Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 38

“Bịakwutenụ M, . . . M Ga-emekwa Ka Unu Nweta Ume”

“Bịakwutenụ M, . . . M Ga-emekwa Ka Unu Nweta Ume”

“Bịakwutenụ m, unu niile ndị na-adọgbu onwe unu n’ọrụ na ndị e boro ibu dị arọ, m ga-emekwa ka unu nweta ume.”—MAT. 11:28.

ABỤ NKE 17 “Achọrọ M”

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee nkwa Jizọs kwere na Matiu 11:28-30?

JIZỌS kwere ìgwè mmadụ na-ege ya ntị nkwa magburu onwe ya. Ọ sịrị ha: “Bịakwutenụ m, . . . m ga-emekwa ka unu nweta ume.” (Gụọ Matiu 11:28-30.) Nkwa ahụ o kwere ha abụghị naanị n’ọnụ. Dị ka ihe atụ, chegodị ihe o meere otu nwaanyị na-arịa ọrịa ọjọọ.

2. Olee ihe Jizọs meere otu nwaanyị ahụ́ na-adịghị?

2 Nwaanyị ahụ chọsiri ike ka e nyere ya aka. Ọ gakwuuru ọtụtụ ndị dọkịta ka ha gwọọ ya, ma ha agwọlighị ya kemgbe afọ iri na abụọ. Iwu Mozis kwuru na ọ dịghị ọcha. (Lev. 15:25) O mechara nụ na Jizọs na-agwọ ndị ọrịa. N’ihi ya, ọ chọọrọ Jizọs gawa. Mgbe ọ hụrụ Jizọs, o bitụrụ ọnụ ọnụ uwe ya aka, a gwọọ ya ozugbo. Ọ bụghị naanị na Jizọs gwọrọ ya, otú o si meso ya mere ka ọ mata na ọ hụrụ ya n’anya. Dị ka ihe atụ, mgbe Jizọs na-agwa ya okwu, Jizọs kpọrọ ya “nwa m nwaanyị,” nke gosiri na ọ hụrụ ya n’anya, jirikwa ya kpọrọ ihe. Ihe a o mere mere ka ahụ́ ruo nwaanyị ahụ ala, meekwa ka obi sie ya ike.—Luk 8:43-48.

3. Olee ajụjụ ndị anyị ga-aza?

3 Ị̀ chọpụtara na ọ bụ nwaanyị ahụ gbara mbọ gakwuru Jizọs? Anyịnwa kwesịkwara ịgba mbọ ‘bịakwute’ Jizọs. Taa, Jizọs anaghịzi arụ ọrụ ebube agwọ ndị ‘bịakwutere’ ya ọrịa. Ma, ọ ka na-agwa anyị, sị: “Bịakwutenụ m, . . . m ga-emekwa ka unu nweta ume.” N’isiokwu a, anyị ga-aza ajụjụ ise: Olee otú anyị nwere ike isi ‘bịakwute’ Jizọs? Gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ sịrị: “Nyaranụ yok m”? Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’aka Jizọs? Gịnị mere ọrụ ahụ o nyere anyị ji eme ka anyị nweta ume? Olee otú anyị ga-esi nyara yok Jizọs ma ka na-enweta ume?

“BỊAKWUTENỤ M”

4-5. Olee ụzọ ụfọdụ anyị nwere ike isi ‘bịakwute’ Jizọs?

4 Otu ụzọ anyị ga-esi ‘bịakwute’ Jizọs bụ ịgbalịsi ike mụọ gbasara ihe ndị o kwuru na ihe ndị o mere. (Luk 1:1-4) O nweghị onye ga-emere anyị ya. Ọ bụ anyịnwa ga-eji aka anyị mụọ ihe Baịbụl kọrọ gbasara Jizọs. Otú ọzọ anyị sikwa ‘abịakwute’ Jizọs Kraịst bụ ikpebi ka e mee anyị baptizim, anyị aghọọ ndị na-eso ụzọ ya.

