Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ NKE 32

Ka Ịhụnanya Unu Na-abakwu Ụba

Ka Ịhụnanya Unu Na-abakwu Ụba

“Ihe m na-ekpe n’ekpere bụ ka ịhụnanya unu na-abawanye ụba, ka unu nweekwa ezi ihe ọmụma na nghọta zuru ezu.”​—FIL. 1:9.

ABỤ NKE 106 Ka Anyị Mụta Ịhụnanya

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Ole ndị nyere aka hiwe ọgbakọ na Filipaị?

MGBE Pọl onyeozi, Saịlas, Luk, na Timoti rutere Filipaị bụ́ ebe ndị Rom na-achị, ha hụrụ ọtụtụ ndị chọrọ ịmatakwu gbasara Alaeze Chineke. Ha anọ nyere aka hiwe ọgbakọ n’ebe ahụ. Ndị niile na-eso ụzọ malitere izukọta ọnụ na-amụ ihe, ikekwe, n’ụlọ otu nwanna nwaanyị na-ele ọbịa nke ọma aha ya bụ Lidia.​—Ọrụ 16:40.

2. Olee nsogbu bịaara ọgbakọ ọhụrụ ahụ?

2 Ma o teghị aka, nsogbu abịara ọgbakọ ọhụrụ a. Ekwensu mere ka ndị iro malite ịkpagbu Pọl na ndị ọzọ n’ihi ozi ọma ha na-ekwusa. A nwụchiri Pọl na Saịlas, pịa ha ụtarị, tụọkwa ha mkpọrọ. Mgbe a tọhapụrụ ha, ha gara leta ụmụnna ndị ahụ ma gbaa ha ume. Mgbe e mechara, Pọl, Saịlas, na Timoti si n’obodo ahụ pụwa. Ma, ọ ga-abụ na Luk nọọrọ ebe ahụ. Olee ihe ọgbakọ ọhụrụ a ga-emezi? Jehova ji mmụọ nsọ ya nyere ha aka, ha anọgide na-efe ya. (Fil. 2:12) Ihe a mere ka Pọl jiri ha na-eme ọnụ.

3. Olee ihe ndị Pọl kpere ekpere gbasara ha ná Ndị Filipaị 1:​9-11?

3 Mgbe ihe dị ka afọ iri gachara, Pọl degaara ọgbakọ ahụ dị na Filipaị akwụkwọ ozi. Ka ị na-agụ akwụkwọ ozi ahụ, ọ ga-adịrị gị mfe ịchọpụta na Pọl hụrụ ụmụnna ndị ahụ n’anya. O dere, sị: ‘Agụụ unu na-agụsi m ike n’ụdị obi ọmịiko ahụ Kraịst Jizọs nwere.’ (Fil. 1:8) Ọ gwakwara ha na ọ na-ekpe ekpere maka ha. Ọ rịọrọ Jehova ka o nyere ha aka ka ịhụnanya ha na-abakwu ụba, ka ha chọpụta ihe ndị ka mkpa, ka ha bụrụ ndị na-enweghị ntụpọ, ka ha ghara ịna-eme ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ, nakwa ka ha jupụta ná mkpụrụ ezi omume. O doro anya na anyịnwa ga-amụtakwa ihe n’ihe a Pọl gwara ndị Filipaị. N’ihi ya, ka anyị gụọ ihe Pọl degaara ha. (Gụọ Ndị Filipaị 1:​9-11.) Anyị ga-atụlezi ihe ndị Pọl gwara ha na otú anyị nwere ike isi na-eme nke ọ bụla n’ime ha.

KA ỊHỤNANYA UNU NA-ABAKWU ỤBA

4. (a) Dị ka 1 Jọn 4:​9, 10 kwuru, olee otú Jehova si gosi na ọ hụrụ anyị n’anya? (b) Olee otú anyịnwa kwesịrị ịhụru ya n’anya?

