Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU A NA-AMỤ AMỤ 35

Jehova Ji Ndị Ohu Ya Dị Umeala n’Obi Kpọrọ Ihe

Jehova Ji Ndị Ohu Ya Dị Umeala n’Obi Kpọrọ Ihe

“Jehova . . . na-ahụ onye dị umeala n’obi.”—ỌMA 138:6.

ABỤ NKE 48 Soro Jehova Na-eje Ije Kwa Ụbọchị

IHE ISIOKWU A NA-EKWU *

1. Olee otú obi na-adị Jehova n’ebe ndị dị umeala n’obi nọ? Kọwaa.

JEHOVA hụrụ ndị dị umeala n’obi n’anya. Ọ bụ naanị ndị dị umeala n’obi n’eziokwu ka ha na ya ga-abụli enyi. “Ma ọ na-anọ onye na-ebuli onwe ya elu n’ebe dị anya.” (Ọma 138:6) Anyị niile chọrọ ime ihe dị Jehova mma, chọọkwa ka anyị na ya dịrị ná mma. N’ihi ya, anyị kwesịrị ịmụta ịdị umeala n’obi.

2. Olee ajụjụ ndị a ga-aza n’isiokwu a?

2 N’isiokwu a, ajụjụ atọ anyị ga-aza bụ: (1) Gịnị bụ ịdị umeala n’obi? (2) Gịnị mere anyị kwesịrị iji mụta ịdị umeala n’obi? (3) Olee mgbe ụfọdụ o nwere ike isiri anyị ike ịdị umeala n’obi? Dị ka anyị ga-achọpụta, anyị mụta ịdị umeala n’obi, anyị ga-eme ka obi Jehova ṅụrịa. Ọ ga-abakwara anyị uru.—Ilu 27:11; Aịza. 48:17.

GỊNỊ BỤ ỊDỊ UMEALA N’OBI?

3. Gịnị bụ ịdị umeala n’obi?

3 Ịdị umeala n’obi bụ adịghị nganga ma ọ bụ mpako. Ihe Baịbụl kwuru gosiri na onye dị umeala n’obi ghọtara na o nweghị ebe o ruru ma e jiri ya tụnyere Jehova. Ọ ma na e nwere ihe ndị ọzọ ji ka ya mma.—Fil. 2:3, 4.

4-5. Gịnị mere onye yiri ka ọ̀ dị umeala n’obi nwere ike iji bụrụ na ọ dịghị umeala n’obi n’eziokwu?

4 E nwere ndị ị ga-ahụ, gị echee na ha dị umeala n’obi. Ha nwere ike ịbụ ndị ihere. O nwekwara ike ịbụ na omenala ha na otú e si zụọ ha mere ka ha na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù. Ma, n’ime obi ha, o nwere ike ịbụ mpako juru na ya. Ha na-emecha gosi ihe dị ha n’obi.—Luk 6:45.

5 E nwekwara ndị na-akata obi ekwu ihe ha chere, ma ọ pụtaghị na ha dị mpako. (Jọn 1:46, 47) Ma, ndị na-ekwu otú ọ dị ha n’obi kwesịkwara ịkpachara anya ka ha ghara ịtụkwasị onwe ha obi. Ma ànyị bụ ndị ihere ma ànyị na-ekwukarị otú ọ dị anyị n’obi, anyị niile kwesịrị ịgbalị mụta ịdị umeala n’obi.

Pọl onyeozi dị umeala n’obi. O cheghịkwa na ya ka ndị ọzọ mma (A ga-akọwa ya na paragraf nke 6) *

