike ime ka anyị chefuo nkwa niile magburu onwe ha Jehova kwere anyị. (Mkpu. 21:3, 4) Ịda mbà n’obi nwere ike ime ka ike gwụ anyị, anyị akwụsịzie ife Jehova. (Ilu 24:10) Ma, anyị ekwesịghị ikwe ka ụdị ihe ahụ mee anyị.

10. Olee ihe ị mụtara n’akwụkwọ ozi otu nwanna nwaanyị dere?

10 Chegodị otú otu nwanna nwaanyị bi n’Amerịka si na-eme ka okwukwe ya sikwuo ike mgbe ọ na-elekọta di ya na-arịa ezigbo ọrịa. N’akwụkwọ ozi o degaara isi ụlọ ọrụ anyị, o dere, sị: “Otú a ihe si dịrị anyị na-eme ka anyị na-echegbu onwe anyị, na-emekwa ka anyị daa mbà mgbe ụfọdụ. Ma, anyị nwere olileanya siri ike. Obi dị m ezigbo ụtọ maka ihe niile Jehova ji na-eme ka okwukwe anyị sikwuo ike ma na-agba anyị ume. Ndụmọdụ na agbamume ndị a dị anyị ezigbo mkpa ugbu a. Ọ na-eme ka anyị ghara ịkwụsị ijere Jehova ozi ma na-edi ọnwụnwa ndị Setan chọrọ iji na-eme ka ike gwụ anyị.” Ihe nwanna nwaanyị a kwuru na-akụziri anyị na anyị nwere ike imeri ịda mbà n’obi. Olee otú ị ga-esi emeri ya? Cheta na ọ bụ Setan na-akpata ụdị nsogbu ndị ahụ. Tụkwasị Jehova obi na ọ ga-akasi gị obi. Jirikwa ihe ọ na-akụziri anyị kpọrọ ihe.

Ị̀ na-eme ka “ọta ukwu bụ́ okwukwe” gị dị otú o kwesịrị? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11) *

11. Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị iji chọpụta ma okwukwe anyị ò sikwara ike?

11 Ị̀ chọpụtala na i kwesịrị ime ka okwukwe gị sikwuo ike? N’ime ọnwa ole na ole gara aga, ì nweela ike ịgbara nchegbu ọsọ? Ị̀ gbalịsiela ike jụ ige ntị n’ihe ndị si n’ezi ofufe dapụ na-ekwu nakwa ịrụwa ụka gbasara ụgha ha na-agbasa? Ì meriela ịda mbà n’obi? Ọ bụrụ otú ahụ, ọ pụtara na okwukwe gị dị otú o kwesịrị. Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya n’ihi na Setan nwere ngwá ọgụ ndị ọzọ o ji na-alụso anyị ọgụ. Ka anyị kwuo gbasara otu n’ime ha.

KPACHARA ANYA KA Ị GHARA ỊHỤ IHE ONWUNWE N’ANYA

12. Gịnị ka ịhụ akụnụba n’anya nwere ike ime anyị?

12 Ịhụ akụnụba n’anya nwere ike imegharị anyị anya, meekwa ka anyị leghara okwukwe anyị anya. Pọl onyeozi kwuru, sị: “Onye ọ bụla nke na-eje ozi dị ka onye agha adịghị etinye aka n’ọrụ ego a na-arụ ná ndụ, ka ihe ya wee masị onye debara aha ya dị ka onye agha.” (2 Tim. 2:4) N’eziokwu, a naghị ekwe ka ndị agha ndị Rom rụwa ọrụ ọzọ. Gịnị nwere ike ime ma onye agha gaa rụwa ọrụ ọzọ?

13. Gịnị mere onye agha ekwesịghị itinye aka n’ọrụ ego?

13 Ka e were ya na n’ụtụtụ, ndị agha ji mma agha na-amụ otú e si alụ ọgụ, ma otu n’ime ha anọghị ya. Ọ gara n’ebe ọ na-ere nri. Ná mgbede, ndị agha ahụ ewepụta oge na-eleru ngwá agha ha anya, na-amụkwa mma agha ha ka ọ dịrị nkọ. Ma onye nke ahụ na-ere nri nọ na-esi nri ọ ga-ere echi ya. Ma, n’ụtụtụ echi ya, ndị iro abịa ịlụso ha ọgụ na mberede. Olee onye agha nke i chere ga-eme ihe o kwesịrị ime ozugbo ma mee ka obi dị onyeisi ha ụtọ? Ọ bụrụ na i so na-alụ agha ahụ, olee onye agha nke ị ga-achọ ka ọ nọrọ gị n’akụkụ? Ọ̀ bụ ndị nke ahụ dị njikere, ka ọ̀ bụ onye nke ahụ nọ na-eme ihe ọzọ?

14. Ebe anyị bụ ndị agha Kraịst, olee ihe bụ́ mkpa anyị?

14 Anyị dị ka ezigbo ndị agha. Anyị agaghị ekwe ka ihe ọ bụla megharịa anyị anya, obi anyị apụzie n’ihe bụ́ mkpa anyị, ya bụ, ime ihe ga-adị Ndị Ọchịagha anyị bụ́ Jehova na Jizọs mma. Anyị weere ya ka ihe dị mkpa karịa ihe ọ bụla anyị ga-enweta n’ụwa Ekwensu a. Anyị ga-agbalịsi ike ka anyị nwee oge na ume anyị ga-eji na-ejere Jehova ozi, na-emekwa ka ọta anyị na ihe ndị ọzọ so n’ekike agha Chineke nyere anyị dịrị otú ha kwesịrị.

