Mmadụ Ijide Onwe Ya
Baịbụl gwara anyị ka anyị na-ejide onwe anyị ma gbalịa na-eme ihe ndị ga-abara anyị uru.
IWE IWE
IHE BAỊBỤL KWURU: “Onye na-adịghị ewe iwe ọsọ ọsọ dị mma karịa dike.”—Ilu 16:32.
IHE Ọ PỤTARA: Ọ bụrụ na anyị ejisie ike na-ejide onwe anyị, ghara ịna-ewe iwe ọsọ ọsọ, ọ ga-abara anyị uru. Mgbe ụfọdụ, e nwere ezigbo ihe mere mmadụ nwere ike iji wee iwe. Ma, oké iwe ga-akpatara anyị nsogbu. Ndị na-eme nchọpụta n’oge a kwuru na mmadụ anaghị eche echiche nke ọma ma iwe jide ya nakwa na onye iwe ji na-ekwukarị ma ọ bụ na-emekarị ihe ọ ga-emecha kwaara mmakwaara.
IHE I NWERE IKE IME: Tupu iwe emee ka i mee ihe na-adịghị mma, gbalịa jide onwe gị. Ụfọdụ ndị chere na mmadụ iwe oké iwe na-egosi na onye ahụ siri ike. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na onye ahụ adịghị ike. Baịbụl kwuru, sị: “Dị ka obodo e tidara etida nke na-enweghị mgbidi, otú ahụ ka onye na-adịghị ejide mmụọ ya dị.” (Ilu 25:28) Otu ihe ga-enyere anyị aka ịghara iwe oké iwe bụ ibu ụzọ chọpụta ihe merenụ tupu anyị ekwuo ma ọ bụ mee ihe ọ bụla. Baịbụl kwuru, sị: “Nghọta mmadụ nwere na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.” (Ilu 19:11) N’ihi ya, esemokwu bilite, anyị kwesịrị ige onye nke ọ bụla ntị nke ọma. O nwere ike mee ka anyị ghara iwe oké iwe n’ihi na anyị aghọtala ihe merenụ.
ỊNA-EKELE NDỊ MEERE GỊ IHE
IHE BAỊBỤL KWURU: “Gosikwanụ na unu bụ ndị nwere ekele.”—Ndị Kọlọsi 3:15.
IHE Ọ PỤTARA: Ndị mmadụ ekwuola na ọ bụ naanị ndị na-ekele ndị ọzọ maka ihe e meere ha na-enwe obi ụtọ. Ndị mmadụ nwụnahụtụrụla ma ọ bụ ndị ezigbo ihe funahụtụrụla ga-ekweta na ihe a bụ eziokwu. Ha kwuru na ihe nyeere ha aka
mgbe ụdị ihe a mere ha bụ ilekwasị anya n’ihe ndị ha nwere, ọ bụghị n’ihe ndị fụnahụrụ ha.IHE I NWERE IKE IME: N’ụbọchị ọ bụla, chee banyere ihe ndị ị ga-ekele Chineke maka ha ma ọ bụkwanụ gị edee ha n’akwụkwọ. Ọ bụghị iwu na ihe ndị ahụ ga-abụ oké ihe. Chee banyere ihe ndị yiri ihe na-adịchaghị mkpa, dị ka ọmarịcha anyanwụ na-awa n’ígwé, mkparịta ụka gị na onye ị hụrụ n’anya nwere, ma ọ bụkwanụ ndụ ị dị. Ime ihe ndị a nwere ike ime ka ị na-enwe obi ụtọ.
Ihe ọzọ ga-enyere gị aka bụ iche banyere ihe mere obi ji dị gị ụtọ maka ezinụlọ gị na ndị enyi gị. Ị chọpụta ihe na-amasị gị n’ebe ndị ọzọ nọ, gwa ha ya ihu na ihu ma ọ bụ n’akwụkwọ ozi, n’ozi iimel, ma ọ bụkwanụ n’ozi ekwentị. Ime ihe a ga-eme ka gị na ha na-adịkwu ná mma, gị ana-enwekwa obi ụtọ n’ihi ihe ọma ị na-emere ha.—Ọrụ Ndịozi 20:35.
IHE NDỊ ỌZỌ BAỊBỤL KWURU
ARỤMỤKA BIDO, SI EBE AHỤ PỤỌ.
“Mmalite esemokwu dị ka mmadụ imeghere mmiri ụzọ; ya mere, tupu esemokwu amalite, si n’ebe ahụ pụọ.”—ILU 17:14.
KWỤSỊ ỊNA-ECHEGBU ONWE GỊ BANYERE ỌDỊNIHU.
“Unu echegbula onwe unu mgbe ọ bụla maka echi, n’ihi na echi ga-enwe nchegbu nke ya. Ihe ọjọọ nke ụbọchị nke ọ bụla ezuworo ya.”—MATIU 6:34.
TUPU GỊ EMEE IHE, CHEE YA NKE ỌMA. EMELA IHE N’IHI OTÚ O SI DỊ GỊ N’OBI.
“Ikike iche echiche ga-echekwa gị nche, nghọta ga-echebekwa gị.”—ILU 2:11.