Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 31

“Anyị Adịghị Ada Mbà”

“Anyị Adịghị Ada Mbà”

“Ya mere, anyị adịghị ada mbà.”​—2 KỌR. 4:16.

ABỤ NKE 128 Ka Anyị Tachie Obi Ruo Ọgwụgwụ

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee ihe Ndị Kraịst kwesịrị ime iji gbaruo ọsọ ndụ ahụ n’isi?

NDỊ KRAỊST na-agba ọsọ ndụ. Ma ànyị ka malitere ịgba ya ọhụrụ ma ànyị agbaala ya ọtụtụ afọ, anyị kwesịrị ịna-agba ya ruo n’isi. Ndụmọdụ ahụ Pọl onyeozi nyere Ndị Kraịst nọ na Filipaị nwere ike inyere anyị aka ịgbaru ọsọ ahụ n’isi. Ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ dị na Filipaị n’oge ahụ efeela Jehova ọtụtụ afọ mgbe ha nwetara akwụkwọ ozi ahụ Pọl dere. Ha na-agba ọsọ ahụ nke ọma, ma Pọl chetaara ha na ha kwesịrị iji ntachi obi na-agba ya. Ọ chọrọ ka ha ‘na-achụso ihe mgbaru ọsọ ahụ’ otú ahụ yanwa na-eme.​—Fil. 3:14.

2. Olee ihe mere ndụmọdụ ahụ Pọl nyere ndị Filipaị ji daba adaba?

Ndụmọdụ a Pọl nyere ndị Filipaị dabara adaba. E bidoro ịkpagbu ọgbakọ ahụ ozugbo e hiwere ya. Ọ malitere mgbe Pọl na Saịlas bịara Filipaị n’ihe dị ka afọ 50 n’ihi na Chineke gwara ha ka ha “gafeta na Masedonia.” (Ọrụ 16:9) N’ebe ahụ, ha hụrụ otu nwaanyị aha ya bụ Lidia. ‘Ọ nọ na-ege ha ntị. Jehova wee meghee obi ya ịnabata’ ozi ọma. (Ọrụ 16:14) Ọ dịghị anya, e mee ya na ezinụlọ ya niile baptizim. Ma ozugbo ahụ, Ekwensu eburu ọgụ bịa. Ndị obodo ahụ kpụpụrụ Pọl na Saịlas n’ihu ndị na-achị achị ma bo ha ebubo na ha na-akpaghasị obodo. N’ihi ya, e tiri Pọl na Saịlas ihe, tụọ ha mkpọrọ ma mechaa gwa ha ka ha si n’obodo ahụ pụọ. (Ọrụ 16:​16-40) Ihe ahụ ò mere ka ha daa mbà? Mbanụ. Gịnị ka ụmụnna ndị nọ n’ọgbakọ ahụ e hiwere ọhụrụ mere? Ha tachikwara obi. Ihe a ha mere magburu onwe ya. O doro anya na ọ bụ otú Pọl na Saịlas si tachie obi nyeere ha aka ịtachi obi.

3. Gịnị ka Pọl ma, oleekwa ajụjụ ndị anyị ga-aza?

3 Pọl kpebisiri ike na ya agaghị ada mbà. (2 Kọr. 4:16) Ma, ọ ma na ihe ga-enyere ya aka ịgbaru ọsọ ndụ ahụ n’isi bụ ilekwasị anya n’ihe ọ ga-enweta. Gịnị ka ihe a Pọl mere na-akụziri anyị? Olee ihe ụmụnna anyị n’oge a mere gosiri na anyị nwekwara ike ịtachi obi n’agbanyeghị nsogbu? Oleekwa otú olileanya anyị nwere ga-esi mee ka anyị kpebisikwuo ike na anyị agaghị ada mbà?

OTÚ IHE PỌL MERE GA-ESI BAARA ANYỊ URU

4. Olee otú Pọl si na-agba mbọ n’ozi Jehova n’agbanyeghị otú ihe si dịrị ya?

4 Chegodị otú Pọl si na-agba mbọ n’ozi Jehova mgbe o degaara ndị Filipaị akwụkwọ ozi. A tụrụ ya mkpọrọ n’ụlọ ya na Rom. O nweghị ike ịpụ gaa kwusaa ozi ọma. Ma, ọ nọ na-ezi ndị bịara ileta ya ozi ọma, na-edegakwara ọgbakọ ndị dị ebe dị anya akwụkwọ ozi. Otú ahụ ka ọ dịkwa taa. Ọtụtụ ụmụnna na-anaghị esili n’ụlọ ha apụ na-ezi ndị bịara ileta ha ozi ọma. Ha na-edegakwara ndị a na-anaghị enweta n’ụlọ akwụkwọ ozi.