6. Dị ka e kwuru ná 1 Ndị Kọrịnt 15:10, gịnị ka anyị nwere ike ịmụta n’aka Pọl onyeozi?

6 Chegodị gbasara Pọl onyeozi. Jehova ji ya rụọ ọtụtụ ọrụ. O ji ya hiwe ọgbakọ ọhụrụ n’ebe dị iche iche. O nwekwara ike ịbụ na Pọl rụrụ ihe karịrị ihe ndịozi Jizọs Kraịst ndị ọzọ rụrụ. Ma, o meghị ka Pọl chee na ya ka ụmụnna ya mma. O kwuru ihe gosiri na ọ dị umeala n’obi. Ọ sịrị: “Abụ m onye kasị nta n’ime ndịozi, ekwesịghịkwa m ka a kpọọ m onyeozi, n’ihi na akpagburu m ọgbakọ Chineke.” (1 Kọr. 15:9) O kwuziri na naanị ihe mere ya na Chineke ji dịrị ná mma bụ n’ihi obiọma Chineke nke na-erughịrị mmadụ, ọ bụghị n’ihi na ọ bụ onye pụrụ iche ma ọ bụ n’ihi ọtụtụ ihe ọ rụrụ. (Gụọ 1 Ndị Kọrịnt 15:10.) Pọl gosiri otú e si adị umeala n’obi. N’akwụkwọ ozi o degaara Ndị Kraịst nọ na Kọrịnt, o tughị ọnụ n’agbanyeghị na ụfọdụ ndị nọ n’ọgbakọ ahụ nọ na-agbalị igosi na ha ka ya mma.—2 Kọr. 10:10.

Karl F. Klein bụ nwanna dị umeala n’obi. O sobu n’Òtù Na-achị Isi (A ga-akọwa ya na paragraf nke 7)

7. Olee otú nwanna a ma ama n’oge anyị a si gosi na ọ dị umeala n’obi?

7 Akụkọ ndụ Nwanna Karl F. Klein, bụ́ onye sobu n’Òtù Na-achị Isi, agbaala ọtụtụ ndị Jehova ume. N’akụkọ ndụ ya, otú o si dị umeala n’obi mere ka o kwuo ọtụtụ ihe ọ na-emetaghị nakwa ọtụtụ nsogbu bịaara ya ná ndụ. Dị ka ihe atụ, o kwuru na mgbe mbụ ọ gara ozi ọma ụlọ n’ụlọ bụ n’afọ 1922. Mana otú ozi ọma ahụ si siere ya ike mere na ọ gaghị ya ọzọ ruo mgbe ihe dị ka afọ abụọ gachara. Mgbe o mechara jewe ozi na Betel, o buuru otu nwanna nyere ya ndụmọdụ iwe n’obi ruo oge ụfọdụ. E nwekwara mgbe obi ezughị ike kpataara ya ọrịa, ya emechaa gbakee. Ma, ọ rụkwara ọtụtụ ọrụ dị mkpa ná nzukọ Jehova. O doro anya na ọ bụ ịdị umeala n’obi mere ka nwanna a kwuo ihe ndị ọ na-emetaghị n’ezoghị ọnụ n’agbanyeghị na ọ bụ onye a ma ama. Obi na-adị ọtụtụ ụmụnna ụtọ ma ha cheta Nwanna Klein na akụkọ ndụ ya na-atọ ụtọ, nke ọ kọrọ n’ezoghị ọnụ. *

GỊNỊ MERE ANYỊ KWESỊRỊ IJI MỤTA ỊDỊ UMEALA N’OBI?

8. Olee otú 1 Pita 5:6 si eme ka anyị ghọta na ịdị umeala n’obi na-eme Jehova obi ụtọ?

8 Ihe kacha mkpa mere anyị ji kwesị ịmụta ịdị umeala n’obi bụ na ọ na-eme Jehova obi ụtọ. Pita onyeozi mere ka ihe a doo anya. (Gụọ 1 Pita 5:6.) Akwụkwọ bụ́ ‘Bịa Bụrụ Onye Na-eso Ụzọ M’ kwuru gbasara ihe a Pita kwuru. Ọ sịrị: “Nganga dị ka nsí. Ọ pụrụ imebi ihe nke ukwuu. Ọ bụ àgwà nke pụrụ ime ka onye kasị nwee onyinye ghara ịbara Chineke uru. Otú ọ dị, ịdị umeala n’obi pụrụ ime ka onye kasị nta baara Jehova uru nke ukwuu. . . . Ọ ga-amasịkwa Chineke anyị ịkwụ gị ụgwọ n’ihi ịdị umeala n’obi gị.” * È nwere ihe karịrị ime ka obi Jehova ṅụrịa?—Ilu 23:15.

