Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 33

A Ga-azọpụta “Ndị Na-ege Gị Ntị”

A Ga-azọpụta “Ndị Na-ege Gị Ntị”

“Na-elezi onwe gị na ozizi gị anya mgbe niile. Nọgide n’ihe ndị a, n’ihi na site n’ime otú a, ị ga-azọpụta onwe gị, zọpụtakwa ndị na-ege gị ntị.”​—1 TIM. 4:16.

ABỤ NKE 67 “Kwusaa Okwu Chineke”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe anyị niile chọrọ ka ndị ezinụlọ anyị mee?

OTU nwanna nwaanyị aha ya bụ Pauline * kwuru, sị: “Malite mgbe m mụtara eziokwu, m chọrọ ka onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ anyị soro m banye na Paradaịs. M chọkwara ka di m Wayne na nwa anyị nwoke soro m fewe Jehova.” È nwere ndị ezinụlọ unu na-amaghịdị Jehova, ma ya fọdụzie ịhụ ya n’anya? O nwere ike ịbụ na ị chọrọ ka ha fewe Jehova otú ahụ Pauline chọkwara.

2. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

2 Anyị agaghị amanyeli ndị ezinụlọ anyị ige ntị n’ozi ọma anyị. Ma, anyị nwere ike ịgba ha ume ka ha chebara ihe Baịbụl na-ekwu echiche ma nabata ya. (2 Tim. 3:​14, 15) Gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ezi ndị ezinụlọ anyị ozi ọma? Gịnị mere anyị kwesịrị iji gbalịa ịghọta otú ọ dị ha? Olee ihe anyị nwere ike ime iji nyere ha aka ka ha hụ Jehova n’anya otú ahụ anyịnwa hụrụ ya? Oleekwa otú ndị niile nọ n’ọgbakọ anyị ga-esi nyere anyị aka? Anyị ga-aza ajụjụ ndị a n’isiokwu a.

GỊNỊ MERE ANYỊ JI KWESỊ ỊNA-EZI NDỊ EZINỤLỌ ANYỊ OZI ỌMA?

3. Dị ka e kwuru na 2 Pita 3:​9, gịnị mere anyị ji kwesị ịna-ezi ndị ezinụlọ anyị ozi ọma?

3 N’oge na-adịghị anya, Jehova ga-ebibi ụwa ochie a. Ọ bụ naanị ndị “nwere ezi obi maka inweta ndụ ebighị ebi” ka a ga-azọpụta. (Ọrụ 13:48) Anyị na-ewepụta oge anyị, jirikwa ike anyị na-ezi ndị anyị na-amaghị ozi ọma n’ebe anyị bi. N’ihi ya, anyị chọkwara ka ndị ezinụlọ anyị bịa soro anyị fewe Jehova. Jehova, bụ́ Nna hụrụ anyị n’anya, ‘achọghị ka e bibie onye ọ bụla, kama ọ chọrọ ka mmadụ niile chegharịa.’​—Gụọ 2 Pita 3:9.

4. Olee ihe na-adịghị mma anyị nwere ike ime ma anyị ziwe ndị ezinụlọ anyị ozi ọma?

4 Anyị kwesịrị iburu n’obi na e nwere ụzọ dị mma na ụzọ na-adịghị mma e si ezi ozi ọma. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike iji olu ọma zie onye anyị na-amaghị ozi ọma. Ma, anyị ziwezie onye ezinụlọ anyị ozi ọma, anyị ejiri ọnụ ọjọọ na-agwa ya okwu.

5. Gịnị ka anyị kwesịrị iburu n’obi tupu anyị eziwe ndị ezinụlọ anyị ozi ọma?

5 Anyị cheta oge mbụ anyị gbalịrị izi ndị ezinụlọ anyị ozi ọma, ọtụtụ n’ime anyị nwere ike ịkwa mmakwaara n’otú anyị si dowe ọnụ zie ha ya. Pọl onyeozi dụrụ Ndị Kraịst ọdụ, sị: “Ka okwu unu dịrị n’amara mgbe niile, ka ọ bụrụ ihe e ji nnu mee ka ọ dị ụtọ, ka unu wee mara otú unu kwesịrị isi azaghachi onye ọ bụla.” (Kọl. 4:​5, 6) Anyị kwesịrị ịna-echeta ihe a mgbe ọ bụla anyị na-ezi onye ezinụlọ anyị ozi ọma. Ma ọ́ bụghị ya, anyị nwere ike ime ihe ga-eme ka ọ ghara ige anyị ntị.

