ỤLỌ NCHE—NKE A NA-AMỤ AMỤ Septemba 2019

Ihe dị n’Ụlọ Nche a bụ isiokwu ndị a ga-amụ malite n’Ọktoba 28 ruo Disemba 1, 2019.

Jehova Ji Ndị Ohu Ya Dị Umeala n’Obi Kpọrọ Ihe

Ịdị umeala n’obi so n’àgwà ndị kacha mkpa anyị kwesịrị ịmụta. Gịnị mere o nwere ike iji siere anyị ike ịdị umeala n’obi ma ihe gbanweere anyị?

Amagedọn Bụ Ihe Ọma

Olee ihe ndị dị mkpa ga-eme tupu Amagedọn? Olee otú anyị nwere ike isi mee ka okwukwe anyị na-esikwu ike ka ọgwụgwụ ụwa a na-eru nso?

Gịnị Mere Anyị Ga-eji Jiri Obi Anyị Niile Na-erubere Jehova Isi?

Ndị okenye, ndị nna, na ndị nne nwere ike ịmụta irube isi n’aka Gọvanọ Nehemaya, Eze Devid na Meri nne Jizọs.

“Bịakwutenụ M, . . . M Ga-emekwa Ka Unu Nweta Ume”

Olee ihe ndị anyị ga-eme iji za òkù a? Anyị ga-anyara yok Jizọs ma ka na-enweta ume ma ọ bụrụ na anyị emee ihe atọ e kwuru n’isiokwu a.

‘Lee Oké Ìgwè Mmadụ’

N’ọhụụ Jọn hụrụ, Jehova mere ka a mata ndị bụ́ “oké ìgwè mmadụ” ahụ ga-agafe oké mkpagbu ahụ ma biri n’ụwa ruo mgbe ebighị ebi, na ha buru ibu, nakwa na ha si ebe dị iche iche.