Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 34

Otú Ị Ga-esi Na-enwe Obi Ụtọ ma Ozi Ị Na-eje Gbanwee

Otú Ị Ga-esi Na-enwe Obi Ụtọ ma Ozi Ị Na-eje Gbanwee

“Chineke abụghị onye ajọ omume ichefu ọrụ unu na ịhụnanya unu gosiri maka aha ya.”​—HIB. 6:10.

ABỤ NKE 38 Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-3. Olee ihe ụfọdụ nwere ike ime ka ozi ndị nọ n’ozi oge niile gbanwee?

OTU nwanna aha ya bụ Robert na nwunye ya Mary Jo sịrị: “Mgbe anyị jere ozi ala ọzọ afọ iri abụọ na otu, nká mere ka ahụ́ gharazie isi nne na nna anyị abụọ ike. Obi dị anyị ụtọ ịga na-elekọta ha. Ma, o wutere anyị na anyị hapụrụ ebe anyị nọ na-eje ozi na-atọgbu anyị atọgbu.”

2 Nwanna ọzọ aha ya bụ William na nwunye ya Terrie sịrị: “Mgbe anyị matara na ọrịa agaghịzi ekwe anyị laghachi n’ebe anyị na-eje ozi, anyị bere ákwá. Kemgbe ụwa, ijere Jehova ozi ná mba ọzọ gụsiri anyị agụụ ike. Ma, ozi ahụ esila otú ahụ kwụsị.”

3 Nwanna ọzọ aha ya bụ Aleksey kwuru, sị: “Anyị ma na ndị ọchịchị chọrọ imechi alaka ụlọ ọrụ m nọ na-eje ozi. Ma, o wutere anyị mgbe ha mechiri ya, anyị esi na Betel pụọ.”

4. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

4 E nwekwara ọtụtụ ndị na-ejebu ozi na Betel ma ọ bụ n’ebe ndị ọzọ ozi ha gbanwere. * O nwere ike isiri ụmụnna ndị ahụ ike ịhapụ ozi ha na-eje nke na-atọ ha ezigbo ụtọ. Olee ihe ga-enyere ha aka inwe obi ụtọ n’agbanyeghị na ozi ha gbanwere? Olee otú i nwere ike isi nyere ha aka? Azịza ajụjụ ndị a nwere ike ịbara anyị niile uru ma ihe gbanwee ná ndụ anyị.

IHE Ị GA-EME MA IHE GBANWEE

Gịnị mere o nwere ike iji na-esiri ndị ozi oge niile ike ịhapụ ozi ha na-eje? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 5) *

5. Gịnị na gịnị nwere ike ime ma ozi anyị na-eje gbanwee?

5 Ma ànyị na-eje ozi na Betel ma ọ bụ n’ebe ọzọ, anyị nwere ike ịhụ ndị nọ ebe ahụ n’anya, ịnọ ebe ahụ ana-atọkwa anyị ụtọ. E nwee ihe mere ka anyị si ebe ahụ pụọ, ọ ga na-ewute anyị. Ọ ga na-agụsi anyị agụụ ike ịhụ ụmụnna ndị anyị hapụrụ. Anyị ga na-echegbukwa onwe anyị banyere ha, karịchaa ma ọ bụrụ na ihe mere anyị ji si ebe ahụ pụọ bụ na a na-akpagbu ụmụnna anyị. (Mat. 10:23; 2 Kọr. 11:​28, 29) Ihe ọzọ bụ na o nwere ike isiri anyị ike ịga jewe ozi n’ebe ọzọ n’ihi na ọ pụtara ịga mụwa otú ndị obodo ahụ si eme ihe. O nwedịrị ike ịdị anyị otú ahụ ma ọ bụrụ obodo anyị ka anyị laghachiri. Nwanna Robert na nwunye ya Mary Jo kwuru, sị: “Otú ndị obodo anyị si eme ihe edoghịzi anyị anya, ma iji asụsụ anyị zie ozi ọma. Ọ dịzi ka ànyị bụ ndị mbịarambịa n’obodo anyị.” Ụfọdụ ndị ozi ha na-eje gbanwere nwere ike ịchọpụta na ọ dị mkpa ka ha mefuwe ego n’ihe ndị ha na-anaghị emefubu ego na ha. Ụjọ nwere ike ịna-atụ ha, ha achịrị obi n’aka. Ha agaghị ama ihe ha ga-eme eme. Olee ihe ga-enyere ha aka?