4 Jehova gosiri na ọ hụrụ anyị n’anya mgbe o zitere Ọkpara ya n’ụwa ka ọ bịa nwụọ maka mmehie anyị. (Gụọ 1 Jọn 4:​9, 10.) Otú a o si hụ anyị n’anya na-eme ka anyịnwa hụkwa ya n’anya. (Rom 5:8) Olee otú anyị kwesịrị ịhụru Chineke n’anya? Jizọs zara ajụjụ a mgbe ọ gwara onye Farisii, sị: “Jiri obi gị dum na mkpụrụ obi gị dum na uche gị dum hụ Jehova bụ́ Chineke gị n’anya.” (Mat. 22:​36, 37) Anyị chọrọ iji obi anyị niile hụ Chineke n’anya, chọọkwa ka ịhụnanya ahụ na-esikwu ike kwa ụbọchị. Pọl gwara ndị Filipaị na ha kwesịrị ime ka ‘ịhụnanya ha na-abakwu ụba.’ Gịnị ka anyị ga-eme iji na-ahụkwu Chineke n’anya?

5. Olee otú anyị nwere ike isi na-ahụkwu Chineke n’anya?

5 Iji hụ Chineke n’anya, anyị kwesịrị ịmata onye ọ bụ. Baịbụl kwuru, sị: “Onye na-enweghị ịhụnanya amaghị Chineke, n’ihi na Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Pọl onyeozi kwuru na anyị ga-ahụkwu Chineke n’anya ma anyị na-enweta “ezi ihe ọmụma na nghọta zuru ezu” banyere ya. (Fil. 1:9) Mgbe anyị bidoro ịmụ Baịbụl, anyị bidoro ịhụ Chineke n’anya n’agbanyeghị na ọ bụ ihe ole na ole ka anyị maara banyere ya. Ka anyị na-amụtakwu ihe ndị ọzọ banyere ya, ka ịhụnanya anyị nwere n’ebe ọ nọ na-esikwu ike. Ọ bụ ya mere o ji dị ezigbo mkpa ka anyị na-amụchi Baịbụl anya ma na-atụgharị uche na ya.​—Fil. 2:16.

6. Dị ka 1 Jọn 4:​11, 20, 21 kwuru, olee ndị anyị kwesịrị ịhụ n’anya iji gosi na ịhụnanya anyị na-abakwu ụba?

6 Otú Chineke si hụ anyị n’anya ga-eme ka anyị hụ ụmụnna anyị n’anya. (Gụọ 1 Jọn 4:​11, 20, 21.) Anyị nwere ike ịna-eche na ọ ga-adịrị anyị mfe ịhụ ụmụnna anyị n’anya. A sị ka e kwuwe, anyị na-efe Chineke ma na-agbalị ime ka ya. Anyị na-eṅomikwa Jizọs bụ́ onye hụrụ anyị n’anya nke na ọ nwụrụ maka anyị. Ma mgbe ụfọdụ, o nwere ike isiri anyị ike ịhụ ụmụnna anyị n’anya. Ka anyị jiri ihe mere n’ọgbakọ dị na Filipaị mee ihe atụ.

7. Olee ihe anyị mụtara na ndụmọdụ Pọl nyere Yuodia na Sintiki?

7 Pọl onyeozi na ụmụnna nwaanyị abụọ aha ha bụ Yuodia na Sintiki “gbakọrọ mbọ ọnụ” n’ozi ọma. Ma, o nwere ike ịbụ na ha kwere ka nghọtahie ha nwere mee ka ha see okwu. N’akwụkwọ ozi Pọl degaara ọgbakọ Yuodia na Sintiki hà, ọ kpọrọ ha aha, gwa ha ka ha “nwee otu obi.” (Fil. 4:​2, 3) Ọ chọpụtara na ọ dị mma ịdụ ndị niile nọ n’ọgbakọ ahụ ọdụ. Ọ sịrị ha: “Na-emenụ ihe niile n’atamughị ntamu, n’arụghịkwa ụka.” (Fil. 2:14) O doro anya na ndụmọdụ Pọl nyere ụmụnna nwaanyị ndị a n’ezoghị ọnụ nyeere ha na ndị niile nọ n’ọgbakọ ahụ aka ịna-ahụkwu ibe ha n’anya.

