Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Jọn Onye Na-eme Baptizim Na-akụziri Anyị Otú Anyị Ga-esi Na-enwe Obi Ụtọ

Jọn Onye Na-eme Baptizim Na-akụziri Anyị Otú Anyị Ga-esi Na-enwe Obi Ụtọ

È NWERE ọrụ ị chọrọ ka e nye gị n’ọgbakọ ma e nyebeghị gị ya? O nwere ike ịbụ na nwanna ọzọ na-arụ ọrụ ahụ, ma ọ bụkwanụ na e nwere ụdị ozi oge niile pụrụ iche ị na-ejebu, nke ka na-agụsi agụụ ike. Ma, afọ ndụ gị, ọrịa, ụkọ ego, ma ọ bụ ibu ezinụlọ nwere ike ime ka ị ghara imeli ihe ụfọdụ. Ma eleghị anya, ihe ndị a gbanwere ná nzukọ Jehova emeela ka ị kwụsị ịrụ ọrụ ị nọ na-arụ kemgbe ọtụtụ afọ. N’agbanyeghị ihe kpatara ya, o nwere ike ịdị gị ka ị naghị emecha ihe niile ị chọrọ ịna-eme n’ozi Chineke. Ụdị ihe ahụ mee, o doro anya na o nwere ike ịna-ewute gị mgbe ụfọdụ. Ma, olee ihe ị ga-eme ka iwe na ọnụma ghara iju gị obi, obi agharakwa ịda gị mbà? Olee otú i nwere ike isi na-enwe obi ụtọ?

Anyị nwere ike ịmụta ihe bara uru ga-enyere anyị aka ịna-enwe obi ụtọ n’aka Jọn Onye Na-eme Baptizim. Jọn mere ọtụtụ ihe n’ozi Chineke. Ma, o nwere ike ịbụ na ihe ụfọdụ mere ná ndụ ya abụghị ihe ọ tụrụ anya ha. Ikekwe, e nweghị mgbe o chere na oge ọ ga-anọ n’ụlọ mkpọrọ ga-akarị oge ọ ga-eji kwusaa ozi ọma. N’agbanyeghị ihe ndị a, ọ kwụsịghị inwe obi ụtọ. Ọ nọkwa na-enwe obi ụtọ ruo mgbe ọ nwụrụ. Gịnị nyeere ya aka? Olee otú anyị nwere ike isi na-enwe obi ụtọ ọ bụrụgodị na ihe merenụ bụ ihe anyị na-atụghị anya ya?

ỌRỤ MERE JỌN OBI ỤTỌ

N’ihe dị ka n’ọnwa Eprel afọ 29, Jọn bidoro ọrụ Chineke nyere ya, ya bụ, ime ka ndị Juu dịrị njikere maka ọbịbịa Mesaya. Ọ sịrị: “Chegharịanụ, n’ihi na alaeze eluigwe eruwo nso.” (Mat. 3:2; Luk 1:​12-17) Ọtụtụ ndị gere ya ntị. N’eziokwu, ìgwè mmadụ na-esi ebe dị iche iche abịa ịnụrụ ihe ọ na-ekwu, ọtụtụ n’ime ha echegharịa, e meekwa ha baptizim. Jọn ji obi ike dọọ ndị ndú okpukpe bụ́ ndị ezi omume n’anya onwe ha aka ná ntị maka ikpe Chineke ga-ekpe ha ma ọ bụrụ na ha echegharịghị. (Mat. 3:​5-12) Ọrụ kacha mkpa Jọn rụrụ bụ baptizim o mere Jizọs n’ihe dị ka n’ọnwa Ọktoba afọ 29. Malite mgbe ahụ, Jọn nọzi na-agwa ndị ọzọ ka ha soro Jizọs, bụ́ Mesaya Chineke kwere ná nkwa.​—⁠Jọn 1:​32-37.

N’ihi ọrụ pụrụ iche Jọn rụrụ, Jizọs kwuru, sị: “N’etiti ndị ụmụ nwaanyị mụrụ, ọ dịbeghị onye e mere ka o bilie nke ka Jọn Onye Na-eme Baptizim ukwuu.” (Mat. 11:11) O doro anya na Jọn ṅụrịrị ọṅụ maka ihe ọma niile Jehova meere ya. Taa, Chineke emeerela anyị ọtụtụ ihe ọma otú ahụ o meere Jọn. Dị ka ihe atụ, chegodị banyere Nwanna Terry na Sandra nwunye ya. Ha ejeela ozi oge niile ihe karịrị afọ iri ise. Terry kwuru, sị: “Ejeela m ozi dị iche iche n’ọgbakọ Jehova. Asụọla m ụzọ oge niile, jee ozi na Betel, sụọ ụzọ pụrụ iche, bụrụ onye nlekọta sekit na onye nlekọta distrikti. Ugbu a, alaghachila m n’ọsụ ụzọ pụrụ iche.” Obi na-adị anyị ụtọ ma e nye anyị ọrụ ná nzukọ Jehova. Ma, dị ka anyị ga-amụta n’ihe mere Jọn, ọ naghị adị mfe ịna-enwe obi ụtọ ma ozi anyị gbanwee.