Ọ dị mkpa ka anyị bịaruo Jehova nso ma na-atụkwasị ya obi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6-7) *

6. Olee otú anyị nwere ike isi nọrọ Jehova nso?

6 Nọrọ Jehova nso. (Jems 4:8) Olee otú anyị nwere ike isi mee ya? Ọ bụ ịtụkwasị ya obi n’ihi na ọ bụ “Onye na-anụ ekpere.” (Ọma 65:2) Abụ Ọma 62:8 kwuru, sị: “Wụpụnụ obi unu n’ihu ya dị ka mmiri.” Jehova nwere ike imere anyị ihe mmaji kwuru mmaji “karịa ihe niile anyị na-arịọ ma ọ bụ na-eche n’echiche.” (Efe. 3:20) Ọ naghị emere anyị naanị ihe anyị rịọrọ ya. O nwere ike ime ihe anyị na-atụghị anya ya, ihe karịrị ihe anyị nwere ike iche n’echiche, iji gbooro anyị mkpa anyị.

7. (a) Olee ihe ga-enyere anyị aka ịnọ Jehova nso? (b) Dị ka e kwuru ná Ndị Hibru 6:​10-12, olee uru anyị ga-erite ma anyị jiri obi anyị niile na-ejere Jehova ozi?

7 Ị chọọ ịnọ Jehova nso, na-agụ Baịbụl kwa ụbọchị ma na-echebara ihe ị gụrụ echiche. Otu nwanna bụ́bu onye ozi ala ọzọ sịrị: “Na-enwe ofufe ezinụlọ kwa izu, na-akwadebekwa ọmụmụ ihe, otú ahụ i si emebu.” Akwụsịkwala ịna-eme ike gị niile n’ozi ọma n’ọgbakọ ọhụrụ gị. Jehova na-echeta ndị ji obi ha niile na-ejere ya ozi, ọ bụrụgodị na ha agaghịzi emeli ihe ha na-emebu.​—Gụọ Ndị Hibru 6:​10-12.

8. Olee otú ihe e kwuru na 1 Jọn 2:​15-17 nwere ike isi nyere gị aka ka ị ghara ịna-ebi ndụ okomoko?

8 Ebila ndụ okomoko. Ekwela ka nchegbu nke ụwa Ekwensu a mee ka ị kwụsị ịna-efe Chineke. (Mat. 13:22) Ekwela ka ụwa a, ndị enyi gị ma ọ bụ ndị ikwu gị ndị chọrọ ka ihe gaziere gị mee ka i chewe na ịchụ akụnụba ọnwụ ọnwụ ga-eme ka ndụ gị ka mma n’ụwa ochie a. (Gụọ 1 Jọn 2:​15-17.) Tụkwasị Jehova obi. O kwere nkwa na ọ ga-enyere gị aka ka okwukwe gị sie ike, mee ka ahụ́ ruo gị ala, nyekwa gị ihe ọ bụla dị gị mkpa “n’oge kwesịrị ekwesị.”​—Hib. 4:16; 13:​5, 6.

9. Dị ka e kwuru n’Ilu 22:​3, 7, gịnị mere o ji dị mkpa ka anyị ghara ikoro ụgwọ na-enweghị isi na ọdụ, oleekwa ihe nwere ike inyere anyị aka ikpebi ihe dị mma?

9 Agala koro ụgwọ na-enweghị isi na ọdụ. (Gụọ Ilu 22:​3, 7.) Ịkwaga ebe ọzọ nwere ike ifu ezigbo ego. Iji ụgwọ anaghị ara ahụ́. N’ihi ya, agbazirila ego gaa zụọ ihe na-adịghị gị mkpa n’eziokwu. Mgbe ihe siri ike, dị ka, mgbe anyị na-elekọta onye ezinụlọ anyị ahụ́ na-adịghị, o nwere ike isiri anyị ike ikpebi ego ole anyị ga-agbaziri. Ya dị otú ahụ, cheta na “ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike” nwere ike inyere gị aka ikpebi ihe ga-adị mma. Otú Jehova nwere ike isi zaa gị ekpere ahụ bụ ime ka i nwee udo nke ‘ga-eche obi gị na ike iche echiche gị nche,’ mee ka i wetuo obi kpebie ihe dị mma ị ga-eme.​—Fil. 4:​6, 7; 1 Pita 5:7.

