Gịnị Mere Ọtụtụ Ndị Anaghịzi Akwanyere Ndị Ọzọ Ùgwù?
IHE MERE ỊKWANYERE NDỊ ỌZỌ ÙGWÙ JI DỊ MKPA
Ọ bụrụ na anyị akwanyere ndị ọzọ ùgwù, obi na-ajụrụ ha, ọ na-emekwa ka nsogbu ghara ịka njọ.
-
Otu ilu dị na Baịbụl kwuru, sị: “Mmadụ na-akwụsị iwe iwe ma e wetuo obi zaa ya okwu, ma okwu ọjọọ na-akpasu iwe.” (Ilu 15:1) Naanị ihe okwu mkparị na akwanyereghị ndị mmadụ ùgwù na-akpata bụ ime ka nsogbu ka njọ. Ọtụtụ mgbe, ọ na-akpata nsogbu ndị dị oké njọ.
-
Jizọs kwuru, sị: “Ihe juru mmadụ n’obi ka ọnụ ya na-ekwu.” (Matiu 12:34) Ọ bụrụ na anyị akparịa mmadụ, o nwere ike igosi ihe dị anyị n’obi, ya bụ, otú anyị si were ndị si n’agbụrụ ọzọ, ebo ọzọ, mba ọzọ, ma ọ bụkwanụ ndị ka anyị n’ọkwá na ndị anyị ka n’ọkwá.
N’oge na-adịbeghị anya, a gbara ihe karịrị puku mmadụ iri atọ na puku abụọ (32,000) bụ́ ndị si ná mba iri abụọ na asatọ ajụjụ ọnụ. Ihe karịrị ọkara n’ime ha kwuru na ndị mmadụ anaghịzi akwanyere ndị ọzọ ùgwù nakwa na ọ kala ezigbo njọ n’oge a.
IHE I NWERE IKE IME
Ma ị̀ nọ n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ n’ebe ị na-arụ ọrụ, na-akwanyere mmadụ niile ùgwù, ọ bụrụgodị na ị naghị ele ihe anya otú ha si ele ya. Gbalịa chọpụta ihe gị na ndị ọzọ ga-enweli otu olu na ha. Ọ ga-enyere gị aka ka ị ghara ịna-akatọ ndị ọzọ ma ọ bụ na-ama ha ikpe.
Na-emeso ndị ọzọ ihe otú ị ga-achọ ka ha na-emeso gị ihe. Ọ bụrụ na ị na-echebara ndị ọzọ echiche ma jiri obiọma na-emeso ha ihe, ọ ga-adịrị ha mfe isikwa otú ahụ na-emeso gị ihe.
Na-agbaghara ndị ọzọ. Ọ bụrụ na ndị mmadụ ekwuo ma ọ bụ mee ihe na-adịghị mma, gbalịa leghara ya anya, obi siekwa gị ike na ọ pụtaghị na ha buuru gị ihe ọjọọ n’obi.
IHE ANYỊ NA-EME
Ndịàmà Jehova na-akwanyere ndị ọzọ ùgwù n’ebe ha bi nakwa n’ebe ha na-arụ ọrụ, ha na-agwakwa ndị ọzọ ka ha na-eme otú ahụ.
Anyị na-akụziri ndị mmadụ Baịbụl n’anaghị ha ego n’agbanyeghị ebe ha si. Ma, anyị anaghị amanye ndị mmadụ amanye ka ha kweta ihe anyị na-ekwu. Kama, anyị na-agbalị ime ihe Baịbụl kwuru, ya bụ, ‘imeda obi’ ma anyị ziwe ha ozi ọma nakwa ‘ịkwanyere ha ezigbo ùgwù.’—1 Pita 3:15; 2 Timoti 2:24.
Anyị anaghị akpa ókè, kama anyị na-anabata ụdị ndị dị iche iche chọrọ ịmata ihe Baịbụl na-akụzi n’ọmụmụ ihe anyị. Anyị na-agbalịkwa ‘ịsọpụrụ ụdị mmadụ niile.’—1 Pita 2:17.
Anyị na-akwanyere ndị ọchịchị ùgwù n’ebe ọ bụla anyị bi. (Ndị Rom 13:1) Anyị na-erubere iwu isi, na-atụkwa ụtụ isi. Ọ bụ eziokwu na anyị anaghị etinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị, anyị anaghị enye onye ọ bụla chọrọ ime otú ahụ nsogbu n’ihi na anyị ma na ọ bụ onye ọ bụla ga-ekpebiri onwe ya ihe ọ ga-eme n’okwu gbasara ndọrọ ndọrọ ọchịchị.