5 Ụzọ ọzọ anyị si ‘abịakwute’ Jizọs bụ ịgakwuru ndị okenye ọgbakọ mgbe anyị chọrọ enyemaka. Jizọs ji ụmụnna ndị a bụ́ “onyinye n’ụdị mmadụ” na-elekọta atụrụ ya. (Efe. 4:7, 8, 11; Jọn 21:16; 1 Pita 5:1-3) Anyị kwesịrị ịgbalịsi ike gaa gwa ha ka ha nyere anyị aka. Anyị agaghị atụ anya ka ndị okenye mara ihe dị anyị n’obi na ihe dị anyị mkpa. Chegodị gbasara otu nwanna aha ya bụ Julian. Ọ sịrị: “Ọrịa mere ka m pụọ na Betel, otu enyi m atụọrọ m aro ka m kpọọ ndị okenye ka ha bịa gbaa m ume. Na mbụ, echeghị m na ọ dị m mkpa. Ma m mechara gwa ndị okenye ka ha bịa nyere m aka. Nleta ha ahụ so n’ihe ọma kachanụ e meere m.” Ụdị ndị okenye abụọ ahụ letara Julian nwere ike inyere anyị aka ịmata “uche nke Kraịst,” ya bụ, ịghọta otú Jizọs si eche echiche na otú o si ele ihe anya ma na-eme ka ya. (1 Kọr. 2:16; 1 Pita 2:21) Aka ha ga-enyere anyị so n’onyinye kachanụ ha nwere ike inye anyị.

“NYARANỤ YOK M”

6. Gịnị ka okwu Jizọs ahụ bụ́ “nyaranụ yok m” pụtara?

6 Mgbe Jizọs sịrị: “Nyaranụ yok m,” o nwere ike ịbụ na ihe ọ na-ekwu bụ “Na-eruberenụ m isi.” O nwekwara ike ịbụ na ihe ọ na-ekwu bụ “Nyaranụ yok m, mụ na unu ga-esokwa na-arụrụ Jehova ọrụ.” Nke ọ bụla ọ bụ, ọrụ dị n’ịnyara yok ahụ.

7. Dị ka e kwuru na Matiu 28:18-20, olee ọrụ e nyere anyị, oleekwa ihe obi kwesịrị isi anyị ike maka ya?

7 Otú anyị si zaa òkù ahụ Jizọs kpọrọ bụ inyefe Jehova onwe anyị ma mee baptizim. Ọ bụ mmadụ niile ka Jizọs na-akpọ. Ọ gaghị ajụ onye ọ bụla ji obi ya niile bịa ife Chineke. (Jọn 6:37, 38) E nyere ndị niile na-eso ụzọ Kraịst ọrụ iso Jizọs na-arụ ọrụ Jehova nyere ya. Obi siri anyị ike na Jizọs ga na-enyere anyị aka ịrụ ọrụ ahụ.—Gụọ Matiu 28:18-20.

“MỤTAKWANỤ IHE N’AKA M”

Na-eme ka ndị ọzọ nweta ume otú ahụ Jizọs mere (A ga-akọwa ya na paragraf nke 8 ruo na nke 11) *

8-9. Gịnị mere ndị dị umeala n’obi ji bịakwute Jizọs, oleekwa ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

Ndị dị umeala n’obi na-achọ ịgakwuru Jizọs. (Mat. 19:13, 14; Luk 7:37, 38) N’ihi gịnị? Chegodị otú Jizọs si dị iche n’ebe ndị Farisii bụ́ ndị ndú okpukpe nọ. Ha ahụghị ndị mmadụ n’anya, ha dịkwa mpako. (Mat. 12:9-14) Jizọs hụrụ ndị mmadụ n’anya, ọ dịkwa umeala n’obi. Ndị Farisii chọrọ ịbụ ndị a ma ama, na-ebulikwa onwe ha elu n’ihi ọkwá ha. Jizọs kwuru na ụdị àgwà ahụ adịghị mma. Ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ka ha dịrị umeala n’obi ma na-ejere ndị ọzọ ozi. (Mat. 23:2, 6-11) Ndị Farisii nọ na-achị ndị mmadụ ọchịchị nchịgbu, na-emekwa ka ha na-atụ ha ụjọ. (Jọn 9:13, 22) Jizọs ji obiọma ya na okwu ọma ya mee ka ndị mmadụ nweta ume.

