Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 36

Amagedọn Bụ Ihe Ọma

Amagedọn Bụ Ihe Ọma

“Ha wee kpọkọta ha n’ebe a na-akpọ Ha-Magedọn.” —MKPU. 16:16.

ABỤ NKE 150 Chọọ Chineke Ka O Chebe Gị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1-2. (a) Gịnị mere Amagedọn ji bụrụ ihe ọma ga-emere ụmụ mmadụ? (b) Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza n’isiokwu a?

Ị̀ NỤTỤLA ebe ndị mmadụ ji okwu bụ́ “Amagedọn” na-akọwa agha ọgwụrụ mba ma ọ bụ ọdachi na-emere onwe ya nke ga-ebibi ụwa? Ma, ihe Baịbụl kwuru gbasara Amagedọn bụ ihe ọma ga-eme ka obi dị anyị ụtọ. (Mkpu. 1:3) Agha Amagedọn agaghị egbukpọ mmadụ niile, kama ọ ga-azọpụta ụmụ mmadụ. Gịnị mere anyị ji kwuo ya?

2 Ihe Baịbụl kwuru gosiri na agha Amagedọn ga-azọpụta ụmụ mmadụ. Otú ọ ga-esi eme ya bụ na ọ ga-akwụsị ọchịchị mmadụ, bibie ndị ọjọọ ma chebe ndị ezi omume, bibiekwa ndị na-ebibi ụwa. (Mkpu. 11:18) Iji nyere anyị aka ịghọta ihe ndị a nke ọma, ka anyị zaa ajụjụ anọ ndị a: Gịnị bụ Amagedọn? Olee ihe ndị ga-eme tupu agha ahụ ebido? Olee otú anyị ga-esi soro ná ndị a ga-echebe n’Amagedọn? Olee otú anyị nwere ike isi mee ka okwukwe anyị na-esikwu ike ka Amagedọn na-eru nso?

GỊNỊ BỤ AMAGEDỌN?

3. (a) Gịnị ka okwu ahụ bụ́ “Amagedọn” pụtara? (b) Olee otú Mkpughe 16:14, 16 si mee ka anyị mata na e nweghị ebe na-aza Amagedọn n’ụwa a?

3 Gụọ Mkpughe 16:14, 16. Okwu ahụ bụ́ “Amagedọn” pụtara naanị otu ugboro na Baịbụl. O si n’okwu Hibru nke pụtara “Ugwu Megido.” Megido bụ obodo dị n’Izrel oge ochie. (Jọsh. 17:11) Ma, e nweghị ebe na-aza Amagedọn n’ụwa a. N’eziokwu, Amagedọn bụ mgbe “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi” ga-ezukọta ịlụso Jehova agha. (Mkpu. 16:14) Ma n’isiokwu a, anyị ga-ejikwa okwu ahụ bụ́ “Amagedọn” kọwaa agha ga-amalite ozugbo ndị eze ụwa zukọtara ịlụso Jehova agha. Olee otú anyị si mara na e nweghị ebe na-aza Amagedọn? Nke mbụ bụ na e nweghị ugwu ọ bụla aha ya bụ Megido. Nke abụọ bụ na o nweghị otú ebe dị gburugburu Megido ga-esi baa “ndị eze nke elu ụwa dum mmadụ bi,” ndị agha ha, na ngwá agha ha. Nke atọ abụrụ na, dị ka anyị ga-emecha hụ n’isiokwu a, agha Amagedọn ga-ebido mgbe “ndị eze” ụwa ga-alụso ndị Chineke n’ụwa niile ọgụ.

4. Gịnị mere Chineke ji si na Megido nweta aha agha ukwu ikpeazụ ya?

4 Gịnị mere Jehova ji si na Megido nweta aha agha ukwu ikpeazụ ya? A nọ na Megido na Ndagwurugwu Jezril nke dị ya nso lụọ ọtụtụ agha. E nwere mgbe ụfọdụ Jehova nyeere ndị ya aka ịlụso ndị iro ha ọgụ n’agha ndị ahụ. Dị ka ihe atụ, ọ bụ “n’akụkụ mmiri Megido” ka Chineke nyeere Berak bụ́ onyeikpe n’Izrel aka imeri ndị agha Kenan, nke Sisera bụ ọchịagha ha. Berak na Debora bụ́ onye amụma nwaanyị kelere Jehova maka otú o si rụọ ọrụ ebube mee ka ha merie. Ha bụrụ abụ, sị: “Kpakpando si n’eluigwe . . . buso Sisera agha. Iyi Kaịshọn buuru ha.”—Ikpe 5:19-21.

