Ezinụlọ na Ndị Enyi
Ọ na-esiri ọtụtụ ndị ike ha na ndị ezinụlọ ha na ndị enyi ha ịdị ná mma. Lee ihe Baịbụl kwuru ga-enyere gị aka ka gị na ndị mmadụ na-adịkwu ná mma.
NA-EME IHE GA-ABARA NDỊ ỌZỌ URU
IHE BAỊBỤL KWURU: “Na-elekwasị anya, ọ bụghị naanị n’ọdịmma onwe unu, kamakwa n’ọdịmma nke ndị ọzọ.”—Ndị Filipaị 2:4.
IHE Ọ PỤTARA: Ọ bụrụ na mkpa anyị abụrụ otú anyị ga-esi meere ndị ọzọ ihe ọma kama ịbụ otú anyị ga-esi nweta ihe n’aka ha, ọ ga-eme ka anyị na ha na-adị ná mma. Ọ bụrụ na ị na-achọ naanị ihe ga-abara gị uru, ọ ga-emebi adịm ná mma gị na ndị ọzọ. Dị ka ihe atụ, di ma ọ bụ nwunye na-achọ naanị ihe ga-abara ya uru nwere ike malite ịgba n’èzí. Ihe ọzọ bụ na o nweghị onye ọ na-amasị ka ya na onye na-eji ihe o nwere ma ọ bụ ihe ọ ma na-etu ọnụ na-akpa. Ọ bụ ya mere otu akwụkwọ aha ya bụ The Road to Character ji kwuo, sị: “Ndị na-eche naanị banyere onwe ha ga-enwe ọtụtụ nsogbu.”
IHE I NWERE IKE IME:
-
Na-enyere ndị ọzọ aka. Ezi ndị enyi na-atụkwasị ibe ha obi ma na-adị njikere inyere ibe ha aka mgbe niile. Nchọpụta ụfọdụ e mere gosiri na ndị na-enyere ndị ọzọ aka anaghị adakarị mbà n’obi. Ọ na-eme ka obi sie ha ike na ha bara uru.
-
Ka ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ gị n’obi. Ihe banyere ndị ọzọ imetụ mmadụ n’obi pụtara onye ahụ inwe mwute n’ihi nsogbu ndị ọzọ na-enwe. Ọ bụrụ na ihe banyere onye ọzọ na-emetụ gị n’obi, ị gaghị na-agwa ya okwu ọjọọ n’ụdị njakịrị.
Ọ bụrụ na ihe banyere ndị ọzọ na-emetụ gị n’obi, ị ga na-anabata ha. Ọ ga-emekwa ka ị ghara ịna-akpa ókè, meekwa ka ị na-emeta ndị ọzọ enyi n’agbanyeghị obodo ha si ma ọ bụ omenala ha.
-
Gị na ndị ọzọ na-anọrị. Anyị ga na-amatakwu ndị ọzọ nke ọma ma anyị na ha na-anọrị. Ị chọọ imeta ezi ndị enyi, na-ekwu gbasara ihe ndị na-amasị ha na ihe ndị dị ha mkpa. N’ihi ya, na-ege ntị nke ọma. Gosi na ihe na-echu enyi gị ụra, na-echukwa gị ụra. Nchọpụta e mere na nso nso a gosiri na “mmadụ na onye ọzọ ịkparịta ezigbo ụka na-eme ka ha nwee obi ụtọ.”
SAA ANYA NÁ MMIRI HỌRỌ EZI NDỊ ENYI
IHE BAỊBỤL KWURU: “Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.”—1 Ndị Kọrịnt 15:33.
IHE Ọ PỤTARA: Ndị gị na ha na-akpa nwere ike ime ka ị na-akpa àgwà ọma ma ọ bụ àgwà ọjọọ. Ndị na-amụ banyere àgwà mmadụ kwuru na onye ya na mmadụ na-akpa nwere ike ịgbanwe ọtụtụ ihe ná ndụ onye ahụ. Dị ka ihe atụ, ha kwuru na ọ bụrụ na gị na ndị na-ese sịga ma ọ bụ ndị chọrọ ịgba alụkwaghịm ana-akpa, i nwere ike ibidokwa sewe sịga ma ọ bụkwanụ chọọ ịgba alụkwaghịm.
IHE I NWERE IKE IME: Meta ndị na-akpa àgwà ndị na-amasị gị ma ọ bụ ndị nke ị chọrọ ịna-akpa enyi. Dị ka ihe atụ, gị na ndị dị akọ, ndị na-asọpụrụ ndị ọzọ, ndị na-emesapụ aka, na ndị na-ele ọbịa kwesịrị ịna-akpa.
IHE NDỊ ỌZỌ BAỊBỤL KWURU
ZERE ỊGWA NDỊ ỌZỌ OKWU ỌJỌỌ.
“E nwere onye na-ekwu okwu n’echeghị echiche dị ka ebe e ji mma agha maa mmadụ.”—ILU 12:18.
NA-EMESAPỤ AKA.
“Mkpụrụ obi nke na-emesapụ aka ka a ga-eme ka ọ maa abụba.”—ILU 11:25.
NA-EMESO NDỊ ỌZỌ IHE OTÚ Ị GA-ACHỌ KA E SI MESOO GỊ.
“Ihe niile unu chọrọ ka ndị mmadụ na-emere unu, unu onwe unu aghaghị imere ha otú ahụ.”—MATIU 7:12.