OLEE OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI NYERE NDỊ EZINỤLỌ ANYỊ AKA?

Ọ bụrụ na ị na-aghọta otú ọ dị ndị ezinụlọ unu ma na-akpa àgwà ọma, o nwere ike ime ka ha gee gị ntị (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6 ruo na nke 8) *

6-7. Nye ihe atụ gosiri na anyị kwesịrị ịna-aghọta di anyị ma ọ bụ nwunye anyị.

6 Na-aghọta otú ọ dị ha. Pauline ahụ e kwuru okwu ya ná mmalite sịrị: “Ná mbido, naanị ihe m na-achọ ịgwa di m bụ gbasara Chineke na Baịbụl. Anyị anaghị ekwu gbasara ihe ndị ọzọ.” Ma, Wayne bụ́ di Pauline amachaghị ihe gbasara Baịbụl. Ọ naghịkwa aghọta ihe Pauline na-ekwu. Ọ dị ya ka naanị ihe nwunye ya na-eche bụ gbasara okpukpe ya. O chewere na nwunye ya abanyela òtù ọjọọ nakwa na e duhiewala ya.

7 Pauline kwuru na o nwere mgbe ihe na-ewekọrọ oge ya ná mgbede nakwa ná ngwụcha izu bụ ịga ọmụmụ ihe, ịga ozi ọma, na ịga leta ụmụnna n’ụlọ ha. Ọ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, o nweghị onye na-anọ n’ụlọ ma di m lọta, nke na-eme ka owu na-ama ya.” N’eziokwu, ọ na-adị Wayne ka ya bụrụ na nwunye ya na nwa ya nọ n’ụlọ. Ọ maghị ndị ha na ha nọ. O yikwara ka ndị enyi ọhụrụ nwunye ya metara hà dịzi ya mkpa karịa di ya. Ihe Wayne meziri bụ ịgwa Pauline na ya ga-agba ya alụkwaghịm. Ò nwere ihe i chere Pauline gaara eme iji gosi na ọ na-aghọta otú ọ dị di ya?

8. Dị ka e kwuru na 1 Pita 3:​1, 2, olee ihe ndị ezinụlọ anyị nwere ike ịkacha hụ?

8 Na-akpa àgwà ọma. Ọtụtụ mgbe, ndị ezinụlọ anyị na-ahụ ihe anyị na-eme karịa ihe anyị na-ekwu. (Gụọ 1 Pita 3:​1, 2.) Ọ bụ ihe Pauline mechara chọpụta. Ọ sịrị: “Ama m na di m hụrụ anyị n’anya, nakwa na ọ chọghị ịgba m alụkwaghịm. Ma, ihe ahụ o kwuru mere ka m mata na m kwesịrị imewe ihe Jehova kwuru gbasara alụmdi na nwunye. M kwesịrị ịna-akpa àgwà ọma, ọ bụghị ịna-ekwu oké okwu.” Pauline kwụsịrị inye di ya nsogbu ka ha kwuwe ihe gbasara Baịbụl. Ha abụọ maliteziri ikwu gbasara ihe ndị ọzọ. Wayne hụrụ na nwunye ya na-agbakwu mbọ ka udo dị nakwa na nwa ha nwoke na-akpakwu àgwà ọma. (Ilu 31:​18, 27, 28) Mgbe Wayne chọpụtara na ihe ndị ezinụlọ ya na-amụta na Baịbụl emeela ka ha na-akpakwu àgwà ọma, ọ malitere ige ntị n’ozi ọma.​—1 Kọr. 7:​12-14, 16.