15. Olee aka ná ntị Pọl dọrọ anyị? N’ihi gịnịkwa?

15 Anyị kwesịrị ịsa anya na mmiri. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na Pọl dọrọ anyị aka ná ntị na a ‘ga-eduhie ndị kpebisiri ike ịba ọgaranya,’ ha ‘adapụkwa n’okwukwe.’ (1 Tim. 6:9, 10) Okwu ahụ bụ́ ‘iduhie’ na-egosi na ịchụwa ihe ndị na-adịghị mkpa nwere ike imegharị anyị anya. “Ọtụtụ ọchịchọ ndị amamihe na-adịghị na ha, ndị na-emerụkwa ahụ́” nweziri ike iri anyị obi. Kama ikwe ka ọchịchọ ndị a rie anyị obi, anyị kwesịrị ịghọta na ha so n’ihe Setan ji eme ka okwukwe anyị ghara isi ike.

16. Olee ajụjụ ụfọdụ ihe a kọrọ na Mak 10:17-22 kwesịrị ime ka anyị chebara echiche?

16 Ka e were ya na anyị nwere ego anyị ga-eji zụọ ọtụtụ ihe. Ò nwere ihe ọjọọ anyị mere ma ọ bụrụ na anyị azụọ ihe masịrị anyị, ma ya abụrụ ihe na-adịghị anyị mkpa? O nwere ike o nweghị. Ma, chegodị gbasara ajụjụ ndị a: Ọ bụrụgodị na anyị nwere ego ịzụ ihe, ànyị nwere oge na ume anyị ga-eji na-elekọta ya? Ò nwere ike ime ka ihe anyị nwere rie anyị obi? Otú ihe anyị nwere si rie anyị obi ò nwere ike ime ka anyị mee ka nwa okorobịa ahụ na-ekweghị ewepụta oge jekwuoro Chineke ozi otú Jizọs gwara ya? (Gụọ Mak 10:17-22.) Ọ ga-akacha mma ka anyị ghara ibi ndụ okomoko. Kama ka anyị wepụtakwuo oge anyị na ume anyị na-eme ihe Chineke chọrọ.

NA-EME KA OKWUKWE GỊ NA-ESIKWU IKE

17. Gịnị ka anyị na-ekwesịghị ichefu?

17 Anyị ekwesịghị ichefu na anyị nọ n’agha. Anyị kwesịkwara ịdị njikere ịna-alụ agha ahụ kwa ụbọchị. (Mkpu. 12:17) Ụmụnna anyị agaghị ebutere anyị ọta anyị, ya bụ, okwukwe anyị. Anyị ga-eji aka anyị na-eme ka okwukwe anyị na-esikwu ike.

18. N’oge ochie, gịnị mere ndị agha ji ejidesi ọta ha ike?

18 N’oge ochie, a na-akwanyere onye agha ji obi ike lụọ agha ùgwù. Ma, ihere ga-emegbu ya ma ọ gbara aka ọta ya lọta. Tasitọs, bụ́ onye Rom na-akọ ihe ndị mere n’oge ochie, dere, sị: “O nweghị ihe ihere karịrị onye agha ịgba aka ọta ya lọta agha.” O so n’ihe mere ndị agha ji ejidesi ọta ha ike.

Ebe otu nwanna nwaanyị jidesiri ọta ukwu bụ́ okwukwe ya ike. Otú o si eme ya bụ na ọ na-agụ Baịbụl, na-aga ọmụmụ ihe mgbe niile, na-ekwusasikwa ozi ọma ike (A ga-akọwa ya na paragraf nke 19)

19. Olee otú anyị ga-esi jidesie ọta anyị ike?

19 Otú anyị ga-esi ejidesi ọta anyị ike bụ ịna-aga ọmụmụ ihe mgbe niile na ịna-agwa ndị ọzọ gbasara Jehova na Alaeze ya. (Hib. 10:23-25) Anyị ga na-agụkwa Baịbụl kwa ụbọchị ma na-arịọ Jehova ka o nyere anyị aka ime ihe anyị gụtara na ya. (2 Tim. 3:16, 17) Anyị mee otú ahụ, o nweghị ngwá ọgụ ọ bụla Setan ga-eji lụso anyị ọgụ ga-eme ka anyị ghara ịdị ndụ ebighị ebi. (Aịza. 54:17) “Ọta ukwu bụ́ okwukwe” anyị ga-echebe anyị. Anyị ga-akwụrụ chịm, anyị na ụmụnna anyị ejiri otu obi na-efe Jehova. Ọ bụghị naanị na anyị ga-emeri n’ọgụ anyị na-alụ kwa ụbọchị, kama anyị ga na-akwado Jizọs mgbe ọ ga-emeri n’ọgụ ọ na-alụso Setan na ndị òtù ya.—Mkpu. 17:14; 20:10.

ABỤ NKE 118 “Nyere Anyị Aka Ka Okwukwe Anyị Sie Ike”

^ par. 5 N’oge ochie, ọta na-echebe ndị agha. Okwukwe anyị dị ka ọta. Otú ahụ onye agha si elekọta ọta ya ka anyịnwa kwesịkwara ịna-elebara okwukwe anyị anya. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe anyị nwere ike ime iji mata ma okwukwe anyị ọ̀ dịkwa otú o kwesịrị.

^ par. 58 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na ezinụlọ ya gbanyụrụ tiivi ha ozugbo e bidoro ịkọ gbasara ụgha ndị si n’ezi ofufe dapụ na-aghagide Ndịàmà Jehova.

^ par. 60 NKỌWA FOTO: N’ofufe ezinụlọ ha, nwanna ahụ mechara jiri ihe a kọrọ na Baịbụl na-eme ka okwukwe ezinụlọ ya sie ike.