N’ỤWA A NSOGBU JURU
3 | Na-ahụ Ndị Gị na Ha Dị ná Mma n’Anya
IHE MERE O JI DỊ MKPA
Otú nsogbu si akakwu njọ n’ụwa na-eme ka ọtụtụ ndị na-echegbu onwe ha, ya emezie ka ha kwụsị ịna-ahụ ndị ha na ha dị ná mma n’anya. Ha nwere ike ime ya n’amaghị ụma.
-
Ndị mmadụ na-ahapụ ndị enyi ha gaa nọrọ naanị ha.
-
Di na nwunye na-esekarị okwu karịa otú ha na-emebu.
-
Ndị mụrụ ụmụ anaghị elebachara ihe ndị na-enye ụmụ ha nsogbu n’obi anya, ụfọdụ anaghị elebatụdịrị ha anya.
Ihe I Kwesịrị Ịma
-
Inwe ezigbo ndị enyi na-eme ka ahụ́ sie anyị ike, na-emekwa ka obi ruo anyị ala, karịchaa, n’oge nsogbu.
-
Nsogbu juru n’ụwa nwere ike ikowe unu obi n’elu ma kpaghasịa ezinụlọ unu otú unu na-atụghị anya ya.
-
Akụkọ ọjọọ ndị a na-agbasa na tivii ma ọ bụ na redio nwere ike imenye ụmụ gị ụjọ karịa otú i chere.
Ihe Ndị I Nwere Ike Ime Ugbu A
Baịbụl sịrị: “Ezigbo enyi na-egosi mgbe niile na ọ hụrụ enyi ya n’anya. Ọ bụkwa nwanne nke na-enyere enyi ya aka n’oge nsogbu.”—Ilu 17:17.
Ndị enyi anyị nwere ike inyere anyị aka ma nye anyị ezigbo ndụmọdụ. Naanị ịmara na e nwere ndị hụrụ gị n’anya nwere ike ime ka i kpebisikwuo ike na ị ga-edi nsogbu ndị bịaara gị.