5. Olee ihe Pọl kwuru ná Ndị Filipaị 3:​12-14 nyeere ya aka ilekwasị anya n’ihe ọ ga-enweta?

5 Pọl ekweghị ka ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ ndị o mere n’oge gara aga mee ka uche ya pụọ n’ife Jehova. O kwuru na ‘ichefu ihe ndị dị n’azụ’ ga-eme ka o nwee ike ‘ịmatị onwe ya nweta ihe ndị dị n’ihu,’ ya bụ, ịgbaru ọsọ ndụ ahụ n’isi. (Gụọ Ndị Filipaị 3:​12-14.) Olee ụfọdụ ihe gaara eme ka uche Pọl pụọ n’ijere Jehova ozi? Nke mbụ, o mere ọtụtụ ihe n’okpukpe ndị Juu, nke mere ka a na-akwanyere ya ùgwù. Ma, o weere ihe ndị ahụ niile “ka nnukwu ihe e kpofuru ekpofu.” (Fil. 3:​3-8) Nke abụọ, n’agbanyeghị na obi ya nwere ike ịna-ama ya ikpe na ọ kpagburu Ndị Kraịst, o kweghị ka o mee ka ọ kwụsị ife Jehova. Nke atọ, o cheghị na ihe niile o mere n’ozi Chineke ezuola, na o nweziri ike iselata aka. Pọl rụrụ ọtụtụ ihe n’ozi ọma ya n’agbanyeghị na a tụrụ ya mkpọrọ, tie ya ihe, tụọ ya nkume, ụgbọ ha ekpuo, ya anọọ agụụ, nọọkwa n’enweghị uwe. (2 Kọr. 11:​23-27) N’agbanyeghị ihe niile Pọl mere n’ozi Jehova na ahụhụ niile ọ tara, ọ ma na o kwesịrị ịnọgide na-efe Jehova. Ọ bụkwa ihe anyịnwa kwesịrị ime.

6. Olee ụfọdụ ihe so ‘n’ihe ndị dị n’azụ’ o nwere ike ịdị mkpa ka anyị chefuo?

6 Olee otú anyị nwere ike isi ‘chefuo ihe ndị dị n’azụ’ otú ahụ Pọl mere? Obi nwere ike ịna-ama ụfọdụ n’ime anyị ikpe maka ihe ọjọọ ndị ha mere n’oge gara aga. Ọ bụrụ na ọ dị gị otú ahụ, ọ ga-adị mma ka ị mụọ gbasara àjà Jizọs ji ndụ ya chụọ. Ị mụọ gbasara ya, chebara ya echiche ma kpee ekpere, o nwere ike ime ka obi ahụ na-ama gị ikpe belata. O nwedịrị ike ime ka ị kwụsịchaa ichegbu onwe gị maka mmehie Jehova gbaghaara gị. E nwere ihe ọzọ anyị nwekwara ike ịmụta n’aka Pọl. O nwere ike ịbụ na ụfọdụ n’ime anyị hapụrụ ọrụ gaara eme ka ha baa ọgaranya iji nwee ike jekwuoro Jehova ozi. Ọ bụrụ otú ahụ, ka anyị gbalịa chefuo ihe ndị ahụ anyị hapụrụ ma ghara ikwe ka ha gụwa anyị agụụ. (Ọnụ Ọgụ. 11:​4-6; Ekli. 7:10) “Ihe ndị dị n’azụ” anyị ga-echefu nwekwara ike ịbụ ozi ndị anyị jeere Jehova n’oge gara aga na mkpagbu ndị a kpagburu anyị. N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị ana-eche gbasara otú Jehova sirila gọzie anyị ma nyere anyị aka n’oge gara aga, o nwere ike ime ka anyị bịarukwuo Nna anyị nso. Ma, ka anyị ghara ịna-eche na anyị emeela ihe niile anyị kwesịrị ime n’ozi Jehova.​—1 Kọr. 15:58.