9 Ị̀ mụtala ihe ndị a n’aka Jizọs? Jụọ onwe gị, sị: ‘Ndị ọzọ hà ma m ka onye dị nwayọọ na onye dị umeala n’obi? M̀ na-arụ ọrụ ndị e weere ka ọrụ dị ala iji nyere ndị ọzọ aka? M̀ na-emere ndị ọzọ obiọma?’

10. Olee otú Jizọs mere ka ahụ́ dị ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ?

10 Jizọs mere ka ahụ́ ruo ndị ya na ha na-arụkọ ọrụ ala. Ịzụ ha na-emekwa ya obi ụtọ. (Luk 10:1, 19-21) O mere ka ọ dịrị ndị na-eso ụzọ ya mfe ịjụ ya ajụjụ. Ọ chọkwara ịnụ ihe ha chere. (Mat. 16:13-16) Ndị na-eso ụzọ ya nọ na-eme nke ọma otú ahụ ihe a kụrụ akụ na-ama pokopoko ma a na-elekọta ya nke ọma. Ha mụtara ihe Jizọs kụziiri ha ma jiri ya na-eme ihe dị mma.

Mee ka ọ dịrị ndị ọzọ mfe ịbịa gị nso, na-emekwa ka enyi ha

Jiri ozi ọma kpọrọ ihe

Dị umeala n’obi ma na-arụsi ọrụ ike *

11. Olee ajụjụ ndị anyị kwesịrị ịjụ onwe anyị?

11 È nwere ndị ị na-elekọta? Ọ bụrụ na e nwere, jụọ onwe gị, sị: ‘Olee otú m si emeso ndị mụ na ha na-arụkọ ọrụ ma ọ bụ ndị ezinụlọ m? M̀ na-eme ka udo dị? M̀ na-eme ka ọ dịrị ha mfe ịjụ m ajụjụ? M̀ na-ege ha ntị ma ha kwuwe uche ha?’ Ndị Farisii anaghị achọ ka ndị mmadụ jụọ ha ajụjụ. Ha na-atakwa onye ọ bụla kwuru ihe dị iche n’ihe ha chere ahụhụ. Anyị ekwesịghị ịna-eme ka ha.—Mak 3:1-6; Jọn 9:29-34.

“UNU GA-ENWETA UME”

12-14. Gịnị mere ọrụ ahụ Jizọs nyere anyị ji eme ka anyị nweta ume?

12 Gịnị mere anyị ji enweta ume ma anyị rụọ ọrụ ahụ Jizọs nyere anyị? E nwere ọtụtụ ihe kpatara ya. Mana, ka anyị leba anya n’ụfọdụ n’ime ha.

13 Anyị nwere ndị nlekọta kacha mma. Jehova, bụ́ Onye Nlekọta anyị kachanụ, abụghị nna ukwu obi fere azụ, nke na-anaghị ekele ndị meere ya ihe. O ji ọrụ anyị na-arụrụ ya kpọrọ ihe. (Hib. 6:10) Ọ na-enyekwa anyị ike anyị ga-eji rụọ ọrụ o nyere anyị. (2 Kọr. 4:7; Gal. 6:5) Jizọs, bụ́ Eze anyị, gosiri anyị otú anyị ga-esi na-emeso ndị ọzọ. (Jọn 13:15) Ndị okenye na-agbalịkwa ime ka Jizọs, bụ́ “nnukwu onye ọzụzụ atụrụ ahụ.” (Hib. 13:20; 1 Pita 5:2) Ha na-agbasi mbọ ike ịdị obiọma, ịna-enwe obi ike, na ịna-agba anyị ume ka ha na-akụziri anyị ihe ma na-echebe anyị.