5. Olee ihe dị mkpa mere agha Amagedọn ga-eji dị iche n’agha ahụ Berak lụrụ?

5 Ihe Berak na Debora ji mechie abụ ahụ ha bụrụ bụ: “Jehova, ka ndị iro gị niile si otú a laa n’iyi, ka ndị hụrụ gị n’anya dịrị ka mgbe anyanwụ ji ike ya dum na-awa.” (Ikpe 5:31) N’Amagedọn, ndị iro Chineke ga-alakwa n’iyi, ma a ga-azọpụta ndị hụrụ ya n’anya. Ma, e nwere ezigbo ihe dị iche n’agha abụọ a. Ndị Chineke agaghị alụ ọgụ n’agha Amagedọn. Ha agaghịdị eji ngwá agha. Naanị ihe ga-eme ka ha dị ike bụ ‘ịnọrọ jụụ na ịtụkwasị’ Jehova na ìgwè ndị agha ya nke eluigwe obi.—Aịza. 30:15; Mkpu. 19:11-15.

6. Olee ihe Jehova nwere ike iji merie ndị iro ya n’Amagedọn?

6 Gịnị ka Chineke ga-eji merie ndị iro ya n’Amagedọn? O nwere ike iji ihe dị iche iche. Dị ka ihe atụ, o nwere ike iji ala ọma jijiji, akụ́ mmiri igwe, na àmụ̀mà. (Job 38:22, 23; Ezik. 38:19-22) O nwere ike ime ka ndị iro ya gburịtawa ibe ha. (2 Ihe 20:17, 22, 23) O nwekwara ike iji ndị mmụọ ozi gbuo ndị ajọ omume. (Aịza. 37:36) N’agbanyeghị ihe Chineke ga-eji eme ya, ọ bụ ya ga-emeri. Ọ ga-ebibi ndị iro ya niile ma zọpụta ndị ezi omume niile.—Ilu 3:25, 26.

OLEE IHE NDỊ GA-EME TUPU AMAGEDỌN?

7-8. (a) Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Tesalonaịka 5:1-6, olee ọkwa a na-amatụbeghị ndị ọchịchị ụwa ga-ama? (b) Gịnị mere ọkwa ahụ ga-eji bụrụ ụgha jọgburu onwe ya?

7 A ga-ama ọkwa na e nweela “udo na obi iru ala” tupu “ụbọchị Jehova” abịa. (Gụọ 1 Ndị Tesalonaịka 5:1-6.) “Ụbọchị Jehova” e kwuru okwu ya ná 1 Ndị Tesalonaịka 5:2 bụ “oké mkpagbu ahụ.” (Mkpu. 7:14) Olee otú anyị ga-esi mara na oké mkpagbu ahụ achọwala ibido? Ọ bụ ọkwa Baịbụl kwuru na a ga-ama na e nweela “udo na obi iru ala.” Ọkwa ahụ ndị ọchịchị ụwa ga-ama ga-egosi na oké mkpagbu ahụ agawala ibido.

8 Gịnị mere ndị ọchịchị ụwa ga-eji kwuo ihe ahụ? Ndị ndú okpukpe hà ga-eso kwuo ya? Ha nwere ike. Ma, ihe ahụ ga-abụ ụgha ọzọ si n’aka ndị mmụọ ọjọọ. Ma, ụgha a ga-ajọgbu onwe ya n’ihi na ọ ga-eme ka ndị mmadụ chee na e nweela ezigbo udo tupu oké mkpagbu a na-ahụtụbeghị ụdị ya amalite. Nke bụ́ eziokwu bụ na “mbibi mberede ga-abịakwasị ha n’otu ntabi anya” otú ahụ ime si eme nwaanyị dị ime na mberede. Gịnị ga-eme ndị ji obi ha niile na-efe Jehova? Otú ụbọchị Jehova si bịa n’otu ntabi anya nwere ike iju ha anya, ma ha ga-adị njikere maka ya.

9. Jehova ọ̀ ga-ebibi ụwa Setan otu mgbe? Kọwaa.

9 Jehova agaghị ebibi ụwa Setan otu mgbe otú ahụ o mere n’oge Noa. Kama, mbibi ahụ ga-enwe agba nke mbụ na nke abụọ. Nke mbụ bụ na ọ ga-ebibi Babịlọn Ukwu, ya bụ, okpukpe ụgha niile dị n’ụwa. O ruzie n’Amagedọn, ya ebibichaa ụwa Setan, ma ndị ọchịchị ya, ma ndị agha ya, ma ndị azụmahịa ya. Ka anyị lerukwuo anya n’ihe abụọ ahụ dị mkpa ga-emenụ.

