Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 45

Otú Mmụọ Nsọ Si Enyere Anyị Aka

Otú Mmụọ Nsọ Si Enyere Anyị Aka

“N’ihe niile, enwere m ike site n’aka onye ahụ nke na-enye m ike.”—FIL. 4:13.

ABỤ NKE 104 Chineke Na-enye Anyị Mmụọ Nsọ Ya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. (a) Olee ihe na-enyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị kwa ụbọchị? Kọwaa. (b) Gịnị ka anyị ga-eleba anya na ha n’isiokwu a?

È NWEELA mgbe i chetara otu nsogbu i diri, gị asị: “Ama m na ọ bụrụ n’ike aka m, agaaraghị m edili nsogbu ahụ?” Ọtụtụ n’ime anyị ekwuola otú ahụ. Ọ ga-abụ na i kwuru ya mgbe i chetara otú i si die ezigbo ọrịa rịara gị ma ọ bụ ọnwụ onye nke gị. I cheta ihe merenụ, obi gị na-agwa gị na naanị ihe mere i ji die ya bụ na mmụọ nsọ Jehova nyere gị “ike karịrị ike nkịtị.”—2 Kọr. 4:7-9.

2 Ọ bụ mmụọ nsọ ga-enyekwara anyị aka idi nsogbu ndị juru n’ụwa Ekwensu a. (1 Jọn 5:19) Ihe ọzọkwa bụ na anyị na-alụso “ìgwè ndị mmụọ ọjọọ” ọgụ. (Efe. 6:12) Ka anyị leba anya n’ụzọ abụọ mmụọ nsọ si enyere anyị aka idi nsogbu ndị a. Anyị ga-elebakwa anya n’ihe ndị anyị nwere ike ime ka mmụọ nsọ nyere anyị aka.

MMỤỌ NSỌ NA-ENYE ANYỊ IKE

3. Olee otu ụzọ mmụọ nsọ Jehova si enyere anyị aka idi nsogbu?

3 Mmụọ nsọ Jehova na-enye anyị ike anyị ga-eji mee ihe niile anyị kwesịrị ime n’agbanyeghị nsogbu. Pọl onyeozi kwuru na ihe mere o ji nwee ike ịna-efe Jehova n’agbanyeghị nsogbu ndị bịaara ya bụ na “ike nke Kraịst” nyeere ya aka. (2 Kọr. 12:9) Mgbe Pọl na-aga ozi ala ọzọ nke abụọ ya, ọ nọ na-ekwusasi ozi ọma ike, na-arụkwa ọrụ o ji akpa afọ ya. O biri na Kọrịnt n’ụlọ Akwịla na Prisila. Ha bụ ndị na-akpa ákwà ụlọikwuu. Ebe ọ bụ na Pọl na-akpakwa ákwà ụlọikwuu, o so ha na-arụ ọrụ ahụ ụbọchị ụfọdụ. (Ọrụ 18:1-4) Mmụọ nsọ nyere Pọl ike ịna-arụ ya ma na-ekwusa ozi ọma.

4. 2 Ndị Kọrịnt 12:7b-9, olee nsogbu Pọl kwuru na ya nwere?

4 Gụọ 2 Ndị Kọrịnt 12:7b-9. N’amaokwu a, gịnị ka Pọl bu n’obi kwuo na ya nwere “ogwu n’anụ ahụ́”? Ọ bụrụ na e nwere ogwu dị gị n’ahụ́, ọ ga na-afụ gị ezigbo ụfụ. N’ihi ya, ihe okwu Pọl pụtara bụ na o nwere ihe na-enye ya nsogbu. Ọ kpọrọ nsogbu ahụ “mmụọ ozi Setan” nke nọ ‘na-ama ya ụra,’ ma ọ bụ na-eti ya ihe. O nwere ike ọ bụghị Ekwensu ma ọ bụ ndị mmụọ ọjọọ ya kpataara Pọl nsogbu ahụ yiri ogwu n’ahụ́ ya. Ma, mgbe ha hụrụ “ogwu” ahụ dị Pọl n’ahụ́, o nwere ike ịbụ na ha gbalịrị ime ka ọ bamikwuo ya n’ahụ́, ka ọ fụsie ya ụfụ ike. Gịnị ka Pọl mere?

