Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Okwu Mmalite

Okwu Mmalite

Ihe Iri na Abụọ Na-eme Ka Ezinụlọ Na-enwe Obi Ụtọ

Anyị na-anụkarị ọtụtụ ihe mere ọtụtụ ezinụlọ ji enwe nsogbu. Ma, oleekwanụ ihe mere ezinụlọ ụfọdụ ji enwe obi ụtọ?

  • N’Amerịka, n’agbata afọ 1990 na afọ 2015, otú ndị di na nwunye dị ihe karịrị afọ iri ise si na-agba alụkwaghịm ji okpukpu abụọ karịa otú ọ dịbu, ndị nke dị ihe karịrị afọ iri isii na ise ji okpukpu atọ karịa otú ọ dịbu.

  • Ndị nne na nna amaghịzi nke ha ga-eso eso n’ihi na ụfọdụ ndị ọkachamara sịrị na ọ kacha mma ịna-apa ụmụaka apa, ndị ọzọ ekwuo na ọ ka mma iji aka ike na-azụ ha.

  • Ụmụaka na-eto, ghọọ dimkpa n’enwetaghị ọzụzụ ga-enyere ha aka ná ndụ.

N’agbanyeghị ihe a niile, nke bụ́ eziokwu bụ na . . .

  • Di na nwunye nwere ike ịna-enwe obi ụtọ, gharakwa itisa.

  • Ndị nne na nna nwere ike ịmụta otú ha ga-esi eji ịhụnanya na-agbazi ụmụ ha.

  • Ụmụaka nwekwara ike ịmụta ihe ndị ga-enyere ha aka ibi ndụ dị mma ma ha too.

Olee otú ihe ndị a ga-esi kwe omume? Teta! a lebara anya n’ihe iri na abụọ ga-eme ka ezinụlọ na-enwe obi ụtọ.