9. Olee otú ịdị umeala n’obi si eme ka ndị ọzọ na-abịa anyị nso?

9 E wezụga ime Jehova obi ụtọ, anyị ga-eritekwa ọtụtụ uru ma anyị mụta ịdị umeala n’obi. Ịdị umeala n’obi ga-eme ka ndị ọzọ na-abịa anyị nso. N’ihi gịnị? Ngwa, chegodị gbasara ụdị ndị ị na-achọ ịga nso. (Mat. 7:12) Anyị anaghị achọ ka anyị na ndị na-achọkarị ka okwu bie n’ọnụ ha na ndị bụ́ eze onye agwala m na-emekọ ihe. Ma, obi na-adị anyị ụtọ ma anyị na ụmụnna anyị nọrọ, ndị ‘ihe banyere onye ọzọ na-emetụ n’obi, ndị hụrụ ụmụnna ha n’anya, nwee obi ọmịiko, dịrịkwa umeala n’obi.’ (1 Pita 3:8) Ọ bụrụ na anyị na-achọ ka anyị na ụdị ndị ahụ na-akpa, hanwa nwekwara ike ịchọ ka anyị na ha na-akpa, ma ọ bụrụhaala na anyị dị umeala n’obi.

10. Olee otú ịdị umeala n’obi si eme ka ọ dịrị anyị mfe idi nsogbu?

10 Ịdị umeala n’obi na-emekwa ka ọ dịrị anyị mfe idi nsogbu. Anyị nwere ike ịna-ahụ ihe ndị anyị chere na ha adịchaghị otú o kwesịrị. Eze Sọlọmọn bụ́ nwoke ma ihe sịrị: “Ahụwo m ka ndị ohu na-agba ịnyịnya ma ndị isi ejiri ụkwụ na-aga dị ka ndị ohu.” (Ekli. 10:7) Ọ bụghị mgbe niile ka a na-eto ndị ma ihe. Mgbe ụfọdụ, ọ bụ ndị na-enwechaghị nke ha ma ka a na-aka eto. Ma, Sọlọmọn kwuru na ọ ga-akara anyị mma iwere ihe otú anyị si hụ ya kama ịnọ na-echegbu onwe anyị gbasara ihe na-adịghị otú o kwesịrị. (Ekli. 6:9) Ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, ọ ga-adịrị anyị mfe iwere ihe otú anyị hụrụ ya kama ịna-eche otú o kwesịrị ịdị.

OLEE MGBE ỤFỌDỤ O NWERE IKE ISIRI ANYỊ IKE ỊDỊ UMEALA N’OBI?

Gịnị mere o nwere ike iji siere anyị ike ịdị umeala n’obi ma ụdị ihe a mee? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 11 na nke 12) *

11. Olee ihe anyị kwesịrị ime ma e nye anyị ndụmọdụ?

11 Kwa ụbọchị, anyị nwere ọtụtụ ohere anyị ga-eji gosi na anyị dị umeala n’obi. Otu n’ime ha bụ mgbe e nyere anyị ndụmọdụ. Anyị kwesịrị icheta na tupu mmadụ enyewe anyị ndụmọdụ, ọ ga-abụ na anyị emejọọla ihe karịa otú anyị chere. Ụdị ihe ahụ mee, anyị nwere ike chọọ ịjụ ndụmọdụ ahụ ozugbo. Anyị nwedịrị ike bawara onye ahụ mba ma ọ bụ kwuwe na otú o si nye anyị ndụmọdụ ahụ adịghị mma. Ma, ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi, anyị ga-agbalị nabata ya.

12. Dị ka e kwuru n’Ilu 27:5, 6, gịnị mere anyị ji kwesị inwe obi ụtọ ma mmadụ nye anyị ndụmọdụ? Nye ihe atụ.

12 Onye dị umeala n’obi na-anabata ndụmọdụ. Dị ka ihe atụ, ka e were ya na ị nọ n’ọmụmụ ihe. Mgbe gị na ụmụnna ụfọdụ kparịtachara ụka, otu n’ime ha akpọpụ gị n’akụkụ, jiri akọ gwa gị na e nwere ihe tapaara gị n’ezé. O doro anya na ihere ga-emewe gị. Ma, ọ̀ bụ na obi agaghị adị gị ụtọ na ọ gwara gị? N’eziokwu, o nwedịrị ike ịkara gị mma ma a sị na e nweela onye gwara gị ya tupu mgbe ahụ. Otú ahụkwa ka anyị kwesịrị ịdị umeala n’obi ma kelee nwanna katara obi bịa nye anyị ndụmọdụ e kwesịrị inye anyị. Anyị kwesịrị iwere onye ahụ ka enyi, ọ bụghị onye iro.—Gụọ Ilu 27:5, 6; Gal. 4:16.