9. Gịnị mere anyị ekwesịghị ịkwụsị inyere ndị ezinụlọ anyị aka?

9 Akwụsịla inyere ndị ezinụlọ gị aka. Jehova gosiri anyị ihe anyị ga-eme. Ọ na-enye ndị mmadụ ohere “ugboro ugboro” ige ntị n’ozi ọma ma nweta ndụ. (2 Ihe 36:15) Pọl onyeozi gwakwara Timoti ka ọ ghara ịkwụsị inyere ndị ọzọ aka. N’ihi gịnị? N’ihi na ọ ga-eme ka ọ zọpụta onwe ya, zọpụtakwa ndị na-ege ya ntị. (1 Tim. 4:16) Anyị hụrụ ndị ezinụlọ anyị n’anya. N’ihi ya, anyị chọrọ ka ha mata eziokwu dị na Baịbụl. Ka oge na-aga, ihe Pauline na-ekwu na ihe ọ na-eme baara ndị ezinụlọ ya uru. Obi dị ya ụtọ na ya na di ya na-efezi Jehova ugbu a. Ha abụọ bụzi ndị ọsụ ụzọ, di ya abụrụkwa okenye.

10. Gịnị mere anyị ji kwesị inwe ndidi?

10 Na-enwe ndidi. Anyị biwe ndụ otú Chineke chọrọ, o nwere ike isiri ndị ezinụlọ anyị ike ịnabata ihe ọhụrụ ndị anyị kweere na otú anyị sizi ebi ndụ. Ihe ha na-ebukarị ụzọ ahụ bụ na anyị anaghịzi eso ha eme ememme okpukpe na ihe ọ bụla gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Ndị ezinụlọ anyị ụfọdụ nwere ike iwewere anyị iwe. (Mat. 10:​35, 36) Ma, anyị ekwesịghị iche na ha agaghị agbanwe. Ọ bụrụ na anyị akwụsị inyere ha aka ka ha ghọta ihe anyị kweere, ọ pụtara na anyị ekpebiela na ha adịghị mma inweta ndụ ebighị ebi. Jehova enyeghị anyị ọrụ ikpe ndị mmadụ ikpe. Ọ bụ Jizọs ka o nyere ọrụ ahụ. (Jọn 5:22) Ọ bụrụ na anyị ana-enwere ndị ezinụlọ anyị ndidi, ha nwere ike imecha gee anyị ntị.​—Gụọ igbe bụ́ “ Jiri Ebe Anyị Na-edebe Ihe n’Ịntanet Na-akụzi Ihe.”

11-13. Gịnị ka ị mụtara n’otú Alice si mesoo nne na nna ya?

11 Jiri akọ na-agwa ha okwu, ma nọsie ike n’ihe i kweere. (Ilu 15:2) Chegodị ihe otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Alice mere. Ọ mụtara gbasara Jehova mgbe o bi n’otu obodo dị anya n’ebe nne na nna ya bi. Nne na nna ya ekweghị na Chineke, ha ejighịkwa ihe gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị egwu egwu. Ọ chọpụtara na o kwesịghị igbu oge ịgwa ha ihe ọma ndị ọ na-amụta. Ọ sịrị: “Ọ bụrụ na i gbuo oge ịgwa ndị ezinụlọ gị ihe ọhụrụ ndị i kweere na ihe ọhụrụ ndị ị na-emezi, ọ ga-aka ewe ha iwe.” Ọ gbalịrị chọta isiokwu ndị o chere ga-amasị ha, dị ka ịhụnanya. O degaziiri ha akwụkwọ ozi gwa ha ihe Baịbụl kwuru gbasara isiokwu ndị ahụ, jụọkwa ha ihe ha chere gbasara ihe ahụ Baịbụl kwuru. (1 Kọr. 13:​1-13) O kelere ha maka ịzụ ya na ilekọta ya. O zigakwaara ha onyinye. Mgbe ọ bụla ọ gara ileta ha, ọ na-eme ike ya niile iji nyere mama ya aka n’ọrụ ụlọ. Ná mmalite, obi adịghị nne na nna Alice mma mgbe ọ gwara ha gbasara ihe ọhụrụ ndị o kweere.

