Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

Gịnị Mere Ịmata ma È Nwere Onye Okike Ji Dị Mkpa?

Gịnị Mere Ịmata ma È Nwere Onye Okike Ji Dị Mkpa?

Gịnị mere ịmata azịza ajụjụ a ji dị mkpa? Ọ bụrụ na ihe ndị a e kwurula emeela ka i kweta na Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile dị adị, o nwere ike ịbụ na ị ga-achọ ileba anya n’ihe ndị gosiri na Baịbụl si n’ike mmụọ nsọ ya. Ọ bụrụkwa na i kwetara n’ihe Baịbụl kwuru, lee uru ndị ị ga-erite:

Ị ga na-enwekwu obi ụtọ ná ndụ

IHE BAỊBỤL KWURU: “[Chineke] na-eme ka mmiri si n’eluigwe zooro unu, na-eme ka mkpụrụ unu kụrụ na-amị n’oge ya n’uju, na-enye unu nri hiri nne, na-emekwa ka unu na-enwe obi ụtọ.”​—Ọrụ Ndịozi 14:17.

IHE Ọ PỤTARA: Ihe niile dị n’ụwa a ndị na-eme ka ndụ na-atọ gị ụtọ bụ onyinye si n’aka Onye kere ihe niile. Obi ga na-atọkwu gị ụtọ maka onyinye ndị a ma ị mata na Onye nyere gị ha ji gị kpọrọ ihe.

Ị ga-enweta ezigbo ndụmọdụ ndị ga na-abara gị uru kwa ụbọchị

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ị ga-aghọta ihe bụ́ ezi omume na ikpe ziri ezi na ịkwụwa aka ọtọ, ya bụ, ihe niile dị mma mmadụ kwesịrị ịna-eme.”​—Ilu 2:9.

IHE Ọ PỤTARA: Ebe ọ bụ Chineke kere gị, ọ ma ihe ndị ga na-eme gị obi ụtọ. Ọ bụrụ na ị mụọ Baịbụl, ị ga-amụta ihe ndị ga-abara gị uru ugbu a.

Ị ga-amata azịza ajụjụ ndị ị na-ajụ

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ị ga-amụtakwa banyere Chineke.”​—Ilu 2:5.

IHE Ọ PỤTARA: Ị mata na e nwere Onye Okike, ọ ga-enyere gị aka ịmata azịza ajụjụ ndị dị ka: Gịnị ka o bu n’obi kee mmadụ? Gịnị mere ahụhụ ji ju ebe niile? Gịnị na-eme anyị ma anyị nwụọ? Ị ga-ahụ azịza ajụjụ ndị a na Baịbụl.

Ị ga-enwe olileanya na ihe ga-adị mma n’ọdịnihu

IHE BAỊBỤL KWURU: “Jehova kwuru, sị, ‘Ama m nnọọ ihe m na-echere unu. Ọ bụ ka udo dịrị unu, ọ bụghị ka ọdachi dakwasị unu. M chọrọ ka ihe dịrị unu ná mma n’ọdịnihu nakwa ka unu nwee olileanya.’”​—Jeremaya 29:11.

IHE Ọ PỤTARA: Chineke kwere nkwa na ọ ga-eme ka ihe ọjọọ, ahụhụ, na ọnwụ kwụsị n’ọdịnihu. Ọ bụrụ na obi esie gị ike na nkwa ndị Chineke kwere ga-emezu, ọ ga-eme ka i jiri obi ike na-edi nsogbu ndị na-abịara gị kwa ụbọchị.