Gịnị mere anyị ji kwesị ịdị umeala n’obi ma e nye ndị ọzọ ọrụ n’ọgbakọ? (A ga-akọwa ya na paragraf nke 13 na nke 14) *

13. Olee otú anyị nwere ike isi gosi na anyị dị umeala n’obi ma e nye ndị ọzọ ọrụ n’ọgbakọ?

13 Mgbe e nyere ndị ọzọ ọrụ n’ọgbakọ. Otu okenye aha ya bụ Jason sịrị: “Mgbe ụfọdụ, m hụ ka e nyere ndị ọzọ ọrụ n’ọgbakọ, mụ echewe ihe mere na ọ bụghị mụnwa ka e nyere ya.” Ò nwetụla mgbe ọ dị gị otú ahụ? Ọ dịghị njọ ma mmadụ ‘gbalịwa ka o ruo eru’ ịrụkwu ọrụ n’ọgbakọ. (1 Tim. 3:1) Ma, anyị kwesịrị ịkpachara anya n’ihe anyị na-eche n’echiche. Ma ọ́ bụghị ya, anyị nwere ike ikwe ka mpako bata anyị n’obi. Dị ka ihe atụ, nwanna nwoke nwere ike ichewe na e nwere ọrụ ọ bụ ya kacha ruo eruo ịrụ. Nwunye nwanna nwekwara ike ịna-eche, sị: ‘Di m ruru eru ịrụ ọrụ a karịa nwanna nke ọzọ.’ Ma, ọ bụrụ na anyị dị umeala n’obi n’eziokwu, anyị agaghị echewe otú ahụ.

14. Olee ihe anyị nwere ike ịmụta n’ihe Mozis mere mgbe e nyere ndị ọzọ ọrụ?

14 Anyị nwere ike ịmụta ezigbo ihe n’ihe Mozis mere mgbe e nyere ndị ọzọ ọrụ. Mozis ji ọrụ e nyere ya ịbụ onye ndú Izrel kpọrọ ihe. Gịnị ka Mozis mere mgbe Jehova kwere ka ndị ọzọ na-arụ ụfọdụ ọrụ ọ na-arụbu? O meereghị ha anyaụfụ. (Ọnụ Ọgụ. 11:24-29) N’ihe gbasara ikpe ndị Izrel ikpe, o weturu obi kwe ka ndị ọzọ soro ya na-arụ ya. (Ọpụ. 18:13-24) E si otú ahụ nwekwuo ndị ga na-ekpe ndị Izrel ikpe ka ihe na-aga aga. Ihe ahụ Mozis mere gosiri na o ji ihe ga-abara ndị Izrel uru kpọrọ ihe karịa ịrụ ọtụtụ ọrụ. Anyị kwesịrị ịgbalị mụta ihe ahụ o mere. Ka anyị na-echeta na ọ bụrụ na anyị chọrọ ịbara Jehova uru, ịdị umeala n’obi dị mkpa karịa inwe nnukwu nkà. “Jehova dị elu, ma ọ na-ahụ onye dị umeala n’obi.”—Ọma 138:6.

15. Olee otú ihe si gbanweere ọtụtụ ụmụnna?

15 Mgbe ihe gbanwere ná ndụ anyị. N’afọ ndị na-adịbeghị anya, a gbanweerela ọtụtụ ụmụnna ọrụ n’agbanyeghị na ha arụọla ọrụ ahụ ọtụtụ afọ. Dị ka ihe atụ, n’afọ 2014, nzukọ Jehova kwuru na a gaghịzi enwe ndị nlekọta distrikti. N’ihi ya, e nyere ha na nwunye ha ọrụ ọzọ. Malite n’afọ ahụ, ndị nlekọta sekit rurula afọ iri asaa ga-akwụsị ọrụ ha. Ụmụnna rurula afọ iri asatọ ga-akwụsịkwa ịbụ ndị na-ahaziri ndị okenye ọrụ. Ihe ọzọ bụ na, kemgbe afọ ole na ole, a gwala ọtụtụ ndị nọ na Betel ka ha gaa sụwa ụzọ. E nwekwara ndị nke kwụsịrị ozi oge niile pụrụ iche ha na-eje n’ihi ọrịa, ibu ezinụlọ, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ.