10. Dị ka e kwuru ná Mkpughe 17:1, 6 na 18:24, gịnị mere Jehova ga-eji bibie Babịlọn Ukwu ahụ?

10 “Ikpe ahụ a mara oké nwaanyị akwụna ahụ.” (Gụọ Mkpughe 17:1, 6; 18:24.) Babịlọn Ukwu ahụ emeela ka a na-akọcha aha Chineke. Ọ na-akụzi ihe na-abụghị eziokwu gbasara Chineke. Ọ na-eme ka nwaanyị akwụna. Otú o si eme ya bụ na ọ na-akwado ọchịchị ụmụ mmadụ kama ịkwado ọchịchị Jehova. O ji ike ya na-emegbu ndị òtù ya, na-anapụ ha ego ha. Ọbara ọ kwafurula abụghị ihe e ji ọnụ ekwu, ma ọbara ndị na-efe Chineke. (Mkpu. 19:2) Olee otú Jehova ga-esi bibie Babịlọn Ukwu ahụ?

11. Gịnị bụ ‘anụ ọhịa ahụ na-acha uhie uhie,’ oleekwa ihe Chineke ga-eji ya mee Babịlọn Ukwu ahụ?

11 Jehova ga-eji “mpi iri” nke ‘anụ ọhịa na-acha uhie uhie’ bibie “nwaanyị akwụna ahụ.” Anụ ọhịa ahụ nọchiri anya Òtù Mba Ụwa. Mpi iri ahụ nọchiri anya ọchịchị ndị dị ugbu a na-akwado òtù ahụ. N’oge Chineke kara aka, ọchịchị ndị ahụ ga-alụso Babịlọn Ukwu ahụ ọgụ. Ha ‘ga-ala ya n’iyi ma mee ka ọ gbara ọtọ.’ Otú ha ga-esi eme ya bụ na ha ga-ebukọrọ akụ̀ ya ma gbaa omume ọjọọ ya n’anwụ. (Mkpu. 17:3, 16) Mbibi ahụ ga-abịa na mberede ka à ga-asị na ọ bụ n’otu ụbọchị, mee ka ndị na-akwado ya kụja. A sị ka e kwuwe, ọ dịla anya o kwuwere, sị: “Anọ m ọdụ dị ka eze nwaanyị, abụghịkwa m nwaanyị di ya nwụrụ, ọ dịghịkwa mgbe m ga-ahụ iru uju.”—Mkpu. 18:7, 8.

12. Gịnị ka Jehova na-agaghị ekwe ka mba dị iche iche mee? Ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?

12 Chineke agaghị ekwe ka mba dị iche iche bibie ndị ya, ndị ji obi ụtọ na-aza aha ya ma si na Babịlọn Ukwu ahụ pụta otú ọ gwara ha ka ha mee. (Ọrụ 15:16, 17; Mkpu. 18:4) Ha agbaakwala ezigbo mbọ nyere ndị ọzọ aka isi na ya pụta. N’ihi ya, ndị na-efe Jehova agaghị ‘anata ụfọdụ n’ime ihe otiti ya.’ Ma, okwukwe ha ga-esi ezigbo ike iji nwee ike idi ihe ọzọ ga-abịara ha.

N’ebe ọ bụla ndị Chineke nọ n’ụwa, ha ga-atụkwasị ya obi mgbe Gọg ga-abịa ịlụso ha ọgụ (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13) *

13. (a) Ònye bụ Gọg? (b) Dị ka e kwuru n’Ezikiel 38:2, 8, 9, olee mgbe Gọg ga-abịaru n’ebe ahụ e ji mee ihe atụ, nke a kpọrọ Amagedọn?

