Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ Ị GA-ESI NA-ENWE OBI ỤTỌ

Ịhụnanya

Ịhụnanya

ỤMỤ MMADỤ NA-ACHỌKARỊ KA A HỤ HA N’ANYA. Ihe agaghị na-aga nke ọma n’alụmdi na nwunye, n’ezinụlọ ma ọ bụ n’etiti ndị enyi ma ọ bụrụ na ha enweghị ịhụnanya. Ihe ọ pụtara bụ na ịhụnanya nwere ike ime ka mmadụ na ibe ya na-adị ná mma ma na-enwe obi ụtọ. Ma, gịnịdị bụ “ịhụnanya”?

Ịhụnanya a na-ekwu okwu ya ebe a abụghị ịhụnanya nwoke na nwaanyị, ọ bụ eziokwu na nke ahụ dịkwa mkpa. Kama, ọ bụ ụdị ịhụnanya pụrụ iche nke na-eme ka mmadụ si n’ala ala obi ya na-achọkarị ọdịmma ndị ọzọ tupu nke ya. A na-egosi ụdị ịhụnanya a otú Chineke kwuru ka e si na-egosi ya. Ma, ọ pụtaghị na ọ bụ ịhụnanya jụrụ oyi.

Otu ụzọ magburu onwe ya Baịbụl si kọwaa ịhụnanya bụ: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma. Ịhụnanya adịghị ekwo ekworo, ọ dịghị etu ọnụ, ọ dịghị afụli onwe ya elu, ọ dịghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị, ọ dịghị achọ ọdịmma nke ya, ọ dịghị abụ nke a kpasuru iwe. Ọ dịghị agụkọ ihe ọjọọ. Ọ dịghị aṅụrị ọnụ n’ihi ajọ omume, kama ọ na-eso eziokwu aṅụrị ọṅụ. Ọ na-edi ihe niile, na-ekwere ihe niile, na-enwe olileanya ihe niile, na-atachi obi n’ihe niile.”​—⁠1 Ndị Kọrịnt 13:​4-8.

Ụdị ịhụnanya a “anaghị ada ada” n’ihi na o nweghị mgbe ọ ga-akwụsị ịdị. Kama, ọ ga na-esikwu ike ka oge na-aga. Ebe ọ bụ na ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi na obiọma ma na-agbagharakwa mmejọ, ọ bụ “ihe nkekọ zuru okè nke ịdị n’otu.” (Ndị Kọlọsi 3:14) Ọ bụ ya mere ndị nwere ụdị ịhụnanya a n’ebe ibe ha nọ ji enwe obi ụtọ na obi iru ala, n’agbanyeghị na ha ezughị okè. Ugbu a, ka anyị lebatụ anya n’ihe gbasara alụmdi na nwunye.

NDỊ “IHE NKEKỌ ZURU OKÈ NKE ỊDỊ N’OTU” JIKỌTARA

Jizọs kụziri ọtụtụ ihe ga-abara ndị di na nwunye uru. Dị ka ihe atụ, ọ sịrị: “ ‘Nwoke ga-ahapụ nna ya na nne ya wee rapara n’ahụ́ nwunye ya, ha abụọ ga-abụ otu anụ ahụ́’ . . . Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Matiu 19:​5, 6) Ọ dịkarịa ala, e nwere ihe abụọ ebe a kwuru ga-abara ha uru.

“HA ABỤỌ GA-ABỤ OTU ANỤ AHỤ́.” Alụmdi na nwunye bụ ihe kacha ejikọ mmadụ na ibe ya. Ọ bụkwanụ ịhụnanya na-eme ka di ma ọ bụ nwunye ghara ịgba n’èzí. Ịgba n’èzí ga-eme ka ha na onye na-abụghị di ha ma ọ bụ nwunye ha bụrụzie otu anụ ahụ́. (1 Ndị Kọrịnt 6:16; Ndị Hibru 13:⁠4) Ịgba n’èzí na-eme ka di na nwunye ghara ịtụkwasị onwe ha obi. O nwekwara ike ime ka ha tisaa. Ọ bụrụ na ha mụrụ ụmụ, ọ ga-adị ụmụ ha ka o nweghị ihe e ji ha kpọrọ ma ọ bụkwanụ obi agaghị eru ha ala.

“IHE CHINEKE KEKỌTARA.” Alụmdi na nwunye dịkwa nsọ n’anya Chineke. Di na nwunye ghọtara nke a na-eme ike ha ka alụmdi na nwunye ha bụrụ a kwaa akwụrụ. Ha anaghị achọwa otú ha ga-esi etisa ma ha nwee nsogbu. Ịhụnanya ha na-esi ezigbo ike, bụrụkwa a kwaa akwụrụ. Ụdị ịhụnanya a na-eme ka ha “na-edi ihe niile,” na-agbalị idozi nsogbu ha, si otú ahụ mee ka ha na-adị n’udo ma dịrịkwa n’otu.

Ọ bụrụ na ndị nne na nna ejiri obi ha niile hụ onwe ha n’anya, ọ ga-abara ụmụ ha ezigbo uru. Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Jessica kwuru, sị: “Papa m na mama m hụrụ onwe ha n’anya n’eziokwu ma na-akwanyere ibe ha ùgwù. Otú mama m si akwanyere papa m ùgwù ma na-akwado mkpebi ya na-eme ka ọ na-agụ m agụụ ime ka ya.”

Ịhụnanya bụ àgwà bụ́ isi Chineke nwere. Baịbụl kwudịrị na “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:⁠8) Ọ bụ ya mere na ọ naghị eju anyị anya na Baịbụl kpọkwara Jehova, “Chineke bụ́ onye obi ụtọ.” (1 Timoti 1:11) Anyị ga na-enwekwa obi ụtọ ma ọ bụrụ na anyị agbaa mbọ na-eṅomi àgwà dị iche iche Onye kere anyị nwere, karịchaa, ịhụnanya ya. Ndị Efesọs 5:​1, 2 kwuru, sị: “Ghọọnụ ndị na-eṅomi Chineke, dị ka ụmụ a hụrụ n’anya, na-ejekwanụ ije n’ịhụnanya.”