16. Olee otú ụmụnna anyị si gosi na ha dị umeala n’obi ma nabata ozi a gbanweere ha?

16 Ihe ndị ahụ a gbanwere adịghịrị ụmụnna ndị ahụ mfe. O doro anya na ọ bụ n’ihi otú ozi ahụ si na-atọ ha ụtọ. Ọtụtụ n’ime ha ejeela ya ọtụtụ afọ. Otú o si ewute ụfọdụ n’ime ha na-eme ka ọ dị ka hà na-eruru ozi ahụ uju. Ma, ka oge na-aga, ha malitekwara inwe obi ụtọ. N’ihi gịnị? Ihe kacha nyere ha aka bụ na ha hụrụ Jehova n’anya. Ha ma na ọ bụ Jehova ka ha nyefere onwe ha, ọ bụghị ọrụ e nyere ha ma ọ bụ ihe a na-akpọ ha. (Kọl. 3:23) Obi dị ha ụtọ iji obi umeala na-ejere Jehova ozi n’agbanyeghị ụdị ozi ọ bụ. Ha ‘na-atụkwasị ya nchegbu ha niile,’ n’ihi na ha ma na ihe banyere ha na-emetụ ya n’obi.—1 Pita 5:6, 7.

17. Gịnị mere obi ji dị anyị ụtọ na Okwu Chineke gbara anyị ume ịmụta ịdị umeala n’obi?

17 Obi dị anyị ezigbo ụtọ na Okwu Chineke gwara anyị ka anyị mụta ịdị umeala n’obi. Ọ bụrụ na anyị adị umeala n’obi, ndị ọzọ ga na-akpa anyị nso, ọ ga-abakwara anyị na ha uru. Ọ ga-emekwa ka ọ dịrị anyị mfe idi nsogbu ndị bịaara anyị. Nke ka nke bụ na ọ ga-eme ka anyị na Nna anyị nke eluigwe dịkwuo ná mma. Obi dị anyị ezigbo ụtọ ịmata na n’agbanyeghị na ọ bụ “Onye Dị Elu na Onye Ukwu,” o ji ndị ohu ya dị umeala n’obi kpọrọ ihe.—Aịza. 57:15.

ABỤ NKE 45 Ihe M Na-atụgharị n’Uche

^ par. 5 Otu n’ime àgwà kacha mkpa anyị kwesịrị ịmụta bụ ịdị umeala n’obi. Gịnị bụ ịdị umeala n’obi? Gịnị mere anyị kwesịrị iji mụta ya? Gịnị mere o nwere ike iji siere anyị ike ịdị umeala n’obi ma ihe gbanweere anyị? A ga-aza ajụjụ ndị a dị mkpa n’isiokwu a.

^ par. 7 Gụọ isiokwu bụ́ “Jehova Emesowo M Nke Ọma,” n’Ụlọ Nche April 15, 1985, peeji nke 21.

^ par. 8 Gụọ isi nke 3, paragraf nke 23.

^ par. 53 NKỌWA FOTO: Ebe Pọl onyeozi nọ n’ụlọ otu nwanna, ya na ndị ọzọ ana-akparịta ụka, ma ụmụaka. Ihe a gosiri na ọ dị umeala n’obi.

^ par. 57 NKỌWA FOTO: Ebe nwanna na-anara ndụmọdụ nwanna na-akatabeghị ahụ́ si na Baịbụl na-enye ya.

^ par. 59 NKỌWA FOTO: Ebe nwanna nke katarala ahụ́ na-ele nwanna nke ọzọ e nyere ọrụ n’ọgbakọ, ma ọ naghị emere ya anyaụfụ.