NA-EKELE JEHOVA MAKA ỌRỤ O NYERE GỊ

Ihe mere ka Jọn Onye Na-eme Baptizim jiri ọṅụ jeere Jehova ozi bụ na o nweghị mgbe ọ kwụsịrị ikele ya maka ọrụ o nyere ya. Dị ka ihe atụ, mgbe Jọn mechara Jizọs baptizim, ndị na-eso ụzọ ya malitere ibelata, ma ndị na-eso ụzọ Jizọs ana-ebukwu ibu. Ihe a wutere ndị na-eso ụzọ Jọn, ha agwa ya gbasara Jizọs, sị: “Lee, ọ na-eme baptizim, mmadụ niile na-agakwurukwa ya.” (Jọn 3:26) Jọn zara ha, sị: “Onye nwe nwaanyị a na-alụ ọhụrụ bụ nwoke na-alụ ya. Otú ọ dị, mgbe enyi nke nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ guzo ọtọ wee nụ olu ya, ọ na-enwe oké ọṅụ n’ihi olu nwoke ahụ nke na-alụ nwaanyị ọhụrụ. Ya mere, e mewo ka ọṅụ a m nwere zuo ezu.” (Jọn 3:29) O nweghị mgbe Jọn mawara Jizọs aka. O cheghịkwa na ọrụ ya abaghịzi uru maka na Jizọs na-arụ ọrụ ka nke ya mkpa. Kama ichewe otú ahụ, Jọn nwere obi ụtọ n’ihi na o ji ọrụ Chineke nyere ya kpọrọ ihe, nke bụ́ ịbụ ‘enyi nwoke ahụ na-alụ nwaanyị ọhụrụ.’

Otú Jọn si ele ihe anya nyeere ya aka inwe obi ụtọ n’agbanyeghị na ọrụ ya adịghị mfe. Dị ka ihe atụ, Jọn si n’afọ nne ya bụrụ onye Naziraịt. N’ihi ya, ọ gaghị aṅụ mmanya. (Luk 1:15) Mgbe Jizọs na-ekwu gbasara ụdị ndụ Jọn na-ebi, ọ sịrị: “Jọn bịara, ọ naghị eri ihe, ọ naghịkwa aṅụ ihe ọṅụṅụ.” Ma a gwaghị Jizọs na ndị na-eso ụzọ ya ka ha sọwa ihe ndị ahụ Jọn na-asọ. Ha biri ndụ otú ndị ọzọ si ebi. (Mat. 11:​18, 19) Ihe ọzọ bụ na n’agbanyeghị na Jọn arụghị ọrụ ebube ọ bụla, ọ ma na e nyere ndị na-eso ụzọ Jizọs ike ịrụ ọrụ ebube, ma ụfọdụ ndị bụ́bu ndị na-eso ụzọ Jọn. (Mat. 10:1; Jọn 10:41) Kama ichegbuwe onwe ya na ndị na-eso ụzọ ya anaghị emeli ihe ndị na-eso ụzọ Jizọs na-eme, Jọn ji obi ya niile na-arụ ọrụ Chineke nyere ya.

Ọ bụrụ na anyịnwa ejiri ọrụ Jehova nyere anyị ugbu a kpọrọ ihe, anyị ga na-enwe ọṅụ. Nwanna Terry anyị kwuburu okwu ya sịrị: “M tinyere uche m n’ọrụ ọ bụla e nyere m.” Ọ na-abụ o chee gbasara ozi oge niile o jere, ya asị: “Anaghị m akwa mmakwaara. Ọnụ na-abụ m ọchị ọchị ma m cheta ya.”

Anyị ga na-enwekwu obi ụtọ n’ozi Chineke ma ọ bụrụ na anyị ana-eche gbasara ihe mere ozi ọ bụla anyị na-ejere Jehova ji baa ezigbo uru. Ọ bụ maka na ‘anyị na Chineke na-arụkọ ọrụ.’ (1 Kọr. 3:⁠9) Mmadụ nwee ihe dara oké ọnụ ma na-elekọta ya nke ọma, ihe ahụ ga na-ama mma mgbe niile. Otú ahụkwa ka anyị ga na-enwe obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị ana-eche gbasara ụdị ihe ọma Chineke meere anyị kwe ka anyị na ya na-arụkọ ọrụ. Anyị agaghị eji mbọ anyị na-agba na-atụnyere nke ndị ọzọ. Anyị agaghị echewe na ọrụ Jehova nyere anyị abachaghị uru ka nke o nyere ndị ọzọ.​—⁠Gal. 6:⁠4.

