Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

È KERE YA EKE?

Otú Aṅụ Si Efedata

Otú Aṅụ Si Efedata

AṄỤ nwere ike isi otú ọ bụla masịrị ya fedata n’enweghị nsogbu ọ bụla. Olee otú o si eme ya?

Ihe Ị Ga-echebara Echiche: Tupu aṅụ enwee ike ifedata nke ọma, ọ ga-ebu ụzọ belata ọsọ o ji na-efe, ọ na-afọkwa ntakịrị ka ọ bụrụ na ọ kwụsịchaala tupu ya ebere n’ihe. O nwere ihe abụọ ọ ga-agbakọrịrị tupu ya enwee ike ifedata nke ọma. Nke mbụ bụ ọsọ o ji na-efe, nke abụọ abụrụ otú ebe ọ chọrọ ibekwasị dịruru n’anya. Ihe a na-eme ka ọ mara otú ọ ga-esi belata ọsọ ya. Ma, ọ ga-esiri ọtụtụ ụmụ ahụhụ ndị ọzọ ike ime ihe ndị a n’ihi na anya ha anaghị enwe ike ịmata otú ihe dịruru n’anya.

Otú aṅụ si ahụ ụzọ dị nnọọ iche n’otú anyịnwa si ahụ ụzọ n’ihi na anyị nwere ike iji anya anyị mata otú ihe dịruru n’anya. Ọ dị ka ihe na-enyere aṅụ aka ịma otú ihe dịruru n’anya bụ na ka ọ na-abịa ihe nso, ihe ahụ ga na-ebukwu ya ibu n’anya. Nchọpụta ndị e mere na mahadum a na-akpọ Australian National University gosiri na aṅụ na-ebelata ọsọ o ji na-efe otú ga-eme ka ihe ọ na-ele anya jiri nwayọọ na-ebukwu ibu. Ọ bụ ihe a na-eme ka aṅụ nwee ike ifedata nke ọma n’emerụghị ahụ́.

Akwụkwọ bụ́ Proceedings of the National Academy of Sciences, kwuru, sị: “N’ihi otú a o si adịrị aṅụ mfe ifedata n’enweghị nsogbu ọ bụla . . . ọ dị mma ilere anya na ya rụọ robọt ndị ga na-efegharị n’enweghị nsogbu ọ bụla.”

Gịnị ka i chere? Otú ahụ aṅụ si efedata n’enweghị nsogbu ọ bụla, ọ̀ nọkatara dịrị, ka è nwere onye kere ya otú ahụ?