Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ọtụtụ Ndị Anaghịzi Akwanyere Ndị Ezinụlọ Ha Ùgwù?

Gịnị Mere Ọtụtụ Ndị Anaghịzi Akwanyere Ndị Ezinụlọ Ha Ùgwù?

IHE MERE MMADỤ ỊKWANYERE NDỊ EZINỤLỌ YA ÙGWÙ JI DỊ MKPA

Ọ bụrụ na anyị ana-akwanyere ndị ezinụlọ anyị ùgwù, ọ ga-eme ka obi ruo onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ ala, ma di ma nwunye ma ụmụ.

  • Akwụkwọ bụ́ The Seven Principles for Making Marriage Work kwuru na ọ bụrụ na di na nwunye na-akwanyere ibe ha ùgwù, ha ga na-egosi ibe ha ịhụnanya, “ọ bụghị naanị ná nnukwu ihe, kama n’ụmụ obere ihe ha na-emere ibe ha kwa ụbọchị.”

  • Nchọpụta e mere gosiri na ụmụaka ndị mụtara ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù na-aka enwe obi ụtọ, ha na ndị mụrụ ha na-aka adị ná mma, uche na-akakwa akpakọ ha ọnụ.

IHE I NWERE IKE IME

Gị na ndị ezinụlọ unu kpebie otú unu ga na-esi akwanyere ibe unu ùgwù. Ihe mbụ unu ga-eme bụ ijide n’aka na onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ unu ghọtara ihe ịkwanyere ndị ọzọ ùgwù pụtara. Ihe nke abụọ unu ga-eme bụ ide àgwà ndị onye ọ bụla nọ n’ezinụlọ unu kwesịrị ịkpa na ndị nke ọ na-ekwesịghị ịkpa. Nke atọ abụrụzie unu niile ịkparịta ya ka ụmụ unu nakwa ununwa mara ihe unu ga na-eme iji na-akwanyere ibe unu ùgwù.

“Atụmatụ onye na-arụsi ọrụ ike ga-eme ka ihe gaziere ya.”​—Ilu 21:5.

Ka ndị ọzọ si n’aka gị na-amụta ihe. Ị̀ na-akatọ ndị ezinụlọ gị maka ihe ndị ha na-anaghị emeta, na-akwa ha emo ma ha kwuo uche ha, ma ọ bụ leghara ha anya ma ọ bụkwanụ nara ha okwu n’ọnụ mgbe ha na-agwa gị okwu?

Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka: Gbalịa ka i were ịkwanyere di gị ma ọ bụ nwunye gị na ụmụ unu ùgwù ka ụgwọ i ji ha, ọ bụghị ka ihe ha ga-enweta n’aka gị naanị mgbe ha na-eme nke ọma.

“Na-ebunụ ụzọ asọpụrụ ndị ọzọ.” ​—Ndị Rom 12:10.

Ọ bụrụgodị na i kwetaghị ihe onye nke ọzọ kwuru, kwanyere ya ùgwù. Ị gwawa onye nke ọzọ ihe dị gị n’obi, ekwula ihe ndị dị ka “mgbe niile, ị na-eme” ma ọ bụ “o nweghị mgbe ị na-eme.” Ịgwa onye ezinụlọ gị ụdị okwu a ga-akpasu ya iwe, o nwekwara ike ime ka obere nghọtahie bụrụzie nnukwu esemokwu.

“Mmadụ na-akwụsị iwe iwe ma e wetuo obi zaa ya okwu, ma okwu ọjọọ na-akpasu iwe.”​—Ilu 15:1.

IHE ANYỊ NA-EME

Ndịàmà Jehova na-agba ndị nọ n’ezinụlọ ume ka ha na-akwanyere ibe ha ùgwù. Ọtụtụ mgbe, a na-ekwu gbasara ya n’isiokwu dị iche iche, n’akwụkwọ, na broshọ, nakwa na vidio ndị anyị na-ewepụta. Onye ọ bụla nwere ike inweta ihe ndị a n’akwụghị ụgwọ ọ bụla.

MAKA NDỊ DI NA NWUNYE: Isiokwu dị iche iche a kpọrọ Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka nwere ike inyere ndị di na nwunye aka . . .

  • ịna-ege ntị nke ọma

  • ịkwụsị ịgbachi ibe ha nkịtị

  • ịkwụsị ịbarịta mba

(Gaa na jw.org chọọ “Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka”)

MAKA NDỊ NNE NA NNA: Isiokwu dị iche iche a kpọrọ Ihe Ndị Ga-enyere Ezinụlọ Aka nwere ike inyere ndị nne na nna aka ịzụ ụmụ ha ka ha . . .

  • na-erube isi

  • nye aka na-arụ ọrụ ndị a na-arụ n’ụlọ

  • na-asị “biko” na “i meela”

(Gaa na jw.org chọọ “Ịzụ Ụmụ” na “Ịzụ Ndị Na-eto Eto”)

I nwere ike ịgụ isiokwu bụ́ “Ajụjụ Ndị Nne na Nna Na-ajụ.” Ọ gbara n’isiokwu ndị ọzọ n’akwụkwọ bụ́ Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ​—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1. (Gaa na jw.org chọọ “Ajụjụ Ndị Nne na Nna Na-ajụ.”)

MAKA NDỊ NA-ETO ETO: Isiokwu dị iche iche, vidio, na ihe omume ndị na-agba n’ebe a kpọrọ Ndị Na-eto Eto na jw.org nwere ike inyere ndị na-eto eto aka . . .

  • ka ha na ndị mụrụ ha na ụmụnne ha na-adị ná mma

  • ka ha na-akwanyere ndị mụrụ ha ùgwù mgbe ha na ha na-ekwurịta gbasara iwu ndị mụrụ ha nyere ha

  • ka ha na-akpa àgwà otú ga-eme ka ndị mụrụ ha tụkwasị ha obi

(Gaa na jw.org chọọ “Ndị Na-eto Eto”)

A naghị ana mmadụ ego maka ịga na jw.org. E nweghị ụgwọ a na-akwụ ma ọ bụ òtù mmadụ ga-abanye na ya tupu ya agaa na ya. A naghịkwa agwa mmadụ ka o kwuo ihe ụfọdụ gbasara onwe ya tupu ya abanye na ya.