5. Olee otú Jehova si za ekpere Pọl?

5 Na mbụ, Pọl chọrọ ka e wepụrụ ya “ogwu” ahụ. O kwuru, sị: “Ugboro atọ ka m rịọsiri Onyenwe anyị [Jehova] arịrịọ ike ka ihe a si n’ebe m nọ pụọ.” Ma, n’agbanyeghị ekpere niile Pọl kpere, ogwu ahụ apụghị. Ọ̀ pụtara na Jehova azaghị ekpere ya? Mba. Ọ zara ya. Jehova ewepụghị nsogbu ahụ. Ma, o nyere ya ike ọ ga-eji edi ya. Jehova sịrị ya: “A na-eme ka ike m zuo okè n’adịghị ike.” (2 Kọr. 12:8, 9) Chineke nyeere Pọl aka ịna-enwe obi ụtọ, obi eruokwa ya ala.—Fil. 4:4-7.

6. (a) Olee otú Jehova nwere ike isi za ekpere anyị? (b) Olee ihe e kwuru n’amaokwu Baịbụl ndị dị na paragraf a na-eme ka obi sie gị ike?

6 Ò nwetụla mgbe ị rịọrọ Jehova ka o wepụrụ gị nsogbu gị na ya na-alụ otú ahụ Pọl mere? O nwere ike ịbụ na ị rịọrọ ya ọtụtụ ugboro, ma o wepụghị ya, kama, ihe ana-akadị njọ. Ò mere ka i chewe ma ọ̀ ga-abụ na Jehova na-ewere gị iwe? Ya bụrụ otú ahụ, cheta Pọl. Jehova zara ekpere ya. Ọ ga-azakwa nke gị. O nwere ike ọ gaghị ewepụrụ gị nsogbu ahụ. Ma, ọ ga-eji mmụọ nsọ ya nye gị ike ị ga-eji edi ya. (Ọma 61:3, 4) Nsogbu nwere ike ‘ịkwada’ gị, ma, Jehova agaghị agbahapụ gị.—2 Kọr. 4:8, 9; Fil. 4:13.

MMỤỌ NSỌ NA-EME KA ANYỊ GHARA ỊKWỤSỊ IFE JEHOVA

7-8. (a) Olee otú mmụọ nsọ si yie ifufe? (b) Olee otú Pita si kọwaa otú mmụọ nsọ si arụ ọrụ?

7 Olee ụzọ ọzọ mmụọ nsọ si enyere anyị aka? Anyị nwere ike iji mmụọ nsọ tụnyere ifufe. Ifufe nwere ike inyere ụgbọ mmiri aka iru ebe ọ na-aga ọ bụrụgodị na ebili mmiri na-enye ya nsogbu. Otú ahụkwa ka mmụọ nsọ si enyere anyị aka ịna-efe Jehova n’agbanyeghị nsogbu ndị na-abịara anyị ruo mgbe anyị ga-abanye n’ụwa ọhụrụ.

8 Ebe ọ bụ na Pita onyeozi bụ onye na-akụ azụ̀, ọ ma ihe gbasara ịkwọ ụgbọ mmiri. O nwere ike ịbụ ya mere o ji jiri okwu dị ka ò nwere ihe jikọrọ ya na ịkwọ ụgbọ mmiri kọwaa otú mmụọ nsọ si arụ ọrụ. O kwuru, sị: “Ọ dịghị mgbe e si n’uche mmadụ buo amụma ọ bụla, kama ndị mmadụ kwuru ihe Chineke mere ka ha kwuo mgbe mmụọ nsọ na-edu ha.” Okwu Grik e si sụgharịta “na-edu” pụtara “bu na-aga.”—2 Pita 1:21.

9. Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “bu na-aga” na-eme ka mmadụ chewe?

9 Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “bu na-aga” na-eme ka mmadụ chewe? Luk onye dere akwụkwọ Ọrụ Ndịozi jikwa okwu yiri ya kọwaa ụgbọ mmiri ifufe ‘bu na-aga.’ (Ọrụ 27:15) N’ihi ya, otu ọkà mmụta Baịbụl kwuru na mgbe Pita dere na mmụọ nsọ ‘duru’ ndị dere Baịbụl, okwu o ji kọwaa ya bụ okwu ga-eme ka ndị mmadụ chewe gbasara ịkwọ ụgbọ mmiri. Ihe Pita na-ekwu bụ na otú ahụ ifufe si ebu ụgbọ mmiri ruo ebe ọ na-aga ka mmụọ nsọ si duo ndị so dee Baịbụl. Otu ọkà mmụta ahụ kwuru na e nwere ike ikwu na ndị ahụ so dee Baịbụl “mepere ákwà ụgbọ mmiri ha,” ya bụ, na ha dị njikere ịrụ ọrụ mmụọ nsọ gwara ha rụọ. Jehova mere ihe o kwesịrị ime. O nyere ha mmụọ nsọ, nke rụụrụ ha ihe ifufe na-arụrụ ụgbọ mmiri. Ndị so dee Baịbụl mekwara ihe ha kwesịrị ime. Ha mere ihe mmụọ nsọ gwara ha mee.

