IHE NKE 6
Ụmụaka Kwesịrị Ịmụta Ịna-akpa Àgwà Ọma
GỊNỊ BỤ ÀGWÀ ỌMA?
Ndị na-akpa àgwà ọma na-ama ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi. Ihe ha ji ekpebi ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi abụghị otú obi dị ha. Kama, e nwere ụkpụrụ ma ọ bụ iwu ndị na-ekpebi otú ha si akpa àgwà, ma mgbe naanị ha nọ ma mgbe ha na ndị ọzọ nọ.
GỊNỊ MERE ÀGWÀ ỌMA JI DỊ MKPA?
E nwere ọtụtụ ihe na-ezighị ezi a na-agwa ndị na-eto eto taa banyere ihe bụ́ àgwà ọma. Ebe ha si anụ ihe ndị a bụ n’ọnụ ụmụ akwụkwọ ibe ha, n’egwú, na fim, nakwa na tiivi. Ihe ndị a nwere ike ime ka ha nwewe obi abụọ banyere ihe ndị a kụziiri ha na ha bụ ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.
Ihe a na-emekarị ndị nọ n’afọ iri na ụma. Otu akwụkwọ aha ya bụ Beyond the Big Talk kwuru na n’oge a ụmụaka ndị a na-eto eto, “ha kwesịrị ịghọta na ndị ọgbọ ha na ndị ha na-ahụ na tiivi nakwa n’Ịntanet na-achọ ime ka ha bụrụ ndị a ma ama. Ha kwesịkwara ịmụta ịna-eji ezigbo ihe ndị a kụziiri ha eme mkpebi, ọ bụrụgodị na ọ bụghị ihe ndị enyi ha chọrọ ka ha mee.” N’eziokwu, ndị nne na nna kwesịrị ịkụziri ụmụ ha ihe ndị a tupu ha eruo afọ iri na ụma.
OTÚ Ị GA-ESI KỤZIERE NWA GỊ ỊNA-AKPA ÀGWÀ ỌMA
Mee ka ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi doo ya anya.
IHE BAỊBỤL KWURU: ‘Ndị tozuru okè . . . zuru ikike nghọta ha azụ . . . ịmata ihe dị iche n’ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.’—Ndị Hibru 5:14.
-
Na-akpọrọ nwa gị aha ihe ndị ziri ezi na ihe ndị na-ezighị ezi. Jiri ihe ndị na-eme kwa ụbọchị na-eme ya. Dị ka ihe atụ, na-agwa ya, sị: “Ihe a bụ ikwu eziokwu; ihe a bụ ịgha ụgha.” “Ihe a bụ irube isi; ihe a bụ inupụ isi.” “Ihe a bụ inwe obiọma; ihe a bụ inwe obi ọjọọ.” Ọ ga-eme ka nwa gị mata ihe ndị o kwesịrị ime na ihe ndị ọ na-ekwesịghị ime.
-
Na-agwa ya ihe mere ihe ji zie ezi ma ọ bụ ghara izi ezi. Dị ka ihe atụ, na-ajụ ya ajụjụ ndị dị ka: Gịnị mere o ji akacha mma ikwu eziokwu? Olee otú ụgha si ekewa enyi na enyi? Gịnị mere izu ohi ji dị njọ? Kụziere ya iche echiche nke ọma ka ọ na-amata ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.
-
Mee ka ọ mata uru dị n’ịkpa àgwà ọma. I nwere ike ịgwa ya, sị: “Ị na-ekwu eziokwu, ndị mmadụ ga na-atụkwasị gị obi” ma ọ bụkwanụ “Ị dị obiọma, ndị mmadụ ga na-akpa gị nso.”
Gbalịa mee ka ndị ezinụlọ unu niile na-akpa àgwà ọma.
IHE BAỊBỤL KWURU: “Na-anwapụtanụ ihe unu onwe unu bụ.”—2 Ndị Kọrịnt 13:5.
-
Ndị ezinụlọ unu kwesịrị ịna-akpa àgwà ọma ka i nwee ike ikwu n’eziokwu, sị:
-
“Ndị ezinụlọ anyị anaghị agha ụgha.”
-
“Anyị anaghị alụ ọgụ ma ọ bụ aba mba.”
-
“Anyị anaghị agwa mmadụ okwu ọjọọ.”
-
Ọ ga-eme ka nwa gị mata na ọ bụghị naanị na unu chọrọ ka ndị ezinụlọ unu na-akpa àgwà ọma, kama na unu chọrọ ka e jiri ya mara ezinụlọ unu.
-
Gị na nwa gị na-ekwụrịta àgwà ndị ị chọrọ ka ndị ezinụlọ unu na-akpa. Jiri ihe ndị na-eme kwa ụbọchị na-akụziri ya ihe. I nwere ike ime ka ọ mata ihe mere àgwà ndị ị chọrọ ka ọ na-akpa ji dị iche ná ndị nke a na-akụzi n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ na tiivi. Jụọ ya ajụjụ ndị dị ka: “Ọ bụrụ gị ka ihe a mere, gịnị ka ị gaara eme?” “Olee ihe ezinụlọ anyị gaara eme?”
Mee ka obi sie ya ike ịna-eme ihe ziri ezi.
IHE BAỊBỤL KWURU: “Nweenụ ezi akọ na uche.”—1 Pita 3:16.
-
Jaa nwa gị mma ma o mee ihe ziri ezi. Nwa gị kpaa àgwà ọma, jaa ya mma, meekwa ka ọ mata ihe mere ihe ahụ o mere ji dị mma. Dị ka ihe atụ, i nwere ike ịgwa ya, sị: “I kwuru eziokwu n’ihe a. Eji m gị eme ọnụ.” Nwa gị gwa gị ihe ọjọọ o mere, buru ụzọ jaa ya mma maka ikwu ihe ahụ o mere tupu gị enyewa ya ndụmọdụ.
-
Gbazie nwa gị ma ọ kpaa àgwà ọjọọ. Nwa gị mejọọ ihe, nyere ya aka ikweta na o mejọrọ. E kwesịrị ịna-eme ka ụmụaka mata ihe ha mejọrọ na otú o si dị iche n’ihe e ji mara ezinụlọ unu. Ụfọdụ ndị nne na nna anaghị achọ ịgwa nwa ha banyere ihe o mejọrọ ka obi ghara ịjọwa ya njọ. Ma, gị na nwa gị kwurịta banyere ihe o mejọrọ, ọ ga-enyere ya aka ịzụ akọnuche ya ka ọ na-amata ihe ziri ezi na ihe na-ezighị ezi.