Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ỌCHỊCHỊ GA-AGWỌTA NSOGBU ANYỊ NIILE

“Udo nke Ọ Ga-enye Agaghị Enwe Njedebe”

“Udo nke Ọ Ga-enye Agaghị Enwe Njedebe”

Òtù Mba Ụwa na-agba mmadụ niile ume n’agbanyeghị ebe ha nọ n’ụwa, ịna-emekọ ihe ọnụ, imere ndị ọzọ ihe ruuru ha nakwa ichekwa gburugburu ebe obibi anyị. N’ihi gịnị? Ọ bụ n’ihi ihe otu nwoke aha ya bụ Maher Nasser dere n’akwụkwọ bụ́ UN Chronicle. O dere, sị: “Mgbanwe ihu ígwé, mpụ, aka ahaghị otu, esemokwu ndị na-ekweghị ndozi, ịgbaga ọsọ ndụ ná mba ọzọ, iyi ọha egwu, ọrịa na-efe efe na nsogbu ndị ọzọ na-akpa ndị mmadụ aka ọjọọ n’ebe niile n’ụwa.”

Ụfọdụ ndị atụọla aro ka e nwee otu ọchịchị ga-achị ụwa niile. Abụọ n’ime ha bụ ọkachamara aha ya bụ Dante (1265-1321) na onye sayensị aha ya bụ Albert Einstein (1879-1955). Dante kweere na o nweghị ihe ga-eme ka udo dịrị n’ụwa ndọrọ ndọrọ ọchịchị mere ka e nwee nkewa. O kwughachịrị ihe ahụ Jizọs kwuru na Luk 11:​17, na “Alaeze ọ bụla nke kewara wee na-emegide onwe ya ga-ada.”

Obere oge agha ụwa nke abụọ a tụrụ bọmbụ atọm abụọ na ya gwụrụ, Albert Einstein degaara Òtù Mba Ụwa akwụkwọ ozi e biri n’akwụkwọ akụkọ. N’akwụkwọ ozi ahụ, ọ sịrị: “Òtù Mba Ụwa kwesịrị ime ngwa ngwa hụ na ha hiwere otu ọchịchị ga-achị ụwa niile iji mee ka udo dịrị n’ebe niile n’ụwa.”

Ma, ọ̀ ga-ekwe omume na ndị ga-anọ n’isi n’ọchịchị ọhụrụ ahụ ga-azụta ihe a tụrụ ha n’ahịa ma ghara ịrụrụ aka ma ọ bụ megbuwe ndị ha na-achị? Ka hà ga-akpakwa àgwà ọjọọ ndị ibe ha kpara? Ajụjụ ndị a mere ka anyị cheta ihe otu ọkọ akụkọ ihe mere eme, bụ́ onye Briten aha ya bụ Lord Acton kwuru. Ọ sịrị na ụmụ mmadụ na-ejikarị ikike ha nwere eme ihe otú na-adịghị mma.

Ka ụmụ mmadụ nwee ike ịna-ebi n’udo, ha na ibe ha ga-adịrịrị n’otu. Ma, olee ihe ga-eme ka o kwe omume? Ọ̀ ga-ekweli omume? Ihe Baịbụl kwuru gosiri na ọ ga-ekweli omume. Ma, olee otú a ga-esi eme ya? O doro anya na ọ bụghị ọchịchị ụmụ mmadụ ndị nwere ike imecha rụrụwa aka ga-anọ n’isi ya. Kama, ọ bụ naanị ọchịchị Chineke hiwere ga-emeli ya. Ọchịchị ahụ ga-egosi na ọ bụ naanị Chineke ka o ruuru ịchị ihe niile o kere eke. Gịnị bụ aha ọchịchị ahụ? Baịbụl kpọrọ ya “Alaeze Chineke.”​—Luk 4:43.

“KA ALAEZE GỊ BỊA”

Ọ bụ Alaeze Chineke ka Jizọs bu n’obi sị “Ka alaeze gị bịa. Ka uche gị meekwa n’ụwa” n’ekpere ahụ ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya. (Matiu 6:​9, 10) Alaeze Chineke ga-eme ka uche Chineke mee n’ụwa, ọ bụghị uche ndị na-eche naanị banyere onwe ha, ji anya ukwu na-achọ inweta ọchịchị.

Baịbụl kpọkwara Alaeze Chineke “Alaeze eluigwe.” (Matiu 5:3) N’ihi gịnị? N’ihị na ọ ga-esi n’eluigwe na-achị ụwa. Chee echiche ihe nke ahụ pụtara. Ọ pụtara na ọchịchị ahụ agaghị achọ enyemaka ọ bụla n’aka ụmụ mmadụ ma ọ bụkwanụ nawa ha ụtụ isi iji nweta ego. Ọ ga-eme ka ụmụ mmadụ ndị ọ ga-achị kuru ume ndụ.

Aha ahụ bụ́ “Alaeze” gosiri na Alaeze Chineke bụ ọchịchị nwere eze.  Eze ya bụ Jizọs Kraịst. Ọ natara ikike ọchịchị n’aka Chineke. Baịbụl kwuru gbasara Jizọs, sị:

  • “Ọchịchị ga-abụkwa nke ya . . . Ọchịchị ya na udo nke ọ ga-enye agaghị enwe njedebe.”​—Aịzaya 9:​6, 7, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik.

  • “E nyere ya ọchịchị, mee ka a na-akwanyere ya ùgwù, nyekwa ya alaeze, ka ndị dị iche iche, ndị si ná mba dị iche iche, na ndị na-asụ asụsụ dị iche iche na-ejere ya ozi. ­Ọchịchị ya bụ . . . nke na-agaghị akwụsị akwụsi.”​—Daniel 7:14.

  • “Alaeze ụwa aghọọla Alaeze nke Chineke na nke Kraịst ya.”​—Mkpughe 11:15.

Dị ka Jizọs kwuru n’ekpere ahụ ọ kụziiri ndị na-eso ụzọ ya, Alaeze Chineke ga-eme ka ihe niile bụ́ uche Chineke mezuo n’ụwa. Ọ ga-emekwa ka ụmụ mmadụ mụta ilekọta ụwa nke ọma ka ọ bụrụ ebe dị mma obibi na ebe ihe dị iche iche e kere eke ga-ejupụta.

Ihe ọzọ Alaeze Chineke ga-eme bụ na ọ ga-akụziri ndị niile ọ ga-achị otu ihe. Ịkpa ókè ma ọ bụ nkewa agaghị adị. Aịzaya 11:9 kwuru, sị: “Ha agaghị emerụ ihe ọ bụla ahụ́, ha agaghịkwa emebi ihe ọ bụla . . . n’ihi na ihe ọmụma Jehova ga-ejupụta ụwa otú mmiri si ejupụta oké osimiri.”

Ndị bi n’ụwa ga-adị n’otu, dịrịkwa n’udo bụ́kwanụ ihe Òtu Mba Ụwa na-enwelighị ike ime. Abụ Ọma 37:11 kwuru, sị: “Obi ga-adịkwa ha ezigbo ụtọ maka na ha ga-anọ nnọọ n’udo.” N’oge na-adịghị anya, ndị mmadụ agakwaghị na-echeta okwu ndị dị ka “mpụ,” “imetọ ụwa,” “ịda ogbenye,” na “agha.” Ma, olee mgbe ihe ndị a ga-eme? Olee mgbe Alaeze Chineke ga-amalite ịchị ụwa niile? Olee otú ọ ga-esi eme ya? Olee otú i nwere ike isi soro ná ndị ọ ga-achị? Ka anyị chọpụta.