Gịnị mere anyị kwesịrị iji na-elekwasị anya n’ebe ụmụnna anyị na-eme nke ọma? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8) *

8. Olee ihe nwere ike ime ka o siere anyị ezigbo ike ịhụ ụmụnna anyị n’anya, oleekwa ihe nwere ike inyere anyị aka?

8 Ụdị ihe ahụ mere Yuodia na Sintiki nwekwara ike ime anyị. O nwere ike isiri anyị ezigbo ike ịhụ ụmụnna anyị n’anya ma ọ bụrụ na anyị na-elekwasịkarị anya n’ihe ha na-emejọ. Anyị niile na-emehie kwa ụbọchị. Ọ bụrụ na anyị ana-eche gbasara ihe ụmụnna anyị na-emetaghị, ọ ga-esikwuru anyị ike ịhụ ha n’anya. Dị ka ihe atụ, nwanna chefuo inyere anyị aka mgbe anyị na-azacha Ụlọ Nzukọ Alaeze, o nwere ike iwe anyị iwe. Ọ bụrụ na anyị echewezie gbasara ihe ọjọọ ndị ọzọ o mere, iwe anyị ga-akakwu njọ. Anyị agaghịzi ahụ ya n’anya otú anyị kwesịrị. Ụdị ihe ahụ mee, ọ ga-adị mma ka i cheta na Jehova na-ahụ ezughị okè anyị na ezughị okè ụmụnna anyị. Ma, n’agbanyeghị na anyị ezughị okè, ọ ka hụrụ anyị na ụmụnna anyị n’anya. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-elekwasị anya n’ebe ụmụnna anyị na-eme nke ọma, hụkwa ha n’anya otú Jehova si hụ ha n’anya. Anyị gbalịsie ike na-ahụ ụmụnna anyị n’anya, ọ ga-eme ka anyị na ha dịkwuo n’otu.​—Fil. 2:​1, 2.

“IHE NDỊ KA MKPA”

9. Olee ụfọdụ n’ime “ihe ndị ka mkpa” Pọl kwuru okwu ha n’akwụkwọ ozi o degaara ndị Filipaị?

9 Pọl si n’ike mmụọ nsọ gwa ndị Filipaị na Ndị Kraịst niile ka ha “chọpụta ihe ndị ka mkpa.” (Fil. 1:10) Ụfọdụ n’ime ihe ndị ahụ ka mkpa bụ ido aha Jehova nsọ, imezu nzube ya, na ọgbakọ ịdị n’otu, udo adịrịkwa na ya. (Mat. 6:​9, 10; Jọn 13:35) Ọ bụrụ na anyị ewere ihe ndị a ka ihe ka mkpa ná ndụ anyị, anyị na-egosi na anyị hụrụ Jehova n’anya.

10. Olee ihe anyị kwesịrị ime ka Jehova were anyị ka ndị na-enweghị ntụpọ?

10 Pọl kwukwara na anyị kwesịrị ịbụ ndị “na-enweghị ntụpọ.” Ihe ọ na-ekwu abụghị na anyị ga-ezu okè. Anyị agaghị abụli ndị na-enweghị ntụpọ ka Jehova Chineke. Ma, Jehova ga-ewere anyị ka ndị na-enweghị ntụpọ ma ọ bụrụ na anyị na-eme ike anyị niile iji nwekwuo ịhụnanya, na-achọpụtakwa ihe ndị ka mkpa. Otu ụzọ anyị ga-esi egosi na anyị hụrụ ndị ọzọ n’anya bụ ịghara ime ka ha sụọ ngọngọ.