N’ọsọ ndụ anyị na-agba, anyị kwesịrị ilekwasị anya n’ihe anyị chọrọ inweta ma ghara ikwe ka ihe ọ bụla megharịa anyị anya (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 9:​24-27, olee ihe anyị kwesịrị ime ma ọ bụrụ na anyị chọrọ imeri n’ọsọ ndụ anyị na-agba? Nye ihe atụ.

7 Pọl ghọtara okwu Jizọs ahụ bụ́ “gbalịsienụ ike.” (Luk 13:​23, 24) Ọ ma na ya kwesịrị ịgbalịsi ike ná ndụ ya niile, otú ahụ Jizọs mere. Ọ bụ ihe mere o ji jiri ndụ Onye Kraịst tụnyere ịgba ọsọ. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 9:​24-27.) Onye na-agba ọsọ na-elekwasị anya n’ebe ọ chọrọ ịgbaru. Ọ naghị ekwe ka ihe ọ bụla megharịa ya anya. Dị ka ihe atụ, ndị na-agba ọsọ taa n’obodo mepere emepe nwere ike ịna-agbafe ụlọ ahịa na ihe ndị ọzọ nwere ike imegharị ha anya. Ì chere na onye na-agba ọsọ ga-akwụsịtụ, gaa lewe ihe ndị a kpọsara n’ụlọ ahịa? Ọ gaghị eme otú ahụ ma ọ bụrụ na ọ chọrọ ịgbata ihe. N’ọsọ ndụ anyị na-agba, anyị ekwesịghị ikwe ka ihe ọ bụla megharịa anyị anya. Ọ bụrụ na anyị agbalịsie ike ka Pọl ma lekwasị anya n’ihe anyị ga-agbata, anyị ga-enweta ihe a na-agbata n’ọsọ.

OTÚ ANYỊ NWERE IKE ISI NỌSIE IKE N’OFUFE JEHOVA N’AGBANYEGHỊ NSOGBU

8. Olee nsogbu atọ anyị ga-eleba anya na ha?

8 Ugbu a, ka anyị tụlee nsogbu atọ nwere ike ime ka anyị daa mbà. Nke mbụ bụ mgbe ihe anyị na-atụ anya ya na-emebeghị. Nke abụọ bụ mgbe nká mere ka ike gwụwa anyị. Nke atọ abụrụ mgbe nsogbu na-ekweghị akwụsị akwụsị bịaara anyị. Ịmụta otú ndị ọzọ si merie nsogbu ndị a nwere ike inyere anyị aka.​—Fil. 3:17.

9. Olee ihe nwere ike ime anyị ma ọ bụrụ na ihe anyị na-atụ anya ya emebeghị?

9 Mgbe ihe anyị tụrụ anya ya na-emebeghị. Anyị na-atụkarị anya ka ihe ọma ndị Jehova kwere anyị ná nkwa mezuo. Mgbe Habakọk onye amụma kwuru na ọ na-atụsi anya ike ka Jehova kwụsị ihe ọjọọ na-eme na Juda, Jehova gwara ya ka ọ “na-atụ anya ya.” (Hab. 2:3) Ma, ọ bụrụ na ọ dị anyị ka ihe anyị na-atụ anya ya ọ̀ na-egbu oge, o nwere ike ime ka ike gwụwa anyị. O nwedịrị ike ime ka anyị daa mbà. (Ilu 13:12) Ọ bụ ihe mere ụfọdụ ụmụnna anyị n’ihe dị ka n’afọ 1914. Ọtụtụ Ndị Kraịst e tere mmanụ tụrụ anya ịga eluigwe n’afọ ahụ. Mgbe nke ahụ na-emeghị, gịnị ka ndị ji obi ha niile na-efe Jehova mere gbasara ya?

