Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

IHE BỤ́ NSOGBU

Ihe Ndị Na-eme Ka Obi Ghara Iru Anyị Ala

Ihe Ndị Na-eme Ka Obi Ghara Iru Anyị Ala

“Ọgbọ anyị a enweela ọganihu na-enweghị atụ n’ihe gbasara sayensị, nkà na ụzụ nakwa akụnụba . . . Ma n’agbanyeghị ya, ọgbọ a bụ ọgbọ mbụ mere ka ihe niile ghịghasịa n’ụwa.”​—The Global Risks Report 2018, World Economic Forum.

GỊNỊ MERE NDỊ MA NKE A NA-AKỌ JI NA-ECHEGBU ONWE HA BANYERE IHE ECHI GA-ABỤ NAKWA BANYERE IHE GA-EME ỤWA A N’ỌDỊNIHU? KA ANYỊ LEBA ANYA N’ỤFỌDỤ NSOGBU NDỊ ANYỊ NWERE N’ỤWA TAA.

  • MPỤ NDỊ E JI ỊNTANET EME: Otu akwụkwọ akụkọ aha ya bụ The Australian kwuru, sị: “Kwa ụbọchị, ka Ịntanet na-aghọ ebe na-adịghị mma ọgịga. Ọ bụzi ebe ndị na-emetọ ụmụaka, ndị na-achọ okwu, ndị na-etinye ihe na-akpata esemokwu ma ọ bụ nrụrịta ụka, nakwa ndị na-abanye na Kọmputa ndị ọzọ, jizi mere ụlọ. Ịntanet emeela ka ọ dịrị ọtụtụ ndị mfe ịna-akpa arụ ndị jọgburu onwe ha.”

  • AKA AHAGHỊ OTU: Otu ụlọ ọrụ a na-akpọ Oxfam International kwuru na akụnụba mmadụ asatọ kacha baa ọgaranya n’ụwa nwere hà ka ihe niile ihe karịrị ijeri mmadụ atọ kacha daa ogbenye n’ụwa nwere. Ha kwukwara na otú azụmahịa ụwa a si aga adịghị mma n’ihi na o mere ka ndị bara ọgaranya na-abakwu ọgaranya, ndị dara ogbenye a na-adakwu ogbenye. Ọtụtụ n’ime ndị ahụ dara ogbenye bụ ụmụ nwaanyị. Ụfọdụ ndị chere na ihe dịrị otú a na-aga, o nwere ike ịkpata ọgba aghara.

  • MMEGIDE NA AGHA: N’afọ 2018, Ngalaba Òtù Mba Ụwa Na-ahụ Maka Ndị Gbara Ọsọ Ndụ kwuru, sị: “Ọ bụ n’oge a ka a kacha nwee ndị gbara ọsọ ndụ gbaga obodo ọzọ.” Ihe karịrị nde mmadụ iri isii na asatọ ahapụla ụlọ ha gbaa ọsọ ndụ n’ihi agha ma ọ bụ mmegide. Ngalaba ahụ kwukwara na “ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ otu onye na-agbapụ n’ụlọ ya kwa tịnkọm tịnkọm abụọ ọ bụla.”

  • IMEBI ALA NA OSIMIRI: Akwụkwọ bụ́ The Global Risks Report 2018, kwuru, sị: “Ọtụtụ osisi na ụmụ anụmanụ na-anwụ n’ike n’ike. Otú e sizi na-emetọ ikuku na osimiri ga na-akpatara ndị mmadụ ọtụtụ nsogbu ahụ́ ike.” N’ụfọdụ mba, ụmụ ahụhụ na ụmụ ihe ndị ọzọ na-efe efe na-achọzi ịnwụcha. Ndị sayensị na-ekwu na ebe ọ bụ na ụmụ ahụhụ ndị a na-enye aka eme ka ihe akụkụ na osisi dị iche iche mịa mkpụrụ na-anwụzi n’ike n’ike, o nwere ike ime ka “ụwa anyị a gharazie ikwe obibi.”

Ụmụ mmadụ hà ga-enweli ike ime ka ụwa a bụrụ ebe dị mma obibi na ebe ahụ́ ga-eru mmadụ niile ala? Ụfọdụ ndị na-eche na otu n’ime ihe ndị ga-eme ka o kwe omume bụ ịkụziri ndị mmadụ ihe. Ya bụrụ otú ahụ, olee ụdị ihe a ga-akụziri ndị mmadụ ga-agbanwe otú ha si eche echiche na otú ha si akpa àgwà? Isiokwu ndị na-esonụ ga-enyere anyị aka ịza ajụjụ a.