Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Icheoku nke na-acha anụnụ anụnụ na odo odo. Ogologo ya: sentimita iri asatọ na ise

Ọmarịcha Icheoku

Ọmarịcha Icheoku

ICHEOKU dị́ ọtụtụ na-efe n’elu, ha na-ama ezigbo mma. Mgbe ndị na-eme nchọpụta si Yurop gaa ebe bụ Nikaragụa ugbu a na mba ndị dị n’ebe ndịda ya n’ihe dị ka narị afọ ise gara aga, icheoku ndị ha hụrụ riri ha ọnụ. Ha mara ezigbo mma, nweekwa ọdụ ogologo. Ka oge na-aga, a malitere ise icheoku na map obodo ndị dị n’ebe ahụ.

Icheoku niile na-ama mma, ma oké ma nne. O nweghị nnụnụ ọzọ oké ya na nne ya na-ama mma otú ahụ. Icheoku ma ihe. Ha na-esokarị n’ìgwè, na-emekwa oké ụzụ. Ha nwere ike iru iri atọ si n’akwụ́ ha dị iche iche gawa ịkpa nri n’isi ụtụtụ. Nri ha bụ mkpụrụ osisi ndị dị́ n’ọhịa. Ha hụ nri ha chọrọ iri, ha agado ya ụkwụ, werezie ọnụ na-atụrụ ya. Ha nwedịrị ike iji ọnụ ha tapuo ihe sịrị ike ka akị. Ha richaa, ha na-efegakarị n’elu ugwu ma ọ bụkwanụ n’akụkụ mmiri gaa tụrịa ụrọ. Ụrọ ahụ na-eme ka ihe ọ bụla ha riri ghara inye ha nsogbu n’afọ.

‘Chineke emewo ka ihe ọ bụla maa mma n’oge ya.’—Ekliziastis 3:11

Oké icheoku ọ bụla na-ahọrọ nke nne ya na ya ga-ebi ruo mgbe ha nwụrụ. Ha abụọ na-ejikọkwa aka elekọta ụmụ ha. Ebe ndị ha na-ebi bụ n’oghere ndị dị́ n’osisi, ọnụ dị́ n’akụkụ mmiri, n’ugwu, nakwa na mkpu. Ha nọrọ, ha ana-atụcha onwe ha. Ụkwụ na-esi nwa icheoku ike n’ala ma o ruo ọnwa isii, ma, ya na nne ya na nna ya na-anọ ruo mgbe o ruru ihe dị ka afọ atọ. Icheoku ndị bi n’ọhịa na-anọru afọ iri atọ ma ọ bụ afọ iri anọ, ebe ndị nke a na-azụ azụ na-anọ ihe karịrị afọ iri isii. E nwere ụdị icheoku iri na asatọ. E sere ụfọdụ n’ime ha ebe a.

Icheoku nke na-acha ọbara ọbara na akwụkwọ ndụ akwụkwọ ndụ. Ogologo ya: ihe fọrọ obere ka o ruo otu mita

Icheoku nke na-acha uhie uhie. Ogologo ya: sentimita iri asatọ na ise

Icheoku nke na-acha anụnụ anụnụ. Ogologo ya: otu mita. Ọ kacha ndị nke ọzọ ibu, ọ fọrọ obere ka o ruo otu kilogram na ọkara