Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

OTÚ A GA-ESI GWỌTA NSOGBU ANYỊ NIILE

“Udo Ga-adị Ebe Niile” n’Alaeze Chineke

“Udo Ga-adị Ebe Niile” n’Alaeze Chineke

N’oge na-adịghị anya, Alaeze Chineke anyị na-atụ anya ya kemgbe ga-amalite ịchị ụwa niile. Ọ ga-eme ka udo na ịdị n’otu dịrị n’ụwa niile. Abụ Ọma 72:7 kwuru na n’oge ahụ, ‘udo ga-adị ebe niile.’ Ma, olee mgbe ọ ga-amalite ịchị ụwa a? Olee otú ọ ga-esi eme ya? Olee otú anyị ga-esi soro ná ndị ọ ga-achị?

OLEE MGBE ALAEZE CHINEKE GA-ABỊA?

Baịbụl buru amụma banyere ihe ịrịba àmà ndị ga-enyere anyị aka ịma na Alaeze Chineke adịla nso. Ha bụ ọtụtụ ihe ga na-emekọta ọnụ otu mgbe dị ka agha a na-alụ n’ebe dị iche iche n’ụwa, ụkọ nri, ọrịa, ọtụtụ ala ọma jijiji na mmebi iwu.​—Matiu 24:​3, 7, 12; Luk 21:11; Mkpughe 6:​2-8.

Amụma Baịbụl ọzọ kwuru na: “Oge ikpeazụ ga-adị oké egwu, taakwa akpụ. N’ihi na ndị mmadụ ga-abụ ndị hụrụ naanị onwe ha n’anya, ndị hụrụ ego n’anya, ndị na-etu ọnụ, ndị mpako, ndị na-ekwulu ndị ọzọ, ndị na-enupụrụ ndị mụrụ ha isi, ndị na-anaghị ekele onye meere ha ihe, ndị na-agharịpụ ndị ọzọ, ndị na-enweghị obi mmadụ, ndị na-adịghị achọ inwe nkwekọrịta ọ bụla, ndị nkwutọ, ndị na-naghị achọ ka ha na ndị ọzọ kwekọrịta n’ihe ọ bụla, ndị na-ekwutọ ndị ọzọ, ndị na-anaghị ejideli onwe ha, ndị tigbuo zọgbuo, ndị ihe ọma na-anaghị amasị, . . . ndị onwe ha na-ebu isi, ndị ihe bụ́ mkpa ha bụ ikpori ndụ, ọ bụghị ịhụ Chineke n’anya.” (2 Timoti 3:​1-4) Kemgbe ụwa, e nwere ụfọdụ ndị na-akpa ụdị àgwà ndị a, ma n’oge ndị a, ọ bụzi àgwà e ji mara ọtụtụ ndị.

Amụma ndị a malitere imezu n’afọ 1914. N’eziokwu, ọtụtụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme na ndị ọnụ na-eru n’okwu ekwuola ọtụtụ ihe gbasara otú ihe si gbanwee n’afọ ahụ. Dị ka ihe atụ, otu ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ́ onye Denmak, aha ya bụ Peter Munch, dere, sị: “Agha ahụ a lụrụ n’afọ 1914 mere ka ọtụtụ ihe ghịghasịa n’ụwa. Tupu afọ ahụ, ndị mmadụ chere na ihe ga na-aka mma, . . . ma ihe a hụziri bụ ọdachi, ọgba aghara, ịkpọasị na obi erughị ala.”

Ma obi dị anyị ụtọ na mmiri zochaa, anwụ ga-acha. Ihe ndị a na-emenụ na-egosi na oge Alaeze Chineke ga-achị ụwa niile adịla nso. O nwedịrị otu ihe ọma Jizọs kwuru ga na-eme n’oge ọgwụgwụ. Ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma Alaeze Chineke n’ebe niile n’ụwa ka ọ bụụrụ mba niile àmà, mgbe ahụkwa ka ọgwụgwụ ga-abịa.”​—Matiu 24:14.