14 Anyị nwere ndị enyi kacha mma. E nweghị ndị nwere ụdị ndị enyi hụrụ ha n’anya na ụdị ọrụ na-eme obi ụtọ anyị nwere. Chegodị ihe a: Ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ bụ ụmụnna anyị, bụ́ ndị nwere àgwà kacha mma na ndị na-anaghị eche na ha ka ndị ọzọ mma. Ha nwere nkà dị iche iche, ma ha anaghị eji ya anya isi. Ha na-ewere na ndị ọzọ ka ha mma. Ha anaghị ewere anyị naanị ka ndị ha na ha na-arụkọ ọrụ, kamakwa ka ndị enyi. Otú ha si hụ anyị n’anya mere ka ha dịrị njikere ịnwụ maka anyị.

15. Olee otú obi kwesịrị ịdị anyị maka ọrụ anyị na-arụ?

15 Anyị na-arụ ọrụ kacha mma. Anyị na-akụziri ndị mmadụ eziokwu gbasara Jehova, na-agbakwa ụgha Ekwensu n’anwụ. (Jọn 8:44) Ekwensu na-ebo ndị mmadụ ibu ha na-agaghị ebuli. Dị ka ihe atụ, ọ chọrọ ka anyị kweta na Jehova agaghị agbaghara anyị mmehie anyị nakwa na ọ gaghị ahụli anyị n’anya. Ihe a o kwuru bụ okpookpo ụgha na-eme ka ike ụwa gwụ ndị mmadụ. Anyị ‘bịakwute’ Jizọs, a ga-agbaghara anyị mmehie anyị. Nke bụ́ eziokwu bụ na Jehova hụrụ anyị niile n’anya. (Rom 8:32, 38, 39) Obi na-adị anyị ezigbo ụtọ inyere ndị mmadụ aka ịmụta ịtụkwasị Jehova obi ma hụ otú o si mee ka ndụ ha ka mma.

NYARA YOK JIZỌS MA KA NA-ENWETA UME

16. Olee otú ibu ahụ Jizọs sịrị anyị buru si dị iche n’ibu ndị ọzọ anyị na-ebu?

16 Ibu Jizọs gwara anyị buru dị iche n’ibu ndị ọzọ anyị na-ebu. Dị ka ihe atụ, ọ na-abụ ọtụtụ ndị si ọrụ lọta, ike agwụchaa ha, obi agaghịkwa adị ha mma. Ma, ọ bụrụ ozi Jehova na nke Kraịst ka anyị ji oge anyị jee, obi na-atọ anyị ezigbo ụtọ. Ike nwere ike ịgwụ anyị ma anyị lọta ọrụ, anyị ejisie ike gaa ọmụmụ ihe ná mgbede ahụ. Ma, ọtụtụ mgbe, anyị si ọmụmụ ihe lọta, obi na-adị anyị mma, anyị enwetakwa onwe anyị. Otú ahụ ka ọ na-adịkwa ma anyị gbaa mbọ gaa ozi ọma ma mụọ ihe nke onwe anyị. Uru ya na-akarị mbọ ọ bụla anyị gbara mee ya.