12 Mgbe Alice nọ n’ụlọ ha, ọ na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị. O kwuru, sị: “Otú a m si agụ Baịbụl kwa ụbọchị mere ka mama m ghọta na Baịbụl dị m ezigbo mkpa.” Papa Alice mechara kpebie ịmụ ihe gbasara Baịbụl ka o nwee ike ịghọta ihe mere nwa ya ji gbanwee. Ọ chọkwara ịchọta ihe ọ ga-eji katọọ Baịbụl. Alice kwuru, sị: “M nyere ya Baịbụl ma dee ihe ga-emetụ ya n’obi n’ime ya.” Gịnị meziri? E nweghị ihe papa Alice hụrụ iji katọọ Baịbụl. Kama nke ahụ, ihe ọ gụtara metụrụ ya n’obi.

13 Anyị kwesịrị iji akọ na-agwa ndị ezinụlọ anyị okwu ma nọsie ike n’ihe anyị kweere ọ bụrụgodị na ha akpagbuwe anyị. (1 Kọr. 4:12b) Dị ka ihe atụ, mama Alice kpagburu ya. Alice sịrị: “Mgbe e mere m baptizim, mama m kpọrọ m ‘nwa ọjọọ.’ ” Gịnị ka Alice mere? Ọ sịrị: “Akwụsịghị m ikwu gbasara ihe m kweere. Kama, m ji olu ọma kọwaara ya na ekpebiela m ịbụ Onyeàmà Jehova, nakwa na agaghị m akwụsị. M gbalịrị ime ka obi sie ya ike na m hụrụ ya n’anya n’eziokwu. Anyị abụọ bere ákwá, mụ esiere ya nri a kwọrọ aka sie. Mama m chọpụtawaziri na Baịbụl emeela ka àgwà m ka mma.”

14. Gịnị mere anyị ekwesịghị ikwe ka ndị ezinụlọ anyị mee ka anyị gbanwee ihe anyị kpebiri?

14 O nwere ike iwe oge tupu ndị ezinụlọ anyị aghọtachaa otú ife Jehova dịruru anyị ná mkpa. Dị ka ihe atụ, mgbe Alice kpebiri ịsụwa ụzọ kama ịgụrụ akwụkwọ na mahadum na-aga, nke bụ́ ihe nne na nna ya chọrọ ka o mee, mama ya bekwara ákwá. Ma, Alice nọsiri ike n’ihe o kweere. Alice kwuru, sị: “Ọ bụrụ na i kwere ka ndị ezinụlọ unu gbanwee obi gị n’otu ihe, ha nwere ike ịchọwa ka ha gbanwee obi gị n’ihe ndị ọzọ. Ma, ọ bụrụ na i jiri olu ọma gwa ha okwu ma nọsie ike n’ihe i kweere, ụfọdụ n’ime ha nwere ike ige gị ntị.” Ọ bụ ihe ọma meere Alice. Mama ya na papa ya bụ ndị ọsụ ụzọ ugbu a, papa ya abụrụkwa okenye.

OLEE OTÚ NDỊ NIILE NỌ N’ỌGBAKỌ ANYỊ GA-ESI NYERE ANYỊ AKA?

Olee otú ndị ọgbakọ anyị nwere ike isi nyere onye ezinụlọ anyị na-abụghị nwanna aka? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15 na nke 16) *

15. Dị ka e kwuru na Matiu 5:​14-16 nakwa na 1 Pita 2:​12, olee otú “ọrụ ọma” ụmụnna ndị ọzọ nwere ike isi nyere ndị ezinụlọ anyị aka?

15 Jehova ji “ọrụ ọma” ọgbakọ Ndị Kraịst na-arụ eme ka ndị mmadụ bịa fewe ya. (Gụọ Matiu 5:​14-16; 1 Pita 2:12.) Ọ bụrụ na di gị ma ọ bụ nwunye gị abụghị Onyeàmà Jehova, ọ̀ matala ndị nọ n’ọgbakọ unu? Pauline anyị kwuburu okwu ya kpọrọ ụmụnna ka ha bịa n’ụlọ ya ka ha na di ya mata. Di ya bụ́ Wayne chetara otú otu nwanna si nyere ya aka ịghọta Ndịàmà Jehova nke ọma. Ọ sịrị: “Ọ hapụrụ ọrụ otu ụbọchị ka mụ na ya soro lee bọl na tiivi. M chere, sị: ‘Ọ na-emekwa ihe ndị ọzọ na-eme.’”

16. Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-akpọ ndị ezinụlọ anyị ka ha bịa ọmụmụ ihe?

16 Otu ụzọ magburu onwe ya anyị ga-esi nyere ndị ezinụlọ anyị aka bụ ịkpọ ha ka ha soro anyị bịa ọmụmụ ihe. (1 Kọr. 14:​24, 25) Ọmụmụ ihe mbụ Wayne bịara bụ Ncheta Ọnwụ Jizọs n’ihi na ọ bụ mgbe ọrụ gbasarala, ọ naghịkwa ewe oge. Ọ sịrị: “Aghọtachaghị m ihe niile e kwuru, ma m chetara ihe ndị m hụrụ ebe ahụ mere. Ha bịara nabata m, jiri obi ha niile kwee m n’aka. Obi m gwara m na ha bụ ndị ezigbo mmadụ.” E nwere di na nwunye nọ na-enyere Pauline aka ilekọta ụmụ ya n’ọmụmụ ihe nakwa n’ozi ọma. N’ihi ya, mgbe Wayne mechara kpebie ịmatakwu gbasara ihe nwunye ya Pauline kweere, ọ gwara nwanna nwoke ahụ ka ọ bịa mụwara ya Baịbụl.

17. Olee ihe anyị na-ekwesịghị ịta onwe anyị ụta maka ya? Gịnịkwa mere anyị ekwesịghị ịkwụsị inyere ndị ezinụlọ anyị aka?

17 Anyị nwere olileanya na ndị ezinụlọ anyị niile ga-esoro anyị fewe Jehova. Ma, n’agbanyeghị mbọ niile anyị gbara inyere ha aka, o nwere ike ha agaghị abata n’ọgbakọ. Ụdị ihe ahụ mee, anyị ekwesịghị ịtawa onwe anyị ụta maka ihe ha kpebiri. A sị ka e kwuwe, anyị agaghị amanyeli onye ọ bụla ịnabata ihe anyị kweere. Ma, ọ bụrụ na ndị ezinụlọ unu ahụ otú obi si atọ gị ụtọ n’ihi na ị na-efe Jehova, o nwere ike ime ka ha gbanwee obi ha. Na-ekpe ekpere maka ha. Jiri akọ na-agwa ha okwu. Akwụsịla inyere ha aka. (Ọrụ 20:20) Ka obi sie gị ike na Jehova ga-agọzi mbọ ị na-agba. Ọ bụrụ na ndị ezinụlọ unu ekpebie ige gị ntị, a ga-azọpụta ha.

ABỤ NKE 57 Anyị Na-ezi Ụdị Mmadụ Niile Ozi Ọma

^ par. 5 Anyị chọrọ ka ndị ezinụlọ anyị anyị mara Jehova. Ma, ọ bụ ha ga-ekpebi ma hà ga-efe ya ma ọ bụ na ha agaghị efe ya. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe ndị anyị nwere ike ime ka ọ dịrị ha mfe ige anyị ntị.

^ par. 1 Aha a kpọrọ ụfọdụ ndị n’isiokwu a abụghị ezigbo aha ha. Ọ bụ eziokwu na isiokwu a na-ekwu banyere ndị ezinụlọ anyị na-anaghị efe Jehova, ọ gbasakwara ndị ikwu anyị.

^ par. 53 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna na-enyere papa ya na-abụghị nwanna aka ịrụzi ụgbọala ya. N’oge dabara adaba, ya ana-egosi ya vidio dị na jw.org®.

^ par. 55 NKỌWA FOTO: Ebe otu nwanna nwaanyị na-ege di ya na-abụghị nwanna ntị ka ọ na-akọrọ ya ihe mere n’ụbọchị ahụ. E mechaa, ya na ezinụlọ ya ana-atụrụ ndụ.

^ par. 57 NKỌWA FOTO: Ebe nwanna nwaanyị ahụ kpọrọ ndị ọgbakọ ha n’ụlọ ya, ha ana-agbalị ịmata di ya. Di ya emechaa soro ya bịa Ncheta Ọnwụ Jizọs.