Ọ bụ ozi ọma gbasara Alaeze Chineke bụ́ isi ihe Ndịàmà Jehova na-ekwusa. Ọ bụ ya mere ha ji kpọọ akwụkwọ bụ́ isi ha na-ebipụta Ụlọ Nche nke Na-ekwusa Alaeze Jehova. Ọ na-ekwu gbasara ọtụtụ ihe ọma ndị Alaeze Chineke ga-eme n’ụwa nakwa ihe ọ ga-emere ụmụ mmadụ.

OLEE OTÚ ALAEZE CHINEKE GA-ESI ACHỊ?

Lee azịza anọ maka ajụjụ a:

  1. Ọ bụghị ndị ọchịchị e nwere n’ụwa taa ga na-achị n’Alaeze Chineke.

  2. Ndị ọchịchị ụwa ga-ezuzuru gaa lụsoo Alaeze Chineke ọgụ, n’ihi na ha achọghị ịchịliri ya aka elu.​—Abụ Ọma 2:​2-9.

  3. Alaeze Chineke ga-ebibi ọchịchị niile chọrọ ịnọgide na-achị ụmụ mmadụ. (Daniel 2:44; Mkpughe 19:​17-21) Ọ bụ n’agha ikpeazụ a na-akpọ Amagedọn ka nke ahụ ga-eme.​—Mkpughe 16:​14, 16.

  4. Ndị niile rubere isi n’ọchịchị Alaeze Chineke agaghị anwụ n’agha Amagedọn, kama, ha ga-abanye n’ụwa ọhụrụ nke udo juru n’ime ya. Ọ bụ ndị a ka Baịbụl kpọrọ “oké ìgwè mmadụ.” Ha nwere ike ịbụ ọtụtụ nde mmadụ.​—Mkpughe 7:​9, 10, 13, 14.

OLEE OTÚ Ị GA-ESI SORO NÁ NDỊ ALAEZE CHINEKE GA-ACHỊ?

Ihe mbụ ga-eme ka mmadụ soro ná ndị Alaeze Chineke ga-achị bụ na a ga-akụziri onye ahụ ihe. Ọ bụ ya mere Jizọs ji kpee ekpere, sị: “Iji nweta ndụ ebighị ebi, ha ga-amata gị, onye naanị ya bụ ezi Chineke, matakwa onye i zitere, bụ́ Jizọs Kraịst.”​—Jọn 17:3.

Ọ bụrụ na ndị mmadụ amata onye Chineke bụ nke ọma, ọ ga-abara ha ọtụtụ uru. Ka anyị leba anya n’uru abụọ ọ ga-abara ha: Nke mbụ, ọ ga-eme ka okwukwe ha sie ike n’ebe ọ nọ. Okwukwe a ha nwere, nke nwere ezigbo ihe mere ka ha nwee ya, na-eme ka obi sie ha ike na Alaeze Chineke dị adị nakwa na mgbe ọ ga-amalite ịchị dị nso. (Ndị Hibru 11:1) Nke abụọ abụrụ na ha ga-ahụkwu Chineke na ndị agbata obi ha n’anya. Ịhụnanya ha nwere maka Chineke ga-eme ka ha si n’ala ala obi ha na-erubere ya isi. Ịhụnanya ha nwere maka ndị agbata obi ha ga-emekwa ka ha na-eme ihe a Jizọs kwuru na Luk 6:​31, ebe sịrị, “Otú unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emeso unu, na-emesonụ ha otú ahụ.”

Jehova bụ́ Nna hụrụ anyị n’anya, chọrọ ka ihe gaziere anyị. Ọ chọrọ ka anyị nweta “ndụ nke bụ́ ezigbo ndụ.” (1 Timoti 6:19) Ndụ anyị dị taa abụghị “ndụ nke bụ́ ezigbo ndụ.” Ndụ na-esiri ọtụtụ ndị mmadụ ike taa, ha na-ahụsikwa anya. Ka i nwee ike ịmatatụ otú “ndụ nke bụ́ ezigbo ndụ” ga-adị, tụlee ihe ọma ụfọdụ Alaeze Chineke ga-emere ndị ọ ga-achị.

N’Alaeze Chineke, obi ga-eru ndị mmadụ ala, nri ejupụtakwa ebe niile