Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ọ bụrụ na a ga-agwọta mmadụ ọrịa ya, a ga-eburịrị ụzọ gwọọ ihe kpatara ya

IHE MERE O JI ESI IKE

Ịchọpụta Otú Mmiri Si Baa n’Opi Ụgbọgụrụ

Ịchọpụta Otú Mmiri Si Baa n’Opi Ụgbọgụrụ

Ì chere na ụmụ mmadụ ga-enweli ike ịkwụsị ọtụtụ nsogbu na-eme ha ụra aga n’anya, kwụsịkwa ịtụ egwu ihe echi ga-abụ? Iji mee ya, ha ga-eburịrị ụzọ chọpụta ihe kpatara nsogbu ahụ, ọ bụghị naanị ime ihe ga-agwọta nsogbu ahụ.

Dị ka ihe atụ, otu nwoke aha ya bụ Tom dara ọrịa ma mechaa nwụọ. Gịnị mere o ji nwụọ? Dọkịta ikpeazụ letara ya tupu ya anwụọ kwuru, sị: “Mgbe mbụ ọrịa ahụ bidoro ya, o nweghị onye gbara mbọ chọpụta ihe kpatara ya. Ọ dị ka ndị dọkịta nọbu na-elekọta ya, hà nọ na-enye ya naanị ọgwụ ndị ga-eme ka o nwetatụ onwe ya.”

O yiri ka ụmụ mmadụ hà na-eme ihe yiri ya ná mbọ ha na-agba ịkwụsị nsogbu. Dị ka ihe atụ, gọọmentị chọọ ịkwụsị mpụ, ha na-eme iwu, tinye onyokomita n’ebe niile iji na-esere ihe na-eme n’obodo, ma ọ bụkwanụ nyekwuo ndị uwe ojii ngwá ọrụ ha ga-eji na-arụ ọrụ ha nke ọma. Ọ bụ eziokwu na ihe ndị a na-enye aka eme ka mpụ belata, ma ha anaghị akwụsị ihe ndị na-akpata ya. A sị ka e kwuwe, àgwà ndị mmadụ na-akpa na-egosikarị otú ha si eche echiche, ihe ha kweere na ihe ha chọrọ.

Otu nwoke aha ya bụ Daniel, bi n’otu mba ihe siri ike na ya, dị n’Ebe Ndịda Amerịka, kwuru, sị: “Mgbe mbụ, ihe dị mma n’obodo anyị. Anyị anaghị atụ ụjọ ndị ohi. Ma ugbu a, ma n’ime ime obodo ma n’obodo mepere emepe, obi na-ekorozi ndị mmadụ n’elu. Ihe isi ike emeela ka a mata na ọtụtụ ndị dị anya ukwu nakwa na ha ejighị ndụ na akụnụba ndị ọzọ kpọrọ ihe.”

Otu nwoke si n’otu obodo a na-alụ agha n’Eshia gbapụ, ma mechaa mụọ Baịbụl kwuru, sị: “N’obodo anyị, ma ndị ezinụlọ ma ndị ọchịchị ma ndị isi okpukpe na-agba ụmụ okorobịa ume ka ha soro lụọ agha n’ihi na ọ ga-eme a na-akwanyere ha ùgwù. Ndị obodo nke ọzọ ha na ndị obodo anyị na-alụ agha gwakwara ụmụ okorobịa ha otu ihe ahụ. Ihe a niile mere ka m ghọta na ọ baghị uru ịtụkwasị ndị ọchịchị obi.”

Baịbụl kwuru, sị:

  • “Ihe dị mmadụ n’obi malite n’oge ọ bụ ­nwata bụ ihe ọjọo.”​—Jenesis 8:21.

  • “Obi dị aghụghọ karịa ihe ọ bụla ọzọ. O sikwara ike njite. Ònye ga-amatali ya?”​—Jeremaya 17:9.

  • “N’obi ka echiche ọjọọ, igbu ọchụ, . . . ịkwa iko, izu ohi, ịgba akaebe ụgha, . . . si apụta.”​—Matiu 15:19.

Ụmụ mmadụ enwebeghị ike ịchọta ihe ga-eme ka ha kwụsị àgwà ọjọọ ndị dị ha n’ahụ́ na-eme ka ha na-eme mmadụ ibe ha ihe ọjọọ. Àgwà ọjọọ ndị a na-akakwu njọ dị ka anyị kwuru n’isiokwu bu nke a ụzọ. (2 Timoti 3:​1-5) Ha na-akakwu njọ n’agbanyeghị na ụmụ mmadụ achọpụtala ọtụtụ ihe, karịchaa otú kacha mma mmadụ na ibe ya ga-esi na-emekọ ihe. Gịnị mere anyị enweghị ike ime ka udo na obi iru ala dịrị n’ụwa a? Ọ̀ bụ na ụmụ mmadụ agaghị emeli ya ka ọ̀ bụ na ọ gaghị ekwe omume?

