ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Ọgọst 2017

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite na Septemba 25 ruo Ọktoba 22, 2017.

Ị̀ Dị Njikere Iji Ndidi Chere Jehova?

Ndị ji obi ha niile fee Jehova n’oge gara aga jụrụ oge ha ga-ediru ọnwụnwa ndị bịaara ha, ma Chineke amaghị ha ikpe maka ịjụ ajụjụ ahụ.

“Udo nke Chineke . . . Karịrị Echiche Niile”

Ì chetụla ihe mere Chineke ji kwe ka ọnwụnwa ụfọdụ bịaara gị? Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ga-enyere gị aka ịtachi obi ma tụkwasị Jehova obi gị niile?

AKỤKỌ NDỤ

Ịtachi Obi n’Ọnwụnwa Mere Ka Jehova Gọzie M

Gịnị mere ndị gbagara Saịberịa ji ajụ gbasara ehi ebe ihe ha na-achọ bụ atụrụ? Ị ga-amata azịza ajụjụ a n’akụkọ ndụ Pavel Sivulsky na Maria Sivulsky.

Otú Anyị Ga-esi Yipụ Mmadụ Ochie Ahụ, Gharakwa Iyiri Ya Ọzọ

Anyị yipụ mmadụ ochie ahụ, anyị kwesịrị ịgbalịsi ike ka anyị ghara iyiri ya ọzọ. Olee otú anyị ga-esi mee ha n’agbanyeghị otú ihe ọjọọ anyị mere hà?

Otú Anyị Ga-esi Yiri Mmadụ Ọhụrụ Ahụ, Gharakwa Iyipụ Ya Ọzọ

Jehova ga-enyere gị aka ka ị bụrụ ụdị mmadụ ọ chọrọ ka ị bụrụ. Gụọ ihe ndị ga-enyere gị aka ịna-adị ọmịiko, obiọma, umeala n’obi, na ịdị nwayọọ.

Ịhụnanya Bụ Àgwà Bara Ezigbo Uru

Baịbụl mere ka o doo anya na ịhụnanya so na àgwà e ji ama onye mmụọ nsọ na-edu. Gịnị bụ ịhụnanya? Olee otú anyị ga-esi enwe ya, gosikwa ya kwa ụbọchị?

IHE SI N’EBE ANYỊ NA-EDEBE IHE OCHIE

“Olee Mgbe Anyị Ga-enwe Mgbakọ Ọzọ?”

Gịnị mere mgbakọ a e nwere n’isi obodo Meksiko n’afọ 1932 ji dị mkpa?

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Gịnị mere ihe Matiu kọrọ banyere ihe ndị merenụ mgbe Jizọs na-etolite ji dị iche n’ihe Luk kọrọ?