IHE GA-ENYERE GỊ AKA IBELATA NCHEGBU
Gịnị Bụ Nchegbu?
Nchegbu bụ ihe mmadụ na-emekarị ma ihe karịrị ya bịara ya. N’oge nchegbu, ụbụrụ gị na-emepụta ihe dị mmiri mmiri a na-akpọ hormone. Ihe a na-agazu gị ahụ́ niile, na-eme ka obi gị na-akụsi ike, na-eme ka ọbara gị na-agbasi ike, na-eme ka akpa ume gị gbasaa ma ọ bụ kpachitụ, na-emekwa ka uru ahụ́ gị sie ike. Tupu gị amara ihe na-eme, ahụ́ gị adịla njikere maka ihe chọrọ ime. Ọ bụrụ na oge ahụ agafechaa, ahụ́ gị na-adịghachikwa otú ọ dị na mbụ.
NCHEGBU NDỊ NKE DỊ MMA NA NDỊ NKE NA-ADỊGHỊ MMA
Nchegbu nwere ike ime ka ị dịrị njikere maka ihe ndị tara akpụ na ihe ndị dị ize ndụ na-aga ime. Ọ na-amalite n’ụbụrụ gị. Ọ na-eme ka i mee ihe ngwa ngwa. O nwekwara ike ime ka ị na-emekwu nke ọma, dị ka n’ule, mgbe a na-agba gị ajụjụ ọnụ n’ebe a chọrọ iwe gị n’ọrụ, ma ọ bụkwanụ mgbe ị na-eme egwuregwu.
Ma, nchegbu gafere ókè nwere ike ịkpatara gị nsogbu. Ọ bụrụ na ị na-echegbu onwe gị mgbe niile, o nwere ike ịkpatara gị ọrịa, iwekarị iwe, ụjọ, ma ọ bụ ichefu ihe. O nwekwara ike ime ka àgwà gị na otú i si emeso ndị mmadụ gbanwee. Mmadụ ichegbukarị onwe ya nwere ike ime ka ọ ṅụwa ọgwụ ọjọọ ma ọ bụ mewe ihe ndị ọzọ na-adịghị mma iji chefuo nsogbu ya. O nwedịrị ike ịkpatara mmadụ ịda mbà, ike ọgwụgwụ, ma ọ bụ iche echiche igbu onwe ya.
Ọ bụ eziokwu na ihe nchegbu na-eme Okeke nwere ike ịdị iche n’ihe ọ na-eme Okafọ, ma o nwere ike ịkpata ọtụtụ ọrịa. O nwekwara ike ịkpa ihe fọrọ obere ka ọ bụrụ akụkụ ahụ́ anyị niile aka ọjọọ.