IHE NKE MBỤ: Na-eme ihe Chineke chọrọ ka anyị na-eme n’ozi ya mgbe niile

IHE NKE ABỤỌ: Jiri ike gị niile na-eme ihe ndị Chineke chọrọ ka anyị na-eme (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11) *

10-11. Olee ihe abụọ anyị kwesịrị ime ka mmụọ nsọ nwee ike inyere anyị aka? Nye ihe atụ.

10 N’eziokwu, Jehova anaghịzi eji mmụọ nsọ ya eme ka ndị mmadụ dee Baịbụl n’oge anyị a. Ma, ọ ka na-eji mmụọ nsọ ya eduzi ndị ya. Jehova ka na-eme ihe o kwesịrị ime. Olee ihe anyị ga-eme ka mmụọ nsọ ya nwee ike ịna-edu anyị? Anyị kwesịrị ịgbalị na-eme ihe anyị kwesịrị ime. Olee otú anyị ga-esi eme ya?

11 Chegodị gbasara ihe atụ a. Ọ bụrụ na onye na-akwọ ụgbọ mmiri chọrọ ka ifufe buru ụgbọ ya na-aga, e nwere ihe abụọ ọ ga-eme. Nke mbụ bụ na ọ ga-adọsa ụgbọ ya n’ebe ifufe ahụ na-efe. A sị ka e kwuwe, ụgbọ mmiri ahụ agaghị akwọpụ ma ọ bụrụ na ọ dị n’ọdụ ụgbọ mmiri dị ezigbo anya n’ebe ifufe ahụ na-efe. Nke abụọ bụ na o kwesịrị imeghecha ákwà ụgbọ mmiri ahụ. O doro anya na ọ bụrụgodị na ifufe na-efe, ọ bụ naanị mgbe ifufe juru n’ákwà ụgbọ mmiri ahụ ka ọ ga-akwọpụ njem. Otú ahụ ka ọ dịkwa anyịnwa. Ọ bụ naanị mmụọ nsọ ga-eme ka anyị ghara ịkwụsị ife Jehova. Ka mmụọ nsọ nwee ike inyere anyị aka, e nwere ihe abụọ anyị ga-eme. Nke mbụ bụ na anyị ga na-eme ihe mmụọ nsọ Chineke chọrọ ka anyị na-eme. Nke abụọ abụrụ na anyị kwesịrị iji ike anyị niile na-eme ihe ndị ahụ. (Ọma 119:32) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị a, mmụọ nsọ ga-enye anyị ike anyị ga-eji na-efe Jehova ruo mgbe anyị ga-aba n’ụwa ọhụrụ.

12. Gịnị ka anyị ga-elebazi anya na ya?

12 Anyị ekwuola ụzọ abụọ mmụọ nsọ si enyere anyị aka. Mmụọ nsọ na-enye anyị ike ma na-enyere anyị aka idi nsogbu ndị na-abịara anyị. Ọ na-eduzi anyị, na-enyekwara anyị aka ịrụ ọrụ Jehova nyere anyị nke ga-eme ka anyị nweta ndụ ebighị ebi. Ka anyị lebazie anya n’ihe anọ anyị kwesịrị ịna-eme ka mmụọ nsọ nwee ike ịna-enyere anyị aka.

IHE ANYỊ GA-EME KA MMỤỌ NSỌ NWEE IKE ỊNA-ENYERE ANYỊ AKA

13. Dị ka e kwuru na 2 Timoti 3:16, 17, olee ihe Baịbụl nwere ike imere anyị, oleekwanụ ihe anyịnwa kwesịrị ime?

13 Nke mbụ, na-amụ Okwu Chineke. (Gụọ 2 Timoti 3:16, 17.) Okwu Grik e si sụgharịta “si n’ike mmụọ nsọ Chineke” pụtara “ume Chineke kunyere.” Chineke ji mmụọ nsọ ya tinye echiche ya n’obi ndị so dee Baịbụl. Ọ bụrụ na anyị ana-agụ Baịbụl ma na-echebara ihe anyị gụrụ echiche, ihe ndị Chineke chọrọ ka anyị mee ga na-abanye anyị n’obi. Ihe ndị ahụ ga-eme ka anyị gbanwee ndụ anyị mewe ihe Chineke chọrọ. (Hib. 4:12) Ka mmụọ nsọ baara anyị uru, anyị kwesịrị iwepụta oge na-amụ Baịbụl mgbe niile ma na-echebara ihe anyị mụrụ echiche. Anyị mee otú ahụ, Okwu Chineke ga na-edu anyị n’ihe niile anyị na-ekwu na n’ihe niile anyị na-eme.