11. Gịnị mere anyị ekwesịghị ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ?

11 Pọl dọsiri anyị aka ná ntị ike ka anyị ghara ime “ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ.” Olee otú anyị nwere ike isi mee ka mmadụ sụọ ngọngọ? Ihe ndị anyị ji atụrụ ndụ, ụdị uwe anyị na-eyi ma ọ bụkwanụ ụdị ọrụ anyị na-arụ nwere ike ime ka mmadụ sụọ ngọngọ. O nwere ike ihe anyị na-eme abụghị ihe ọjọọ. Ma, ọ ga-abụ ihe ọjọọ ma ọ bụrụ na ọ na-enye akọnuche onye ọzọ nsogbu ma mee ka onye ahụ sụọ ngọngọ. Jizọs sịrị na ọ ga-akara anyị mma ka e konye anyị nkume igwe nri n’olu ma tụba anyị n’oké osimiri, kama ime ka otu atụrụ ya sụọ ngọngọ.​—Mat. 18:6.

12. Gịnị ka anyị mụtara n’ihe otu di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ mere?

12 Legodị otú otu di na nwunye bụ́ ndị ọsụ ụzọ si mee ihe a Jizọs kwuru. E nwere di na nwunye ọzọ ka mere baptizim ọhụrụ ha na ha nọ n’otu ọgbakọ. Ndị nke a mere baptizim ọhụrụ toro n’ezinụlọ a na-egbochi mmadụ ime ihe ụfọdụ. Ha kweere na Ndị Kraịst ekwesịghị ịga lee fim, ọ bụrụgodị fim dị mma. Ezigbo iwe were ha mgbe ha nụrụ na e nwere fim di na nwunye ahụ bụ́ ndị ọsụ ụzọ gara lee. Ndị nke ahụ bụ́ ndị ọsụ ụzọ mechara kwụsịzie ịna-aga ele fim ruo mgbe ndị nke ahụ bụ́ ndị ọhụrụ zụrụ akọnuche ha ma ghọtakwuo ihe dị mma na ihe na-adịghị mma. (Hib. 5:14) Ha si otú ahụ gosi na ha hụrụ ndị nke ahụ mere baptizim ọhụrụ n’anya, ọ bụghị naanị n’ọnụ, kamakwa n’omume.​—Rom 14:​19-21; 1 Jọn 3:18.

13. Olee otú anyị nwere ike isi mee ka mmadụ mee mmehie?

13 Otú ọzọ anyị nwere ike isi mee ka mmadụ sụọ ngọngọ bụ ime ka o mee mmehie. Olee otú o nwere ike isi mee? Chegodị gbasara ihe atụ a. Ka e were ya na e nwere onye aṅụrụma a na-amụrụ Baịbụl, ya esiere ya ike ịkwụsị aṅụrụma ya. Ma, mgbe ọ gbalịsiri ike ruo ogologo oge, o mechara selata aka n’ịṅụ mmanya. Ọ ghọtara na ya kwesịrị ịkwụsịcha ịṅụ mmanya kpamkpam. Ọ gbanwere ọtụtụ ihe ná ndụ ya ma mee baptizim. Ka oge na-aga, otu nwanna kpọrọ ya oriri ma jiri obi ọcha ya gwa ya ka ọ ṅụọ mmanya na-aba n’anya, na-asị ya: “Ị bụzi Onye Kraịst ugbu a. I nwekwara mmụọ nsọ Chineke. Otu n’ime àgwà ndị e ji ama onye mmụọ nsọ na-edu bụ onye ahụ ịna-ejide onwe ya. Ọ bụrụ na ị na-ejide onwe gị, i kwesịrị ịna-aṅụtụ obere mmanya na-aba n’anya.” Chegodị nsogbu ọ ga-akpata ma nwanna ahụ gee ntị n’ụdị ndụmọdụ ahụ na-enweghị isi na ọdụ.