Ihe Nwanna Royal Spatz na nwunye ya Pearl tụrụ anya ya ga-eme n’afọ 1914 emeghị, ma ha nọgidere na-efe Jehova ruo ọtụtụ afọ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 10)

10. Gịnị ka otu nwanna na nwunye ya mere mgbe ihe ha tụrụ anya ya na-emeghị?

10 Ka anyị leba anya n’otú ụmụnna abụọ ji obi ha niile fee Jehova si merie nsogbu ahụ. E mere Nwanna Royal Spatz baptizim n’afọ 1908 mgbe ọ dị afọ iri abụọ. Obi siri ya ezigbo ike na ọ ga-aga eluigwe n’oge na-adịghị anya. Ọ gwara Nwanna Nwaanyị Pearl n’afọ 1911 na ya chọrọ ịlụ ya ma sị ya: “Ị manụ ihe na-aga ime n’afọ 1914. Ọ bụrụ na anyị ga-alụ, ka anyị lụọ ozugbo.” Nwanna a na nwunye ya hà kwụsịrị ịgba ọsọ ndụ ahụ mgbe ha na-agaghị eluigwe n’afọ 1914? Mba. Ihe ka ha mkpa bụ iji obi ha niile na-eme uche Chineke, ọ bụghị ịga eluigwe. Ha kpebisiri ike iji ntachi obi na-agba ọsọ ndụ ahụ. Nwanna Royal Spatz na nwunye ya ji obi ha niile fee Jehova ọtụtụ afọ ruo mgbe ha nwụrụ. O doro anya na ị na-atụsi anya ike ka Jehova mee ka a kwụsị ịkọcha aha ya, mee ka o doo anya na ọ bụ ọchịchị ya kacha mma, mezuokwa nkwa niile o kwere. Ka obi sie gị ike na ihe ndị a ga-emezu mgbe oge Jehova ruru. Tupu mgbe ahụ, ka anyị niile na-agbalịsi ike n’ozi Chineke ma ghara ikwe ka ihe anyị na-atụ anya ya na-emebeghị mee ka anyị dawa mbà.

Ruokwa mgbe Nwanna Arthur Secord mere agadi, ọ chọsiri ike ime ike ya niile n’ozi Jehova (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11)

11-12. Gịnị mere anyị ga-eji nọgide na-efe Jehova ọ bụrụgodị na nká emee ka ike gwụwa anyị? Nye ihe atụ.

11 Nká mee ka ike gwụwa anyị. Mmadụ inwekwu okwukwe na Jehova na iji obi ya niile na-efe ya adịghị ka ịgba ọsọ nkịtị. Ọ bụghị ihe e ji ike ọkpụkpụ aka eme. Nke bụ́ eziokwu bụ na ọtụtụ ndị na-agbasighịzi ike ka na-agba mbọ ime ike ha niile n’ozi Jehova. (2 Kọr. 4:16) Dị ka ihe atụ, e nwere otu nwanna aha ya bụ Arthur Secord. * Mgbe ọ dị afọ iri asatọ na asatọ, o jeela ozi na Betel ruo afọ iri ise na ise. Ahụ́ esighịzi ya ike mgbe ahụ. Otu ụbọchị, nọọsụ na-elekọta ya bịara n’àkwà o dina, lee ya anya ma wetuo obi sị ya: “Nwanna Secord, i jirila ahụ́ gị a rụọrọ Jehova ọrụ ọtụtụ afọ.” Nwanna Secord elekwasịghị anya n’ihe ndị o mere n’oge gara aga. O lere nọọsụ ahụ anya, sị ya: “Ọ bụ eziokwu. Mana, ihe kacha mkpa abụghị ihe anyị merela n’ozi Jehova, kama ọ bụ ihe anyị na-eme malite ugbu a gawa.”

12 O nwere ike ịbụ na i feela Jehova ọtụtụ afọ, ma, ọrịa anaghịzi ekwe gị mee ihe ndị ị na-emebu. Ọ bụrụ otú ahụ, adala mbà. Ka obi sie gị ike na Jehova ji ozi i ji obi gị niile jeere ya n’oge gara aga kpọrọ ihe. (Hib. 6:10) Ka ọ dị ugbu a, cheta na ihe e ji amata ma ànyị ji obi anyị niile hụ Jehova n’anya abụghị ọtụtụ ihe anyị mere n’ozi Jehova. Kama, ọ bụ inwe olileanya ma jiri ọṅụ na-ejere Jehova ozi, na ịna-eme ike anyị niile n’ozi ya. (Kọl. 3:23) Jehova ma ebe ike anyị ruru, ọ naghịkwa atụ anya ka anyị mee ihe anyị na-agaghị emeli.​—Mak 12:​43, 44.