LEKWASỊ ANYA N’OZI Ị NA-EJERE JEHOVA

Ọ ga-abụ na Jọn ma na ọ gaghị arụte ọrụ ya aka. Ma, o nwere ike ọ maghị na ọ ga-akwụsị na mberede nke otú ahụ. (Jọn 3:30) N’afọ 30, ihe dị ka ọnwa isii o mechara Jizọs baptizim, Eze Herọd tụrụ ya mkpọrọ. Ma, Jọn ka nọkwa na-akụzi eziokwu. (Mak 6:​17-20) Olee ihe ga-enyere ya aka ịna-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị na egwú adagharịala? Ọ bụ ilekwasị anya n’ozi ọ na-ejere Chineke.

Jọn nọ n’ụlọ mkpọrọ nụ na ozi Jizọs na-agbasakwu. (Mat. 11:2; Luk 7:18) O kwetasiri ike na Jizọs bụ Mesaya. Ma, o nwere ike ịna-eche otú Jizọs ga-esi mezuo ihe niile Akwụkwọ Nsọ kwuru na Mesaya ga-eme. O nwere ike ịna-ajụ onwe ya, sị: ‘Ebe ọ bụ na Mesaya ga-abụ eze, Jizọs ọ̀ ga-ebido ọchịchị ya n’oge na-adịghị anya? Ọ̀ ga-eme ka a kpọpụta m n’ụlọ mkpọrọ?’ Ọ chọrọ ịghọtakwu ihe Jizọs ga-arụ. N’ihi ya, o zigara ndị na-eso ụzọ ya abụọ ka ha gaa jụọ Jizọs, sị: “Ọ̀ bụ gị bụ Onye ahụ nke Na-abịa, ka ànyị ga-atụwa anya onye ọzọ?” (Luk 7:19) Mgbe ha lọtara, ọ ga-abụrịrị na Jọn gere ntị nke ọma ka ha na-akọrọ ya otú Jizọs si rụọ ọrụ ebube gwọọ ndị mmadụ. Jizọs sịrị ha gwa Jọn na “ndị ìsì na-ahụ ụzọ, ndị ngwọrọ na-eje ije, a na-eme ka ndị ekpenta dị ọcha, ndị ntị chiri na-anụkwa ihe, a na-akpọlitekwa ndị nwụrụ anwụ, a na-ezikwa ndị ogbenye ozi ọma.”​—⁠Luk 7:​20-22.

O doro anya na ihe ha kọrọ gbara Jọn ume. O mere ka obi sie ya ike na Jizọs na-emezu amụma ndị e buru gbasara Mesaya. Jọn ma na ozi o jere abụghị n’efu ọ bụ eziokwu na Jizọs agaghị eme ka a kpọpụta ya n’ụlọ mkpọrọ. E nwere ezigbo ihe mere Jọn ga-eji na-enwe obi ụtọ n’agbanyeghị ihe e mere ya.

Ọ bụrụ na anyị ana-eche gbasara ihe ọma a na-akọ banyere ozi ọma a na-ekwusa n’ụwa niile, o nwere ike inyere anyị aka ịna-enwe ọṅụ

Ọ bụrụ na anyị elekwasị anya n’ozi anyị na-ejere Chineke otú ahụ Jọn mere, anyị ga-enwe ike iji ọṅụ na ndidi na-atachi obi. (Kọl. 1:​9-11) Otú anyị ga-esi eme ya bụ ịna-agụ Baịbụl ma na-echebara ihe anyị gụrụ echiche. Ọ ga-eme ka anyị na-echeta na ọrụ anyị na-arụrụ Chineke abụghị ịkwọ aka tiere ọkụkọ akị. (1 Kọr. 15:58) Otu nwanna nwaanyị aha ya bụ Sandra sịrị: “Ịgụ otu isiakwụkwọ na Baịbụl kwa ụbọchị enyerela m aka ịbịarukwu Jehova nso. O meela ka m lekwasị ya anya, kama ịna-eche gbasara onwe m.” Ihe ọzọ anyị nwere ike ịna-eche banyere ya bụ akụkọ gbasara ọrụ Alaeze Chineke. Ọ ga-eme ka anyị ghara ịna-eche naanị gbasara otú ihe si dịrị anyị, kama anyị ga na-echekwa gbasara ihe Jehova na-eme. Sandra sịrị: “Ihe Omume Tiivi Ndịàmà Jehova nke a na-ewepụta kwa ọnwa na-enyere anyị aka ịbịarukwu nzukọ Jehova nso. Ọ na-emekwa ka anyị jiri obi ụtọ na-eje ozi anyị.”

Jọn Onye Na-eme Baptizim ji “mmụọ na ike Ịlaịja” kwusaa ozi ọma n’obere oge ahụ o jere ozi ya. Ọ bụkwa mmadụ ibe anyị otú ahụ Ịlaịja bụ. (Luk 1:17; Jems 5:17) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ka ya, na-ekele Chineke maka ihe ndị o meere anyị ma lekwasị anya n’ozi anyị na-ejere ya, anyị ga-ejili obi ụtọ na-ejere ya ozi ihe ọ sọkwara ya mee.