IHE BAỊBỤL KWURU
Ite Ime
Kwa afọ, afọ ime ndị mmadụ na-akpachara anya ete na-akarị nde iri ise. Ọnụ ọgụgụ a karịdịrị ọnụ ọgụgụ ndị bi ná mba ụfọdụ.
Ite ime ọ̀ bụ ihe mmadụ ga-ekpebiri onwe ya, ka ọ̀ gbasara iwu Chineke?
IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU
O nwere ihe na-akpata ụfọdụ ụmụ nwaanyị ji ete ime. O nwere ike ịbụ n’ihi ihe isi ike, esemokwu di na nwunye, ịchọ ịgakwu akwụkwọ, ma ọ bụkwanụ achọghị ịmụta nwa na-enweghị nna. Ma, o nwekwara ndị chere na ite ime bụ ihe ọjọọ, nakwa na nwaanyị mere ụdị ihe ahụ aghọọla nkịta tara ọkpụkpụ a nyawara ya n’olu.
IHE BAỊBỤL KWURU
N’anya Chineke, ndụ bụ ihe dị oké ọnụ ahịa, karịchaa ndụ mmadụ. (Jenesis 9:6; Abụ Ọma 36:9) Otú Chineke si ele ndụ dimkpa anya ka o sikwa ele ndụ nwa e bu n’afọ anya. Ọ bụ ya mere o ji mee ka nwa na-anọ n’akpa nwa ka ihe ọ bụla ghara ime ya ruo mgbe a ga-amụ ya. Otu onye so dee Baịbụl kwuru, sị: “I kpuchiri m ekpuchi n’ime afọ nne m.” O kwukwara, sị: “Anya gị hụrụ m ọbụna mgbe m bụ nwa e bu n’afọ; e dekwara akụkụ ahụ́ m niile n’akwụkwọ gị, bụ́ ụbọchị a kpụrụ ha.”—Abụ Ọma 139:13, 16.
Ihe Chineke kwuru n’Iwu o nyere ụmụ Izrel nakwa otú o si kee akọnuche anyị gosiri na o jighị ndụ nwa e bu n’afọ egwu egwu. Iwu Chineke kwuru na a ga-egbu onye ọ bụla kụrụ nwaanyị di ime ihe, nwa o bu n’afọ anwụọ. Onye ahụ ga-eji ndụ ya kwụọ ụgwọ ndụ ahụ ọ lara n’iyi. (Ọpụpụ 21:22, 23) Ma, ndị ikpe ga-eleba anya n’ihe onye ahụ bu n’obi na ihe ndị gbara ya gburugburu.—Ọnụ Ọgụgụ 35:22-24, 31.
Chineke nyekwara ụmụ mmadụ akọnuche. Ọ bụrụ na nwaanyị dị ime e gee akọnuche ya ntị ma ghara igbu nwa o bu n’afọ, akọnuche ya agaghị na-enye ya nsogbu. * Ma, ọ bụrụ na o geghị akọnuche ya ntị, akọnuche ya ga na-apịa ya ụtarị. (Ndị Rom 2:14, 15) Nchọpụta ndị e mere gosiri na ụmụ nwaanyị ndị terela ime na-emecha bido chegbuwe onwe ha ma ọ bụkwanụ na-ada mbà n’obi.
Ma, oleekwanụ ihe a ga-eme ma ọ bụrụ na ọ ga-esi ike ịzụ nwa ahụ ma a mụọ ya, karịchaa ma ọ bụrụ na ime ahụ menahụrụ di na nwunye ahụ emenahụ? Lee ihe Chineke sịrị na ọ ga-emere ndị niile na-erubere ya isi: “Onye na-eguzosi ike n’ihe ka ị ga-eji iguzosi ike n’ihe meso ihe; ị ga-emeso onye na-enweghị ntụpọ, bụ́ dimkpa, ihe n’ụzọ na-enweghị ntụpọ.” (Abụ Ọma 18:25) Baịbụl kwukwara, sị: “Jehova hụrụ ikpe ziri ezi n’anya, ọ gaghịkwa ahapụ ndị na-eguzosi ike n’ebe ọ nọ.”—Abụ Ọma 37:28.
