5 Ò Nwere Mgbe Ahụhụ Ga-akwụsị?
Ihe Mere O Ji Dị Mkpa Ịmata Azịza Ya
Ọ bụrụ na o nwere ihe gosiri na ahụhụ ga-emecha kwụsị, o nwere ike ime ka otú anyị si ele ihe anya kakwuo mma, anyị agaghịkwa na-ata Chineke ụta.
Ihe Ị Ga-echebara Echiche
Ọtụtụ ndị ga-achọ ime ka ahụhụ ụwa a bie, mana ha agaghị emeli ya. Chegodị banyere ihe ndị a:
N’agbanyeghị ọganihu ụmụ mmadụ nwerela n’ihe gbasara ọgwụ . . .
Ọrịa obi ka bụ ihe kacha akpata ọnwụ ụmụ mmadụ.
Ọrịa kansa na-egbu ọtụtụ nde mmadụ kwa afọ.
N’akwụkwọ bụ́ Frontiers in Immunology, otu nwoke aha ya bụ Dr. David Bloom kwuru, sị: “Ọrịa ndị dị kemgbe ụwa, ndị nke ọhụrụ, na ndị nke na-eme ha nọtụ ha alọghachi, ka na eyi ụmụ mmadụ egwu.”
N’agbanyeghị na mba ụfọdụ bara ezigbo ọgaranya . . .
Kwa afọ, ọtụtụ nde ụmụaka na-anwụ, karịchaa, ụmụaka ndị bi ná mba ndị dara ogbenye.
Ọtụtụ ijeri mmadụ enweghị ebe dị mma a na-aga mposi ma ọ bụ ebe a na-ekpofu unyi.
Ọtụtụ narị nde mmadụ enweghị ebe ha ga-enweta ezigbo mmiri dị ọcha.
N’agbanyeghị na ọtụtụ ndị amatala gbasara ihe ndị ruuru mmadụ . . .
Otu akụkọ sị n’aka Òtù Mba Ụwa kwuru na a ka na-atụ mgbere mmadụ n’ọtụtụ obodo. Ọ ga-abụ na mba ndị hapụrụ ndị na-akpa arụ a amaghị na ụdị ihe ahụ na-eme n’obodo ha, ma ọ bụkwanụ ya abụrụ na ha enweghị ihe ndị ga-enyere ha aka ịkpara ndị a aka.
MỤTAKWUO IHE NDỊ ỌZỌ
Lee vidio bụ́ Gịnị Bụ Alaeze Chineke? Ọ dị na jw.org.
Ihe Baịbụl Kwuru
Ihe banyere anyị na-emetụ Chineke n’obi.
Ahụhụ anyị na-ata na nsogbu anyị nọ na ya na-ewute ya.
‘Chineke adịghị eleda mmekpa ahụ́ nke onye nọ n’ahụhụ anya, ọ dịghịkwa eleghara ya anya; o wepụghịkwa ihu ya n’ebe ọ nọ, mgbe o tikuru ya maka enyemaka, ọ nụrụ.’—ABỤ ỌMA 22:24.
“Na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.”—1 PITA 5:7.
Ahụhụ agaghị adịgide ruo ebighị ebi.
Baịbụl kwere anyị nkwa na Chineke ga-emecha mezuo ihe o bu n’obi kee anyị.
“Chineke . . . ga-ehichapụkwa anya mmiri niile n’anya ha, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ.”—MKPUGHE 21:3, 4.
Chineke ga-ewepụ ihe niile na-akpatara ụmụ mmadụ ahụhụ.
Ọ ga-eji Alaeze ya mee ya. Baịbụl gosiri na Alaeze Chineke bụ ọchịchị dị adị.
“Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze nke a na-agaghị ebibi ebibi malite ịchị. A gaghịkwa enyefe ndị ọ bụla ọzọ alaeze ahụ. . . . Ma ya onwe ya ga-adịru mgbe ebighị ebi.”—DANIEL 2:44.