13 Ọgụ Gọg ga-alụso ndị Chineke. (Gụọ Ezikiel 38:2, 8, 9.) E bibichaa okpukpe ụgha niile, ndị Chineke ga-adịzi ka otu osisi fọrọnụ mgbe oké ifufe fetuchara osisi ndị ọzọ niile. Ma, iwe ga-eju Setan obi. Iwe ahụ ga-eme ka o jiri ụgha ndị mmụọ ọjọọ mee ka mba dị iche iche bịa ịlụso ndị Jehova ọgụ. Akwụkwọ Mkpughe kpọrọ ụgha ahụ ‘okwu na-adịghị ọcha ndị si n’aka mmụọ.’ (Mkpu. 16:13, 14) Ihe Baịbụl kpọrọ mba ndị ahụ ga-ejikọ aka bụ “Gọg nke ala Megọg.” Mgbe ha ga-alụso ndị Chineke ọgụ, e nwere ike ikwu na ha erutela n’ebe ahụ e ji mee ihe atụ, nke a kpọrọ Amagedọn.—Mkpu. 16:16.

14. Gịnị ka Gọg ga-emecha mata?

14 Ihe Gọg ga-atụkwasị obi bụ ‘ogwe aka ya bụ́ anụ ahụ́,’ ya bụ, ìgwè ndị agha ya. (2 Ihe 32:8) Ma, anyịnwa ga-atụkwasị Jehova Chineke anyị obi. Mba dị iche iche lechaa anyị, ha ga-eche na anyị dị iberiibe. A sị ka e kwuwe, Babịlọn Ukwu ahụ na-akpabu ike, ma chi ndị ọ nọ na-efe azọpụtalighị ya n’aka “anụ ọhịa ahụ” na “mpi iri” ya. (Mkpu. 17:16) N’ihi ya, Gọg ga-eche na ọ ga-adịrị ya mfe imeri anyị. Ọ ga-abịa ịlụso ndị Jehova ọgụ “dị ka ígwé ojii” si ekpuchi ala. (Ezik. 38:16) Ma, ọ gaghị adị anya Gọg amata na ọnyà amala ya. Gọg ga-amata na ọ bụ Jehova ka ọ bịara ịlụso ọgụ otú ahụ Fero matara n’Oké Osimiri Uhie.—Ọpụ. 14:1-4; Ezik. 38:3, 4, 18, 21-23.

15. Olee otú Jizọs ga-esi merie ndị iro ya niile n’agha Amagedọn?

15 Kraịst na ndị agha ya nke eluigwe ga-echebe ndị Chineke ma laa Gọg na ndị agha ya n’iyi. (Mkpu. 19:11, 14, 15) Gịnị ga-eme Setan, bụ́ onyeisi ndị iro Chineke, onye ji ụgha ya mee ka mba dị iche iche lụso ndị Chineke ọgụ n’Amagedọn? Jizọs ga-atụba ya na ndị mmụọ ọjọọ ya n’abis, kpọchie ha n’ebe ahụ ruo otu puku afọ.—Mkpu. 20:1-3.

OLEE OTÚ A GA-ESI CHEBE GỊ N’AGHA AMAGEDỌN?

16. (a) Olee otú anyị ga-esi gosi na anyị ‘ma Chineke’? (b) Olee uru ịma Jehova ga-abara anyị n’Amagedọn?

16 Ma ànyị anọọla n’ọgbakọ ọtụtụ afọ ma ọ bụ na anyị anọbeghị, ihe ga-eme ka e chebe anyị n’Amagedọn bụ igosi na anyị ‘ma Chineke’ nakwa “ịna-erube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs.” (2 Tesa. 1:7-9) Otú anyị si egosi na anyị ‘ma Chineke’ bụ ịma ihe ndị na-amasị ya na ihe ndị na-anaghị amasị ya nakwa iwu ya. Anyị na-egosikwa na anyị ma ya ma ọ bụrụ na anyị ahụ ya n’anya, na-erubere ya isi ma na-efe naanị ya. (1 Jọn 2:3-5; 5:3) Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe gosiri na anyị ma Chineke, ‘ọ ga-amarakwa’ anyị, nke ga-eme ka e chebe anyị n’Amagedọn. (1 Kọr. 8:3) N’ihi gịnị? N’ihi na ọ bụrụ na ọ ‘mara anyị,’ ọ pụtara na anyị na ya dị ná mma.

17. Olee ihe ‘irube isi n’ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs’ pụtara?

17 “Ozi ọma banyere Onyenwe anyị Jizọs” bụ eziokwu niile Jizọs kụziri e dere na Baịbụl. Anyị na-erube isi n’ozi ọma ahụ ma ọ bụrụ na anyị na-eme ihe dị na ya. Otú anyị si eme ya bụ ibu ụzọ na-achọ Alaeze Chineke, irube isi n’iwu Chineke na ikwusa ozi ọma Alaeze Chineke. (Mat. 6:33; 24:14) Otú ọzọ anyị si eme ya bụ ịna-akwado ụmụnna Jizọs e tere mmanụ n’ọrụ dị mkpa ha na-arụ.—Mat. 25:31-40.