14. Olee otú ọmụmụ ihe ọgbakọ si enyere anyị aka ime ihe ahụ e kwuru ná Ndị Filipaị 1:10?

14 Ọmụmụ ihe ọgbakọ na-enyere anyị aka ịma ụzọ dị iche iche anyị ga-esi mee ihe ahụ e kwuru ná Ndị Filipaị 1:10. Nke mbụ bụ na ihe a na-akụziri anyị n’ọmụmụ ihe na-echetara anyị ihe Jehova weere ka ihe ndị ka mkpa. Nke abụọ bụ na a na-akụziri anyị otú anyị ga-esi na-eme ihe anyị na-amụta iji bụrụ ndị na-enweghị ntụpọ. Nke atọ abụrụ na ọ na-eme ka anyị ‘nwee ịhụnanya ma na-arụ ezi ọrụ.’ (Hib. 10:​24, 25) Ọ bụrụ na ụmụnna anyị ana-agbakwu anyị ume, anyị ga na-ahụkwu Chineke na ụmụnna anyị n’anya. Ọ bụrụ na anyị ejiri obi anyị niile hụ Chineke na ụmụnna anyị n’anya, anyị ga na-agbalịsi ike ka anyị ghara ime ka ụmụnna anyị sụọ ngọngọ.

NA-AMỊ “MKPỤRỤ EZI OMUME”

15. Olee otú anyị si amị “mkpụrụ ezi omume”?

15 Pọl kpesiri ekpere ike ka ụmụnna nọ na Filipaị na-amị “mkpụrụ ezi omume.” (Fil. 1:11) O doro anya na ihe so ná “mkpụrụ ezi omume” ahụ bụ ịhụ Jehova na ndị ya n’anya. Ihe ọzọ so na ya bụ ịna-agwa ndị ọzọ banyere okwukwe ha nwere na Jizọs na olileanya magburu onwe ya ha nwere. Ndị Filipaị 2:15 kwuru ihe ọzọ gbasara ya, ya bụ, ‘inwu dị ka ndị na-enye ìhè n’ụwa.’ Ihe a dabara adaba n’ihi na Jizọs kpọrọ ndị na-eso ụzọ ya “ìhè nke ụwa.” (Mat. 5:​14-16) O nyekwara ha iwu ka ha mee ‘ka ndị mmadụ bụrụ ndị na-eso ụzọ ya,’ kwuokwa na ha ga-abụ ‘ndị àmà ruo n’ebe kasị anya n’ụwa.’ (Mat. 28:​18-20; Ọrụ 1:8) Anyị na-amị “mkpụrụ ezi omume” mgbe anyị ji ike anyị niile na-arụ ọrụ a dị ezigbo mkpa.

Ebe Pọl na-edegara ọgbakọ dị na Filipaị akwụkwọ ozi mgbe a tụrụ ya mkpọrọ n’ụlọ ya na Rom. O jikwa oge ahụ zie ndị na-eche ya nche na ndị bịara ileta ya ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 16)

16. Olee otú Ndị Filipaị 1:​12-14 si gosi na anyị ga-enweli ike inwu ka ndị na-enye ìhè ọ bụrụgodị na ihe siiri anyị ike? (Lee ihe e sere n’ihu Ụlọ Nche a.)

16 Anyị ga-enweli ike inwu ka ndị na-enye ìhè n’agbanyeghị otú ihe si dịrị anyị. Mgbe ụfọdụ, ihe yiri ka ọ̀ ga-egbochi anyị ikwusa ozi ọma nwere ike imecha bụrụ ohere anyị ga-eji zie ozi ọma. Dị ka ihe atụ, a tụrụ Pọl onyeozi mkpọrọ n’ụlọ ya na Rom mgbe o dere akwụkwọ Ndị Filipaị. Ma mkpọrọ a tụrụ ya emeghị ka ọ ghara izi ndị na-eche ya nche na ndị bịara ileta ya ozi ọma. Pọl ji obi ya niile kwusaa ozi ọma n’oge ahụ. Ihe ahụ o mere mekwara ka ụmụnna ya nwee obi ike ‘ikwu okwu Chineke n’atụghị egwu.’​—Gụọ Ndị Filipaị 1:​12-14; 4:22.