Nwanna Anatoly Melnik na nwunye ya Lidiya nọgidere na-efe Jehova n’agbanyeghị ọtụtụ nsogbu bịaara ha (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13)

13. Gịnị mere Nwanna Anatoly Melnik na Lidiya nwunye ya, oleekwa otú ọ ga-esi nyere anyị aka ịna-efe Jehova ọ bụrụgodị na ọtụtụ nsogbu abịara anyị?

13 Nsogbu na-ekweghị akwụsị akwụsị bịara anyị. Ụfọdụ ndị ohu Jehova ediela ihe isi ike na mkpagbu ruo ọtụtụ afọ. Dị ka ihe atụ, chegodị gbasara Nwanna Anatoly Melnik. * Ọ dị naanị afọ iri na abụọ mgbe a nwụchiri papa ya, tụọ ya mkpọrọ. E mechakwara chụga ya Saịberịa, ebe dị ihe karịrị puku kilomita asaa ma e si Mọldova ebe ezinụlọ ya nọ gawa ya. Mgbe otu afọ gachara, a chụgakwara Anatoly, mama ya na nne na nna mama ya Saịberia. Ka oge na-aga, ha bidoro ịga ọmụmụ ihe n’obodo ọzọ. Ma, ha na-eji ụkwụ gaa kilomita iri atọ mgbe snoo na-ada. Ụdị oyi na-atụkwa n’ebe ahụ abụghị ihe e ji ọnụ ekwu. E mechakwara tụọ nwanna a mkpọrọ afọ atọ n’ebe dị anya n’ebe nwunye ya bụ́ Lidiya na nwa ha nwaanyị dị otu afọ nọ. N’agbanyeghị nsogbu niile a bịaara Nwanna Melnik na ezinụlọ ya, ha ji obi ha niile na-efe Jehova. Nwanna a dịzi iri afọ asatọ na abụọ, sorokwa na Kọmitii Alaka dị n’Ebe Etiti Eshia. Ka anyị mee ihe Nwanna Melnik na Lidiya nwunye ya mere, na-eme ihe niile anyị nwere ike ime n’ozi Jehova ma nọgide na-atachi obi otú anyị na-emebu.​—Gal. 6:9.

LEKWASỊ ANYA N’OLILEANYA I NWERE

14. Olee ihe Pọl chọpụtara na o kwesịrị ime iji nwee ike inweta ihe ọ chọrọ inweta?

14 Obi siri Pọl ike na ọ ga-agbaru ọsọ ndụ ahụ n’isi, nwetakwa ihe ọ chọrọ inweta. Ebe o so ná ndị e tere mmanụ, o nwere olileanya inweta “ihe a na-agbata n’ọsọ, bụ́ òkù a kpọrọ ịga eluigwe.” Ma, ọ chọpụtara na o kwesịrị ijisi ike na-agba ọsọ ahụ ma ọ bụrụ na ọ ga-enweta ihe ahụ ọ chọrọ inweta. (Fil. 3:14) Pọl meere ndị Filipaị ihe atụ dabara adaba iji nyere ha aka ilekwasị anya n’ihe ha chọrọ inweta.

15. Olee otú Pọl si jiri ihe gbasara ịbụ nwa amaala nyere Ndị Kraịst nọ na Filipaị aka ịnọgide ‘na-achụso’ ihe ha chọrọ inweta?

15 Pọl chetaara ndị Filipaị na ha ga-emecha gaa eluigwe. (Fil. 3:20) Olee ihe mere ha ji kwesị icheta ya? N’oge ahụ, ndị mmadụ chọsiri ike ịbụ ụmụ amaala Rom n’ihi na ọ ga-abara ha ọtụtụ uru. * Ma, ndị e tere mmanụ bụ ụmụ amaala nke ọchịchị karịrị nke ndị Rom. Uru ha ga-erite na ya enweghịkwa atụ. E nweghị ihe ịbụ nwa amaala Rom bụ ma e jiri ya tụnyere ịbụ nwa amaala Alaeze Chineke. Ọ bụ ya mere Pọl ji gbaa ndị Filipaị ume ka ha ‘na-akpa àgwà n’ụzọ kwesịrị ozi ọma banyere Kraịst.’ (Fil. 1:27) N’amaokwu a, okwu ahụ bụ́ ‘na-akpa àgwa’ pụtara ‘na-eme ka ụmụ amaala.’ Taa, Ndị Kraịst e tere mmanụ na-egosi anyị otú e si agbasi mbọ ike ka ha na-agbalịsi ike inweta ndụ ebighị ebi n’eluigwe.