“Akọ na uche ha so ha na-agba àmà, n’echiche nke ha kwa, ha bụ ndị a na-ebo ebubo ma ọ bụ ọbụna ndị a na-agọpụ.”—Ndị Rom 2:15.
Gịnị ka ị ga-eme ma ọ bụrụ na o nwetụla mgbe i tere ime?
IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU
Otu nwaanyị aha ya bụ Ruth naanị ya na-azụ ụmụ kwuru, sị: “Eji m ụmụ atọ. Achọghịkwanụ m ịmụta ọzọ. Ma, mgbe m techara ime, obi m nọ na-agwa m na mụ emeela arụ.” * Ma, nwaanyị a ò meela mmehie Chineke na-agaghị agbagharali ya?
IHE BAỊBỤL KWURU
Jizọs Kraịst kwuru uche Chineke mgbe ọ sịrị: “Ọ bụghị ndị ezi omume ka m bịara ịkpọ, kama ọ bụ ndị mmehie, ka ha wee chegharịa.” (Luk 5:32) N’eziokwu, ọ bụrụ na anyị akwaa ụta maka ihe ọjọọ anyị mere ma chegharịa ma ọ bụ rịọ Chineke mgbaghara, ọ ga-agbaghara anyị, ọ sọgodị ya ya bụrụ mmehie dị oké njọ. (Aịzaya 1:18) Abụ Ọma 51:17 sịrị: “Chineke, ị gaghị eleghara obi tiwara etiwa, nke nọ ná mwute, anya.”
E wezụga inwe akọnuche dị ọcha, Chineke na-emekwa ka onye kwara ụta n’ihi ihe o mere nwee udo nke obi ma onye ahụ rịọ ya mgbaghara n’ekpere. Ndị Filipaị 4:6, 7 sịrị: “Jirinụ ekpere na ịrịọsi arịrịọ ike na inye ekele mee ka Chineke mara ihe unu na-arịọ; udo nke Chineke nke karịrị echiche niile ga-eche obi unu na ike iche echiche unu nche.” * Mgbe Ruth anyị kwuburu okwu ya mụrụ Akwụkwọ Nsọ, rịọkwa Chineke arịrịọ n’ekpere, o nwetara udo nke obi. Ọ matara na “ezi mgbaghara dị n’aka” Chineke.—Abụ Ọma 130:4.
‘Chineke adịghị emeso anyị dị ka mmehie anyị si dị; ọ dịghịkwa enye anyị ntaramahụhụ dị ka njehie anyị si dị.’—Abụ Ọma 103:10.
^ para. 8 Na nwaanyị di ime ma ọ bụ nwa o bu n’afọ nwere ike ịnwụ abụghị ya ga-eme ka ite ime dị mma. Mgbe a na-amụ nwa, ọ bụrụ na ọ dapụta na a ga-ekpebi ma à ga-azọwa ndụ nne ka ọ̀ bụ nke nwa, ọ bụ di na nwunye ka ọ dịịrị ikpebi. Ma, n’ọtụtụ mba ndị mepere emepe, ọ na-esi ike inwe ụdị ọnọdụ a n’ihi na e nweela ngwá ọrụ ọgbara ọhụrụ ndị na-enye aka.
^ para. 12 Aha a kpọrọ ya abụghị ezigbo aha ya.
^ para. 14 Olileanya mbilite n’ọnwụ nwekwara ike ime ka mmadụ nwee udo nke obi. Gụọ “Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ” nke gbara n’Ụlọ Nche April 15, 2009. Ebe ahụ kọwara ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru nke gosiri na e nwere ike ịkpọlite ụmụaka nwụrụ mgbe ha ka nọ n’afọ.