ÀNYỊ NA-ACHỌ IME IHE NA-AGAGHỊ EKWE OMUME?

Ọ bụrụgodị na o nwere otú anyị nwere ike isi gbanwee ndị mmadụ ka ha kwụsi ịkpa àgwà ọjọọ, anyị agaghị enweli ike ime ka udo dịrị n’ụwa niile. N’ihi gịnị? N’ihi na anyị ezughị okè.

Otu eziokwu doro anya bụ na: “Ọ dịrịghị mmadụ . . . ọbụna iduzi nzọụkwụ ya.” (Jeremaya 10:23) E keghị mmadụ ịchị onwe ya. E keghị anyị ịchị onwe anyị otú ahụ a na-ekeghị anyị ibi ná mmiri ma ọ bụ na mbara ígwé.

E keghị anyị ịchị onwe anyị otú ahụ a na-ekeghị anyị ibi ná mmiri

Chetụgodị echiche, ò nwere onye na-achọ ka mmadụ ibe ya na-atụrụ ya ihe ọ ga-eme na ihe ọ na-agaghị eme ná ndụ? Ndị mmadụ hà na-achọ ka ndị ọzọ na-agwa ha otú ha kwesịrị isi na-ele ite ime na ndị ọchịchị ịma mmadụ ikpe ọnwụ anya, ma ọ bụ otú ha ga-esi azụ ụmụ ha? Ihe ndị a so n’ihe na-akpata nsogbu n’etiti mmadụ na ibe ya. Anyị enweghị ikike ịchị mmadụ ibe anyị. Ọ bụ eziokwu na o nwere ike isi ike ikweta, ma, ihe Baịbụl kwuru bụ eziokwu. Oleezi ebe anyị ga-esi enweta enyemaka?

Ọ bụ Onye kere anyị ga-enyeliri anyị aka. A sị kwuwe, ọ bụ ya kere anyị. O chefubeghị anyị, dị ka ụfọdụ ndị chere. Otu ihe gosiri na o ji anyị kpọrọ ihe bụ ihe ndị na-abara anyị uru o dere na Baịbụl. Ọ bụrụ na anyị aghọta ihe dị na ya, ọ ga-eme ka anyị mata ebe anyị na-anaghị eme nke ọma. Anyị ga-aghọtakwa ihe mere nsogbu ji zuo ụmụ mmadụ ahụ́. Anyị ga-aghọta ihe mere otu onye ọkachamara bụ́ onye Jamanị ji kwuo, sị: “Ụmụ mmadụ amụtabeghị ihe n’ihe ndị merela eme, n’ihi ya, ha enwebeghị ike ịgbanwe otú ha si akpa àgwà.”

IHE BAỊBỤL KWURU NA-ECHEBE ANYỊ

Jizọs kwuru na “a na-egosi na amamihe ziri ezi site n’ụmụ ya niile.” (Luk 7:35) Otu ihe gosiri na ọ bụ eziokwu bụ ihe e dere n’Abụ Ọma 146:3. Ebe ahụ sịrị: “Unu atụkwasịkwala nwa nke mmadụ obi, bụ́ onye ọ na-adịghị nzọpụta dị n’aka ya.” Ndụmọdụ a bara uru nwere ike ime ka anyị ghara ịna-atụ anya ihe n’enweghị ike ime eme. Otu nwoke aha ya bụ Kenneth, bi n’otu obodo ọgba aghara juru n’Ebe Ugwu Amerịka, kwuru, si: “Onye ọchịchị nke ọ bụla na-ekwe nkwa ime ka ihe dị mma, ma ha anaghị emezuli nkwa ha. Ihe ndị a ha na-enweghị ike imeli gosiri na ihe Baịbụl na-ekwu bụ eziokwu.”

Daniel, anyị kwuburu banyere ya kwuru, sị: “Kwa ụbọchị ka m na-ahụkwu ihe na-eme ka o doo m anya na ụmụ mmadụ agaghị achịli onwe ha. . . . Mmadụ ịtụkwasị obi n’ego o nwere n’ụlọ akụ̀ ma ọ bụ n’ihe o dowere maka oge ezumike nká ya abụghị ya ga-eme ka ihe dịrị ya mma n’ọdịnihu. Ahụla m ka ụfọdụ ndị na-ata ahụhụ n’ihi ịtụkwasị ihe ndị a obi.”

Ihe Baịbụl kwuru na-eme ka anyị ghara ịtụwa anya ihe na-agaghị eme eme. Ma ọ bụghị naanị ya ka ọ na-eme, ọ na-emekwa ka anyị nwee olileanya maka ọdịnihu, dị ka anyị ga-emecha hụ.