17. Gịnị ka anyị kwesịrị ịmata, gịnịkwa mere anyị ji kwesị ịkpachara anya?

17 Anyị kwesịrị ịmata na e nwere ihe anyị na-agaghị emeli. O nweghị onye n’ime anyị bụ jakị ike na-anaghị agwụ agwụ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịkpachara anya n’ihe anyị na-agbalị ime. Dị ka ihe atụ, anyị nwere ike iji ike anyị niile na-achụ akụnụba. Cheta ihe Jizọs gwara nwa okorobịa ahụ bara ọgaranya, onye jụrụ ya, sị: “Gịnị ka m ga-eme ka m wee keta ndụ ebighị ebi?” Nwa okorobịa ahụ dị mbụ na-erubere Iwu Chineke isi. Ọ ga-abụrịrị na ọ bụ ezigbo mmadụ n’ihi na Oziọma Mak kwuru na Jizọs ‘nwere ịhụnanya n’ebe ọ nọ.’ Jizọs gwara nwa okorobịa ahụ ihe ọ ga-eme. Ọ sịrị ya: “Gaa, ree ihe ndị i nwere, . . . bịakwa bụrụ onye na-eso ụzọ m.” Nwoke ahụ chọrọ iso Jizọs. Ma ọ chọghị ịhapụ “ọtụtụ ihe onwunwe” ya. (Mak 10:17-22) Ọ bụ ihe mere o ji jụ yok ahụ Jizọs sịrị ya bịa nyara. Ọ ka nọkwa na-agbara “Akụnụba” ohu. (Mat. 6:24) Gịnị ka ị gaara eme ma ọ bụrụ gị?

18. Gịnị ka o kwesịrị ịbụ anyị gụrụ gụrụ, anyị emee, n’ihi gịnịkwa?

18 Anyị kwesịrị ịna-eme, anyị gụrụ gụrụ, anyị echebara ihe ndị anyị weere ka ihe kacha mkpa echiche. N’ihi gịnị? Ọ bụ ka anyị nwee ike ịmata ma ànyị jikwa ike anyị na-eme ihe bara uru. Chegodị gbasara otu nwa okorobịa aha ya bụ Mark. Ọ sịrị: “Ruo ọtụtụ afọ, m chere na anaghị m ebi ndụ okomoko. Abụ m ọsụ ụzọ. Ma, m na-eche gbasara ego mgbe niile nakwa otú m ga-esi na-enwetakwu ihe ga-eme ka ndụ na-atọ m ụtọ. M nọ na-eche ihe mere obi anaghị adị m ụtọ. M mechara chọpụta na ihe m kacha achụ bụ ihe ndị gbasara onwe m nakwa na ọ bụ oge m na ike m fọrọ afọ ka m ji na-efe Jehova.” Mark gbanwere otú o si ele ihe anya na otú o si ebi ndụ, wepụtakwa oge jekwuoro Jehova ozi. Ọ sịrị: “Mgbe ụfọdụ, m na-echegbu onwe m gbasara ego. Ma, Jehova na Jizọs nyeere m aka imeri nsogbu a.”

19. Gịnị mere ile ihe anya otú kwesịrị ekwesị ji dị ezigbo mkpa?

19 Anyị nyara yok Jizọs, anyị ga na-enweta ume ma anyị na-eme ihe atọ ndị a: Nke mbụ, na-ele ihe anya otú kwesịrị ekwesị. Ọ bụ Jehova ka anyị na-arụrụ ọrụ. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịna-arụ ya otú Jehova chọrọ. Anyị bụ ndị ọrụ, Jehova abụrụ Nna anyị ukwu. (Luk 17:10) Anyị gbalịwa isi otú anyị chọrọ rụọ ọrụ Jehova, ọ ga-eme ka ịnyara yok ahụ siere anyị ike. Ehi siri ike nwedịrị ike imerụ onwe ya ahụ́, ike agwụkwa ya ma ọ gbalịwa mgbe niile ịgawa ebe sọrọ ya ma gbawa yok onye nwe ya ji na-eduzi ya ụkwụ. Ma, anyị mewe ihe Jehova gwara anyị, anyị ga-emeli ihe anyị chere na anyị agaghị emeli, meriekwa nsogbu ọ bụla anyị chere na anyị agaghị emerili. Cheta na o nweghị onye ga-akwụsịli Jehova ime ihe ọ chọrọ ime.—Rom 8:31; 1 Jọn 4:4.