Na-agba mbọ mgbe niile ka ị chọpụta ụzọ dị iche iche ị ga-esi na-eme ike gị niile n’ozi ọma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 17) *

17. Olee otú ụfọdụ ụmụnna anyị si na-ekwusa ozi ọma mgbe ihe siri ezigbo ike?

17 Ọtụtụ ụmụnna anyị bi n’obodo ebe ha na-anaghị ekwusali ozi ọma n’ụlọ n’ụlọ ma ọ bụ n’ezoghị ezo. Ha nwere ụdị obi ike ahụ Pọl nwere. N’ihi ya, ha na-esi n’ụzọ ndị ọzọ ekwusa ozi ọma. (Matiu 10:​16-20) N’ụdị obodo ahụ, onye nlekọta sekit tụụrụ onye nkwusa nke ọ bụla aro ka ọ na-ezi ndị ikwu ya, ndị agbata obi ya, ụmụ akwụkwọ ibe ya, ndị ọrụ ibe ya, na ndị ọzọ ọ ma ozi ọma. N’ime afọ abụọ, ọgbakọ ole e nwere na sekit ahụ bukwuru ibu. O nwere ike anyị bi n’obodo ebe anyị ga-ezili onye ọ bụla anyị hụrụ ozi ọma. Ma, anyị nwere ike ịmụta ezigbo ihe n’otú ụmụnna anyị ndị ahụ si chepụta otú ha ga-esi kwusaa ozi ọma. Ihe anyị ga-amụta bụ: Na-agba mbọ mgbe niile ka ị chọpụta ụzọ dị iche iche ị ga-esi na-eme ike gị niile n’ozi ọma. Ka obi sie gị ike na Jehova ga-enye gị ike ị ga-eji merie nsogbu ọ bụla bịaara gị.​—Fil. 2:13.

18. Olee ihe anyị kwesịrị ikpebisi ike ịna-eme?

18 N’oge anyị a dị ezigbo mkpa, ka anyị kpebisie ike na anyị ga-eme ihe ahụ Pọl onyeozi gwara ndị Filipaị n’akwụkwọ ozi o degaara ha. Ka anyị na-achọpụta ihe ndị ka mkpa, bụrụ ndị na-enweghị ntụpọ, na-amị mkpụrụ ezi omume ma ghara ime ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ. Anyị ga-esi otú ahụ gosi na ịhụnanya anyị na-abakwu ụba, meekwa ka e too Jehova, bụ́ Nna anyị hụrụ anyị n’anya.

ABỤ NKE 17 “Achọrọ M”

^ par. 5 Anyị kwesịrị ịna-ahụkwu ụmụnna anyị n’anya ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Akwụkwọ ozi Pọl degaara ndị Filipaị ga-enyere anyị aka ịmụta otú anyị ga-esi na-ahụkwu ụmụnna anyị n’anya ọ bụrụgodị na o siiri anyị ike ime ya.

^ par. 54 NKỌWA FOTO: Ebe ụmụnna na-azacha Ụlọ Nzukọ Alaeze, nwanna aha ya bụ Joe akwụsịtụ, ya na nwanna ọzọ na nwa ya nwoke ana-akparịta ụka. Ihe a were Nwanna Mike ya na ya so na-arụ ọrụ iwe. Mike asị n’obi ya, ‘Joe kwesịrị ilekwasị anya n’ihe ọ na-eme, ọ bụghị ịnọ na-akparịta ụka.’ Mike mechara hụ ebe Joe nọ na-enyere nwanna nwaanyị mere agadi aka. O metụrụ ya n’ahụ́, meekwa ka o chewe gbasara àgwà ọma ndị Nwanna Joe nwere.

^ par. 58 NKỌWA FOTO: N’otu obodo a machiri ụmụnna anyị ikwusa ozi ọma, otu nwanna ji akọ na-ezi onye ọ ma ozi ọma. Nwanna ahụ mechakwara ziwe onye ọrụ ibe ya ozi ọma mgbe ha pụrụ brek.