OTÚ Ị GA-ESI NA-ENWE OBI ỤTỌ
Mụtakwuo Ihe Ndị Ọzọ
Ị̀ JỤTỤLA ONWE GỊ AJỤJỤ NDỊ A?
-
Olee otú ezinụlọ m ga-esi na-enwe obi ụtọ?
-
Olee otú m ga-esi emeta ezigbo ndị enyi ma bụrụkwa ezigbo enyi?
-
Ndị nwụnahụrụ m, hà ga-adị ndụ ọzọ?
-
È nwere mgbe ahụhụ ga-akwụsị?
-
Ụmụ mmadụ hà ga-emecha bibie ụwa a?
-
Okpukpe niile hà na-efe ezi Chineke ahụ?
I NWERE IKE ỊCHỌTA AZỊZA AJỤJỤ NDỊ A NAKWA AZỊZA AJỤJỤ NDỊ ỌZỌ
Gaa n’adres Ịntanet anyị bụ́ jw.org/ig. Ọ dịkwa n’ihe karịrị narị asụsụ itoolu ndị ọzọ. N’ebe ahụ, ị ga-ahụ isiokwu dị iche iche ga-enyere gị aka ná ndụ.
I nwekwara ike ịnọ ebe ahụ lee vidio ndị gosiri otú ndị dị iche iche si chọta ụzọ e si enweta obi ụtọ ma nọgidekwa na ya. Ụfọdụ n’ime ha bụbu ndị na-aṅụ ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ ndị nọbu n’ụlọ mkpọrọ. Ndị ọzọ abụrụ ndị gụrụ oké akwụkwọ na ndị sayensị.
I nwere ike ịnọ na jw.org gụọ ma ọ bụ danloduo Baịbụl nakwa akwụkwọ ndị ọzọ ga-amasị gị n’akwụghị ụgwọ ọ bụla. Ụfọdụ n’ime akwụkwọ ndị ahụ bụ:
-
Teta! Jenụwarị-Febụwarị 2015, isiokwu ya bụ: “Ihe Na-eme Ka Mmadụ Nwee Obi Ụtọ.”