18. Olee otú ụmụnna Kraịst e tere mmanụ ga-esi meere ndị so n’atụrụ ọzọ ihe ọma maka inyere ha aka?

18 N’oge na-adịghị anya, ndị ohu Chineke e tere mmanụ ga-emere ndị so ‘n’atụrụ ọzọ’ ihe ọma maka aka niile ha nyeere ha. (Jọn 10:16) Olee otú ha ga-esi mee ya? Tupu Amagedọn amalite, a ga-akpọlite ndị niile so n’otu narị puku na iri puku anọ na puku anọ n’ọnwụ, ha agaa eluigwe, bụrụ ndị mmụọ na-anaghị anwụ anwụ. Ha ga-esozi n’ìgwè ndị agha ga-esi n’eluigwe bịa kụọ Gọg pịapịa ma chebe “oké ìgwè mmadụ” ndị yiri atụrụ. (Mkpu. 2:26, 27; 7:9, 10) N’eziokwu, obi ga-adị oké ìgwè mmadụ ahụ ezigbo ụtọ na ha kwadoro ndị ohu Chineke e tere mmanụ mgbe ha ka nọ n’ụwa.

OLEE OTÚ ANYỊ GA-ESI MEE KA OKWUKWE ANYỊ NA-ESIKWU IKE KA ỌGWỤGWỤ ỤWA A NA-ERU NSO?

19-20. N’agbanyeghị ọnwụnwa ndị na-abịara anyị, olee otú anyị nwere ike isi mee ka okwukwe anyị na-esikwu ike ka Amagedọn na-eru nso?

19 Ọnwụnwa na-abịara ọtụtụ ndị Jehova n’oge ikpeazụ a. Ma, anyị ga-ejili ọṅụ na-atachi obi. (Jems 1:2-4) Ihe ga-enyere anyị aka bụ iji obi anyị niile na-ekpesi ekpere ike. (Luk 21:36) Ọ bụghị naanị na anyị ga na-ekpe ekpere, kama anyị kwesịkwara ịna-amụ Okwu Chineke kwa ụbọchị ma na-atụgharị uche na ya, ma amụma ndị magburu onwe ha Baịbụl buru gbasara oge anyị a. (Ọma 77:12) Ọ bụrụ na anyị na-eme ihe ndị a, na-agbasikwa mbọ ike n’ozi ọma, okwukwe anyị na olileanya anyị ga na-esikwu ike.

20 Chegodị otú obi ga-esi bụrụ gị sọ aṅụrị mgbe Babịlọn Ukwu ahụ ga-ala ka naị, a lụchaakwa agha Amagedọn. Cheekwa otú obi ga-esi dị gị ezigbo ụtọ mgbe mmadụ niile ga na-akwanyere aha Chineke ùgwù, matakwa na ọ bụ ya kwesịrị ịchị. (Ezik. 38:23) N’eziokwu, Amagedọn bụ ihe ọma ga-emere ndị ma Chineke, ndị na-erubere Ọkpara ya isi, na ndị tachiri obi ruo ọgwụgwụ.—Mat. 24:13.

ABỤ NKE 143 Na-agba Mbọ, Na-elekwa Anya Ụbọchị Jehova

^ par. 5 Ndị Jehova na-atụ anya Amagedọn kemgbe ụwa. N’isiokwu a, anyị ga-eleba anya n’ihe Amagedọn bụ, ihe ndị ga-eme tupu ya abịa, na otú anyị nwere ike isi mee ka okwukwe anyị na-esikwu ike ka ọgwụgwụ ụwa a na-eru nso.

^ par. 71 NKỌWA FOTO: Mgbe ihe ndị ga-eme ka ụwa maa jijiji ga na-eme, anyị ga (1) na-ekwusa ozi ọma ma ọ bụrụhaala na o kwere omume, (2) na-amụchi Baịbụl anya, ma (3) na-atụkwasị Chineke obi na ọ ga-echebe anyị.

^ par. 85 NKỌWA FOTO: Ebe ndị uwe ojii na-ejikere ịbata n’ụlọ otu nwanna na ezinụlọ ya n’ike, ma obi esie ụmụnna ndị ahụ ike na Jizọs na ndị mmụọ ozi ya ma ihe na-eme.