10. Olee otú anyị nwere ike isi meta ndị enyi ọhụrụ?

10 Nwee ezigbo ndị enyi. Na-akọrọ ezigbo ndị enyi gị otú obi dị gị na ihe ndị siiri gị ike, karịchaa ndị ụdị ihe ndị ahụ metụrụla. I mee otú ahụ, obi nwere ike ịna-adị gị mma. (Ekli. 4:​9, 10) Gị na ndị enyi gị n’ebe ị na-ejebu ozi ka ga-abụkwa enyi. N’ebe ị na-eje ozi ugbu a, gbalịa meta ndị enyi ọhụrụ. Cheta na ị chọọ imeta enyi, ị ga na-akpa àgwà ka enyi. Olee otú ị ga-esi emeta ndị enyi ọhụrụ? Na-akọrọ ndị ọzọ ihe ọma ndị mere n’ozi i jeere Jehova ka ha nwee ike ịhụ na ozi Jehova na-atọ gị ezigbo ụtọ. Ọ bụrụgodị na ụfọdụ ndị n’ọgbakọ aghọtaghị ihe mere ozi oge niile ji enu gị enu, e nwere ike inwe ndị ga-achọ ka ị gwakwuo ha gbasara ya, ha abụrụkwa ezigbo ndị enyi gị. Ma, cheta na i kwesịghị ịna-ekwu ọtụtụ okwu gbasara ihe ndị i mere n’ozi Jehova ma ọ bụ gbasara ihe ndị were gị iwe.

11. Olee otú i nwere ike isi mee ka gị na di gị ma ọ bụ nwunye gị na-enwe obi ụtọ?

11 Ọ bụrụ na ọ bụ ọrịa di gị ma ọ bụ nwunye gị mere ka ị hapụ ozi ị na-ejebu, atala ya ụta. Ọ bụrụkwanụ na ọ bụ maka na ị na-arịa ọrịa, ekwela ka obi na-ama gị ikpe, gị echewe na i mechuola di gị ma ọ bụ nwunye gị ihu. Cheta na unu abụọ bụ “otu anụ ahụ́,” nakwa na mgbe unu lụrụ, unu kwere Jehova nkwa na unu ga na-elekọta ibe unu ihe ọ sọkwara ya mee. (Mat. 19:​5, 6) Ọ bụrụ na ihe mere i ji kwụsị ozi ị na-ejebu bụ n’ihi afọ ime unu na-atụghị anya ya, gbaa mbọ ka nwa ahụ unu mụtara mara na i ji ya kpọrọ ihe karịa ozi ahụ ị na-ejebu. Na-agwa nwa gị ugboro ugboro na i weere ya ka “ụgwọ ọrụ” si n’aka Chineke. (Ọma 127:​3-5) Ma, echefula ịkọrọ ya ihe ọma ndị meere gị n’oge ahụ ị na-ejebu ozi ahụ. I mee otú ahụ, o nwere ike ime ka nwa gị jeere Jehova ozi oge niile otú ahụ i mere.

OTÚ NDỊ ỌZỌ NWERE IKE ISI NYE AKA

12. (a) Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị nọ n’ozi oge niile aka ịnọgide n’ozi ha? (b) Olee otú anyị nwere ike isi mee ka obi na-adị ha ụtọ n’ebe ha gafetara?

12 Obi dị anyị ụtọ na ọtụtụ ọgbakọ na ọtụtụ ụmụnna na-eme ike ha niile inyere ndị ozi oge niile aka ịnọsi ike n’ozi ha. Otú ha si eme ya bụ ịna-agba ha ume ka ha ghara ịkwụsị ozi ha, ịna-achọtụrụ ha ego ma ọ bụ ihe ndị ọzọ, ma ọ bụkwanụ inyere ha aka na-elekọta ndị ezinụlọ ha nọ n’ụlọ. (Gal. 6:2) E nwee ndị ozi oge niile ozi ha na-eje gbanwere, ha agafeta n’ọgbakọ unu, echela na ọ pụtara na ha anaghị arụ ọrụ ha nke ọma ma ọ bụ na e ji ya dọọ ha aka ná ntị. * Kama, nyere ha aka ka ahụ́ ruo ha ala n’ebe a ha gafetara. Jiri obi gị niile nabata ha. Na-ajakwa ha mma maka ọrụ ha rụrụla, ọ bụrụgodị na ọrịa ekweghịzi ha mee ihe ha na-emebu. Gbalịa mata ha nke ọma. Mụta ihe n’ihe ndị ha ma eme, n’ọzụzụ ndị e nyere ha, nakwa n’ihe ndị ha hụrụ ná ndụ.

