Okwu Mmalite
Ihe Isii Ụmụaka Kwesịrị Ịmụta
Nwa gị too, olee ụdị onye ị ga-achọ ka ọ bụrụ?
Onye na-ejide onwe ya
Onye dị umeala n’obi
Onye na-edi ihe
Onye a ga-atụkwasịli obi
Onye na-akpa àgwà ka dimkpa
Onye na-ekwu eziokwu
Ụmụaka agaghị amụta ihe ndị a n’onwe ha. Ọ bụ gị ga-akụziri ha ya.
N’akwụkwọ a, anyị ga-ekwu banyere ihe isii i kwesịrị ịkụziri ụmụ gị. Ihe ndị ahụ ga-enyere ha aka ma ha too.