Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Ndị mụrụ ụmụ na-egosi ịhụnanya, ụmụ ha ga-amụta ya

IHE GA-ENYE AKA ỊGWỌTA NSOGBU ANYỊ

Ịkụziri Ndị Mmadụ Ịkpa Àgwà Ọma

Ịkụziri Ndị Mmadụ Ịkpa Àgwà Ọma

N’otu mkpapụ otu ụlọ akwụkwọ a ma ama na Kanada haziiri ụmụ akwụkwọ ha, e kwuru na ụfọdụ ụmụ akwụkwọ ha ndị nwoke dị afọ iri na ụma gwusara otu nwa akwụkwọ ibe ha bụ́ nwoke egwuregwu iberibe. Mgbe ihe ahụ mechara, otu onye nta akụkọ aha ya bụ Leonard Stern dere n’otu akwụkwọ akụkọ aha ya bụ Ottawa Citizen, sị: “Ịbụ onye ụbụrụ na-aghọ nkọ, onye gụrụ akwụkwọ, nakwa onye bara ọgaranya, anaghị eme ka ndị na-eto eto ghara ịkpa àgwà ọjọọ.”

Stern kwukwara, sị: “I nwere ike ịna-atụ anya na ihe kacha mkpa ndị nne na nna kwesịrị ime bụ ịkụziri ụmụ ha ihe bụ́ àgwà ọma na àgwà ọjọọ. Ma kama nke ahụ, ihe a na-ahụ bụ na ihe kacha ndị nne na nna mkpa bụ ịhụ na ụmụ ha gụrụ akwụkwọ nke ọma, nweta ọrụ iji kpata ezigbo ego.”

Ọ bụ eziokwu na agụmakwụkwọ dị mma. Ma mmadụ ịga ụlọ akwụkwọ kacha mma e nwere n’ụwa agaghị eme ka ime ihe ọjọọ ghara ịgụ onye ahụ agụụ. Oleezi ụdị agụmakwụkwọ ga-akụziri anyị ịkpa àgwà ọma?

ỤDỊ AGỤMAKWỤKWỌ GA-AKACHA ABARA ANYỊ ỤRỤ

Baịbụl dị ka enyo. Anyị jiri ya lee onwe anyị, anyị ga-ahụ ebe ndị anyị na-anaghị eme nke ọma. (Jems 1:​23-25) Ma, Baịbụl na-eme ihe karịrị nke ahụ. Ọ na-enyere anyị aka ịgbanwe àgwà ndị ahụ na-adịghị mma, na-enyekwara anyị aka ịkpa àgwà ndị ga-eme ka anyị na ndị ọzọ na-adị n’udo ma na-adị n’otu. Àgwà ndị dị ka ịdị mma, obiọma, ndidi, mmadu ijide onwe ya, na ịhụnanya. Baịbụl kwudịrị na ịhụnanya na-eme ka mmadụ niile dịrị n’otu.” (Ndị Kọlọsi 3:14) Gịnị mere ịhụnanya ji bụrụ àgwà pụrụ iche? Lee ihe Baịbụl kwuru gbasara ya.

  • “Ịhụnanya na-enwe ndidi, dịrịkwa obiọma. Ọ naghị ekwo ekworo. Ọ naghị etu ọnụ, ọ naghịkwa ebuli onwe ya elu. Ọ naghị akpa àgwà na-ekwesịghị ekwesị. Ọ naghị achọ ihe ga-abara naanị ya uru. A naghị akpasu ya iwe ngwa ngwa. Ọ naghị agụkọ ihe ọjọọ e mere ya. Ọ naghị aṅụrị ọṅụ n’ihe ọjọọ, kama ọ na-eso eziokwu aṅụrị ọṅụ. Ọ na-edi ihe niile, . . . na-atachi obi n’ihe niile. Ịhụnanya anaghị akwụsị akwụsị.”​—1 Ndị Kọrịnt 13:​4-8.

  • “Onye hụrụ ndị ọzọ n’anya anaghị eme onye agbata obi ya ihe ọjọọ.”​—Ndị Rom 13:10.

  • “Nke ka nke, jirinụ obi unu niile hụ ibe unu n’anya, n’ihi na onye hụrụ ndị ọzọ n’anya na-adị njikere mgbe niile ịgbaghara ha ma ha mejọọ ya.”​—1 Pita 4:8.

Olee otú ọ na-adị gị ma gị na ndị hụrụ gị n’anya nọrọ? Obi ọ̀ na-eru gị ala, ahụ́ adaakwa gị jii? Ee. N’ihi na ị maara na ha bu ọdịmma gị n’obi nakwa na ha agaghị akpachara anya mee ihe ga-ewute gị.

Ịhụnanya nwere ike ime ka mmadụ hapụ ihe ụfọdụ na-amasị ya ma ọ bụkwanụ gbanwee otú o si ebi ndụ n’ihi ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, mgbe otu nwoke nwetara nwa nwa, ọ gụsiri ya agụụ ike ka ya na nwa nwa ya ahụ na-anọ mgbe niile. Ma, o nwere otu nsogbu. Ọ na-aṅụ oké sịga. Ọgọ ya nwoke achọkwanụghị ka ọ nọrọ ebe nwa ha nọ na-anụ sịga. Gịnị ka nwoke ahụ mere? N’agbanyeghị na ọ ṅụọla sịga afọ iri ise, ọ kwụsịrị ya n’ihi nwa nwa ya ahụ. Nke a gosiri na ịhụnanya na-akpa ike dị egwu.

Baịbụl na-enyere anyị aka ịmụta ịkpa àgwà ọma ndị dị ka ịdị mma, obiọma na karịchaa ịhụnanya

Ịhụnanya bụ àgwà e nwere ike ịmụta amụta. Ọ bụ ndị nne na nna kacha akụziri ụmụ ha otú e si ahụ ndị ọzọ n’anya. Ha na-enye ụmụ ha nri, na-echebe ha, na-elekọtakwa ha ma ha merụọ ahụ́ ma ọ bụ daa ọrịa. Ezigbo ndị nne na nna na ụmụ ha na-ekwurịta okwu. Ha na-akụzikwara ha ihe. Ha na-adọkwa ụmụ ha aka ná ntị, si otú ahụ na-akụziri ha ihe bụ́ ihe ọma na ihe ọjọọ. Ihe ọzọ bụkwa na ezigbo ndị nne na nna na-akpa àgwà ọma ndị ga-eme ka ụmụ ha na-achọ iṅomi ha.

Ọ dị mwute na ụfọdụ ndị nne na nna anaghị arụ ọrụ ha nke ọma. Ma, nke ahụ ọ̀ pụtara na ụmụ ha agaghị aba uru? Mba. E nwere ọtụtụ ndị bụ́ dimkpa ugbu a toro n’ezinụlọ nwere nsogbu, gbanwerela otú ha si ebi ndụ ma ghọọ ezigbo mmadụ na ndị e nwere ike ịtụkwasị obi. Dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ, ụfọdụ n’ime ha bụ ndị e cheburu na ha agaghị agbanweli àgwà ọjọọ ha.