13. Olee otú anyị nwere ike isi nyere ndị ozi ha gbanwere aka?

13 Ná mmalite, o nwere ike ịdị mkpa ka i nyere ụmụnna ndị a aka ịchọta ụlọ, ọrụ, inyere ha aka n’ihe gbasara ịgba ụgbọala, na ihe ndị ọzọ dị ha mkpa. O nwekwara ike ịdị mkpa ka i nyere ha aka ịmata gbasara ihe ndị a na-eme kwa ụbọchị, dị ka ịma ebe ahịa, ụlọ akụ̀, ụlọ ọgwụ ma ọ bụ ihe ndị ọzọ dị. Kama naanị imetere ha ebere, ihe kacha mkpa bụ ịghọta otú ihe si dịrị ha ma nyere ha aka. O nwere ike ịbụ na ha na ọrịa na-alụ ma ọ bụ na e nwere onye ezinụlọ ha ahụ́ na-adịghị ma ọ bụkwanụ na ha na-eru uju onye nwụnahụrụ ha. * Ọ bụrụgodị na ha ekwupụtaghị ya, o nwere ike ịna-ewute ha na ha hapụrụ ụmụnna ndị ha na ha dị ná mma n’ebe ha jeburu ozi. N’eziokwu, ọ na-ewe ezigbo oge tupu ụdị echiche ahụ apụchaa mmadụ n’obi.

14. Olee otú ụmụnna nọ n’ọgbakọ si nyere otu nwanna nwaanyị aka ịna-enwe obi ụtọ n’ebe ọhụrụ ọ na-eje ozi?

14 Obi ga na-adị ha ụtọ n’ebe a ha gafetara ma ọ bụrụ na ị na-akwado ha, na-emekwa ihe ga na-agba ha ume. Otu nwanna nwaanyị nke jere ozi ọtụtụ afọ ná mba ọzọ kwuru, sị: “N’ebe m na-ejebu ozi, m na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl kwa ụbọchị. Ma, mgbe m bịara ebe a, o siiri m ike ịhụ onye m ga-agụrụ amaokwu Baịbụl ma ọ bụ onye m ga-egosi vidio n’ozi ọma. Ma, ndị nkwusa nọ n’ọgbakọ anyị gwara m ka m soro ha gaa nletaghachi ha, sorokwa ha mụọrọ ndị mmadụ Baịbụl. Ụmụnna ndị ahụ na-anụ ọkụ n’obi ma nwee obi ike. Mgbe m hụrụ ka ha na-amụrụ ndị mmadụ Baịbụl, ndị ahụ ana-eme nke ọma, o mere ka obi sie m ike na ebe a ga-emecha tọwa m ụtọ. M mụtara otú e si ebido izi mmadụ ozi ọma n’ebe ọhụrụ a. Ihe ndị a nyeere m aka inwewekwa obi ụtọ.”

AKWỤSỊLA IME IKE GỊ NIILE

Chọọ otú ị ga-esi wepụtakwuo oge jeere Jehova ozi n’ebe i bi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 15-16) *

15. Olee otú i nwere ike isi na-eme nke ọma n’ebe ọhụrụ ị na-eje ozi ugbu a?

15 Ị ga-emeli nke ọma n’ebe ọhụrụ ị na-eje ozi ugbu a. Echela na ozi ị na-eje gbanwee, ọ pụtara na mbọ niile ị gbara n’ozi gị kụrụ afọ n’ala ma ọ bụ na ị laala azụ. Chee banyere ihe gosiri na Jehova na-enyere gị aka. Na-ekwusasikwa ozi ọma ike. Mee ihe Ndị Kraịst kwesịrị ntụkwasị obi mere n’oge ndịozi Jizọs. N’ebe ọ bụla ha nọ, ha “gazuru ala ahụ na-ezisa ozi ọma banyere okwu Chineke.” (Ọrụ 8:​1, 4) Mbọ ị na-agba ikwusa ozi ọma nwere ike ịba ezigbo uru. Dị ka ihe atụ, ndị ọsụ ụzọ a gbaara ụgbọ nwa mkpi n’otu obodo kwagara n’obodo dị nso, ma chọpụta na e nwere ọtụtụ ndị ha ga-eji asụsụ ha ma zie ozi ọma n’ebe ahụ. N’ime ọnwa ole na ole, ọtụtụ ndị bidoro iso ìgwè dị iche iche na-abụbeghị ọgbakọ na-amụ ihe n’asụsụ ahụ.

16. Olee otú i nwere ike isi na-enwe obi ụtọ n’ozi ị na-eje ugbu a?

16 ‘Ọṅụ Jehova bụ ebe gị e wusiri ike,’ ma ọ bụ ike gị. (Nehe. 8:10) Ihe kwesịrị ịkacha na-eme anyị obi ụtọ bụ adịm ná mma anyị na Jehova, ọ bụghị ụdị ozi anyị na-eje, otú ọ sọkwara ya na-atọ anyị ụtọ. N’ihi ya, akwụsịla iso Jehova na-eje ije. Na-arịọ ya ka o mee ka i nwee amamihe ma na-eduzi gị, na-akwadokwa gị. Cheta na ihe mere ozi ị na-ejebu ji na-atọ gị ụtọ bụ na i ji obi gị niile na-agbalịsi ike inyere ndị nọ ebe ahụ aka. Jirikwa obi gị niile na-arụ ihe ị na-arụ ugbu a ma hụ otú Jehova ga-esi mee ka ọ tọwa gị ụtọ.​—Ekli. 7:10.

17. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-echeta gbasara ozi anyị na-eje ugbu a?

17 Ka anyị na-echeta na anyị ga-efe Jehova ruo mgbe ebighị ebi. Ma, ihe anyị na-arụ nwere ike ịgbanwe mgbe ọ bụla. N’ụwa ọhụrụ, e nwere ike ịgbanwere anyị ọrụ. Nwanna Aleksey e kwuru okwu ya ná mbido kwuru na otú ozi ya si gbanwee ugbu a na-enyere ya aka ịkwadebe maka ọdịnihu. Ọ sịrị: “Amabu m kemgbe na Jehova dị adị nakwa na ụwa ọhụrụ ya ga-abịa. Ma, ọ bụ ugbu a ka obi siri m ike na mụ na Jehova dị n’ezigbo mma nakwa na ụwa ọhụrụ dị ezigbo nso.” (Ọrụ 2:25) N’agbanyeghị ụdị ozi anyị na-eje ugbu a, ka anyị soro Jehova na-eje ije. Ọ gaghị ahapụ anyị. Kama, ọ ga-enyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ n’ozi ọ bụla anyị na-ejere ya, ihe ọ sọkwara ya bụrụ.​—Aịza. 41:13.

ABỤ NKE 90 Ka Anyị Na-agbarịta Ibe Anyị Ume

^ par. 5 Mgbe ụfọdụ, otu ihe ma ọ bụ ihe ọzọ nwere ike mee ka ụmụnna anyị ndị nọ n’ozi oge niile kwụsị ozi ha. E nwekwara ike gbanweere ha ọrụ. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya ná nsogbu ndị ha na-enwe na ihe ga-enyere ha aka ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị ihe gbanwerenụ. Anyị ga-elebakwa anya n’otú ụmụnna ndị ọzọ nwere ike isi na-agba ha ume ma na-akwado ha, nakwa otú ihe Baịbụl kwuru ga-esi nyere anyị niile aka ma ihe gbanwee ná ndụ anyị.

^ par. 4 Ụdị ihe ahụ nwekwara ike ime ụmụnna ndị e nyere ọrụ n’ọgbakọ. E nwere afọ ole ha ga-eru, ha enyefezie ụmụnna ndị na-akatabeghị ahụ́ ọrụ ndị ha na-arụbu. Gụọ isiokwu bụ́ “Ndị Kraịst Merela Agadi, Jehova Ji Ozi Unu Na-ejere Ya Kpọrọ Ihe,” nke gbara n’Ụlọ Nche Septemba 2018, nakwa isiokwu bụ́ “Ka Obi Na-eru Gị Ala n’Agbanyeghị Otú Ihe Nwere Ike Isi Gbanwee ná Ndụ Gị,” nke gbara n’Ụlọ Nche Ọktoba 2018.

^ par. 12 Ndị okenye ọgbakọ ha nọbu kwesịrị idegara ọgbakọ ha nọ ugbu a akwụkwọ ozi ha ga-eji kọwaa ha ozugbo ka a ghara igbuwe oge tupu a họpụta ha ịbụ ọsụ ụzọ, okenye, ma ọ bụ ohu na-eje ozi n’ọgbakọ ọhụrụ ha.

^ par. 13 Gụọ isiokwu bụ́ “Ihe Ga-enyere Ndị Na-eru Uju Aka,” nke gbara na Teta! Nke 3, n’afọ 2018.

^ par. 57 NKỌWA FOTO: Ebe di na nwunye bụ́ ndị ozi ala ọzọ ji anya mmiri na-asị ndị ọgbakọ ha ka e mesịa.

^ par. 59 NKỌWA FOTO: Mgbe ha laghachiri n’obodo ha, ha ana-arịọsi Jehova ike ka o nyere ha aka idi nsogbu ndị na-abịara ha.

^ par. 61 NKỌWA FOTO: Jehova nyeere ha aka ha amaliteghachi ozi oge niile. Ha ji asụsụ ha mụtara mgbe ha nọ n’ozi ala ọzọ na-ezi ndị mbịarambịa ozi ọma n’ebe ọgbakọ ọhụrụ ha na-ekwusa ozi ọma.