OTÚ Ị GA-ESI NA-ENWE OBI ỤTỌ
Inwe Afọ Ojuju na Imesapụ Aka
Ị̀ NA-ANỤKARỊ KA NDỊ MMADỤ NA-EKWU NA Ọ BỤ NDỊ NWERE AKỤNỤBA BỤ NDỊ IHE NA-AGAZIRI NA NDỊ NA-ENWE OBI ỤTỌ? Ọ bụ ụdị echiche a na-eme ka ọtụtụ nde mmadụ na-arụgbu onwe ha n’ọrụ ọtụtụ awa iji kpata ego. Ma, inweta ego na ọtụtụ ihe onwunwe, ọ̀ na-eme ka mmadụ na-enwe obi ụtọ? Olee ihe ihe ndị na-eme eme na-egosi?
Otu akwụkwọ aha ya bụ Journal of Happiness Studies, kwuru na ozugbo anyị nwetara ego ga-ezuru anyị iji gboo mkpa anyị, inwetakwu ego agaghị eme ka anyị nwekwuo obi ụtọ. Ego n’onwe ya adịghị njọ, kama, dị ka Akwụkwọ aha ya bụ Monitor on Psychology kwuru, ọ bụ “ịchụ [ego] ọnwụ ọnwụ bụ ihe na-eme ka mmadụ ghara inwe obi ụtọ.” Ihe a akwụkwọ a kwuru dabara n’otu ndụmọdụ Baịbụl sịrị: ‘Ịhụ ego n’anya bụ mgbọrọgwụ nke ụdị ihe ọjọọ niile. Site n’ịchụso ụdị ịhụnanya a, . . . ụfọdụ . . . ejirila ọtụtụ ihe mgbu maa onwe ha aghara aghara dị ka mma.’ (1 Timoti 6:9, 10) Olee ihe ndị so n’ihe mgbu ndị ahụ?
NCHEKASỊ NA EHIGHI ỤRA EBE A NA-ACHỌ ICHEKWA AKÙ A KPAKỌBARA. Ekliziastis 5:12 kwuru, sị: “Ụra onye na-eje ozi na-atọ ya ụtọ, n’agbanyeghị ma ọ̀ bụ ihe nta ma ọ bụ ihe ukwu ka o riri; ma ọtụtụ ihe onye ọgaranya nwere adịghị ekwe ya ka ọ rahụ ụra.”
OBI ỌJỌỌ N’IHI ENWETAGHỊ OBI ỤTỌ A TỤRỤ ANYA YA. Mgbe ụfọdụ, ihe na-akpata ya bụ na ego anaghị eju ndị na-achụ ya afọ. Baịbụl kwuru, sị: “Ọlaọcha agaghị eju onye hụrụ ọlaọcha n’anya afọ, ego agaghịkwa eju onye ọ bụla nke hụrụ akụ̀ n’anya afọ.” (Ekliziastis 5:10) Ọzọ abụrụ na ịchụ akụnụba nwere ike ime ka mmadụ leghara ihe ndị dị mkpa na-eme mmadụ obi ụtọ anya, dị ka, mmadụ na ezinụlọ ya na ndị enyi ya ịnọrị, na ime ihe ndị gbasara ofufe Chineke.
MWUTE NA NKỤDA MMỤỌ MGBE AKỤNỤBA DAKPỌRỌ. Ilu 23:4, 5 kwuru, sị: “Adọgbula onwe gị n’ọrụ inweta akụnụba. Kwụsị ịdabere ná nghọta gị. Ì legidewo ya anya, n’agbanyeghị na o nweghị ihe ọ bụ? N’ihi na ọ na-emere onwe ya nku dị ka nke ugo wee fepụ.”
IHE NDỊ NA-EME KA A NA-ENWE OBI ỤTỌ
INWE AFỌ OJUJU. “Ọ dịghị ihe anyị ji bịa n’ụwa, ọ dịghịkwa ihe anyị pụrụ iwere si n’ime ya pụọ. Ya mere, ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju n’ihe ndị a.” (1 Timoti 6:7, 8) Ndị ihe ha nwere juru afọ anaghị eme mkpesa ma ọ bụ na-atamu ntamu, ọ na-emekwa ka ha ghara ịbụ ndị anya ụfụ. Ebe ọ bụ na ha na-ekowe akpa ha ebe aka ha ga-eru, ha anaghị enwe nchegbu na-enweghị isi.
IMESAPỤ AKA. “A na-enweta obi ụtọ ka ukwuu n’inye ihe karịa ka a na-enweta n’ịnara ihe.” (Ọrụ Ndịozi 20:35) Ndị na-emesapụ aka na-enwe obi ụtọ n’ihi na ha na-eme ka ndị ọzọ nwee obi ụtọ, ya bụrụgodị obere oge ha ma ọ bụ ike ha ka ha nyere. Ọtụtụ mgbe, a gaghị ejili ego zụta uru ndị ha ga-erite. Dị ka ihe atụ, ndị ọzọ ga na-ahụ ha n’anya, na-akwanyere ha ùgwù, ha enweekwa ezigbo ndị enyi ga na-emekwara ha otú ha na-emere ndị ọzọ.—Luk 6:38.
ỊHỤ NDỊ MMADỤ N’ANYA KARỊA IHE ONWUNWE. “Nri e ji naanị akwụkwọ nri sie dị mma n’ebe e nwere ịhụnanya karịa ehi mara abụba n’ebe e nwere ịkpọasị.” (Ilu 15:17) Gịnị ka amaokwu a na-ekwu? Ọ na-ekwu na mmadụ na ibe ya ịdị ná mma dị mkpa karịa inwe akụnụba. E mechaa, anyị ga-ahụkwa na igosi ndị ọzọ na anyị hụrụ ha n’anya na-eme ka e nwee obi ụtọ.
Otu nwaanyị bi n’ebe Ndịda Amerịka aha ya bụ Sabina ghọtara uru ime ihe Baịbụl kwuru bara. Di ya gbahapụrụ ya na ụmụ ya nwaanyị abụọ. Kemgbe ahụ, ya ana-adọgbu onwe ya n’ọrụ ịkpa afọ ya na ụmụ ya. Ọ na-arụ ọrụ ebe abụọ, nke na-eme ka ọ na-ebili n’elekere anọ nke ụtụtụ kwa ụbọchị. N’agbanyeghị otú ihe si dịrị ya kachị kachị, Sabina malitere ịmụ Baịbụl. Gịnị si na ya pụta?
Ọ bụ eziokwu na ọ bịaghị baa ọgaranya, ma otú o si ele ihe anya bịara kakwuo mma. Dị ka ihe atụ, ọ bịara na-enwe obi ụtọ n’ihi ihe ndị ọ na-amụta na Baịbụl. (Matiu 5:3) O nwetara ezigbo ndị enyi n’etiti Ndị Chineke, nwetakwa obi ụtọ mmadụ na-enwe n’ihi na ọ na-akụziri ndị ọzọ ihe ndị ọ mụtara na Baịbụl.
Baịbụl kwuru, sị: “A na-egosi na amamihe ziri ezi site n’ọrụ ya.” (Matiu 11:19) Nke a na-egosi na mmadụ inwe afọ ojuju n’ihe o nwere, imesapụ aka, na ịhụ ndị mmadụ n’anya karịa ihe onwunwe bụ ihe kwesịrị ekwesị.