14. (a) Olee ihe mere anyị nwere ike iji kwuo na mmụọ nsọ na-adị n’ọmụmụ ihe anyị? (b) Olee ihe anyị ga-eme tupu anyị agawa ọmụmụ ihe ka mmụọ nsọ nwee ike inyere anyị aka?

14 Nke abụọ, soro ụmụnna gị na-efe Chineke. (Ọma 22:22) E nwere ike ikwu na ọmụmụ ihe anyị bụ “ebe ifufe ahụ na-efe.” Mmụọ nsọ na-adị n’ọmụmụ ihe anyị. (Mkpu. 2:29) Gịnị mere anyị nwere ike iji kwuo otú ahụ? Ọ bụ n’ihi na anyị na ụmụnna anyị nọkọọ ife Jehova, anyị na-ekpe ekpere rịọ ya ka o nye anyị mmụọ nsọ. Anyị na-abụ abụ ndị si na Baịbụl, na-egekwa okwu ụmụnna nwoke e ji mmụọ nsọ họpụta na-eji Baịbụl agwa anyị. Ọ bụkwa otu mmụọ nsọ ahụ na-enyere ụmụnna nwaanyị aka ịkwadebe ihe omume ha ma mee ya. Ka mmụọ nsọ nwee ike inyere anyị aka, tupu anyị agawa ọmụmụ ihe, anyị kwesịrị ịkwadebe ihe a ga-amụ ka anyị nwee ike ịza ajụjụ. Anyị mee otú ahụ, e nwere ike ikwu na anyị mepere ákwà ụgbọ mmiri anyị, ya bụ, na anyị jikeere ejikere bịa.

15. Olee otú mmụọ nsọ si enyere anyị aka n’ozi ọma?

15 Nke atọ, na-ekwusa ozi ọma. Ọ bụrụ na anyị ejiri Baịbụl na-ezi ozi ọma ma na-akụzi ihe, anyị na-ekwe ka mmụọ nsọ na-enyere anyị aka n’ozi ọma anyị. (Rom 15:18, 19) Ka mmụọ nsọ nwee ike ịna-enyere anyị aka, anyị kwesịrị ịna-aga ozi ọma mgbe niile, jirikwa Baịbụl na-ezi ozi ọma mgbe ọ bụla o kwere omume. Otu ụzọ anyị ga-esi na-emekwu nke ọma n’ozi ọma bụ ịna-eme ihe dị n’ebe e dere Ihe Gị na Mmadụ Nwere Ike Ikwurịta nke dị n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ.

16. Olee ụzọ kacha mfe anyị ga-esi nweta mmụọ nsọ?

16 Nke anọ, na-ekpe ekpere. (Mat. 7:7-11; Luk 11:13) Ụzọ kacha mfe anyị ga-esi nweta mmụọ nsọ bụ ịrịọ Jehova n’ekpere ka o nye anyị ya. O nweghị ihe ọ bụla nwere ike igbochi ekpere anyị iru Jehova ntị ma ọ bụ mee ka mmụọ nsọ Chineke na-enye anyị ghara irute n’ebe anyị nọ. Setan ma ọ bụ mkpọrọ a tụrụ anyị agaghị emeli ya. (Jems 1:17) Olee otú anyị kwesịrị isi na-ekpe ekpere ka mmụọ nsọ nwee ike inyere anyị aka? Iji zaa ajụjụ a, ka anyị jiri ihe atụ dị naanị n’Oziọma Luk mụọ gbasara ekpere. *

AKWỤSỊLA IKPE EKPERE

17. Gịnị ka ihe atụ ahụ Jizọs mere e dere na Luk 11:5-9, 13 na-akụziri anyị gbasara ekpere?

17 Gụọ Luk 11:5-9, 13. N’ihe atụ Jizọs mere, o gosiri otú anyị kwesịrị isi na-arịọ Chineke ka o nye anyị mmụọ nsọ. N’ihe atụ ahụ, otu nwoke nwetara ihe ọ na-arịọ n’ihi na “ọ nọgidesiri ike na-arịọ.” Ụjọ atụghị ya ịgakwuru enyi ya ka o nyere ya aka n’agbanyeghị na ọ bụ n’etiti abalị. (Luk 11:8) * Gịnị ka Jizọs ji ihe atụ a na-akụziri anyị gbasara ekpere? Ọ sịrị: “Na-arịọnụ, a ga-enye unu; na-achọnụ, unu ga-achọta; na-akụnụ aka, a ga-emeghere unu.” Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Iji nweta mmụọ nsọ, anyị ekwesịghị ịkwụsị ịrịọ Jehova ka o nye anyị ya.