16. Ma ànyị so ná ndị ga-ebi n’ụwa ma ọ bụ ndị ga-ebi n’eluigwe, olee ihe e kwuru na Ndị Filipaị 4:​6, 7 anyị kwesịrị ịna-eme?

16 Ma ànyị nwere olileanya ịdị ndụ ebighị ebi n’eluigwe ma ọ bụ ibi na paradaịs n’ụwa, anyị kwesịrị ịna-agbalịsi ike ka anyị nweta ihe ahụ anyị chọrọ inweta. N’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị, anyị ekwesịghị ịna-eche banyere ihe ndị mere n’oge gara aga ma ọ bụ kwe ka ihe ọ bụla mee ka anyị kwụsị ife Jehova. (Fil. 3:16) Ihe anyị na-atụ anya ya nwere ike ịdị ka ọ̀ na-egbu oge ma ọ bụ nká emee ka ike gwụwa anyị. O nwekwara ike ịbụ na anyị ediela mkpagbu na ihe isi ike ruo ọtụtụ afọ. Nke ọ bụla ọ bụ, ‘echegbula onwe gị banyere ihe ọ bụla.’ Kama, jiri ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike mee ka Chineke mara ihe ị na-arịọ. Ọ ga-enye gị udo nke karịrị ihe ọ bụla i nwere ike iche n’echiche.​—Gụọ Ndị Filipaị 4:​6, 7.

17. Gịnị ka anyị ga-atụle n’isiokwu na-esonụ?

17 Otú ahụ onye na-agba ọsọ si agbasi ọsọ ike ma o ruwe ebe ọ chọrọ ịgbaru, ka anyịnwa lekwasịkwa anya n’ihe mere anyị ji chọọ ịgbaru ọsọ ndụ ahụ n’isi. Ka anyị gbalịsie ike otú ike anyị hà ugbu a ọsọ a na-agwụzi agwụ ka anyị nweta ihe ọma ndị ahụ Chineke kwere nkwa imere anyị n’ọdịnihu. Oleekwanụ otú anyị ga-esi jiri ndidi na-agba ọsọ ndụ ahụ otú kwesịrị ekwesị? Isiokwu na-esonụ ga-enyere anyị aka ịma ihe anyị kwesịrị iwere ka ihe kacha mkpa ná ndụ na otú anyị ga-esi “chọpụta ihe ndị ka mkpa.”​—Fil. 1:​9, 10.

ABỤ NKE 79 Na-ezi Ha Ihe Ka Okwukwe Ha Sie Ike

^ par. 5 N’agbanyeghị afọ ole anyị ferela Jehova, anyị kwesịrị ịna-agbakwu mbọ ka anyị bụrụ Ndị Kraịst tozuru etozu. Pọl onyeozi gwara Ndị Kraịst ibe ya ka ha ghara ịda mbà. N’akwụkwọ ozi o degaara ndị Filipaị, o kwuru ihe ga-enyere anyị aka ịna-atachi obi n’ọsọ ndụ a anyị na-agba. N’isiokwu a, anyị ga-amụta otú anyị ga-esi na-eme ihe ahụ Pọl ji ike mmụọ nsọ dee.

^ par. 11 Gụọ akụkọ ndụ Nwanna Secord n’Ụlọ Nche Bekee nke June 15, 1965, peeji nke 380-382.

^ par. 13 Gụọ akụkọ ndụ Nwanna Melnik n’isiokwu bụ́ “A Kụziiri M Ịhụ Chineke n’Anya Site na Nwata,” nke gbara na Teta! nke November 8, 2004.

^ par. 15 Ebe ọ bụ ndị Rom na-achị Filipaị, ndị bi na ya na-erite ụfọdụ uru ụmụ amaala Rom na-erite. N’ihi ya, Ndị Kraịst nọ na Filipaị ghọtara ihe atụ ahụ Pọl meere ha.