20. Gịnị ka anyị kwesịrị ibu n’obi nyara yok Jizọs?

20 Nke abụọ, buru ezigbo ihe n’obi na-arụ ọrụ. Anyị chọrọ ime ka e too Jehova, bụ́ Nna anyị hụrụ anyị n’anya. Mgbe Jizọs nọ n’ụwa, e nwere ndị malitere iso ya n’ihi anyaukwu ma ọ bụ ihe ha ga-erite. Ma, ọ dịghị anya ha akwụsị inwe obi ụtọ ma hapụ yok Jizọs. (Jọn 6:25-27, 51, 60, 66; Fil. 3:18, 19) Ma, ndị sowere Jizọs n’ihi na ha hụrụ Chineke na ndị agbata obi ha n’anya ji obi ụtọ nyara yok Jizọs n’oge niile ha dịrị ndụ n’ụwa, nweekwa olileanya iso Jizọs chịa n’eluigwe. Obi ga-adị anyị ụtọ otú ahụ ọ dị ha ma ọ bụrụ na anyị eburu ihe dị mma n’obi nyara yok Jizọs.

21. Dị ka e kwuru na Matiu 6:31-33, olee ihe anyị nwere ike ịtụ anya ka Jehova meere anyị?

21 Nke atọ, nwee olileanya na Jehova ga na-enyere gị aka. Anyị ekpebiela ịhapụ ihe ụfọdụ ma na-efesi Jehova ike. Jizọs gwara anyị na a ga-akpagbu anyị. Ma, obi siri anyị ike na Jehova ga-enye anyị ike idi nsogbu ọ bụla bịaara anyị. Ọ bụrụ na anyị na-atachi obi, okwukwe anyị ga na-esikwu ike. (Jems 1:2-4) Anyị kwesịkwara ịtụ anya na Jehova ga-enye anyị ihe niile dị anyị mkpa, na Jizọs ga na-elekọta anyị, nakwa na ụmụnna anyị ga na-agba anyị ume. (Gụọ Matiu 6:31-33; Jọn 10:14; 1 Tesa. 5:11) È nwere ihe dị anyị mkpa Chineke na-enyebeghị anyị?

22. Gịnị ka anyị kwesịrị ịna-ekele Chineke maka ya?

22 Nwaanyị ahụ Jizọs gwọrọ nwetara onwe ya n’ụbọchị ahụ ọ gwọrọ ya. Ma, naanị ihe ga-eme ka o nweta onwe ya ruo mgbe ebighị ebi bụ iji obi ya niile na-eso ụzọ Jizọs. Olee ihe i chere o mere? Ọ bụrụ na o kpebiri ịnyara yok Jizọs, chegodị otú Chineke ga-esi gọzie ya. Ọ pụtara na ọ ga-abụ na ọ nọ ugbu a n’eluigwe. Ihe ọ bụla ọ hapụrụ iji soro Jizọs enweghị ihe ọ bụ ma e jiri ya tụnyere ụdị ngọzi ahụ. Ma olileanya anyị ọ̀ bụ ịdị ndụ ebighị ebi n’ụwa ma ọ bụ n’eluigwe, anyị kwesịrị ịna-ekele Chineke maka na anyị zara òkù Jizọs kpọrọ anyị, nke bụ́ “Bịakwutenụ m.”

ABỤ NKE 13 Ọ Bụ Kraịst Ka Anyị Na-eso

^ par. 5 Jizọs gwara anyị ka anyị bịakwute ya. Olee ihe anyị ga-eme iji bịakwute ya? A ga-aza ajụjụ a n’isiokwu a, chetakwara anyị otú anyị na Kraịst ịrụkọ ọrụ ga-esi mee ka anyị nweta ume.

^ par. 60 NKỌWA FOTO: E nwere ọtụtụ ụzọ Jizọs si mee ka ndị ọzọ nweta ume.

^ par. 66 NKỌWA FOTO: E nwere ọtụtụ ụzọ nwanna nwere ike isi mee ka ndị ọzọ nweta ume otú ahụ Jizọs mere.