18. Dị ka anyị hụrụ n’ihe atụ Jizọs mere, gịnị mere obi ji kwesị isi anyị ike na Jehova ga-enye anyị mmụọ nsọ ya?

18 Ihe atụ Jizọs ahụ na-akụzikwara anyị ihe mere Jehova ga-eji enye anyị mmụọ nsọ. Nwoke ahụ Jizọs ji mee ihe atụ chọrọ ilekọta onye ọbịa ya nke ọma. Ọ bụ ya mere o ji na-agbalị inye onye ọbịa ahụ bịara n’ụlọ ya n’ime abalị nri n’agbanyeghị na o nweghị ihe ọ bụla. Jizọs kwuru na ihe mere onye agbata obi ya ahụ ji nye ya achịcha bụ n’ihi na ọ nọgidere na-arịọ ya. Gịnị ka Jizọs ji ihe a na-akụziri anyị? Ebe ọ bụ na mmadụ na-ezughị okè meere onye agbata obi ya ihe n’ihi na ọ nọgidere na-arịọ ya, obi kwesịrị isi anyị ike na Nna anyị nke eluigwe ga-enye ndị niile nọgidere na-arịọ ya mmụọ nsọ. N’ihi ya, ka obi sie anyị ike na Jehova ga-enye anyị mmụọ nsọ ma anyị rịọ ya ka o nye anyị ya.—Ọma 10:17; 66:19.

19. Gịnị mere obi kwesịrị iji sie anyị ike na anyị ga-emeri?

19 Obi kwesịrị isi anyị ike na anyị ga-emeri n’agbanyeghị nsogbu niile Ekwensu na-akpatara anyị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi na e nwere ụzọ abụọ mmụọ nsọ si na-enyere anyị aka. Nke mbụ bụ na ọ na-enye anyị ike iji die nsogbu ndị na-abịara anyị. Nke abụọ abụrụ na ọ bụ ike Chineke ji enyere anyị aka ịnọsi ike n’ozi ya ruo mgbe anyị ga-aba n’ụwa ọhụrụ. Ka anyị kpebisie ike na anyị ga na-eme ihe ndị ga-eme ka mmụọ nsọ nwee ike ịna-enyere anyị aka.

ABỤ NKE 41 Biko, Nụrụ Ekpere M

^ par. 5 Isiokwu a kọwara otú Chineke ga-esi eji mmụọ nsọ ya nyere anyị aka idi nsogbu anyị. O kwukwara ihe ndị anyị nwere ike ime ka mmụọ nsọ nyere anyị ezigbo aka.

^ par. 16 N’ime akwụkwọ Baịbụl anọ ndị ahụ kọrọ gbasara ndụ Jizọs, ọ bụ akwụkwọ Luk kacha mee ka o doo anya na ekpere dị Jizọs ezigbo mkpa mgbe ọ nọ n’ụwa.—Luk 3:21; 5:16; 6:12; 9:18, 28, 29; 18:1; 22:41, 44.

^ par. 17 Gụọ isiokwu bụ́ “nọgidesiri ike na-arịọ,” n’ihe a kọwara na Luk 11:8, nke gbara n’Ihe E Kwuru n’Akwụkwọ Ndị A Kpọrọ Aha n’Usoro Ihe Omume Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ, nke Julaị 2018, peeji nke 5.

^ par. 60 NKỌWA FOTO: IHE NKE MBỤ: Ebe otu nwanna na nwunye ya bịarutere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze. Iso ụmụnna ha na-efe Jehova gosiri na ha so na-abịa n’ebe mmụọ nsọ Jehova dị. IHE NKE ABỤỌ: Ha kwadebere ịza ajụjụ n’ọmụmụ ihe. E kwesịkwara ime ụdị ihe abụọ a n’ihe ndị ọzọ anyị lebara anya na ha n’isiokwu a, ya bụ, ịna-amụ Okwu Chineke, ịna-ekwusa ozi ọma, na ịna-ekpe ekpere.