Otú Anyị na Ndị Ọzọ Ga-esi Na-adị n’Udo
Chineke gwara anyị otú anyị na ndị ọzọ ga-esi na-adị n’udo, ma ndị ezinụlọ anyị ma ndị anyị na ha na-arụkọ ọrụ ma ndị enyi anyị. Lee ụfọdụ ezigbo ndụmọdụ ndị o nyere baarala ọtụtụ ndị uru.
Na-agbaghara Ndị Ọzọ
‘Na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam ma e nwee onye ibe ya mejọrọ.’—NDỊ KỌLỌSI 3:13.
Anyị niile na-emejọ ihe. Anyị nwere ike imejọ ndị ọzọ, hanwa nwekwara ike imejọ anyịnwa. Ọ pụtara na anyị kwesịrị ịna-agbaghara ndị ọzọ, ndị ọzọ kwesịkwara ịna-agbaghara anyị. Anyị gbaghara onye mejọrọ anyị, anyị ekwesịghị ịnọgide na-eburu ya iwe n’obi. Anyị anaghị ‘eji ihe ọjọọ akwụ onye ọ bụla ụgwọ ihe ọjọọ.’ Anyị anaghịkwa eme, anyị gụrụ gụrụ, anyị echetara onye mejọrọ anyị ihe o mere anyị. (Ndị Rom 12:17) Ma, ọ bụrụkwanụ na ihe mmadụ mere gbawara anyị obi, ya ana-esikwara anyị ike ichefu ya? Anyị kwesịrị iji nkwanye ùgwù gwa onye ahụ banyere ya mgbe naanị anyị na ya nọ. Ebumnuche anyị kwesịrị ịbụ ime udo, ọ bụghị ka anyị gosi na ọ bụ yanwa ka ikpe mara.—Ndị Rom 12:18.
Dịrị Umeala n’Obi ma Na-asọpụrụ Ndị Ọzọ
“Dịrịnụ umeala n’obi, na-ewerekwanụ na ndị ọzọ ka unu.”—NDỊ FILIPAỊ 2:3.
Anyị dịrị umeala n’obi ma na-asọpụrụ ndị ọzọ, ọ ga-eme ka ndị mmadụ na-abịa anyị nso. Ha ma na anyị ga na-enwere ha obiọma ma na-echebara ha echiche, nakwa na anyị agaghị akpachara anya mewaa ha obi. Ma, ọ bụrụ na anyị ana-ewere ya na anyị ka
ndị ọzọ ma ọ bụ na-achọkarị ka okwu bie n’ọnụ anyị, anyị na ndị ọzọ ga na-ese okwu mgbe niile, ndị mmadụ ga na-agbara anyị ọsọ, ndị enyi anyị ga-adịkwa ole na ole ma ọ bụrụdị na e nwere ndị nke anyị ga-enwe enwe.Elela Mmadụ Anya n’Ihu
“Chineke anaghị ele mmadụ anya n’ihu. Kama ná mba ọ bụla, ọ na-anabata onye na-atụ egwu ya, nke na-emekwa ihe dị mma.”—ỌRỤ NDỊOZI 10:34, 35.
Ihe Chineke na-ele emere ndị mmadụ ihe ọma abụghị obodo ha si, asụsụ ha na-asụ, ọkwá ha, ma ọ bụkwanụ ụcha akpụkpọ ahụ́ ha. ‘O si n’otu mmadụ mee ka mmadụ niile nọ ná mba ọ bụla dịrị.’ (Ọrụ Ndịozi 17:26) Ọ pụtara na mmadụ niile bụ ụmụnne. Ọ bụrụ na anyị na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù, jiri obiọma na-emeso ha ihe, ha ga na-enwe obi ụtọ, anyịnwa ga na-enwekwa obi ụtọ karịa. Obi ga-adịkwa Chineke ụtọ.
Dịrị Nwayọọ n’Obi
Yiri ịdị nwayọọ dị ka uwe.—NDỊ KỌLỌSI 3:12.
Anyị dịrị nwayọọ n’obi, anyị ga-eme ka obi na-eru ndị ọzọ ala. Ụjọ agaghị na-atụ ha ịgwa anyị okwu ma ọ bụ ịgwa anyị ebe anyị mejọrọ n’ihi na ha ma na iwe agaghị ewe anyị. Ọ bụrụkwa na mmadụ ejiri iwe gwa anyị okwu, anyị meda obi zaghachi ya, o nwere ike ime ka obi jụrụ onye ahụ. Ilu 15:1 sịrị: “Mmadụ na-akwụsị iwe iwe ma e wetuo obi zaa ya okwu, ma okwu ọjọọ na-akpasu iwe.”
Na-emesapụ Aka, Na-ekelekwa Ndị Meere Gị Ihe
“A na-aka enwe obi ụtọ n’inye ihe karịa ka a na-enwe n’ịnara ihe.”—ỌRỤ NDỊOZI 20:35.
Ọtụtụ ndị taa dị anyaukwu, na-echekwa naanị gbasara onwe ha. Ma, ndị na-emesapụ aka na-enwe ezigbo obi ụtọ. (Luk 6:38) Ihe mere ha ji enwe obi ụtọ bụ n’ihi na ha hụrụ ndị mmadụ n’anya karịa akụnụba. Otu ịhụnanya ahụ na-emekwa ka ha jiri obi ha niile kelee onye meere ha ihe ọma ma gosi na obi dị ha ụtọ. (Ndị Kọlọsi 3:15) Jụọ onwe gị, sị: ‘Olee onye m na-enwe mmasị ka mụ na ya nọrọ? Ọ̀ bụ onye na-anaghị enwe obi ụtọ maka ihe e meere ya na onye na-anaghị enyetụ mmadụ ihe ka ọ̀ bụ onye na-enwe obi ụtọ maka ihe e meere ya na onye na-emesapụ aka?’ Gịnị ka ihe a na-akụziri anyị? Bụrụ ụdị onye ị na-achọ ka ndị ọzọ bụrụ.—Matiu 7:12.